Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Isiokwu E Bipụtara n’Oge Gara Aga Emetụ Ọtụtụ Ndị n’Obi

Otu Isiokwu E Bipụtara n’Oge Gara Aga Emetụ Ọtụtụ Ndị n’Obi

Otu Isiokwu E Bipụtara n’Oge Gara Aga Emetụ Ọtụtụ Ndị n’Obi

N’OTU ụlọ akwụkwọ dị na Suwałki, n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Poland, otu onye nkụzi gwara ụmụ akwụkwọ ka ha kwadebe okwu ha ga-ekwurịta n’isiokwu metụtara isikwopụ afọ ime. Justyna, bụ́ onye dị afọ 16, si n’akwụkwọ Ndịàmà Jehova nweta ihe o ji mee ihe ná nkwurịta okwu ahụ. N’ụbọchị nkwurịta okwu ahụ, onye nkụzi ahụ nyere ụmụ akwụkwọ ahụ ohere ikwu uche ha.

Justyna na-ekwu, sị: “Agakwuuru m onye nkụzi ahụ ma gosi ya isiokwu bụ́ ‘Ihe Nwa E Bu n’Afọ Dekọrọ’ (Diary of an Unborn Child), bụ́ nke e bipụtara na Teta! (Bekee) nke May 22, 1980. Ọ gwara onye nkụzi ya, sị: “Biko ghọta na e dere ihe a ka à ga-asị na ọ bụ nwa e bu n’afọ a na-achọ isikwopụ esikwopụ na-ekwu ya. Ana m eche na ọ dị ụtọ ọgụgụ.” Onye nkụzi ahụ malitere ịgụpụta ya. Ụmụ akwụkwọ ahụ nile nọ nnọọ jụụ, onye ọ bụla nọ na-ege ntị nke ọma.

Tupu onye nkụzi ahụ agụruo ọkara, ọ chọpụtara na ya nweghịzi ike ịga n’ihu n’ịgụ ya, n’ihi ya, ọ kpọrọ otu nwa akwụkwọ ka ọ gụọ ya. Onye nkụzi ahụ nọdụrụ ala ma malite ibe ákwá. Ka a gụchara ihe odide ahụ, mkparịta ụka dị ụtọ sochiri, ụfọdụ ụmụ akwụkwọ rịọkwara ka e nye ha isiokwu ahụ. “Ụmụ klas anyị gbanwere echiche ha banyere akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara,” ka Justyna na-ekwu. “Mgbe mbụ, ha adịghị ele ya anya ọma, ma ugbu a ha na-ele ya anya ọma. Ọbụna otu nwatakịrị nwoke ghọrọ onye na-agụchi Teta! anya.”

Dị nnọọ ka Justyna si nwee ihe ịga nke ọma n’iji isiokwu o nwetara na Teta! e bipụtara ihe karịrị afọ iri abụọ gara aga mee ihe, gị onwe gị pụrụ inweta “akpa nke jupụtara n’amamihe” na Teta! ndị ochie. (Job 28:18, NW) Mgbe ị gara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ị pụrụ inyocha mpịakọta Teta! ndị dị n’ọ́bá akwụkwọ dị ebe ahụ. Ọ ga-atọ gị ụtọ ịgụ isiokwu ndị bara uru bụ́ ndị oge gafeworonụ na-adịghị eme ka uru ha gwụ. Ị pụkwara inweta Teta! ndị ọhụrụ n’aka Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.

[Foto dị na peeji nke 31]

Mgbe Justyna ka na-aga akwụkwọ