Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ike Eluigwe Ọ̀ Bụ Ụzọ Ị Pụrụ Isi Mata Ihe Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

Ike Eluigwe Ọ̀ Bụ Ụzọ Ị Pụrụ Isi Mata Ihe Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

Echiche nke Bible

Ike Eluigwe Ọ̀ Bụ Ụzọ Ị Pụrụ Isi Mata Ihe Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

O LEE otú ị pụrụ isi meziwanye ndụ gị ma chụta ịhụnanya na ego? Ọtụtụ mmadụ na-aga eke eluigwe iji nwee ike ịchụta ihe ndị a. Kwa ụbọchị, ọtụtụ nde mmadụ na-agụ akwụkwọ akụkọ ndị na-ebu akara eluigwe, na-atụ anya ime ka ọdịnihu ha ka mma. A matawo ọbụna ndị ọchịchị ụwa dị ka ndị na-adabere na kpakpando eme mkpebi.

Ike eluigwe ọ̀ bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi? Olee otú ndị na-eke eluigwe si ebu amụma ha? Ndị Kraịst hà kwesịrị ikwe ka ihe ndị dị n’eluigwe na-ekpebiri ha otú ha ga-esi na-ebi ndụ?

Gịnị Bụ Ike Eluigwe?

Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, ike eluigwe “dabeere na nkwenkwe bụ́ na otú ihe ndị dị n’eluigwe si nọrọ na-eme ka e nwee akara ndị pụrụ igosi ihe ga-abụ àgwà mmadụ ma ọ bụ ọdịnihu ya.” Ndị na-eke eluigwe na-ekwu na ebe mbara ala dị iche iche na akara zodiac nọgasị kpọmkwem n’oge a mụrụ mmadụ, pụrụ imetụta ihe ndụ ya ga-abụ. * Ebe ihe ndị a dị na mbara igwe nọ n’oge ọ bụla ka a na-adabere na ya wee na-akọwa ihe ọdịnihu mmadụ ga-abụ.

Ọ dịla nnọọ anya a malitere kewe eluigwe. Ihe dị ka puku afọ anọ gara aga, ndị Babilọn malitere ịkọ ọdịnihu, na-adabere n’otú anyanwụ, ọnwa, na mbara ala ise ndị a kasị ahụ anya, si nọrọ. Ha kwuru na ihe ndị a dị n’eluigwe nwere ike ụfọdụ na-emetụta omume ụmụ mmadụ. Ka e mesịrị, ha webatara akara zodiac n’ihe ha na-adabere na ya ebu amụma ha.

Otú Amụma Ha Siworo Na-akụ Afọ n’Ala Kemgbe Ụwa

Bible na-akọwa njikọ dị n’etiti Babilọn na ike eluigwe. O zokwara aka ọtụtụ ugboro ná ndị Babilọn na-eke eluigwe. (Daniel 4:7; 5:7, 11) N’oge Daniel onye amụma, ike eluigwe bụ ihe a ma nnọọ ama na Kaldea (Babilọn) nke na onye kwuru “ndị Kaldea” na-adị nnọọ ka à ga-asị na ihe o kwuru bụ ndị na-eke eluigwe.

Ọ bụghị nanị na Daniel hụrụ mmetụta ike eluigwe nwere n’ebe ndị Babilọn nọ, kamakwa ọ hụrụ otú ndị na-eke eluigwe bi na Babịlọn si kụọ afọ n’ala n’ibu amụma banyere ọdịda nke obodo ahụ. (Daniel 2:27) Rịba ama ihe Aịzaịa onye amụma buru amụma ya narị afọ abụọ tupu oge ahụ, ya emeekwa otú ahụ o si buo ya. Aịzaịa mere ha akaje site n’ide, sị: “Ka ha guzo ọtọ, wee zọpụta gị, bụ́ ndị na-eke eluigwe, ndị na-elegide kpakpando, ndị na-eme ka a mara kwa ọnwa ihe ga-eme, na ihe ga-abịakwasị gị. . . . Ha agaghị anapụta onwe ha.”—Aịsaịa 47:13, 14.

O doro anya na ndị Babịlọn na-eke eluigwe ebulighị amụma banyere ọdịda Babilọn, ọbụna awa ole na ole tupu ya emee. Mgbe e dekwara ikpe ọmụma Chineke n’ahụ́ ájá nke obí Eze Belsheza, ndị ahụ na-eke eluigwe akọwalighị ihe odide ahụ dị mgbagwoju anya.—Daniel 5:7, 8.

Taa, ndị na-eke eluigwe enwebeghị ike ịkọ ihe ndị dị ịrịba ama ga-eme n’ọdịnihu. Mgbe ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ R. Culver na Philip Ianna, tụlesịrị ihe karịrị puku amụma atọ ndị na-eke eluigwe buru, ha kwuru na ọ bụ nanị pasent 10 n’ime ha mezuru. Onye ọ bụla bụ aka ochie n’ịtụle ihe ndị na-emenụ, pụrụ ime nke ọma karịa nke ahụ.

Ọ Na-emegide Ozizi Bible

Otú ọ dị, ihe mere ndị amụma Hibru ji jụ ike eluigwe abụghị nanị n’ihi na a na-akụkarị afọ n’ala na ya n’ihe banyere ịkọ ọdịnihu. Iwu ahụ Chineke nyere Mozis dọrọ ndị Izrel aka ná ntị kpọmkwem banyere ịgba afa. Iwu ahụ kwuru, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, . . . ma ọ bụ onye na-agba afa . . . Ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.”—Deuterọnọmi 18:10, 12.

Ọ bụ ezie na a kpọtụghị ike eluigwe aha n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, o doro anya na o so n’ihe iwu ahụ machibidoro. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu na ike eluigwe bụ “ụdị ụfọdụ nke ịjụ ndị mmụọ ase bụ́ nke gụnyere ịkọ ihe ndị ga-eme n’ụwa nakwa ná ndụ mmadụ site n’inyocha kpakpando, Anyanwụ, Ọnwa, nakwa mbara ala ndị ọzọ.” Ụdị nile nke ịjụ ndị mmụọ ase—ma ọ̀ bụ nke e lekwasịrị kpakpando anya wee jụọ ma ọ bụ nke e lekwasịrị n’ihe ndị ọzọ—megidere ụkpụrụ Chineke. N’ihi gịnị? E nwere ezi ihe kpatara ya.

Kama ikwu na ihe ịga nke ọma ma ọ bụ ọdịda anyị na-adabere na kpakpando, Bible kwuru ya hoo haa na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Chineke ga-ajụ onye ọ bụla n’ime anyị ajụjụ maka ihe ndị anyị na-eme, ebe ọ bụ na anyị nweere onwe anyị ime nhọrọ. (Deuterọnọmi 30:19, 20; Ndị Rom 14:12) N’ezie, ihe ọghọm ma ọ bụ ọrịa pụrụ ịdakwasị anyị n’ihi ọnọdụ ndị anyị na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ha. Ma Akwụkwọ Nsọ na-akọwa na ihe na-akpata ahụhụ ndị ahụ bụ “mgbe na ihe ndapụta,” ọ bụghị ebe ihe ndị dị na mbara igwe nọ mgbe a mụrụ anyị.—Eklisiastis 9:11.

A bịa n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya, Bible na-agba anyị ume iyikwasị onwe anyị àgwà ndị dị ka ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya. (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Àgwà ndị a bụ isi ihe na-eme ka mmadụ na ibe ya bụrụ ezigbo enyi nakwa ka alụmdi na nwunye sikwuo ike. “Nwoke na nwanyị inwe otu kpakpando” abụghị ezigbo ihe mmadụ ga-adabere na ya wee họrọ onye ọ ga-alụ. Bernard Silverman, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ, tụlere akara kpakpando nke ihe dị ka di na nwunye 3,500, bụ́ ndị pasent 17 n’ime ha gbarala alụkwaghịm. Ọ chọpụtara na ndị di na nwunye kpakpando ha na ibe ha na-abụghị otu, akaghị ndị nke ‘kpakpando ha na ibe ha bụ otu’ agba alụkwaghịm.

N’ụzọ doro anya, ike eluigwe abụghị ihe apụrụ ịdabere na ya, ọ bụkwa ihe na-eduhie eduhie. Ọ pụrụ ime ka anyị tawa kpakpando ụta kama ịta onwe anyị ụta mgbe anyị mehiere ihe. Nke kasịnụ bụ na Okwu Chineke katọrọ ya kpamkpam.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Akara zodiac bụ ihe osise 12 ndị na-egosi otú kpakpando ndị dị na mbara igwe si nọrọ, bụ́ nke ndị na-eke eluigwe ji eme ihe.