Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ụmụaka Ndị “Na-enye Nsogbu” Pụrụ Ịgbanwe
“Ọtụtụ ụmụaka na-enye nsogbu, bụ́ ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, na-agbanwe ka oge na-aga,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sydney Morning Herald kwuru. “Ha pụrụ ịghọ ndị na-akpa ezi àgwà mgbe ha ruru afọ iri na ụma.” Ná nnyocha Òtù Na-amụ Maka Ezinụlọ n’Australia ji ụmụaka 178 mee, ha nyochara otú ha si na-enwe ọganihu malite n’oge ha ka dị afọ 11 ma ọ bụ 12, bụ́ mgbe a kọwara na ha na-akpa àgwà atọ ma ọ bụ karịa n’ime àgwà ndị dị ka “ime ihe ike ike, ịdị isi ike, enweghị njide onwe onye, adịchaghị etinye uche n’ihe, ịkpa aghara, na iwe iwe ọkụ ma ọ bụ ịgbarụkarị ihu.” Afọ isii ka e mesịrị, otu narị n’ime ha kpawara àgwà “fọrọ obere ka o yie nke ndị ntorobịa na-adịghị enye nsogbu.” Gịnị nyeere ha aka ịgbanwe? “Ụmụaka ndị gbanwere ghọọ ndị ntorobịa na-enwe obi ụtọ yiri nnọọ ka ha adịghị eso ndị na-enweghị omume enyi akpakọrịta, o yikwara ka ndị mụrụ ha hà na-elebara ha anya nke ọma,” ka akụkọ ahụ kwuru.
Nne Anụ Ọhịa Bea Anaghị Atụ Ndị Bịara Nleta Ụjọ
“Mkpọtụ ndị na-abịa eleta anụ ndị bi n’ọhịa na-eme pụrụ ịbara anụ ọhịa bea ndị bi n’ime ọhịa uru n’ụzọ a na-atụghị anya ya,” ka magazin ndị Britain bụ́ New Scientist na-ekwu. Ndị mmadụ ịga nleta n’ọhịa ndị dịpụrụ nnọọ adịpụ na-emetụtakarị àgwà ụmụ anụmanụ, mgbe ụfọdụ, ọ na-akpata ọdachi. Ma, ndị nchọpụta si Britain na America, bụ́ ndị na-amụ banyere anụ ọhịa bea ndị na-acha nchara nchara n’otu mmiri iyi dịpụrụ adịpụ n’ebe ọdịda anyanwụ Canada, bụ́kwa ebe azụ salmon na-anọ eyi àkwá, “chọpụtara na ọ bụ ezie na anụ ọhịa bea ndị nke oké torola eto na-agbara ndị njem ọsọ, . . . ọnụnọ ndị mmadụ adịghị enye ndị nke nne na ụmụ ha nsogbu, bụ́ ndị o yiri ka ụzụ bọs na-eme ọ̀ bụ ihe na-egosi ha na ndị nke oké dị ize ndụ anọghịzi ná mmiri iyi ahụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “Ọbụna mgbe ndị nke oké si n’ógbè ahụ pụọ kpamkpam, ndị nke nne adịghị apụta ruo mgbe ndị njem bịara.” O doro anya na anụ ọhịa bea ndị nke nne na-eji ohere ahụ aga n’ebe nri kasị dịrị na ha n’atụghị ụjọ ma ndị nke oké hà ga-abịa ịtagbu ụmụ ha.
Ịrụ Ọrụ Mgbe Ị Na-arịa Ọrịa
Akwụkwọ akụkọ ndị Britain na-edebe n’Intanet, nke aha ya bụ Telegraph, na-akọ na “ndị na-amanye onwe ha ịrụ ọrụ n’agbanyeghị na ahụ́ adịghị ha” pụrụ ịdị na-amụba ohere ha nwere ịrịa ọrịa obi. Ndị ọkà mmụta sayensị nọ n’ụlọ akwụkwọ University College nke dị na London ji ihe karịrị afọ iri nyochaa ahụ́ ike nke ihe karịrị otu puku ndị ọrụ Bekee nọ na London nakwa ugboro ole ha gara ọrụ. Ihe dị n’agbata pasent 30 na 40 nke ndị ọrụ na-ezughị ike n’ụlọ mgbe ha dara ọrịa—ọbụna mgbe nanị azụ̀zụ̀ na-eme ha—“mere ka ohere ha nwere ịrịa ọrịa obi n’afọ ndị sochirinụ mụbaa okpukpu abụọ,” ka Sir Michael Marmot, bụ́ onye duziri nnyocha ahụ, kwuru.
Okwu Kasị Sie Ike Nsụgharị n’Ụwa
“E kwuwo na okwu kasị sie ike nsụgharị n’ụwa bụ ‘ilunga,’ bụ́ okwu e si n’asụsụ Tshiluba,” bụ́ nke a na-asụ na Democratic Republic of Congo, nweta, ka ụlọ ọrụ BBC News na-ekwu. Okwu ahụ ka a họọrọ mgbe otu puku ndị ọkà asụsụ mere ntụli aka banyere okwu kasị sie ike nsụgharị n’ụwa. Ilunga pụtara “onye dị njikere ịgbaghara mmejọ ọ bụla e mejọrọ ya n’oge mbụ, dịrị njikere ịgba nkịtị n’oge nke abụọ, ma ọ gatụghị agbaghara na nke atọ.” Okwu ọzọ e kwuru na o sikwara nnọọ ike nsụgharị bụ naa, bụ́ okwu e nwetara n’asụsụ Japanese a na-asụ nanị “n’ógbè Kansai nke Japan iji mesie okwu ike ma ọ bụ iji kwenyere mmadụ.” Dị ka Jurga Zilinskiene, bụ́ onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka nsụgharị na ịtapịa okwu, bụ́ nke haziri ntụli aka ahụ si kwuo, “ndị mmadụ na-echefu na onye na-atapịa okwu . . . aghaghị ịsụgharị, ọ bụghị nanị site n’otu asụsụ gaa n’ọzọ kamakwa, site n’otu ọdịbendị gaa n’ọzọ, mgbe ụfọdụ[kwa], a naghị enwe okwu na-enye otu echiche ahụ n’asụsụ nke ọzọ.”
Iji Ịgụ Ihe Atụrụ Ndụ Pụrụ Ime Ka Ị Gbatakwuo Ihe n’Ule
Iji ịgụ ihe atụrụ ndụ so eme ka a na-agbatakwu ihe n’ule karịa “awa ole e ji mụọ ihe, nweta ọzụzụ n’aka nne na nna, gụọ ihe ndị e dere na klas, ma ọ bụ jiri kọmputa mee ihe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Milenio nke Mexico City, na-akọ. Nnyocha e ji ọtụtụ narị puku ụmụ akwụkwọ sekọndrị mee gosiri na ụmụ akwụkwọ ndị wepụtara oge iji mụọ ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ nakwa iji na-agụ ihe n’oge ha na-atụrụ ndụ, yiri ka hà ga-aka eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Akwụkwọ ụmụ akwụkwọ ga na-ahọrọ ịgụ adịghị mkpa na ọ ga-abụrịrị nanị akwụkwọ a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ kama ọ pụrụ ịgụnye akwụkwọ ndị a na-agụ nanị iji tụrụ ndụ, dị ka akụkọ ndụ mmadụ, akwụkwọ ndị e dere nanị uri na ha, na ndị na-ekwu banyere sayensị. N’aka nke ọzọ, akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na ụmụ akwụkwọ ndị na-eji ọtụtụ awa ekiri TV n’ụbọchị kama ịgụ akwụkwọ, adịghị agbata ezigbo ihe n’ule.
Wayo E Ji Akwụkwọ Na-egosi Iru Eru Mmadụ Egwu
Ọ bụ ezie na ndị na-achọ ọrụ n’ozuzu ha na-achọ iji ụzọ ọ bụla kasị mma mee ka ndị ha na-achọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ha mata ha, ụfọdụ na-ahọrọ igwu wayo. Ná nnyocha ụlọ ọrụ na-enyocha ndị na-achọ ọrụ, nke aha ya bụ Australian Background mere, ha chọpụtara na n’ime otu puku ndị na-achọ ọrụ, pasent 21 aghaworo ndị ha na-achọ ọrụ na nke ha ụgha banyere iru eru ha, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sydney Morning Herald kọrọ. Ọzọkwa, “pasent 60 nke ndị a maworo ikpe mpụ adịghị ekweta banyere ya, ọbụna mgbe a jụrụ ha,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Gary Brack, bụ́ nnukwu mmadụ n’ihe banyere ịchọtara ndị mmadụ ọrụ, na-ekwu, sị: “[Ndị] ahụ na-achọ ọrụ pụrụ ikwu na ha bụ elu na ala. Ma mgbe i lebakwuru anya n’ọrụ ikpeazụ ha rụrụ, ị pụrụ ịchọpụta na ọ dịghị ihe ha bụ.”
Emegaghị Ahụ́ Dị Ize Ndụ Ọbụna Karịa Ise Siga
“Emegaghị ahụ́ dị ize ndụ ọbụna karịa ise siga,” ka nnyocha e mere banyere otú puku mmadụ iri abụọ na anọ bi na Hong Kong, bụ́ ndị nwụrụ n’afọ 1998, si emega ahụ́, gosiri. Nnyocha ahụ gosiri na emegaghị ahụ́ mere ka ohere ụmụ nwoke nwere ịnwụchu ọnwụ jiri pasent 59 mụbaa, nke ụmụ nwanyị ejiri pasent 33 mụbaa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ South China Morning Post kọrọ. “Ọ dị mma ma ọ bụrụ na ị dịghị ese siga. Ma, ọ bụrụ na ị dịghị emega ahụ́, ọ bụ ya bụ na ị [ka] nọ n’oké ihe ize ndụ,” ka Lam Tai-hing, bụ́ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọgwụ ndị bi n’ime obodo na Mahadum Hong Kong, kwuru. Prọfesọ Lam kwukwara na ọbụna imega ahụ́ nke nta dị mma karịa emegaghị emega. Ọ na-atụ aro ka i jiri ọkara otu awa n’ime oge i ji anọdụ ala na-aga ije ma ọ bụ na-edebe ụlọ ọcha.”
Ndị Na-arịa Ọta Kpụrụkpụrụ Na-amụba
N’Ịtali, a kọrọ na ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọta kpụrụkpụrụ, bụ́ nke a na-ebute site ná mmekọahụ, “ejirila ihe karịrị okpukpu abụọ mụbaa n’ime afọ abụọ gara aga,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Panorama nke Ịtali, bụ́ nke a na-ebipụta otu ugbo n’izu, kwuru. Dị ka Giampiero Carosi, bụ́ onyeisi n’ihe ọmụmụ metụtara ọrịa na-efe efe na ọrịa nke ebe okpomọkụ ụwa na Mahadum nke Brescia si kwuo, ndị kasị buru ọrịa a bụ ndị ntorobịa na-agatụbeghị nweta ọzụzụ banyere otú e si egbochi ọrịa AIDS, ndị bịakwara n’ụlọ ọgwụ mgbe ha nwesịrị mmekọahụ na nke mbụ ya. Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na n’ime pasent 40 nke ndị bu ọta kpụrụkpụrụ, ọrịa ahụ kawanyere njọ ruo n’ogo “ọ na-egbu akụkụ ahụ́ ndị dị ka ụbụrụ, obi, ọkpụkpụ, nkwonkwo, anya, na imeju.”