Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe A Kwafuru Ọbara n’Aha Kraịst

Mgbe A Kwafuru Ọbara n’Aha Kraịst

Mgbe A Kwafuru Ọbara n’Aha Kraịst

Site n’aka onye edemede Teta! na Mexico

“Mgbe ndị ụkọchukwu na-edo Mas, ha na-anọ n’elu ikpo okwu jiri oké olu kwuo, sị: ‘Ụmụ nke Chọọchị Katọlik dị nsọ, pụtanụ lụọ ọgụ! Gọọmenti chọrọ iweghara chọọchị anyị!’”—Pedro Rosales Vargas, bụ́ onye ji anya ya hụ ihe merenụ.

OLEE ihe mere ndị okpukpe ga-eji bulie ngwá agha iji zọwa okpukpe ha? Gịnị pụrụ ime mgbe ndị mmadụ kpebiri iji ike na-azọ okpukpe ha? Agha ndị Cristero, bụ́kwa ndị a kpọrọ Cristeros—bụ́ aha e nyere ndị lụrụ agha ahụ—lụsoro gọọmenti Mexico na-eme ka a ghọtatụ azịza nke ajụjụ ndị a.

Akwụkwọ bụ́ Enciclopedia Hispánica na-akọwa, sị: “Cristeros bụ aha e nyere ndị Katọlik nke Mexico, bụ́ ndị lụsoro President Plutarco Elías Calles ọgụ n’afọ 1926 n’ihi iwu ndị o tiri megide chọọchị ahụ, dị ka imechi ebe nakwa ụlọ ndị a na-anọ ekpe okpukpe.” Na mbụ, ọ bụ gọọmenti nyere ndị nnupụisi a aha ahụ bụ́ Cristeros n’ihi abụ agha ha na-abụ, sị, “Kraịst bụ́ Eze, ị ga-adị oo!” Otú ọ dị, ihe kpatara agha ahụ malitere ogologo oge tupu mgbe ahụ.

Ihe Kpatara Agha Ahụ

N’afọ 1917, e mesịrị kwadoo iwu mgbanwe ọchịchị ahụ e bu ụzọ tie n’afọ ndị 1850. Otu n’ime ihe ndị e bu n’obi tie iwu ahụ bụ “iji mee ka ala na ụlọ chọọchị ghọọ nke gọọmenti.” (Historia de México) Gọọmenti tiri iwu a iji gbochitụ Chọọchị Katọlik ịkwakọba akụ̀ na ụba nakwa ala. Ozugbo a kwadoro iwu ahụ, ndị ụkọchukwu guzogidesiri ya ike. Gọọmenti mere ihe site n’ijide ọtụtụ ndị ụkọchukwu ma kpọchie ha.

Otu n’ime ihe ndị mere e ji lụọ ọgụ maka mgbanwe ọchịchị na Mexico (1910-1920) bụ iji mee ka ndị ogbenye nweta ala. N’ihi ya, iwu ọhụrụ ahụ kwuru ka a napụ ndị nwere ọtụtụ ala ala ha ma kesaara ya ndị ogbenye. Ndị ụkọchukwu n’ozuzu ha bịara chọọ itinye ọnụ n’okwu a. E kwuwerị, iwu ọhụrụ ahụ metụtara ndị ụkọchukwu ọnụ na-eru n’okwu bụ́ ndị nwere ala buru ibu. Chọọchị ahụ kwuru na ya adịghị emegide atụmatụ ike ala eke, ma ụzọ ọ tụpụtara isi mee ya dị iche n’ụzọ gọọmenti tụpụtara.

Otú ọ dị, ụfọdụ kweere na nanị ihe bụ́ mkpa chọọchị ahụ bụ ịgbachitere ndị nwere ala buru ibu, ndị ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ụkọchukwu bara ọgaranya. N’aka nke ọzọ, e nwere ndị ụkọchukwu kwadoro ka e kesaara ndị ogbenye ala ndị ahụ. Esemokwu a dị n’etiti ndị chọọchị ahụ na ibe ha mere nnọọ ka nsogbu a chọọchị na gọọmenti nwere ka njọ.

Ná mmalite afọ 1925, Plutarco Elías Calles, bụ́ onye ka ghọrọ nnọọ president mba Mexico aghọ, gbasiri nnọọ mbọ ike ịhụ na e tinyere akụkụ nke iwu ọhụrụ ahụ nke metụtara chọọchị n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ chụpụrụ ọtụtụ ndị ụkọchukwu Katọlik si mba ọzọ na Mexico. Tụkwasị na nke ahụ, e jidere achịbishọp nke Mexico ma kpọchie ya mgbe o kwusịrị na ndị ụkọchukwu ga-alụ ọgụ megide iwu a e tiri megide ha. E jichikwara ụfọdụ ụlọ ndị chọọchị nwe. Ọtụtụ ndị kweere na nzube gọọmenti ji na-eme ihe ndị a bụ iji hụ na a dịghị eburu ego Mexico n’ụba ebuga Rom.

Na July 1926, ndị bishọp nọ na Mexico bịara jiri aka ha nye iwu ka a kwụsị ikpe ụka. Gọọmenti weere iwu a ndị bishọp nyere dị ka nkata a na-akpa iji kpalie ndị mmadụ imegide gọọmenti. Ihe ọ sọrọ ya ya bụrụ, ụka ahụ a kwụsịrị ikpe bụ ya kpaliri agha ahụ dị mwute ndị Cristero lụsoro gọọmenti.

Agha Adaa

Ọtụtụ puku ndị Katọlik, bụ́ ndị ndị ụkọchukwu ha kpaliri, lụrụ agha iji zọọ okpukpe ha. Ha gawa agha, ha na-ebu ihe oyiyi nke Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Guadalupe. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Cristero tụrụ anya ka ndị isi chọọchị pụta zọọ chọọchị ha, ihe ka nnọọ ukwuu n’ime ndị bishọp na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ etinyeghị aka n’agha ahụ n’ihi ụjọ ha na-atụ na gọọmenti ga-ata ha ahụhụ. Kama nke ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha gbagara n’ụlọ ndị ọgaranya, n’etinyeghị aka n’agha ahụ, ebe ndị nkịtị nọ na-alụrụ okpukpe ha ọgụ.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ụkọchukwu kwadoro nnọọ otu akụkụ ma ọ bụ akụkụ nke ọzọ. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Cristiada, (Mpịakọta nke 1, Agha Ndị Cristero) si kwuo, ihe dị ka otu narị ndị ụkọchukwu Katọlik akwadoghị ndị Cristero, ebe ndị ụkọchukwu 40 kwadosiri agha ahụ ike. Ndị ụkọchukwu ise ndị ọzọ sodị lụọ agha ahụ alụ.

Nsogbu agha ahụ kpatara abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. N’ọtụtụ ebe, o mere ka ndị mmadụ ghọọ ogbenye ọnụ ntụ. Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ akụkọ ndị kwuru na ndị Cristero na-adọkpụrụ ụmụ okorobịa n’ike ka ha bịa soro lụwa agha. Ndị mmadụ kọrọ na ndị Cristero na ndị agha gọọmenti gakwuuru ezinụlọ dị iche iche ugboro ugboro, jiri ike na-ana ha nri. A kọkwara na òtù abụọ ahụ dinara ndị mmadụ n’ike, ndị ndị mmadụ hụrụ n’anya nwụnahụkwara ha n’agha ahụ.

Ma ndị agha Cristero ma ndị agha gọọmenti mekpọrọ ndị mmadụ ọnụ, gụnyere ogbugbu ha gburu ọtụtụ ndị aka ha na-adịghị n’agha ahụ. N’ikpeazụ, ọnụ ọgụgụ ndị agha ahụ tara isi ha mere ka a ghọta otú ọ dịruru ná njọ—ọ dịkarịa ala, e gburu puku mmadụ iri asaa n’ime afọ atọ a lụrụ agha ahụ.

Agha ahụ Ebie

Mgbe Chọọchị Katọlik na gọọmenti mesịrị nkwekọrịta na June 1929, esemokwu ha kwụsịrị. Ka ọ na-erukwa n’ọnwa August, agha ahụ akwụsịla. Ma ndị agha Cristero esoghị tinye ọnụ n’okwu ahụ, ha apụghịkwa ịghọta ihe mere chọọchị Katọlik ga-eji kwenyere ihe ọtụtụ mmadụ weere dị ka onye iro nke ikike si n’aka Chineke. N’ịbụ ndị nke a wutere ma ha anọgide na-erubere ndị ụkọchukwu isi, ndị Cristero mesịrị chịlie aka elu ma laghachi n’ụlọ ha. Gọọmenti bịara kwe nkwa ịnabatakwu echiche chọọchị na ikwe ka ha maliteghachi ido Mas. Ma, a gbanweghị iwu ndị ahụ e tiri banyere igbochi okpukpe ime ihe ụfọdụ.

A kọwawo agha ahụ ndị Cristero lụsoro gọọmenti dị ka mbọ ụfọdụ ndị nọ na Chọọchị Katọlik gbara inwe ọnụ n’ọchịchị otú ahụ ha sibu nwee ya tupu e tie iwu ndị ahụ e tiri mgbe a gbanwesịrị ọchịchị. N’agbanyeghị agha ahụ, iwu ndị ahụ ka dịgidere na Mexico ruo afọ 1992, bụ́ mgbe e tiri iwu nke metụtara òtù okpukpe dị iche iche. Ma, a ka nọgidere na-enyo òtù okpukpe enyo. A ka gbochikwara ndị ụkọchukwu itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụkwa ezie na òtù okpukpe pụrụ inwe ihe onwunwe ugbu a, ihe onwunwe chọọchị nwetara tupu afọ 1992 ka nọgidere bụrụ nke gọọmenti. Ma, iwu ahụ egbochibeghị ọtụtụ ndị ụkọchukwu nọ na Mexico itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Gịnị Ka A Rụpụtara?

Ngwá agha ndị Cristero buliri iji zọọ okpukpe ha ọ̀ rụpụtaara ha ezi ihe na-adịgide adịgide? María Valadez, bụ́ onye lanahụrụ agha ahụ, na-ekwu ugbu a, sị: “Ekweere m na ndị nile e gburu n’agha ahụ furu ọhịa. Agha ahụ enwetụghị isi.” Pedro Rosales Vargas, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, kwuru banyere ihe ndị dị mwute agha ahụ kpatara, sị: “Ndị mmadụ gburu ibe ha, ọbụna ndị okpukpe ha. Nke a bụ otú m si ghọọ nwa mgbei—ha gburu nna m.”

Ihe ndị dị mwute agha ahụ kụziri emebeghị ka ihe ndị metụtara okpukpe kwụsị ịkpasu agha, dị ka na Northern Ireland nakwa n’ebe bụ́bu Yugoslavia. Nanị ihe pụrụ igbochi ọdachi dị otú ahụ bụ ikpe okpukpe dị ọcha nke Kraịst guzobere. Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ka ha nọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ka ha ghara ịbụ “akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16; 18:36) Jizọs gwara Pita onyeozi, bụ́ onye nwara iji ike mee ka a ghara ijide Ya, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”—Matiu 26:52.

Olee Ihe Ndị Kraịst Kwesịrị Ime Mgbe A Na-emegide Ha?

Nke a ọ̀ na-apụta na ọ bụrụ na ezi Ndị Kraịst ahụ na a na-anapụ ha nnwere onwe ikpe okpukpe ha, na ha ekwesịghị ime ihe ọ bụla banyere ya? Mbanụ. Mgbe a na-akpagbu Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ha gbachiteere onwe ha ọtụtụ mgbe site n’iji usoro ndị iwu kwadoro n’oge ahụ mee ihe. Ha wepụrụ okwu n’ụlọikpe. Ọ bụ eziokwu na a tụrụ ha mkpọrọ mgbe ụfọdụ, ọ dịghị mgbe ha gọnahụrụ okwukwe ha ma ọ bụ tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.—Ọrụ 5:27-42.

Ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla nke Ndị Kraịst oge mbụ nọ bulie egbe na mma iji zọwa ihe ndị ruuru okpukpe ha. Ezi Ndị Kraịst adịghị egbu ndị ha na ha na-anọghị n’otu okpukpe, ma ya fọdụzie ndị ha na ha nọ n’otu okpukpe. Kama nke ahụ, ha na-agbaso ihe Nna ha ukwu kụziiri ha, nke bụ́: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ụkọchukwu ndị agha Cristero abụọ nọ n’akụkụ ya abụọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© (Nọmba e nyere foto: 422036) SINAFO-Fototeca Nacional

[Foto dị na peeji nke 13]

President Plutarco E. Calles

[Ebe E Si Nweta Foto]

© (Nọmba e nyere foto: 66027) SINAFO-Fototeca Nacional

[Foto dị na peeji nke 13]

Ụfọdụ n’ime ndị ọchịagha nke ndị Cristero

[Ebe E Si Nweta Foto]

© (Nọmba e nyere foto: 451110) SINAFO-Fototeca Nacional ▸