Ọdachi Nile Ga-abịa ná Njedebe n’Isi Nso
Ọdachi Nile Ga-abịa ná Njedebe n’Isi Nso
“Ụmụ na ụmụ ụmụ. Geenụ m ntị! . . . N’oge na-adịghị anya, ugwu a ga-amalite ịgbọpụta ọkụ. Ma tupu nke a emee, ala ga-eme mkpọtụ ma maa jijiji. Anwụrụ ọkụ na ọkụ ga-apụta n’ike, oké ifufe ga-efekwa. Gbapụnụ n’eleghị anya n’azụ . . . Ọ bụrụ na unu ewere ya na ọ dịghị ihe ọ bụ, ọ bụrụ na akụ̀ dị unu mkpa karịa ndụ, unu ga-ahụsi anya n’ihi ejighị ihe kpọrọ ihe na anyaukwu unu. Unu echegbula onwe unu banyere akụ̀ na ụlọ unu, kama hụnụ na unu gbapụrụ n’egbughị oge.”
E DERE okwu ịdọ aka ná ntị a, bụ́ nke dị n’akwụkwọ bụ́ Earth Shock nke Andrew Robinson dere, n’elu ihe ncheta dị na Portici—otu obodo dịdebere nnọọ Ugwu Vesuvius nke dị n’Ịtali—mgbe ugwu ahụ gbọpụtasịrị ọkụ n’afọ 1631. O gburu ihe karịrị puku mmadụ anọ. Robinson kwuru, sị: “Ọ bịara daba nnọọ na ọ bụ ọkụ ahụ ugwu a gbọpụtara n’afọ 1631 . . . mere ka Vesuvius ghọọ aha a ma ama.” Olee otú o si bụrụ ya? Ka a nọ na-ewughachi obodo Portici, a chọtara obodo Herculaneum na Pompeii. Obodo abụọ ahụ bibiri mgbe ugwu Vesuvius gbawara n’afọ 79 O.A. ma kpochie ha ájá.
Pliny nke Nta, bụ́ onye Rom nke lanahụrụ ọdachi ahụ ma mesịa ghọọ gọvanọ, dere banyere ụdị mkpọtụ a na-adịghị anụkebe nke ugwu ahụ mere
tupu ya agbawaa. Ya na nne ya na ndị ọzọ mere ihe banyere ịdọ aka ná ntị ahụ ma lanahụ ọdachi ahụ.Ihe Ịrịba Ama Ndị Na-adọ Aka ná Ntị Banyere Oge Anyị
Taa, anyị ji ọsọ na-abịaru ọgwụgwụ nke usoro akụ̀ na ụba, nke mmekọrịta ọhaneze, na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. Olee otú anyị si mara? Otú anyị si mara bụ na Jizọs Kraịst buru amụma banyere ihe ndị ga-emegasị n’ụwa, ndị ga-abụ ihe ịrịba àmà ga-egosi na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke dị nso. Dị ka ugwu nke na-ebigbọ, na-akwụ anwụrụ ọkụ, ma na-agbọpụta ntụ ọkụ, ihe ịrịba ama ahụ na-agụnye agha ukwu, ala ọma jijiji, ụnwụ nri, na ọrịa na-efe efe—bụ́ ndị nọworo na-akpa ụwa ezé n’ụzọ a na-ahụtụbeghị ụdị ya kemgbe 1914.—Matiu 24:3-8; Luk 21:10, 11; Mkpughe 6:1-8.
Ma ihe ịrịba ama ahụ Jizọs ji na-adọ aka ná ntị na-agụnyekwa ozi na-enye olileanya. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Rịba ama na Jizọs kpọrọ ozi Alaeze ahụ “ozi ọma.” Ọ bụ ozi ọma n’ezie n’ihi na Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe nke dị n’aka Kraịst Jizọs, ga-emezi ihe nile ụmụ mmadụ mebiworo. Tụkwasị na nke ahụ, ọ ga-eme ka ọdachi ndị na-emere onwe ha kwụsị.—Luk 4:43; Mkpughe 21:3, 4.
N’ezie, mgbe Jizọs nọ n’ụwa dị ka mmadụ, o gosipụtara ike o nwere n’ebe ọnọdụ ihu igwe dị site n’ime ka oké ifufe nọ na-achọ igbu ndị mmadụ kwụsị. Ihe a Jizọs mere riri ndị na-eso ụzọ ya ọnụ, bụ́ ndị oké ifufe ahụ menyere ụjọ. Ha ajụọ, sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọ na-enye ọbụna ifufe na mmiri iwu, ha na-erubekwara ya isi?” (Luk 8:22-25) Taa, Jizọs abụghị mmadụ nkịtị, kama ọ bụ mmụọ dị ike. N’ihi ya, ịchịkwa ikike ndị sitere n’okike ka ha wee ghara imerụ ndị ọ ga na-achị ahụ́, agaghị abụrụ ya nsogbu!—Abụ Ọma 2:6-9; Mkpughe 11:15.
Ụfọdụ pụrụ iwere ihe a nile dị ka mmadụ ịmụ anya arọ nrọ. Ma buru n’uche na amụma Bible—n’adịghị ka nkwa na amụma nke ụmụ mmadụ—na-emezu kpọmkwem otú ahụ e si buo ya, gụnyere amụma ndị nke anyị hụrụ na-emezu kemgbe 1914. (Aịsaịa 46:10; 55:10, 11) Ee, e ji n’aka na ụwa ga-adị jụụ n’ọdịnihu. Ọdịnihu anyị ga-adịkwa otú ahụ ma anyị buru Okwu Chineke n’obi ma ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ o ji ịhụnanya na-enye banyere ihe omume ndị ga-eme ka ụwa mee mkpatụ, bụ́ ndị gaje iwere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya.—Matiu 24:42, 44; Jọn 17:3.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]
OLILEANYA DỊ AṄAA DỊỊRỊ NDỊ ANYỊ HỤRỤ N’ANYA NWỤRỤ ANWỤ?
MGBE onye anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị, anyị pụrụ iruru ya újú nke ukwuu. Bible gwara anyị na anya mmiri gbara Jizọs mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Ma, nanị minit ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs rụrụ otu ọrụ ebube dị ịrịba ama—o mere ka Lazarọs dịghachi ndụ! (Jọn 11:32-44) Site n’ime otú ahụ, o mere ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ezigbo ihe ha ga-agbakwasị ụkwụ na ya wee kwere ná nkwa ahụ dị ịtụnanya o kwere tupu mgbe ahụ n’oge ọ na-eje ozi ya, bụ́ mgbe ọ sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Ka olileanya ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ịdị ndụ n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs kasie ndị nile ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ obi.—Ọrụ 24:15.
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ị̀ na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị a na-enye na ụwa anyị a nọ n’ụbọchị ikpeazụ ya?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 18]
USGS, David A. Johnston, Cascades Volcano Observatory