Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Njem Nleta Ga-adị Ka Ya n’Ọdịnihu

Ihe Njem Nleta Ga-adị Ka Ya n’Ọdịnihu

Ihe Njem Nleta Ga-adị Ka Ya n’Ọdịnihu

“N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile dị n’ụwa, e nwere ihe atụ ndị na-egosi na ọ bụ njem nleta ọtụtụ mmadụ na-eme ka e weere dị ka isi ihe na-emebi gburugburu ebe obibi.”—Akwụkwọ bụ́ “An Introduction to Tourism,” nke Leonard J. Lickorish na Carson L. Jenkins, dere.

Ọ BỤGHỊ nanị na njem imerime mmadụ na-eme pụrụ ịdị na-emebi gburugburu ebe obibi kama ọ pụrụ ịdị na-akpatakwa nsogbu ndị ọzọ. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha n’ụzọ dị nkenke. E mesịa, anyị ga-atụle otú ọ pụrụ isi kwe omume n’ọdịnihu ịgazu ụwa anyị a dị ebube na ịmata ihe ndị dị ịtụnanya dị na ya, karịsịa ọmarịcha ndị mmadụ bi na ya.

Nsogbu Ndị Metụtara Gburugburu Ebe Obibi

Mmụba ndị na-eme njem nleta taa mụbara emewo ka e nwee nsogbu. “N’India, Taj Mahal na-emebi n’ihi ọtụtụ ndị na-abịa eleta ya,” ka ndị nchọpụta bụ́ Lickorish na Jenkins dere. Ha dekwara, sị: “N’Ijipt, ìgwè mmadụ ndị na-abịa eleta pyramid na-emekwa ka ha na-emebi.”

Tụkwasị na nke ahụ, ndị edemede a na-adọ aka ná ntị na ime nleta aghara aghara n’ọhịa ndị e chekwara echekwa pụrụ ime ka akụ́kụ́ ndị dị na ha nwụọ ma ọ bụ ghara ito nke ọma mgbe imirikiti ndị bịara nleta ji ụkwụ na-agagharị n’ọhịa ndị a. Ọzọkwa, ụfọdụ ihe ndị e kere eke pụrụ ịkọ mgbe ndị bịara nleta na-ewere ihe ndị dị ka mkpokoro ịsam na coral ndị dị ụkọ ma ọ bụkwanụ mgbe ndị obodo na-ewekọta ha iji resị ha ndị bịara nleta.

Ndị njem na-emetọ mbara ala—ná nkezi, otu onye njem na-atụsasị ụmụ mkpọmkpọ ihe ruru otu kilogram n’ala kwa ụbọchị, ka Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi kwuru. O yikwara ka à na-emetọ ọbụna ebe ndị kasị dịpụ adịpụ n’ụwa. Otu akụkọ Òtù Na-echekwa Oké Ọhịa wepụtara na nso nso a, kwuru, sị: “N’ụzọ ọhịa ndị a ma ama ndị njem nleta si aga n’Ugwu Himalaya, ha atụsajuwo mkpọmkpọ ihe na ha ma gbukpọọkwa ọhịa ndị dị n’ugwu ahụ ka ha na-achọ nkụ ha ji esi nri na nke ha ji esi mmiri ịsa ahụ́.”

Ọzọkwa, ndị njem nleta na-ejikarị ihe ụmụ amaala nke obodo ha bịara ileta ji ebi ndụ eme ihe aghara aghara. Dị ka ihe atụ, James Mak dere n’akwụkwọ ya bụ́ Tourism and the Economy, sị: “Mmiri ndị njem na-abịa eleta Grenada ji eme ihe ji okpukpu asaa akarị nke ụmụ amaala obodo ahụ ji eme ihe.” O dekwara, sị: “Ma n’ụzọ pụtara ìhè ma n’ụzọ na-apụghị ìhè, ọ bụ ndị na-abịa eleta Hawaii na-eji pasent 40 nke ọkụ eletrik obodo ahụ eme ihe, n’agbanyeghị na, ná nkezi, ọ bụ otu onye n’ime mmadụ asatọ ọ bụla nọ na Hawaii bịara njem nleta.”

Ọ bụ ezie na ndị njem pụrụ imefu ego dị ukwuu n’ileta mba ndị ka na-emepe emepe, ihe ka ukwuu n’ego ndị ahụ adịghị aba n’akpa ndị obodo ha letara. Ụlọ Akụ̀ Ụwa kwuru na ọ bụ ihe dị ka nanị pasent 45 nke ego a na-enweta na njem na-eru mba ndị ahụ a na-aga eleta aka—ihe ka ukwuu n’ime ha na-aba n’akpa mba ndị mepere emepe site n’aka ụlọ ọrụ ndị si mba ofesi bụ́ ndị na-ahazi maka njem nleta nakwa site n’ụlọ obibi ndị si mba ofesi rụrụ ná mba ndị ahụ a na-aga eleta.

Mmetụta Ọjọọ Ọ Na-enwe n’Àgwà Ndị Mmadụ

Ndị ọgaranya, bụ́ ndị si Europe na United States aga eleta mba ndị ka na-emepe emepe, pụrụ inwe mmetụta ọjọọ ndị ọzọ na-adịchaghị apụta ìhè—na ndị nke na-apụta ìhè mgbe ụfọdụ—n’ebe ụmụ amaala obodo ha na-aga eleta nọ. Dị ka ihe atụ, ndị njem na-ejikarị ihe ndị dara oké ọnụ, bụ́ ndị ga-eme ka ha tụsara ahụ́, aga obodo ha chọrọ ileta. Ọ pụrụ ịtụ ndị obodo ahụ n’anya na mmadụ pụrụ inwegide ego ruo n’ókè nke ibi ụdị ndụ oké ozu ahụ. Ọtụtụ ndị obodo na-abịa nwewa ọchịchọ inweta ihe ndị a dara oké ọnụ, ma ha adịghị enwe ike inweta ha n’emeghị mgbanwe n’ụzọ ha si ebi ndụ—mgbanwe ndị pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’àgwà ha.

Mak chọpụtara nsogbu ndị ọ pụrụ ịkpata, na-ekwu na ọbịbịa ọtụtụ ndị njem na-abịa n’obodo pụrụ “ime ka omenala na ihe ndị ọzọ e ji mara obodo ahụ funahụ ha, mee ka ndị obodo zọwa ala na akụ̀ ndị chi nyere, bụ́ ndị e nwekọọrọ ọnụ, meekwa ka omume ọjọọ, ndị dị ka ime mpụ na ịgba akwụna, mụbaa.”

Ọtụtụ mgbe, ndị njem nke oge a na-ewere ya na ha nweere onwe ha ime ihe masịrị ha, n’ihi ya, ha na-eme ihe ha na-agaraghị eme ma ha nọrọ n’ụlọ ha bụ́ ebe ndị ezinụlọ na ndị enyi ha nọ. Ya mere, omume rụrụ arụ ndị njem na-eme aghọọla nnukwu nsogbu. Ka Mak na-enye otu ihe atụ a ma nnọọ ama, o kwuru, sị: “N’ụwa nile, ndị mmadụ na-enwe nnọọ nchegbu banyere otú ime njem si eme ka ụmụaka na-agba akwụna.” N’afọ 2004, ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ CNN kọrọ, sị: “‘Ọnụ ọgụgụ a pụrụ ịdabere na ya nke ụmụaka ndị a na-edina na Mexico bụ ihe dị ka puku ụmụaka iri na isii ruo puku iri abụọ,’ ebe a ‘kasị edina ha bụ n’ógbè ndị dị n’ókèala Mexico na mba ndị ọzọ, n’obodo ukwu, nakwa n’ebe ndị njem na-aga eleta.’”

Uru Ime Njem Bara

Ụwa anyị bụ ebe obibi magburu onwe ya, nke a na-anọgide na-ahụ ihe ndị dị ịtụnanya na ya—anwụ ọdịda nke na-ama mma n’anya, eluigwe kpakpando ndị na-egbuke egbuke juru, na akụ́kụ́ na ụmụ anụmanụ dịgasị iche iche. Ebe ọ sọkwara anyị biri, anyị na-ahụ ụfọdụ n’ime ihe ndị a na ihe ndị ọzọ dị ebube dị n’ụwa. Ma, lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na ohere adapụtara anyị ime njem ma hụ ihe ndị ọzọ dị ebube dị n’ụwa!

Otú ọ dị, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị njem na-enwe mmasị n’ihe okike ndị mara mma dị n’ụwa, ha na-ekwu na ihe kasị eme ka ime njem na-atọ ha ụtọ bụ mmata ha na-amata ndị omenala ha dị iche na nke ha. Ọtụtụ mgbe, ndị njem na-abịa chọpụta na okwu ọjọọ a na-ekwu banyere ndị ọzọ abụghị eziokwu. Njem ha na-aga na-eme ka ha na-aghọta ndị agbụrụ ha na ọdịbendị ha dị iche na nke ha ma mete ha enyi.

Otu ihe ọtụtụ ndị njem na-amụta bụ na ihe onwunwe adịchaghị eme ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ihe ka eme ya bụ mmadụ iso ndị ọzọ enwe mmekọrịta—mmadụ ịbụ onye ihe na-adabara ya na ndị enyi ya nakwa ya imete ndị enyi ọhụrụ. Otu ihe ndekọ dị na Bible kọrọ banyere otú “obiọma” ndị Mọlta “na-asụ asụsụ ala ọzọ” gosiri ndị njem narị afọ mbụ, bụ́ ndị ụgbọ ha kpuru n’ebe ahụ, si baara ndị njem a uru. (Ọrụ 28:1, 2) Ịga leta mba ndị ọzọ na mmadụ ndị ọzọ taa enyeworo ọtụtụ ndị aka ịghọta na anyị bụ n’ezie otu ezinụlọ nakwa na anyị pụrụ ibikọ ọnụ n’ụwa n’udo.

Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe ike ime njem gaa leta ebe dị iche iche n’ụwa. Ma, gịnị banyere ọdịnihu? Ọ̀ ga-ekwe omume na ihe ka ọtụtụ ga na-eme njem dị otú ahụ, ma ọ bụrụkwarị na ọ bụghị mmadụ nile?

Ihe Ọ Ga-adị Ka Ya n’Ọdịnihu

Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nile bụ ụmụnne, anyị nile si n’otu ezinụlọ. N’eziokwu, nwoke na nwanyị mbụ nwụrụ, dị ka a dọrọ ha aka ná ntị na ha ga-anwụ ma ha nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 1:28; 2:17; 3:19) N’ihi ya, ụmụ ha nile, gụnyere anyị nile taa, bịakwara na-aka nká ma na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma Chineke na-ekwe nkwa na ya ga-emezu nzube mbụ ya nke bụ́ ka ụmụ mmadụ ndị hụrụ ya n’anya biri n’ụwa. “Ee, ekwuwo m,” ka Okwu ya na-ekwu, “M ga-emekwa ya.”—Aịsaịa 45:18; 46:11; 55:11.

Chegodị echiche ihe nke ahụ ga-apụta! Bible na-ekwe nkwa na n’okpuru ọchịchị nke Alaeze Chineke: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29; Matiu 6:9, 10) Ka Bible na-akọwa ọnọdụ ụmụ mmadụ ga-anọ na ya n’ụwa n’ọdịnihu, o kwuru, sị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.

Chegodị echiche banyere ohere ọma a ga-enwe n’oge ahụ ime njem gaa leta ebe nile n’ụwa ma hụ ihe ndị dị ebube dị na ya, karịsịa ọmarịcha ndị mmadụ nọ na ya. N’oge ahụ, ọ dịghị onye ga na-atụ ibe ya ụjọ! Ndị nile nọ n’ụwa n’oge ahụ ga-abụ enyi anyị—n’ezie, ihe Bible kọwara dị ka ‘òtù ụmụnna nile nọ n’ụwa.’—1 Pita 5:9.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Otu ihe na-eme ka ime njem dị ụtọ pụrụ ịbụ imete ndị ọdịbendị ha dị iche na nke anyị enyi

Atụmanya nke ịga leta ndị nakwa ebe dịgasị iche iche agaghị enwe ọgwụgwụ