Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú e si aghọ enyi Chineke

Otú e si aghọ enyi Chineke

Otú e si aghọ enyi Chineke

▪ Nke ahụ bụ ihe broshuọ ahụ dị peeji 32, bụ́ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! na-akụziri anyị. Ihe ọmụmụ ndị na-adọrọ mmasị dị na ya gụnyere “Chineke Na-akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya” na “Chineke Bụ Enyi Kasị Mma Ị Pụrụ Inwe.” A kwadebere broshuọ a inyere onye na-agụ ya aka ịmụta ozizi ndị bụ́ isi dị na Bible.

N’ihe ọmụmụ ya bụ́ “Ndị Enyi Chineke Ga-ebi na Paradaịs,” broshuọ ahụ kọwara nke ọma ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa anyị. Ma anyị aghaghị ịmụta otú Chineke chọrọ ka anyị si na-ejere ya ozi ma ọ bụrụ na anyị ga-ebi na Paradaịs ahụ Bible na-ekwe nkwa ya. Ihe ọmụmụ ndị dị ka “Ụzọ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ” na “Jụ Okpukpe Ụgha!” ga-enyere gị aka ịghọ enyi Chineke ma nweta ihu ọma ya. Anyị ji n’aka na ị ga-erite uru site n’ịgụ broshuọ a.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.