N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Nọrọ N’ụjọ?
N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Nọrọ N’ụjọ?
IHE a kpọrọ mmadụ nọ n’ụjọ. Ọ bụ ọnọdụ a na-adịghị ahụ anya ma ọ dị adị. Ọ na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile, n’agbanyeghị na a dịkebeghị achọpụta ya. Gịnị na-akpata ọnọdụ a? Gịnị mere ụfọdụ ndị ji atụ ụjọ ma ha si n’ụlọ ha pụọ? N’ihi gịnị ka ọtụtụ mmadụ ji atụ ụjọ n’ebe ha na-arụ ọrụ? N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji atụ ụjọ ka a ghara imerụ ụmụ ha ahụ́? Olee ihe ize ndụ ndị na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ụjọ n’ebe obibi ha?
N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji anọ n’ụjọ, ma anyị ga-atụle ụzọ ihe anọ pụrụ ime ka ndị mmadụ nọrọ n’ihe ize ndụ mgbe nile—ọgba aghara a na-enwe n’obodo ukwu, iyi egwu mmekọahụ, ndina n’ike, na ihe ike a na-eme n’ebe obibi. Ka anyị buru ụzọ tụlee ọgba aghara a na-enwe n’obodo ukwu. Nke a kasị daba adaba ugbu a n’ihi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị nile nọ n’ụwa bi n’obodo ukwu.
Ihe Ize Ndụ Ndị A Na-enwe n’Obodo Ukwu
Ikekwe, ihe mere e ji wuo obodo ukwu ndị mbụ bụ iji chebe ndị mmadụ, ma ọtụtụ mmadụ ugbu a na-ewere obodo ukwu dị ka ebe dị ize ndụ. Ebe e webuuru dị ka ebe nchebe aghọziela ebe dị ize ndụ. Ebe na-ekwo ekwo n’obodo ukwu na-adịrị ndị na-apụnara mmadụ ihe mfe ịnọ kpaa ike.
N’obodo ukwu ụfọdụ, ọ na-adị ize ndụ ịbanye n’ógbè ndị na-emepechaghị emepe, bụ́ ndị ọkụ e nwere n’okporo ámá ha dị ole na ole, ndị e nwekwaara ndị uwe ojii ole na ole na ha.E nwere ezigbo ihe mere e ji na-atụ ụjọ a; imerime mmadụ na-anwụ ọnwụ ike. Dị ka akụkọ e si n’aka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa nweta si kwuo, ihe dị ka nde mmadụ 1.6 na-anwụ kwa afọ n’ihi ihe ike e mesoro ha. N’Africa, n’ime otu narị puku mmadụ ọ bụla, ihe dị ka mmadụ 60.9 na-anwụ ọnwụ ike kwa afọ.
A na-ewerezi ọtụtụ mmadụ, ebe, na òtù ndị e lere anya na ha na-echebe mmadụ, dị ka ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, a na-ewerezi ọtụtụ ebe a na-eme egwuregwu, ụlọ akwụkwọ, na ụlọ ahịa dị ka ebe ndị dị ize ndụ n’ihi oké mpụ a na-eme na ha. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị ndú okpukpe, ndị ọrụ ebere, na ndị nkụzi—ndị kwesịrị ichebe ndị mmadụ—aghọọla nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu. Akụkọ ndị a na-anụ na ụfọdụ n’ime ha na-emetọ ụmụaka na-emezi ka obi ghara ịka ndị nne na nna ịhapụrụ ndị ọzọ ụmụ ha ka ha lekọta. Ndị uwe ojii kwesịrị ichebe ndị mmadụ, ma n’obodo ukwu ụfọdụ, a na-anụkarị banyere otú ndị uwe ojii si arụrụ aka ma jiri ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. A bịakwa n’ebe ndị ọrụ “nchebe” nọ, ná mba ụfọdụ, ndị mmadụ ka na-echeta oge a lụrụ agha obodo, bụ́ oge ndị ha hụrụ n’anya miri ala mgbe ndị agha kpụsịịrị ha pụọ. N’ihi ya, n’akụkụ dị iche iche nke ụwa, kama ndị uwe ojii na ndị agha ime ka ndị mmadụ kwụsịtụ ịtụ ụjọ, ha emewo ka ha nọrọkwuo n’ụjọ.
Akwụkwọ bụ́ Citizens of Fear—Urban Violence in Latin America na-ekwu, sị: “Ụmụ amaala nke isi obodo mba ndị dị na Latin America nọ n’ụjọ mgbe nile, tụkwasị n’ụfọdụ ọnọdụ ndị kasị dị ize ndụ n’ụwa ha nọ na ya. N’ógbè ahụ sara mbara, ihe dị ka otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na-anwụ ọnwụ ike kwa afọ, e mesowokwa otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla ihe ike, ma ọ́ bụghị n’ụzọ pụtara ìhè ọ bụrụ n’ụzọ na-apụtaghị ìhè.” N’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, a na-emekarị ngagharị iwe n’isi obodo. Mgbe a malitere mewe ihe ike ná ngagharị iwe ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ na-eji ohere ahụ zukpọọ ngwá ahịa ndị mmadụ, na-eme ka ọgba aghara dị ebe nile. Ndị na-achụ nta ego n’obodo ukwu pụrụ nnọọ ịdaba n’aka ìgwè mmadụ iwe juru obi.
N’ọtụtụ mba, e nwewo ọdịiche dị ukwuu n’etiti ọnọdụ ibi ndụ nke ndị ogbenye na nke ndị ọgaranya, nke a emewokwa ka ndị mmadụ na-eburu ibe ha iwe. Ọtụtụ mmadụ, bụ́ ndị chere na a naghị ekwe ka aka ha ruo n’ihe ndị bụ́ isi na-akpa mmadụ ná ndụ, awabawo n’ógbè nanị ndị oké ozu bi ma zukpọọ ihe ha. Nke ahụ emebeghị n’ụfọdụ obodo ukwu, ma o nwere ike ime mgbe ọ bụla—ọ dịghịkwa onye ma mgbe ọ ga-abụ.
O yiri ka egwu ndị ohi na ndị na-akwado ka e nwee mgbanwe na-eyi ò zuru ime ka ụjọ tụwa ndị mmadụ, n’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe ndị ọzọ na-akpata nchegbu bụ́ ndị na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ụjọ.
Oké Ụjọ Iyi Egwu Mmekọahụ Na-akpata
Nye ọtụtụ nde ndị inyom, iji mkpọrọhịhị akpọ ha, ibisa ha aka n’ụzọ rụrụ arụ, na ilegide ha anya n’ahụ́ na-eme ka obi na-amapụ ha kwa ụbọchị. Magazin bụ́ Asia Week kwuru, sị: “Nnyocha e mere gosiri na e mesowo otu onye n’ime ụmụ nwanyị Japan anọ ọ bụla omume rụrụ arụ n’ihu ọha, pasent 90 mere n’ime ụgbọ okporo ígwè. . . . Ọ bụ nanị pasent 2 n’ime ha na-eme ka ndị ọzọ mara banyere omume ahụ e mesoro ha. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha kwuru na isi ihe mere ha ji emechi
ọnụ bụ na ha na-atụ ụjọ ihe ndị ahụ mesoro ha omume ọjọọ ahụ ga-eme.”Iyi egwu mmekọahụ amụbawo nke ukwuu n’India. “Mgbe ọ bụla nwanyị zọpụrụ ụkwụ n’èzí, ọ na-anọ n’ụjọ,” ka otu odeakụkọ nọ ná mba ahụ na-ekwu. “Ụkwụ ọ bụla ọ zọpụrụ, ọ na-atụ anya na a pụrụ ịkparị ya ma maa ya njakịrị.” N’otu obodo dị n’India bụ́ ebe ndị bi na ya ji okporo ámá ha dịtụ nchebe eme ọnụ ka e si nweta akụkọ a kwuru, sị: “Ọ bụghị n’okporo ámá ka [obodo a] na-enwe nsogbu kama ọ bụ n’ụlọ ọrụ. . . . Pasent 35 nke ndị inyom a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na e yiwo ha egwu mmekọahụ n’ebe ọrụ ha. . . . Pasent 52 nke ndị inyom kwuru na n’ihi egwu a na-eyi ha n’ebe ọrụ, ọ kaara ha mma ịrụ ọrụ a na-akwụ obere ego na ya . . . bụ́ ebe [nanị] ha na ụmụ nwanyị ibe ha ga na-arụkọ ọrụ.”
Ụjọ Ịbụ Ndị E Dinara n’Ike
E nwere ọtụtụ ihe ụmụ nwanyị na-atụrụ ụjọ ya karịa ùgwù ha ịrụ. Mgbe ụfọdụ e yiri ha egwu mmekọahụ, ụjọ ha na-abụ na a pụrụ idina ha n’ike. N’ụzọ kwere nghọta, ndina n’ike bụ mpụ ọtụtụ ndị inyom na-atụ ụjọ ya ọbụna karịa ka ha si atụ igbu ọchụ. Nwanyị pụrụ ịchọpụta na mberede na ya nọ nanị ya n’ebe obi ya gwara ya na a pụrụ ịnọ dinaa ya n’ike. Ọ pụrụ ịhụ nwoke ọ na-amaghị ma ọ bụ nke ọ na-atụkwasịghị obi. Obi ya amalite ịkụsi ike ka o ji ụjọ na-atụle ọnọdụ ahụ. ‘Gịnị ka nwoke a ga-eme? Olee ebe m pụrụ ịgbaga? Ọ̀ bụ m tie mkpu?’ Ọ bụrụ na nwanyị enwee ahụmahụ dị otú ahụ ugboro ugboro, ọ ga-eme ka ahụ́ jiri nke nta nke nta gwụ ya. Ọtụtụ mmadụ na-ahọrọ ịghara ibi n’obodo ukwu ma ọ bụ họrọ ịghara ịga na ya n’ihi ụjọ dị otú ahụ.
“Ụjọ, nchegbu, na obi erughị ala ahụ a na-ekwu okwu ya socha n’ahụmahụ ọtụtụ ụmụ nwanyị na-enwe kwa ụbọchị n’obodo ukwu,” ka akwụkwọ bụ́ The Female Fear na-ekwu. “Ụjọ ụmụ nwanyị na-atụ ndina n’ike na-eme ka obi ha na-agwa ha na ha aghaghị ịnọ na nche ma saa anya mmiri mgbe nile. Ọ na-emekwa ka obi koro nwanyị n’elu ma mmadụ na-eso ya n’azụ, karịsịa n’abalị. Ọ bụ . . . mmetụta na-adịghị apụcha ndị inyom n’obi.”
Ọtụtụ ndị inyom bụ ndị a na-emeso mpụ n’ike. Ma, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị inyom nile na-atụ ụjọ ịbụ ndị a ga-emeso ihe ike. Akwụkwọ bụ́ The State of World Population 2000, nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara, na-ekwu, sị: “Gburugburu ụwa, ọ dịkarịa ala, a kụwo otu onye n’ime ndị inyom atọ ọ bụla ihe, manye ha inwe mmekọahụ, ma ọ bụ megbuo ha n’ụzọ ndị ọzọ—ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndị ha ma nke ọma mere ha ya.” Ọ̀ bụ nanị n’okporo ámá na n’ebe ọrụ ka ndị mmadụ na-ahụ ihe na-emenye ha ụjọ? Ndị mmadụ ịnọ n’ụjọ n’ụlọ ha ọ̀ bụ ihe zuru ebe nile?
Ụjọ Ihe Ike A Na-eme n’Ebe Obibi
Ndị bụ́ di ịkụ nwunye ha ihe n’ebe ndị mmadụ na-agaghị ahụ ha iji mee ka nwunye ha na-erube isi, bụ ihe ọjọọ jọgburu onwe ya a na-eme gburugburu ụwa—ọ ka bụkwa na nso nso a ka e weere ya dị ka mpụ n’ọtụtụ ebe. Otu akụkọ e si n’India nweta kwuru na “ọ dịkarịa ala, pasent 45 nke ndị inyom India bụ ndị di ha na-ama aka ntị, na-agba ụkwụ, ma ọ bụ na-eti ihe.” Ndị bụ́ di iti nwunye ha ihe na-etinye ndụ n’ezigbo ihe ize ndụ n’ụwa nile. Banyere ndị inyom nọ n’agbata afọ 15 na afọ 44 na United States, Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta kwuru na ndị a na-emerụ ahụ́ n’ihe ike a na-eme n’ebe obibi dị ọtụtụ karịa ndị na-emerụ ahụ́ n’ihi ihe mberede ụgbọala, n’ihi ịbụ ndị a wakporo n’ike, nakwa n’ihi ịbụ ndị e dinara n’ike, ma a gụkọta ha ọnụ. Ya mere, ihe ike a na-eme n’ebe obibi dị ize ndụ karịa mbá di na nwunye na-aba mgbe ụfọdụ bụ́ nke na-eru n’ókè nke ịmarịta ibe ha ụra. Ọtụtụ ndị inyom na-atụ ụjọ imerụ ahụ́ na ụjọ ọnwụ n’ebe obibi ha. Otu nnyocha e mere na Canada gosiri na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị inyom e merụrụ ahụ́ n’ihe ike nke ebe obibi adịtụla oge ha tụrụ ụjọ na ha ga-anwụ. Na United States, ndị nchọpụta abụọ kwuru, sị: “Ebe obibi bụ ebe kasị ize ndụ nye ndị inyom, bụrụkwa ebe a na-emekpọkarị mmadụ ọnụ.”
N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị inyom ji nọgide n’alụmdi na nwunye dị otú ahụ? Ọtụtụ mmadụ na-ajụ, sị: ‘Gịnị mere ha adịghị achọ enyemaka? Gịnị mere ha adịghị ahapụ di ha?’ Ọtụtụ mgbe, ihe na-akpata ya na-abụ ụjọ. A kọwawo ụjọ dị ka ihe na-eme ka ihe ike a na-eme n’ezinụlọ dị iche n’ihe ike ndị ọzọ. Ụmụ nwoke na-emegbu nwunye ha na-ejikarị ike achịkwa ha ma na-eme ka ha ghara ikwupụta ya site n’iyi ha egwu ọnwụ. Ọ bụrụgodị na nwanyị ahụ a na-eti ihe akata obi chọwa enyemaka, o nwere ike ọ gaghị enweta ya mgbe nile. Ọbụna ndị na-adịghị anabata ụdị ime ihe ike ndị ọzọ pụrụ iwere ihe ike di na-emeso nwunye ya dị ka ihe na-adịghị
ihe ọ bụ, ihe e kwesịrị ileghara anya, ma ọ bụ ihe ziri ezi. Ọzọkwa, nwoke ahụ na-emegbu nwunye ya pụrụ iyi ezigbo mmadụ n’anya ndị nọ n’èzí. Ọtụtụ mgbe, ndị enyi ya apụghị ikweta na ọ na-eti nwunye ya ihe. N’ihi ịbụ ndị ndị mmadụ na-adịghị ekweta na ọ dị ihe a na-eme ha nakwa n’ihi enweghị ebe ha ga-agbaga, ọtụtụ ndị nwunye di ha na-emegbu na-ewere ya na ọ dịghị ihe ha pụrụ ime ma ọ́ bụghị ịnọ n’ụjọ mgbe nile.Mgbe ụfọdụ, ndị inyom e mekpọrọ ọnụ, bụ́ ndị mesịrị hapụ di ha, na-aghọ ndị a na-amaja site n’isogharị ha ma na-eyi ha egwu. N’otu nnyocha e mere na nso nso a n’Ebe Ugwu America, bụ́ nke e ji ihe karịrị otu puku ndị inyom nọ na steeti Louisiana mee, pasent 15 n’ime ha kwuru na a majawo ha site n’isogharị ha ma yie ha egwu. Chegodị echiche banyere ụdị ụjọ ha ga-anọ na ya. Onye yiri gị egwu anọgide nnọọ na-esogharị gị ebe ọ bụla i jere. Ya ana-akpọ gị na fon, na-esogharị gị, na-ele gị ebe ọ bụla ị nọ, ma na-eche gị. Ọ pụdịrị igbu anụ i ji mere enyi. Nanị ihe bụ́ mkpa ya bụ iyi gị egwu!
O nwere ike ị nọghị n’ụdị ụjo ahụ. Ma ruo ókè há aṅaa ka ụjọ na-emetụta ihe ị na-eme kwa ụbọchị?
Ụjọ Ọ̀ Na-emetụta Ụzọ I Si Eme Ihe?
Ebe ọ bụ na anyị na-anọ n’ụjọ mgbe nile, o nwere ike anyị agaghị amata mkpebi ole anyị ji ụjọ eme kwa ụbọchị. Ruo ókè há aṅaa ka ụjọ na-emetụta ụzọ i si eme ihe?
Ụjọ ihe ike ò mewo ka gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị zere nanị ya ịdị na-alọta n’abalị? Ụjọ ọ̀ na-emetụta otú i si eji ụgbọ njem ọhaneze eme ihe? Ihe ize ndụ dị n’iji ụgbọ njem aga ọrụ ma na-alọta ò metụtawo ụdị ọrụ ị na-arụ? Ụjọ ị na-atụ ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ndị gị na ha ga-emekọ ihe ò metụtawo ụdị ọrụ ị họọrọ ịrụ? Ụjọ ò metụtawo mmekọrịta gị na ndị ọzọ ma ọ bụ ụdị ntụrụndụ ị pụrụ inwe? Ikekwe, ụjọ ị na-atụ izute ndị aṅụrụma na ìgwè mmadụ na-akpa aghara egbochiwo gị ịga egwuregwu na ntụrụndụ ụfọdụ. Ụjọ ò metụtawo ihe ị na-eme n’ụlọ akwụkwọ? Ụjọ ọtụtụ ndị nne na nna na-atụ na ụmụ ha pụrụ ịghọ ndị nnupụisi bụ otu ihe na-emetụta ụdị ụlọ akwụkwọ ha na-ahọrọ iziga ụmụ ha, ọ na-emekwa ka a ghọta ihe mere ọtụtụ n’ime ha ji ahọrọ iji ụgbọala na-aga ebulata ụmụ ha n’agbanyeghị na ụmụ ha pụrụ iji ụkwụ ma ọ bụ ụgbọ njem ọhaneze lọta.
N’ezie, ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ụjọ. Ma ụmụ mmadụ anọwo na-atụ ụjọ ihe ike kemgbe ụwa. Ànyị pụrụ n’ezie ịtụ anya na ihe ga-agbanwe? Nnwere onwe pụọ n’ụjọ ọ̀ bụ nrọ nkịtị? Ka ọ̀ dị ezi ihe mere a ga-eji tụwa anya ọdịnihu nke a na-agaghị atụ ụjọ ihe ọjọọ ọ bụla na ya?