Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igosipụta Ezi Akọ na Uche Na-ewetara Chineke Otuto

Igosipụta Ezi Akọ na Uche Na-ewetara Chineke Otuto

Igosipụta Ezi Akọ na Uche Na-ewetara Chineke Otuto

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA UKRAINE

MGBE ezinụlọ Chibisov, bụ́ otu n’ime ezinụlọ Ndịàmà Jehova nọ na Ukraine, si nzukọ Ndị Kraịst na-ala, ha hụrụ pọọsụ ihe ndị dị mkpa dị na ya, gụnyere akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, akwụkwọ e ji azụ ihe n’aka, na ego obodo ha nke ruru ihe dị ka dollar 500. N’ezinụlọ a dị mmadụ ise, ọ bụ nanị nna nwe ụlọ ahụ na-arụ ọrụ. Ọ na-akpata ihe dị ka dollar 70 n’ọnwa. Ya mere, ego a ha tụtụtara gaara enyere ha aka nke ukwuu. Gịnị ka ha mere?

Onye nke bụ́ nne na-akọ, sị: “Ụmụ anyị ndị nwanyị malitere ozugbo kwurịtawa banyere otú a ga-esi weghachiri onye nwe pọọsụ ahụ pọọsụ ya, bụ́ onye akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala ya gosiri na ọ bụ nwanyị. Obi dị mụ na di m ụtọ ịhụ otú ụmụ anyị si tinye akọ na uche ha a zụrụ nke ọma n’ọrụ. N’echi ya, akpọrọ m nwanyị ahụ pọọsụ ya furu, nke aha ya bụ Olha, na fon. Ya ejiri ọṅụ bịa ma gwa anyị na ya na di ya nwere obere ụlọ ahịa ole na ole n’obodo anyị. Ego dị na pọọsụ ahụ bụ ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha. Ọzọkwa, otu n’ime akwụkwọ ndekọ ego dị na pọọsụ ahụ bụ akwụkwọ dị mkpa o ji dekọọ ihe ndị e rere.

“Olha jụrụ anyị ebe anyị hụrụ pọọsụ ahụ. Anyị gwara ya ebe anyị hụrụ ya ma kọwaakwara ya na anyị si ebe ahụ gafee mgbe anyị na-alọta nzukọ Ndị Kraịst. Mgbe anyị nyere ya akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible, o ji nkwanye ùgwù nara ha.

“Mgbe izu ole na ole gasịrị, otu Onyeàmà nọ n’ọgbakọ anyị gwara anyị na mgbe ya na-enyefe ndị na-agafe n’okporo ámá akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, otu nwanyị kọwaara ya na ọ bụrụ mgbe mbụ, na ya agatụghị ege Ndịàmà Jehova ntị. Ma ugbu a, ọ bụghị nanị na ya dị njikere ige ha ntị kama na ya dịkwa njikere ịnara ha akwụkwọ. O kwuru na ihe kpatara nke a bụ n’ihi na Ndịàmà weghachiiri nwa ya nwanyị pọọsụ ya furu efu.”

[Foto dị na peeji nke 31]

Ezinụlọ Chibisov