Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bịa Gere Okwu Ihu Ọha Isiokwu Ya Bụ “Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịdị Na-erubere Isi?”

Bịa Gere Okwu Ihu Ọha Isiokwu Ya Bụ “Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịdị Na-erubere Isi?”

Bịa Gere Okwu Ihu Ọha Isiokwu Ya Bụ “Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịdị Na-erubere Isi?”

Ahụ́ na-adị agbakasị ọtụtụ ndị ma ha chetụ n’echiche banyere irubere mmadụ isi. ‘Achọrọ m inwere onwe m ime ihe masịrị m,’ bụ echiche ndị mmadụ na-enwekarị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-ewere nrubeisi dị ka ihe dị mkpa ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Mgbe ọ bụla ị gbasoro ịdọ aka ná ntị ma ọ bụ gbasoo ntụziaka, ị na-erube isi ruo n’ókè ụfọdụ. Ọ̀ dị onye pụrụ ikwu na irube isi n’iwu ndị ọchịchị adịghị mkpa iji hụ na a na-anọgide na-enwe udo na ịdị n’otu n’obodo? Chegodị echiche ihe ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ nile ajụ irube isi n’iwu na-achịkwa okporo ụzọ!

Otú ọ dị, ihe anaghị adịcha mma mgbe ndị mmadụ na-achị ibe ha. Ọtụtụ afọ gara aga, Bible kwuru na “mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) È nwere onye ọchịchị nke ruru nnọọ eru ka anyị tụkwasị ya obi ma na-erubere ya isi? Ọ bụrụ na e nwere, olee otú anyị pụrụ isi mara ya? Oleekwa ihe anyị pụrụ ịtụ anya ha n’ọchịchị ya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’okwu ihu ọha na-adọrọ adọrọ nke isiokwu ya bụ, “Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịdị Na-erubere Isi?” A ga-ekwu okwu ihu ọha a ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova nke ga-amalite n’ọnwa October. A ga-enwe ọtụtụ narị mgbakọ dị otú ahụ gburugburu ụwa. Iji chọta ebe kasị dịrị gị nso, jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu, ma ọ bụ jiri adres e depụtara na peeji nke 5 degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.