Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha na Otú Aka Ụmụ Mmadụ Si Dịrị na Ha
Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha na Otú Aka Ụmụ Mmadụ Si Dịrị na Ha
MGBE e lekọtara ụgbọala anya nke ọma, mmadụ pụrụ iji ya mee njem n’enweghị nsogbu. Ma ụgbọala ahụ pụrụ ịdị ize ndụ ma e leghara ya anya ma ọ bụ hapụ ilekọta ya. N’ụzọ ụfọdụ, a pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ụwa anyị.
N’echiche ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị, mgbanwe ụmụ mmadụ ji aka ha mee ka ihu igwe na oké osimiri gbanwee emewo ka ụwa anyị bụrụ ebe dị ize ndụ site n’iso na-eme ka ọdachi ndị na-emere onwe ha na-emekwu ugboro ugboro ma na-akpụ ọkụ n’ọnụ karị. O yighịkwa ka ihe ọ̀ ga-aka mma n’ọdịnihu. “Anyị nọ ná nnukwu nnwale a na-eme aghara aghara, bụ́ nke e ji nanị otu ụwa anyị nwere na-eme,” ka otu isiokwu nke kwuru banyere mgbanwe ihu igwe na magazin bụ́ Science, kwuru.
Ka anyị wee nwee ike ịghọtakwu otú ihe ụmụ mmadụ na-eme pụrụ isi na-emetụta ugboro ole ọdachi ndị na-emere onwe ha na-eme nakwa otú ha na-akpụru ọkụ n’ọnụ, ọ dị anyị mkpa ịghọtatụ banyere ike ndị sitere n’okike bụ́ ndị na-akpata ha. Dị ka ihe atụ, gịnị mere e ji enwe oké ifufe na-ebibi ihe?
Ihe Ndị Na-ebusasị Okpomọkụ n’Ụwa
E jiriwo ihu igwe tụnyere ígwè ọrụ nke na-agbanwe ike sitere n’anyanwụ ma na-ekesa ya. Ebe ọ bụ na ihe ka ukwuu n’okpomọkụ anyanwụ na-achakwasị n’Ebe Okpomọkụ Ụwa, okpomọkụ ahụ na-adịghị ezu ụwa ọnụ na-eme ka ikuku na-efegharị. * Gburugburu ụwa na-agba kwa ụbọchị na-eme ka ikuku a mmiri dị na ya gbawa gburugburu, ụfọdụ n’ime ha na-abịa gbasiwe gburugburu ike. Ikuku a na-agba gburugburu pụrụ imesị ghọọ oké ifufe ma bibie ihe.
Ọ bụrụ na i leruo anya n’otú ifufe nke ebe okpomọkụ si aga, ị ga-achọpụta na ha na-eche ihu n’ógbè ndị ka jụọ oyi, ma ọ́ bụghị n’ebe ugwu ụwa ọ bụrụ n’ebe ndịda ya. Ka ifufe na-eme otú ahụ, ha na-arụ ọrụ dị ka nnukwu ígwè ọrụ na-ebusasị okpomọkụ, na-enye aka eme ka ọnọdụ ihu igwe ghara ịdị njọ. Ma mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke elu oké osimiri gafere 27 degrees
Celsius, ifufe ahụ pụrụ inweta ike ga-eme ka ọ ghọọ oké ifufe na-ebibi ihe.N’ime ọdachi ndị meere onwe ha na United States, nke kasị gbuo mmadụ bụ oké ifufe bu mmiri ozuzo nke kpara mkpamkpa n’agwaetiti Galveston, Texas, na September 8, 1900. Oké ifufe ahụ gburu ihe dị n’agbata puku mmadụ isii na puku mmadụ asatọ n’obodo ahụ, nakwa ihe ruru puku mmadụ anọ n’obodo ndị gbara ya gburugburu, ma bibie ihe dị ka puku ụlọ atọ na narị isii. N’ezie, ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ wuru na Galveston nke ifufe ahụ na-ebibighị.
Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, e nweela ọtụtụ oké ifufe ndị kpara mkpamkpa n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ndị ọkà mmụta sayensị na-eme nchọpụta iji mara ma oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa, bụ́ nke pụrụ ịdị na-enyekwu oké ifufe a ike, ò so akpata ya. Otú ọ dị, mgbanwe a na-enwe n’ọnọdụ ihu igwe pụrụ ịbụ nanị otu ihe na-egosi na okpomọkụ a na-enwe n’ụwa na-aka njọ. Ihe ọzọ pụrụ ibibi ihe nke oké ọkụ ụwa na-ekpo na-akpata pụrụ ịbụwo nke onye ọ bụla ji anya ya na-ahụ.
Otú Oké Osimiri Si Na-etoju na Mgbukpọ A Na-egbukpọ Oké Ọhịa
Dị ka otu isiokwu gbara na magazin bụ́ Science si kwuo, “n’ime otu narị afọ gara aga, oké osimiri ejirila sentimita 10 ruo 20 [inchis anọ ruo asatọ] too, nke ka ya njọ ka ga-emekwa.” Olee otú nke a na oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa pụrụ isi nwee njikọ? Ndị nchọpụta na-arụtụ aka n’ụzọ abụọ ha pụrụ isi nwee njikọ. Otu bụ mgbaze ice ndị dị n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda ụwa pụrụ ịdị na-agbaze, bụ́ nke ga-eme ka oké osimiri too ma ọ sọbanye na ya. Nke ọzọ bụ na ka oké osimiri na-ekpokwu ọkụ ka ọ na-eto.
Ọ pụrụ ịbụ na obere agwaetiti Tuvalu, bụ́ nke dị n’Oké Osimiri Pacific, amalitelarị ịta ahụhụ ntoju a oké osimiri na-etoju. Magazin bụ́ Smithsonian kwuru na ihe ndekọ e nwetara n’agwaetiti Funafuti na-egosi na oké osimiri dị ebe ahụ ji “milimita 5.6 na-eto kwa afọ n’ime afọ iri gara aga.”
N’ọtụtụ ebe n’ụwa, mmụba ndị mmadụ na-amụba na-apụta na ọtụtụ mmadụ ga na-akwaga n’obodo ndị mepere emepe, na a ga na-arụkwu mkpọmkpọ ụlọ aghara aghara, nakwa na a ga na-ebibikwu gburugburu ebe obibi. Ihe ndị a pụrụ ime ka ọdachi ndị na-emere onwe ha na-aka njọ. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Haiti bụ agwaetiti nke ndị bi na ya karịrị akarị, nke e jikwa igbukpọ oké ọhịa mara. N’otu akụkọ ụwa a kọrọ na nso nso a, e kwuru na n’agbanyeghị otú ọnọdụ akụ̀ na ụba, nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke ọhaneze dịruru ná njọ ná mba ahụ, ọ dịghị ihe na-etinye mba ahụ n’ihe ize ndụ karịa mgbukpọ a na-egbukpọ ọhịa ndị dị na ya. Ihe ize ndụ a bịara doo anya n’ụzọ dị egwu n’afọ 2004, bụ́ mgbe oké mmiri ozuzo mere ka e nwee apịtị na-asọ ka mmiri bụ́ nke tara isi ọtụtụ puku mmadụ.
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Time nke Eshia hotara “oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa, ogbugbo a na-egbo mmiri, mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa, na ịsụchasị ọhịa ma kpọọ ya ọkụ iji kọọ ihe na ya,” dị ka ihe ndị kasị mee ka ọdachi ndị meere
onwe ha n’Ebe Ndịda Eshia ka njọ. N’aka nke ọzọ, mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa pụrụ ime ka oké ọkọchị ka njọ site n’ime ka ala kpọọ nkụ ngwa ngwa. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, oké ọkọchị e nwere n’Indonesia nakwa na Brazil mere ka e nwee ụdị ọkụ ọgbụgba a na-enwetụbeghị mbụ, bụ́ ndị gbara ọhịa osisi ndụ juru na ha, ndị na-agatụghị agba ọkụ ma ihe dị otú o kwesịrị. Ma, ọ bụghị nanị ajọ ọnọdụ ihu igwe na-akpata ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọdachi ndị na-eme n’ọtụtụ mba bụ n’ime ala ka ọ na-esi.Mgbe Ala Mara Jijiji
Mbara ala anyị kewagasịrị ekewa n’ụzọ na-ahaghị nhata, ha nile na-agakọkwa. N’ezie, ala na-agagharị agagharị nke ukwuu nke na ọtụtụ nde ala ọma jijiji pụrụ ime kwa afọ. Ma, a dịghị ama banyere ọtụtụ n’ime ha.
A na-ekwu na ihe dị ka pasent 90 nke ala ọma jijiji nile na-emenụ na-eme n’ebe ndị ahụ ala nọ kewaa. Oké ala ọma jijiji na-emekwa mgbe ụfọdụ n’ebe na-abụghị ebe ndị ahụ ala nọ kewaa, ọ bụ ezie na ụdị a adịkebeghị eme. Dị ka ihe ndekọ e nwere na-egosi, ala ọma jijiji nke kasị gbuo mmadụ n’akụkọ ihe mere eme bụ nke ahụ mere n’ógbè atọ dị na China n’afọ 1556. Ọ pụrụ igbuwo ihe ruru narị puku mmadụ asatọ na iri puku atọ!
Ala ọma jijiji pụkwara ịnọgide na-ebibi ihe mgbe o mesịrị. Dị ka ihe atụ, na November 1, 1755, ala ọma jijiji kwaturu ụlọ nile dị na Lisbon, Portugal, bụ́ nke narị puku mmadụ abụọ na iri puku asaa na ise bi na ya. Ma ọdachi ahụ akwụsịghị ebe ahụ. Ala ọma jijiji ahụ mere ka ọkụ malite ịgba, meekwa ka oké ebili mmiri nke ịdị elu ya ruru mita 15, bụ́ nke si n’Oké Osimiri Atlantic, banye n’elu ala ma bibie ihe dị ukwuu. Ná ngụkọta, ndị nwụrụ n’obodo ahụ karịrị iri puku mmadụ isii.
Ọzọkwa, ụmụ mmadụ so mee ka ọnụ ọgụgụ dị ukwuu otú a nwụọ n’ọdachi ndị ahụ. Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ mmadụ na-aga ebi n’ebe ndị ọdachi na-emekarị. “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo ukwu nile dị n’ụwa dịzi n’ebe ndị
ala ọma jijiji pụrụ ime,” ka onye edemede bụ́ Andrew Robinson, kwuru. Ihe ọzọ na-akpata ya bụ ụlọ ndị a na-arụ—ihe ndị e ji rụọ ha na otú ha siruru n’ike. Okwu ahụ a na-ekwukarị bụ́, “Ala ọma jijiji anaghị egbu ndị mmadụ; ọ bụ ụlọ na-egbu ha,” na-abụkarị eziokwu. Ma gịnị ka ndị mmadụ ga-emekwanụ mgbe ha dagidere ogbenye ruo n’ókè nke enweghị ike ịrụta ụlọ ndị pụrụ iguzogide ala ọma jijiji?Ala Ịgbọpụta Ọkụ—Ọ Na-eme Ka Ihe Dịrị, Na-ebibikwa Ihe
“Ikekwe, e nwere ma ọ dịkarịa ala, ebe 20 ala na-agbọpụta ọkụ ugbu a ị na-agụ okwu ndị a,” ka otu akụkọ si n’aka ụlọ ọrụ Smithsonian Institute, nke dị na United States, kwuru. Ndị na-ekwu na ala kewara ekewa na-ekwukarị na ala ga-agbọpụta ọkụ kpọmkwem n’ebe ndị ahụ ala ọma jijiji ga-eme—n’ebe ndị ala nọ kewaa, karịsịa n’ebe ndị o kewara n’oké osimiri; n’ebe e nwere oghere n’ala nke ntụ ọkụ pụrụ isi na ya gbọpụta; nakwa n’ebe ala ndị a kewara ekewa nọ banye n’okpuru ibe ha.
Ọkụ ndị ala si n’ebe ndị ala nọ banye n’okpuru gbọpụta na-akasị egbu mmadụ n’ihi na ọ na-eme ugboro ugboro ma na-emekarị na nso ebe ndị mmadụ bijuru ebiju. Ná mba ndị dịdebere Oké Osimiri Pacific, bụ́ nke a na-akpọ Ógbè Ọkụ, e nwere ọtụtụ ebe ndị ala si n’ụdị ebe a agbọpụta ọkụ. E nwekwara ole na ole n’ime ha n’ebe e nwere ntụ ọkụ n’ime ala bụ́ ndị na-abụghị n’ebe ala nọ kewaa. O yichara ka ọ̀ bụ ájá ọkụ nke ala si n’ụdị ebe a gbọpụta, mere ka e nwee Agwaetiti Hawai, Agwaetiti Azores, Agwaetiti Galápagos, na Society Islands.
N’ezie, ọ dịla anya ájá ọkụ nke ala na-agbọpụta rụwara ọrụ dị mma n’ụwa. Dị ka e kwuru n’ebe otu mahadum na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, ihe ruru “pasent 90 nke ala ndị dị ná mpaghara ụwa ọ bụla nakwa ala oké osimiri, si n’ájá ọkụ ala gbọpụtara.” Ma gịnị na-eme ka ụfọdụ n’ime ájá ndị a bibie ihe n’ụzọ dị egwu ma ha gbọpụta?
Ala na-amalite ịgbọpụta ọkụ mgbe ihe ndị rọrọ arọ bụ́ ndị dị n’ebe dị oké ọkụ n’ime ala pụtawara n’elu ala. Ụfọdụ ugwu na-eji nnọọ nwayọọ agbọpụta ihe ndị a rọrọ arọ, bụ́ nke na-emekarị ka ọ ghara ịsọ ngwa ngwa iji sọkwuru ndị mmadụ na mberede. Ma ugwu ndị ọzọ na-eji ike karịrị ike bọmbụ nuklia agbọpụta ha! Ihe ndị na-akpata ya na-agụnye ihe ndị mejupụtara ihe ahụ gbọpụtaranụ na otú ọ rọruru arọ nakwa otú ikuku na mmiri ọkụ dị na ya haruru. Ka ihe ndị a rutewere n’elu ala, mmiri na ikuku ndị ha zutere na-eme ka ọ mụbaa ngwa ngwa. Ọ bụrụ na ihe ndị mejupụtara ihe ndị ahụ na-apụtanụ dị otú kwesịrịnụ, otú ọ ga-esi gbọpụta ga-adị ka otú soda a gbara ná mkpọ ga-esi agbọpụta ma e meghee ya.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ogologo oge tupu ugwu amalite ịgbọpụta ọkụ, a na-enwe ihe àmà ndị na-egosi na ọ ga-agbọpụta ọkụ. Otú ahụ ka Ugwu Pelée nke dị n’agwaetiti Martinique,
n’ógbè Caribbean, mere n’afọ 1902. Ma, oge a ga-eme ntụli aka ọchịchị n’obodo St. Pierre nke dịdewere ya nọ na-eru nso, ndị na-azọ ọchịchị gbakwara ndị mmadụ ume ịnọgide n’obodo ahụ, n’agbanyeghị ntụ jupụtara na ya nakwa ọrịa na ụjọ ji ndị bi na ya. N’ezie, ọtụtụ ndị ahịa akpọchielarị ụlọ ahịa ha eri ọtụtụ ụbọchị gara aga!May 8 bụ ụbọchị e ji eme ememe maka nrịgo Jizọs rịgoro n’eluigwe, ọtụtụ mmadụ gakwara na katidral ndị Katọlik iji kpee ekpere maka nchebe pụọ n’ọkụ ugwu ahụ na-achọ ịgbọpụta. N’ụtụtụ ahụ, obere oge tupu ya akụọ elekere asatọ nke ụtụtụ, Ugwu Pelée gbawara, na-agbọpụta ntụ ọkụ, ihe ndị dị ka icheku ọkụ, nkume ọkụ, na mmiri ọkụ—ndị ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ọkụ ha ji okpukpu abụọ ruo ise karịa nke mmiri gbọrọ agbọ. Ka ọ gbawara ma si n’ugwu ahụ sọrọ na-agbadata, o rikpuru obodo ahụ ma gbuo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku mmadụ iri atọ, gbazee mgbịrịgba ụlọ chọọchị ahụ, ma mụnye ọkụ n’ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ oké osimiri. Ọ bụ nke kasị gbuo mmadụ n’ime ugwu nile gbọpụtara ọkụ na narị afọ nke 20. Ma, ọ garaghị egburu mmadụ otú ahụ ma a sị na ndị mmadụ ṅara ntị n’ihe àmà ịdọ aka ná ntị ndị ahụ.
Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha, Hà Ga Na-aka Njọ?
N’akwụkwọ bụ́ World Disasters Report 2004, nke Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọrụ Ebere dere, òtù ahụ kwuru na n’ime afọ iri gara aga, ọdachi ndị ọnọdụ mbara ala na nke ihu igwe kpatara ejiriwo ihe karịrị pasent 60 mụbaa. “Nke a na-egosi ọnọdụ a ga-anọgide na-enwe,” ka akụkọ ahụ kwuru, bụ́ nke e bipụtara tupu ọdachi ahụ tara isi ọtụtụ ndị na December 26, bụ́ ụbọchị ala ọma jijiji mere n’Oké Osimiri India ma kpata oké ebili mmiri. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ anọgide na-ebiju n’ebe ndị ọdachi na-emekarị, a nọgidekwa na-egbukpọ oké ọhịa, ọ bụ ya bụ na ọ baghị uru ịtụwa anya na ihe ga-adị mma.
Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ mba ndị mepere emepe ka nọgidere nnọọ na-emebi ikuku. Dị ka e dere na magazin bụ́ Science, ịnọ na-eyigharị oge a ga-akwụsịlata imebi ikuku “dị nnọọ ka ịjụ ịnara ọgwụ maka ọrịa ka na-apụta apụta: Ọ na-eme ka e jide n’aka na a ghaghị imefuru ya ihe ka ukwuu n’ọdịnihu.” Banyere ihe ndị a ga-emefuru ya, otu akwụkwọ ndị Canada nke na-ekwu banyere ibelata ọdachi, kwuru, sị: “A pụrụ ikwu na mgbanwe a na-enwe n’ọnọdụ ihu igwe bụ nke mba ụwa kasịworo kwuo okwu na ya n’ime nsogbu nile metụtara gburugburu ebe obibi.”
Ma ka ọ dị ugbu a, mba ụwa ekwekọrịtabeghị na ihe ụmụ mmadụ na-eme so eme ka ụwa na-ekpokwu ọkụ, ma ya fọdụzie ịchọwa ihe a ga-eme banyere ya. Ọnọdụ a na-echetara anyị eziokwu Bible ahụ bụ́: “Ọ bụghị [mmadụ] . . . nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ma, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, ọnọdụ a abụghị nke olileanya na-adịghị na ya. N’ezie, ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata ugbu a, tinyere ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya, so bụrụ ihe àmà na-egosi na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Okpomọkụ anyanwụ ahụ na-adịghị ezu ụwa ọnụ na-emekwa ka e nwee ebili mmiri nke ga na-ebuga okpomọkụ ahụ n’ógbè ndị ka jụọ oyi n’ụwa.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]
MGBE IHE KARỊRỊ ỌKA TORO N’UBI
N’AFỌ 1943, otu onye ọrụ ugbo na-akọ ọka na Mexico hụrụ ihe na-abụghị ọka ka ọ na-eto n’ubi ya. Mgbe ọ gara n’ubi ya, ọ hụrụ ebe ndị ala gbawatụrụ agbawa. Ka ọ na-erule n’echi ya, ebe ahụ gbawatụrụ agbawa aghọọla obere ugwu nke ọkụ si na ya agbọpụta. N’izu na-esonụ, ugwu ahụ toro ruo mita 150, otu afọ mgbe nke ahụ gasịkwara, o topụrụ ruo mita 360. N’ikpeazụ, ugwu ahụ, bụ́ nke ji mita 2,775 karịa ịdị elu nke oké osimiri, bịara toruzie mita 430. Ugwu a, bụ́ nke a kpọrọ Paricutín, kwụsịrị ịgbọpụta ọkụ na mberede n’afọ 1952, ọ gbọpụtabeghịkwa ọkụ ọzọ kemgbe ahụ.
[Ebe E Si Nweta Foto]
U. S. Geological Survey/Foto nke R. E. Wilcox sere
[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]
MGBE CHINEKE ZỌPỤTARA ỌTỤTỤ MBA N’ỌDACHI
ỤNWỤ NRI bụ otu n’ime ọdachi ndị na-emere onwe ha. Otu n’ime ụnwụ nri ndị e dekọrọ dara mgbe ochie mere n’Ijipt oge ochie n’oge Josef, bụ́ nwa Jekọb, ma ọ bụ Izrel. Ụnwụ nri ahụ dara afọ asaa ma metụta Ijipt, Kenan, na mba ndị ọzọ. Ma, o meghị ka agụụ gbuo ọtụtụ mmadụ n’ihi na Jehova buru amụma banyere ụnwụ nri ahụ afọ asaa tupu ya ebido. O mekwara ka a mara na nri ga-eju ebe nile n’Ijipt n’ime afọ asaa ahụ a ga-anọ tupu ụnwụ nri ahụ amalite. N’okpuru idu ndú nke Josef, bụ́ onye na-atụ egwu Chineke, onye Chineke nyekwara aka mee ka ọ bụrụ praịm minista na onye okwu nri dị n’aka n’Ijipt, ndị Ijipt kwakọbara ọka n’ụba nke na ha “hapụrụ ịgụ ya ọnụ.” N’ihi ya, Ijipt bịara nwee ike ịzụ ọ bụghị nanị onwe ya kamakwa “ụwa nile,” gụnyere ezinụlọ Josef.—Jenesis 41:49, 57; 47:11, 12.
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
HAITI 2004 Ụmụ nwoke bu mmiri ọṅụṅụ na-aga n’okporo ámá mmiri tojuru. Mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa so mee ka oké mmiri ozuzo bubatajuo apịtị n’ebe nile
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
N’ebe azụ: Sophia Pris/EPA/Sipa Press; n’ime: Carl Juste/Miami Herald/Sipa Press
[Foto dị na peeji nke 17]
Ọtụtụ mba ka nọgidere na-emebi ikuku
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Mark Henley/Panos Pictures