Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘I Kwesịrị Iji nke A Na-eme Ọnụ’

‘I Kwesịrị Iji nke A Na-eme Ọnụ’

‘I Kwesịrị Iji nke A Na-eme Ọnụ’

EZI ndị ohu Chineke na-aghọta mkpa ọ dị ịdị na-eme ihe n’eziokwu. Ịhụnanya ha hụrụ Onye Okike ha na-akpali ha ime ihe n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Lázaro. N’oge na-adịbeghị anya gara aga, bụ́ mgbe ọ na-arụ ọrụ n’otu họtel dị na Huatulco, Mexico, ọ hụrụ dollar 70 n’ebe a na-anọ echere mmadụ. O weere ego ahụ ozugbo wegaara onye bụ́ onyeisi ọrụ ha n’ụbọchị ahụ. Obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, ọ hụkwara wọlet n’ebe a na-asa ahụ́. Ya ewega ya n’ebe a na-anabata ndị ọbịa. Nke a tụrụ onye nwe wọlet ahụ n’anya ma nyekwa ya obi ụtọ.

Akụkọ banyere ihe ndị ahụ merenụ mesịrị ruo ọga kpata kpata nke họtel ahụ ntị. Ọ jụrụ Lázaro ihe kpatara o ji weghachi ego ahụ na wọlet ahụ. Lázaro zara ya na ụkpụrụ omume ọma ndị ya mụtara na Bible mere ka ya ghara iwere ihe na-abụghị nke ya. N’akwụkwọ ozi ekele ọga kpata kpata ahụ degaara Lázaro, ọ gwara ya, sị: “O siri nnọọ ike n’oge a ịhụ ndị na-akpa ezi àgwà. Anyị na-aja gị mma maka àgwà gị. Ị gosiwo na ị bụ ezigbo mmadụ, na ị bụ ezi ihe nlereanya nye ndị ọrụ ibe gị. Gị na ezinụlọ gị kwesịrị iji nke a na-eme ọnụ.” A họpụtara Lázaro dị ka onye ọrụ kasị mee nke ọma n’ọnwa ahụ.

Ụfọdụ ndị ha na Lázaro na-arụkọ ọrụ chere na o mere iberibe n’iweghachi ihe ndị ahụ. Ma, mgbe ha hụrụ ihe ọga ha mere, ha kelere Lázaro maka ijigide àgwà ọma ya.

Bible na-agba ụmụazụ Jizọs na-ekwesị ntụkwasị obi ume ka ha “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ,” nakwa ka ha “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Galeshịa 6:10; Ndị Hibru 13:18) Obi abụọ adịghị ya na Ndị Kraịst ime ihe n’eziokwu na-ewetara Chineke nke Bible, bụ́ Jehova, otuto, onye bụ́ “Onye ezi omume na onye ziri ezi.”—Deuterọnọmi 32:4.