Mmanụ Aṅụ—Onyinye Aṅụ Na-enye Mmadụ
Mmanụ Aṅụ—Onyinye Aṅụ Na-enye Mmadụ
Site n’aka onye edemede Teta! na Mexico
MGBE otu onye agha Izrel ike gwụrụla rutere n’ebe mmanụ aṅụ si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ na-atasị n’ime oké ọhịa, o jiiri mkpanaka ya rụnye na ya, ma rachaa ya. Ozugbo ahụ, “anya ya wee nwuo enwu,” ya enwetakwa ike. (1 Samuel 14:25-30) Ihe a e dekọrọ na Bible na-egosi otu n’ime uru mmanụ aṅụ baara mmadụ. Ọ na-enye ike ngwa ngwa, ebe ọ bụ na carbohydrates kasị dị na ya—ihe dị ka pasent 82. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, mmanụ aṅụ nke dị nanị gram 30 pụrụ inye aṅụ ike ọ ga-eji fere gazuo ụwa nile!
Ọ̀ bụ nanị maka ụmụ mmadụ ka aṅụ ji emepụta mmanụ aṅụ? Ee e, mmanụ aṅụ bụkwaara aṅụ nri. Udu aṅụ há otú kwesịrịnụ ga-achọ mmanụ aṅụ dị site kilogram 10 ruo 15 ha ga na-eri iji lanahụ oge oyi. Ma n’oge ihe dị mma, udu aṅụ pụrụ imepụta mmanụ aṅụ dị ihe dị ka kilogram 25, na-eme ka e nwee nke ụmụ mmadụ—nakwa anụmanụ ndị dị ka bea na nwamba ọhịa a na-akpọ raccoon—pụrụ ịracha.
* Mgbe mmiri dị na ya talatara ruo ihe na-erughịzi pasent 18, ha na-eji ihe si n’ahụ́ ha rachie elu ya. Mmanụ aṅụ a rachiri elu ya pụrụ ịdịgide ruo nnọọ ogologo oge. A kọwo na e nwetara mmanụ aṅụ ka dị nnọọ mma ọrịra n’ili ndị Fero, bụ́ ndị dịwara eri ihe dị ka puku afọ atọ gara aga.
Olee otú aṅụ si emepụta mmanụ aṅụ? Aṅụ na-adị na-efegharị n’ebe ndị e nwere okooko osisi, ma jiri ire ha yiri ndụdụ na-amịrị mmiri okooko osisi. Ha na-amịba ya n’otu n’ime akpa afọ ha ma buru ya gaa n’ebe ha chọrọ ịnọ mepụta mmanụ aṅụ. Ha na-amịnye mmiri okooko osisi ahụ ha mịtara n’ọnụ aṅụ ndị ọzọ, bụ́ ndị “na-ata” ya ruo ihe dị ka ọkara awa, na-agwakọta ya na mmiri ndị si n’ọnụ ha. Ha na-amịnyezi ya n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ha ji ihe si n’ahụ́ ha mepụta, ma jirizie nku ha na-efe ya ikuku iji mee ka mmiri dị na ya taa.Ihe Ndị Dị ná Mmanụ Aṅụ nke Mere O Ji Agwọ Ọrịa
Tụkwasị n’ịbụ ezigbo nri—ihe na-enye nnọọ vitamin B, na ihe ndị ọzọ na-adị mma n’ahụ́—mmanụ aṅụ bụ otu n’ime ọgwụ ndị kasị ochie a ka ji eme ihe. * Dr. May Berenbaum, bụ́ ọkà n’ịmụ banyere ụmụ ahụhụ na Mahadum nke Illinois, U.S.A., na-ekwu, sị: “Kemgbe ọtụtụ narị afọ, a nọwo na-eji mmanụ aṅụ agwọ ihe ndị dịgasị iche iche dị ka ọnyá, ebe ọkụ rere mmadụ, na ọrịa anya mkpụrụ ego.”
Ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ CNN na-ekwu banyere mmasị a malitere inwe na nso nso a n’uru mmanụ aṅụ bara n’ịgwọ ọrịa, o kwuru, sị: “Mmanụ aṅụ kwụsịrị ịbụ ọgwụ a na-etekarị n’ọnyá mgbe e wepụtara ọgwụ nje ndị a na-ete n’ọnyá n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ma ihe ndị a chọpụtara ọhụrụ banyere mmanụ aṅụ—nakwa otú nje bacteria ndị ọgwụ nje na-apụghịzi igbu si na-amụba—meziri ka a maliteghachi iji mmanụ aṅụ a e jiworo na-eme ihe kemgbe ụwa, agwọ ọrịa.” Dị ka ihe atụ, otu n’ime nchọpụta ndị e mere bụ otú o si agwọ ebe ọkụ rere mmadụ. A chọpụtara na ọ bụrụ na a na-ete mmanụ aṅụ n’ebe ọkụ rere mmadụ, ọnyá ahụ na-ala ngwa ngwa, ọ naghị afụ oké ụfụ, ọ naghịkwa enwecha àpà.
Nnyocha ndị e mere na-egosi na n’ihi otu ihe si n’ahụ́ aṅụ nke ọ na-amịnye n’ihe ahụ ọ mịtara n’okooko osisi, mmanụ aṅụ nwere ihe ndị na-eji ụzọ dị nro egbu nje. Ihe ahụ na-eme ka mmanụ aṅụ nwee hydrogen peroxide, nke na-egbu nje bacteria ndị dị ize ndụ. * Tụkwasị na nke ahụ, a chọpụtawo na e tee mmanụ aṅụ n’ebe zara aza, ọ na-eme ka ebe ahụ felata ma laa. N’ihi ya, Dr. Peter Molan, bụ́ ọkà n’ịmụ banyere mmiri ọgwụ ahụ́ na New Zealand, na-ekwu, sị: “Ndị dọkịta anọwo na-anabata mmanụ aṅụ dị ka ihe dị mma ma na-arụ ọrụ nke ọma n’ịgwọ ọrịa.” N’ezie, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọgwụ n’Australia akwadowo ka e jiri mmanụ aṅụ na-agwọ ọrịa, a na-erekwa mmanụ aṅụ dị ka ihe e ji agwọ ọnyá ná mba ahụ.
Olee ihe ndị ọzọ a na-eri eri ma ọ bụ na-aracha aracha ị maara na-enye ezigbo ihe n’ahụ́, dịkwa nnọọ ụtọ, ma na-agwọkwa ọrịa? Ka a sịkwa ihe mere e ji tie iwu ndị pụrụ iche n’oge gara aga iji chebe aṅụ na ndị na-akpa aṅụ! Igbutu osisi ma ọ bụ ihe aṅụ bi na ya bụbu mpụ a na-eri onye dara ya ezigbo nhá ma ọ bụ ọbụna gbuo ya. N’ezie, mmanụ aṅụ bụ onyinye bara uru e nyere mmadụ, bụrụkwa ihe e kwesịrị ikele Onye Okike ekele maka ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 E nwere ebe ndị pụrụ iche n’ahụ́ aṅụ, bụ́ ebe ihe ahụ ha ji arụ ụgbụgbọ mmanụ aṅụ si apụta. Otú ahụ ụmụ obere oghere ndị na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ si nwechaa akụkụ isii na-eme ka ọbụna ihe ịdị aro ya ji okpukpu 30 karịa nke udu aṅụ ghara ịdapịasị ya ma a tụkwasị ya n’elu ha. Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ si otú a bụrụ ihe owuwu dị ịtụnanya.
^ par. 7 Ọ dịghị mma inye ụmụ ọhụrụ mmanụ aṅụ n’ihi na ọ pụrụ imebi ha afọ.
^ par. 9 Ebe ọ bụ na ihe ahụ si n’ahụ́ aṅụ, nke na-eme ka mmanụ aṅụ na-agwọ ọrịa, na-anwụ ma e sie ya n’ọkụ nakwa ma e debe ya n’anwụ, a na-eji nke a na-esighị n’ọkụ agwọ ọrịa.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
Iji Mmanụ Aṅụ Esi Ihe
Mmanụ aṅụ dị ụtọ karịa shuga. N’ihi ya, ị chọọ iji ya dochie anya shuga, jiri nanị mmanụ aṅụ ruru ọkara ma ọ bụ ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke shuga ị gaara etinye na nri gị. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na mmiri mejupụtara pasent 18 nke mmanụ aṅụ, webilata mmiri ị ga-etinye n’ihe ị na-esi otú o kwesịrị. Ọ bụrụ na ị gaghị etinye mmiri n’ihe ahụ ị chọrọ iji mmanụ aṅụ sie, tinye ntụ ọka na ya, ihe dị ka ngaji nri abụọ maka otu iko mmanụ aṅụ ọ bụla. Maka ihe ndị a na-eghe eghe, ọ bụrụ na ị chọrọ iji mmanụ aṅụ ghee ya, tinyetụkwuo ihe iko achịcha na ya ma gbatulatatụ ovun gị.
[Ebe E Si Nweta Foto]
National Honey Board
[Foto dị na peeji nke 22]
Ebe aṅụ na-achọ mmiri okooko osisi
[Foto dị na peeji nke 22, 23]
Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ
[Foto dị na peeji nke 23]
Udu aṅụ
[Foto dị na peeji nke 23]
Ebe onye na-akpa aṅụ na-enyocha ebe aṅụ na-anọ emepụta mmanụ aṅụ