Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Na-akawanye Njọ?

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Na-akawanye Njọ?

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Na-akawanye Njọ?

“Anyị pụrụ ịtụ anya na ọnọdụ ọjọọ mgbanwe a na-enwe n’ihu igwe na-akpata ga-anọgide na-ebibikwu ihe n’ọdịnihu. Nke a pụtara na anyị aghaghị ịtụwa anya ụdị ọdachi ndị ọhụrụ ọnọdụ ihu igwe ga-akpata nakwa ihe ndị ka ukwuu ha pụrụ ịla n’iyi. . . . Dị ka ụkpụrụ nke ịkpachara anya si dị, anyị kwesịrị ịdị njikere maka mgbanwe ndị dị ịrịba ama.”—Akwụkwọ Bụ́ “Topics Geo—Annual Review: Natural Catastrophes 2003.”

OKPOMỌKỤ kpara akụkụ ụfọdụ nke Europe aka ọjọọ n’oge ọkọchị nke afọ 2003. Oké okpomọkụ ahụ so n’ihe gburu ihe dị ka iri puku mmadụ atọ na Belgium, Britain, France, Ịtali, Netherlands, Portugal, na Spen. Oké okpomọkụ e nwere tupu udu mmiri amalite na Bangladesh, India, na Pakistan, gburu otu puku na narị mmadụ ise, ebe oké ọkọchị na ụdị okpomọkụ a na-ahụtụbeghị mbụ mere ka ọkụ repịa ọhịa dị ihe karịrị nde hekta atọ n’Australia.

Dị ka Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọnọdụ Ihu Igwe si kwuo, “n’oge oké ifufe Osimiri Atlantic nke afọ 2003, e nwere ụdị oké ifufe 16, bụ́ nke karịrị nnọọ ndị e nwere n’afọ 1944 ruo 1996. Oké ifufe e nwere na nke ọ bụla n’ime afọ ndị ahụ bụ 9.8, ma ọ nọgidewo na-arị elu kwa afọ n’ụzọ dị ịrịba ama kemgbe ihe dị ka afọ 1995.” Ọ dịgidere nnọọ otú ahụ ruo n’afọ 2004, bụ́ mgbe oké ifufe kpara mkpamkpa n’ógbè Caribbean nakwa n’Ọwara Oké Osimiri Mexico, bụ́ ebe o gburu ihe dị ka puku mmadụ abụọ ma bibie ọtụtụ ihe.

N’afọ 2003, oké ifufe na mmiri ozuzo nke kpatara oké idei mmiri, kpara Sri Lanka aka ọjọọ ma gbuo, ọ dịkarịa ala, narị mmadụ abụọ na iri ise. N’afọ 2004, e dekọrọ na ọ dịkarịa ala, oké ifufe 23 kpara mkpamkpa n’ebe ọdịda anyanwụ nke Oké Osimiri Pacific. Iri n’ime ha mere na Japan, bụ́ ebe ha bibiri ihe dị ukwuu ma taa isi ihe karịrị otu narị mmadụ na iri asaa. Idei mmiri oké mmiri ozuzo kpatara kpara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ iri atọ aka ọjọọ n’ebe Ndịda Eshia, karịsịa na Bangladesh. O mere ka ọtụtụ nde mmadụ gharazie inwe ebe obibi, ọ chụpụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ atọ n’ụlọ ha ma gbuo ihe karịrị otu puku na narị mmadụ atọ.

Ọtụtụ oké ala ọma jijiji mere n’afọ 2003. Na May 21, n’Algiers, Algeria, ala ọma jijiji merụrụ puku mmadụ iri ahụ́ ma mee ka narị puku mmadụ abụọ gharazie inwe ebe obibi. Mgbe o ji nkeji iri abụọ na isii gafee elekere ise nke ụtụtụ, n’ụbọchị December 26, ala ọma jijiji mere n’ebe dị kilomita asatọ site n’ebe ndịda nke obodo Bam, bụ́ nke dị n’Iran. Ala ọma jijiji ahụ bibiri pasent 70 nke obodo ahụ, gbuo iri puku mmadụ anọ, ma mee ka ihe karịrị otu narị puku mmadụ gharazie inwe ebe obibi. Ọ bụ nke kasị gbuo mmadụ n’ime ọdachi ndị meere onwe ha n’afọ ahụ. O mekwara ka ihe ka ukwuu n’ebe e wusiri ike nke Bam, bụ́ Arg-e-Bam, bụ́ nke dịwara kemgbe puku afọ abụọ gara aga, ghọọ mkpọmkpọ ebe, nke pụtara na o mere ka otu ihe na-akpọta ndị mmadụ n’ógbè ahụ ma na-enye ógbè ahụ ego, funahụ ha.

Kpọmkwem otu afọ mgbe nke ahụ mesịrị, oké ala ọma jijiji mere n’oké osimiri n’ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri dị n’ebe ugwu Sumatra, Indonesia, na-akpata ajọ ebili mmiri nke kasị laa ndụ n’iyi n’akụkọ ihe mere eme. Ebili mmiri ahụ gburu, ọ dịkarịa ala, narị puku mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ́, mee ka ha ghara inwe ebe obibi, ma ọ bụkwanụ ha abụọ. Ajọ ebili mmiri a kpakwara ike ọbụna n’ụsọ oké osimiri nke ebe ọwụwa anyanwụ Africa, bụ́ nke dị puku kilomita anọ na narị ise ma ọ bụ karịa site n’ebe ala ọma jijiji nke kpatara ebili mmiri ahụ mere.

À Ka Ga-enwe Ọdachi Ndị Ka Njọ?

Ihe ndị a merenụ hà na-egosi na ihe ndị ka ha njọ ka ga-eme? Banyere ọdachi ndị ọnọdụ ihu igwe na-akpata, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kweere na mgbanwe ụmụ mmadụ na-eme ka ọnọdụ ihu igwe na-agbanwe na-emebi ikuku ma na-eme ka ọnọdụ ihu igwe na-adịkwu njọ. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ọ pụtara na ihe agajeghị ịdị mma n’ọdịnihu. Tụkwasị n’ihe ize ndụ ahụ, ọtụtụ mmadụ na-agazi ebi n’ebe ndị ọdachi pụrụ ime n’ihi na ha họọrọ ibi n’ebe ndị ahụ—ma ọ bụkwanụ n’ihi na ọ dịghị ebe ọzọ ha pụrụ ibi.

Ihe ndekọ e nwere na-egosi na pasent 95 nke ndị nile nwụrụ n’ọdachi bụ ná mba ndị ka na-emepe emepe ka ha nọ. N’aka nke ọzọ, ndị ọdachi na-egbu ná mba ndị bara ọgaranya na-epe mpe karịa, ma pasent 75 nke akụ̀ na ụba ha na-ala n’iyi. Ụfọdụ ndị ọrụ inshọransị na-echedị echiche ma ọrụ ha ọ̀ ga-adịgidekwa n’ihi ihe ndị a ọdachi na-ala n’iyi.

N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ikike ndị sitere n’okike bụ́ ndị na-eme ka e nwee ọdachi nakwa ụzọ o si bụrụ na ụmụ mmadụ pụrụ iso eme ka ọdachi na-aka njọ. Anyị ga-atụlekwa ma ụmụ mmadụ hà nwere ike na ọchịchọ iweta mgbanwe a chọrọ iji mee ka ụwa bụrụ ebe dị mma obibi nye ọgbọ na-abịanụ.

[Foto dị na peeji nke 11]

FRANCE 2003 Okpomọkụ nke oge ọkọchị gburu iri puku mmadụ atọ na Europe; ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ e nwere na Spen bụ ihe dị ka 44.8 degrees Celsius

[Ebe E Si Nweta Foto]

Alfred/EPA/Sipa Press

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

IRAN 2003 Ala ọma jijiji nke mere na Bam gburu iri puku mmadụ anọ; ebe ụmụ nwanyị na-eru újú ndị ikwu ha n’ili e liri ọtụtụ mmadụ na ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe azụ na ụmụ nwanyị: © Tim Dirven/Panos Pictures