Gịnị Mere O Ji Abụ Ndị Ọjọọ Ka M Na-enwe Mmasị Iso Na-akpakọrịta?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere O Ji Abụ Ndị Ọjọọ Ka M Na-enwe Mmasị Iso Na-akpakọrịta?
“Ama m na ekwesịghị m iso ya na-akpachi anya, ma anọgidere m soro ya na-akpa. Ọ tụrụ m n’anya na a ga-enwe nwoke ga-achọ ka mụ na ya na-akpa.”— Nancy. *
“Ana m adị aga nanị m n’ebe a na-agba ọsọ n’elu ‘snow,’ ọ naghị ete aka mụ na ndị ‘enyi’ m nwetara ebe ahụ amalite ịkpachi anya. Obere oge, amalitere m ibi ndụ rụrụ arụ.”— Dan.
A MALITERE n’oge Nancy na Dan dị obere kụziwere ha nnọọ ihe ime mmụọ. A zụlitere Nancy n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke, o bidokwara n’oge ọ dị afọ itoolu kọwara ndị ọzọ ihe ndị o kweere. Dan malitere ozi oge nile mgbe ọ dị afọ iri na ụma. N’agbanyeghị nke ahụ, ha abụọ nwere ihe ndị dọghachiri ha azụ n’ozi ha na-ejere Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ha sooro ndị ọjọọ kpakọrịta.
Ọ̀ dịtụla mgbe ị hụtara onwe gị na mberede ka ị malitere iso onye ị maara nke ọma na ọ na-enwe mmetụta dị njọ n’ebe ị nọ na-akpakọrịta? Onye ahụ pụrụ ịbụ nwa klas gị nke ihe ndị na-amasị gị na-amasị—ma ọ bụkwanụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nke i nwere mmasị ịhụnanya n’ebe ọ nọ.
Eleghị anya i chetara ndụmọdụ Bible bụ́: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Ma, ndị nile na-adịghị efe Jehova hà bụ mkpakọrịta ọjọọ? Gịnị ma ọ bụrụ na ha nwere ụfọdụ àgwà ọma ndị na-adọrọ mmasị? Gịnịkwanụ banyere onye bụ́ onye kwere ekwe ibe gị, ma ọ naghị esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ụzọ ime mmụọ? Tupu anyị azaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee otú anyị si amalite inwe mmasị dị otú a na ihe mere anyị ji enwe ya.
Gịnị Mere E Ji Enwe Ụdị Mmasị A?
Ebe ọ bụ na e kere mmadụ nile n’oyiyi Chineke, a pụrụ ịtụ anya na ụfọdụ ndị na-amaghị Jehova ga na-akpa àgwà ndị dị mma. N’ihi ya, ị pụrụ ịhụta ụfọdụ ndị dị ka ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù, ọbụna nwee mmasị n’ebe ha nọ, n’agbanyeghị na ha adịghị efe ezi Chineke ahụ. Ì kwesịrị izere ndị dị otú ahụ kpamkpam nanị n’ihi na ha amaghị eziokwu Bible? Mbanụ. Mgbe Bible na-adụ anyị ọdụ ka anyị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ,” nke ahụ gụnyere ndị gị na ha na-anọghị n’otu okpukpe Ndị Kraịst. (Ndị Galeshia 6:10) N’ihi ya, ilezi anya ịhọrọ ndị gị na ha ga na-akpachi anya apụtaghị na ị ga-emewe ka à ga-asị na ị ka ndị ọzọ. (Ilu 8:13; Ndị Galeshia 6:3) Omume dị otú ahụ ga-enye nkwenkwe gị dị ka onye Kraịst aha ọjọọ.
Otú ọ dị, ekele nke ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst agafeela nkù aka; ha esorowo ụfọdụ ndị
na-enwechaghị mmasị n’ihe ime mmụọ ma ọ bụ ndị na-enwetụghịdị ya enwe na-akpachi anya. Dan, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, bụ aka ochie n’egwuregwu ịgba ọsọ snow. Ndị ọ malitere iso na-akpachi anya n’ebe a na-eme egwuregwu ahụ abụghị Ndị Kraịst. N’ikpeazụ, Dan sooro ndị “enyi” ọhụrụ ya ahụ mewe omume rụrụ arụ, sorokwa ha na-aṅụ ọgwụ ike. Mgbe Dan chọpụtara na ụzọ ndụ ya ekwekọghịzi ná ndụ Ndị Kraịst, ọ kwụsịrị ije ozi ọma na ịga nzukọ ọgbakọ. O were ọtụtụ afọ tupu ya enweta ike ime mgbanwe ndị kwesịrịnụ ma lọghachi n’ezi ofufe.Otu onye kwere ekwe na-adịghị eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ dọọrọ mmasị Melanie. “A gwara m na ọ chọrọ agbamume, n’ihi ya amalitere m iso ya na-akpa,” ka Melanie kọwara. N’ezie, Bible na-agba Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-akwado ndị na-adịghị ike.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ma Melanie malitere iso enyi ọhụrụ ya ahụ na-aga n’ụlọ mmanya, bụ́ ebe ọ nọ tinye aka n’omume ọjọọ n’ihi iso ndị ọzọ o zutere ebe ahụ na-akpakọrịta.
Òkè Ezinụlọ Na-ekere
Ọnọdụ ezinụlọ unu pụrụ iso n’ihe ga-ekpebi ụdị ndị ị ga na-enwe mmasị iso na-akpakọrịta. Michelle na-adị eche ihe mere o ji abụkarị ụmụ nwoke ndị obi kpọrọ nkụ, ndị na-adịghịkwa echebara ndị ọzọ echiche, ka o yiri ka ọ̀ na-enwekarị mmasị iso na-akpakọrịta. O kwuru na ha na-echetara ya nna ya, bụ́ onye ọ na-adịghị mgbe ya na ya kpachiri anya, onye na-adịghịkwa ka ọ̀ dị mgbe o nwere oge iso ya nọkọọ. O kweere na ọ marala ya ahụ́ ịchọ ihu nwoke na-achọghị ya, nke na ọ dịghị ama mgbe ọ malitere iso onye dị otú ahụ dịwa ná mma.
N’aka nke ọzọ, onye na-eto eto nne na nna bụ́ Ndị Kraịst zụlitere pụrụ ịchọ ịma otú ndị ọzọ si ebi ndụ, na-eche na nne ya na nna ya adịghị ekwe ya megharịa ahụ́. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị, ịnwa imegharị ahụ́ site n’iso “ndị enyi nke ụwa” na-akpakọrịta ọ̀ bụ ebe o biri? (Jems 4:4) Tụlee ihe mere Bill.
N’agbanyeghị na nne ya malitere kụziwere ya Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ ka dị obere, Bill achọghị ịrara ndụ ya nye Jehova, na-eche na ime nke ahụ ga-eme ka ya ghara inwere onwe ya ime ihe ọ bụla ya chọrọ ime. Ebe ọ bụ na ọ chọrọ ịma ihe ndụ nke ndị na-abụghị ezi Ndị Kraịst dị ka ya, ọ malitere iso ajọ òtù na-akpakọ. Nke a mere ka ọ malite ịṅụ ọgwụ ike, ime ihe ike, na
ime mpụ. N’ihi ajọ ọsọ ndị uwe ojii chụrụ ya, o merụrụ ahụ́ ma nọọ ọtụtụ ọnwa na-amaghị onwe ya. Ndị dọkịta chere na ọ ga-anwụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na Bill mesịrị gbakee. Ma o kpuola ìsì, nweekwa nkwarụ. Ọ mụtara ihe site n’ahụmahụ ọjọọ, ọ bụzi Onye Kraịst raara onwe ya nye ugbu a. Ma Bill abịakwala ghọta na ịmụta ihe n’ike pụrụ itinye mmadụ ná nsogbu ọ ga-ata ahụhụ ya ná ndụ ya nile.Ihe Ndị Ọzọ Mere E Ji Enwe Ya
Mgbe ụfọdụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emetụta echiche onye ntorobịa na-enwe banyere ụdị onye bụ́ ezigbo enyi. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ, na telivishọn, na fim, nakwa na vidio egwú, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ akụkọ banyere otu dike obi tara mmiri na mbụ, ma ya e mesịa ghọọ onye obiọma. Ihe a na-achọ ka ndị mmadụ kwere bụ na ndị yiri ndị obi tara mmiri na ndị na-eche nanị banyere onwe ha pụrụ imesị n’ezie ghọọ ndị obiọma na ndị na-echebara ndị ọzọ echiche. Ọzọkwa, ha pụrụ ime ka e kwere na nanị ihe dị mkpa iji mee ka àgwà ọma ndị a pụta ìhè bụ ya inwe ezigbo enyi, enyi a na-abụkarịkwa onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya. N’ezie, akụkọ ndị dị otú ahụ na-aga ahịa. Otú ọ dị, ugboro ole ka ị nụtụrụla na akụkọ ndị dị otú ahụ mere eme n’ezie? Ọ bụ ihe dị mwute na e jiriwo akụkọ ifo ndị dị otú ahụ duhie ụfọdụ ndị ntorobịa ma mee ka ha mete onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, nke na-emekwa ihe ike, enyi—ọbụna lụọ ya alụ—ma nọrọzie na-eche ka ọ “gbanwee” ghọọ ezigbo mmadụ, ma o nwebeghị isi.
Tụlee ihe ọzọ mere ụfọdụ ji enwe mmasị iso ndị ọjọọ na-akpakọrịta: Ha na-ewere na ha amaghị mma, n’ihi ya kwa, ha na-ekwe iso onye ọ bụla nyetụrụ ha ihu na-akpakọrịta. Nancy, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, maara ihe Bible kwuru banyere ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọwo na-ele onwe ya anya dị ka onye na-amaghị mma. Ọ bụ ya mere isi ji buo ya mgbe otu onye ọrụ ibe ya nke ya na ya na-anọghị n’otu okpukpe gosiri mmasị ịhụnanya n’ebe ọ nọ. Ọ malitere iso ya na-eme mkpapụ, ọ bịakwara fọ nnọọ obere ka o nwee mmekọahụ rụrụ arụ.
Dị ka ahụmahụ ndị a na-egosi, e nwere ọtụtụ ihe pụrụ ime ka Onye Kraịst na-eto eto nwee mmasị iso ndị ọjọọ na-akpa—o yikwara ka e nwere ọtụtụ ụzọ a pụrụ isi mee ka iso ndị dị otú ahụ na-akpachi anya yie ihe na-adịghị ihe o mere. Ma, ụdị mkpakọrịta a na-ebuterịrị nsogbu, ọbụna kpata ọdachi. N’ihi gịnị?
Mmetụta Ndị Enyi Na-enwe
Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ na-adị ka ndị enyi ya. N’ihi ya, ndị anyị na ha na-akpachi anya na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ebe anyị nọ. Ilu 13:20 na-egosi na mmetụta a pụrụ ịbụ nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ. O kwuru, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” Ndị bụ́ ezigbo enyi na-esirịrị otu ụzọ aga ma na-erukwa n’otu ebe, dị ka mmadụ abụọ ji otu ụgbọala aga, na-eme. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Ụzọ a enyi m si na-aga, m̀ ga-esi ya garuo ebe m na-aga? Ọ̀ ga-eme ka m rukwuo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị m setịpụrụ?’
N’eziokwu, mmadụ ịgwa onwe ya eziokwu anaghị adị mfe. Ọ pụrụ ịbụ na obi gị adịla n’ebe ọ nọ nke ukwuu. Ma, ihe obi gị gwara gị ọ̀ bụ nanị ihe ị ga-adabere na ya wee na-ahọrọ ndị enyi? Ọ pụrụ ịbụ na ị nụla ndụmọdụ ahụ a na-enyekarị, nke bụ́, “Mee ihe obi gị gwara gị.” Ma Ilu 28:26 na-ekwu, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu.” N’ihi gịnị? N’ihi na “obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9; Ọnụ Ọgụgụ 15:39) Mmadụ ịbụ onye aghụghọ pụtara ya ịbụ onye na-adịghị eguzosi ike n’ihe ma ọ bụ onye ụgha ma ọ bụkwanụ onye nrafu. Ị̀ ga-atụkwasị onye a maara na ọ bụ onye nduhie na onye sabo obi? Obi ihe atụ anyị pụrụ ịdị aghụghọ. N’ihi ya, nanị na i chere na adịm ná mma gị na mmadụ dị mma apụtaghị na ọ dị mma.
Ihe kasị mma ị pụrụ ịdabere na ya wee na-eme nhọrọ dị otú ahụ bụ Okwu Chineke. Ụkpụrụ Bible adịghị ka obi gị na-ezughị okè, n’ihi ya, ọ gatụghị arafu ma ọ bụ duhie gị. Olee otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nyere gị aka ikpebi ma mmadụ ọ̀ ga-abụ ezigbo enyi? Oleekwa otú ị pụrụ isi zere ime nhọrọ ọjọọ mgbe ị na-achọ enyi gị na ya ga-ebi ná ndụ gị nile—onye ị ga-alụ? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu ga-abịa n’ihu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwewo aha ndị dị n’isiokwu a.
[Foto dị na peeji nke 29]
Ụlọ ọrụ mgbasa ozi pụrụ imetụta echiche anyị na-enwe banyere ụdị onye bụ́ ezigbo enyi