Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Dị M Ka Ya Bụrụ na M Mere Ihe A Tupu Ugbu A’

‘Ọ Dị M Ka Ya Bụrụ na M Mere Ihe A Tupu Ugbu A’

‘Ọ Dị M Ka Ya Bụrụ na M Mere Ihe A Tupu Ugbu A’

A kpọwo ya ihe na-eri mmadụ ahụ́, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. N’otu nnyocha e mere na United States, a chọpụtara na ụmụntakịrị nwoke ndị dị ihe dị ka afọ 13 na-eji ihe dị ka awa 23 kwa izu egwu egwuregwu vidio. Ọtụtụ ndị okenye abụwokwa ndị o riri ahụ́ n’otu aka ahụ. Tụlee ihe banyere otu Onye Kraịst aha ya bụ Charles. * O kwuru, sị: “Egwuregwu vidio bụ ihe na-eme ka m chefuo nsogbu m, ihe m na-eji atụrụ ndụ ma chefuo mkpa m nile. Ma ọ bịara rie m ahụ́. Ọ bịara dị m ka m gaghị anọli n’egwughị egwuregwu vidio, dị nnọọ ka ọ na-adị ụfọdụ ndị ka ha agaghị anọli n’aṅụghị ọgwụ ike ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya.”

Charles na-ekwu na ya malitere igwu egwuregwu a “mgbe nile” mgbe ya dị ihe dị ka afọ 11. O kwuru, sị: “Anaghị m egwu ndị nke metụtara ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ ndị nke a na-eme ihe ike na ha, ma ana m egwufe ya nnọọ oké. A na-enwe izu ndị nanị ihe m na-eche, ma m̀ nọ n’ụlọ akwụkwọ ma m̀ nọ n’ozi Ndị Kraịst, na-abụ otú m ga-esi merie n’otu egwuregwu vidio.”

Teta! (Bekee) nke December 22, 2002, nke isiokwu ya bụ “Egwuregwu Kọmputa—È Nwere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya?” nwere mmetụta n’ebe Charles nọ. O kwuru, sị: “Mgbe m gụsịrị ya, agbalịrị m ịkwụsịlata igwu egwuregwu a. Ma, ka oge ụfọdụ gasịrị, alaghachiri m azụ mewekwa ka m naara eme.”

Mgbe Charles na-akwadebe ịlụ nwanyị na obere oge ka ọ lụsịrị nwanyị, ọ bịara kwụsịlata igwu egwuregwu vidio. O kwuru, sị: “Ma otu egwuregwu vidio ọhụrụ m nọ na-atụ anya ya kemgbe bịaziri pụta. Agara m gbaziri ego iji zụta kọmputa nwere ihe ndị a chọrọ iji na-egwu egwuregwu vidio ọhụrụ a. Nke a bụ egwuregwu vidio kasị ewe oge n’ime ndị nile m gwutụrụla. O mere ka m ghara inwe oge ọ bụla maka ozi Jehova. O mekwara ka m na-eleghara nwunye m anya.” Ọ dịghị anya, Charles aghọta na ya aghaghị ime ezigbo ihe iji kwụsị omume a. O kwuru, sị: “Ekpebiri m ibibi egwuregwu vidio nile m nwere. Ewepụrụ m egwuregwu vidio nile dị na kọmputa m ma kpofuo ha nile n’ikpo ahịhịa dị n’obodo anyị.”

Charles ọ̀ na-akwa ụta n’ihi mkpebi a o mere? Mbanụ! O kwuru, sị: “Ụdị obi iru ala m nwere mgbe m mesịrị ihe a abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ọ bịara dị m ka a naturu m ibu dị nnọọ arọ. Ọ dị m ugbu a ka mụ na Jehova ànyị bụ enyi karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ana m agwakwa ya okwu mgbe nile n’ekpere. Ana m elebakwara nwunye m anya ugbu a. Obi dị m ụtọ na ahapụla m ihe a ririla m ahụ́. Nanị ihe m na-akwara ụta bụ na emeghị m ya tupu ugbu a.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha dị n’isiokwu a.