Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Gbara Àmà Katara Ahụ́

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Gbara Àmà Katara Ahụ́

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Gbara Àmà Katara Ahụ́

Ọtụtụ ndị na-eto eto n’etiti Ndịàmà Jehova na-eji obi ike ekwupụta ihe ndị ha kweere, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’oge ha nọ n’ozi Ndị Kraịst. Ha enwewokwa ihe ịga nke ọma dị ukwuu na ya. Tụlee ihe atụ ndị a na-esonụ. *

“Mgbe m dị afọ itoolu,” ka Kristina na-ekwu, “onye nkụzi anyị nyere onye ọ bụla n’ime anyị akwụkwọ anyị ga-eji na-edepụta ihe nile anyị na-eme n’ụbọchị. Onye nkụzi anyị kwuru na ya ga-agụ ihe anyị dere ma dee ihe na ya tupu ya enyeghachi ya anyị. Ekpebiri m ide banyere ihe omume m na-aga ime n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. O yiri ka ọ̀ masịrị onye nkụzi ahụ, n’ihi ya, akpọrọ m ya ka ọ bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bịa gere ihe omume m ahụ. Ọ bụghị nanị na ọ bịara, kamakwa onye nkụzi kuziiri m ihe na klas mbụ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, bịakwara. Ka e mesịrị, onye nkụzi anyị gwara ụmụ klas anyị nile otú ihe omume m ahụ si tọọ ya ụtọ. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, akọrọ m ahụmahụ ahụ ná mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova, onye nkụzi anyị ahụ bịakwara mgbakọ ahụ. Ka e mesịrị, mụ na otu enyi m bụ́ onye ọsụ ụzọ jere na nke onye nkụzi m ahụ ma nye ya akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bịawokwa otu n’ime mgbakọ distrikti anyị!”

Mgbe Sydnee dị afọ isii, ọ maara nnọọ otú ọ na-esi eji obi ike agwa ụmụ klas ya banyere eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke, bụ́ nke gụnyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na ọkwá Jizọs ma e jiri ya tụnyere nke Chineke. Nne ya na-ekwu, sị: “Ọ nọwo na-abụ obere onye nkwusa na-adịghị atụ egwu, nke na-anụkwa ọkụ n’obi.” Ná ngwụsị afọ mbụ ya n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, Sydnee kwupụtara mwute ọ na-enwe. O kwuru, sị: “Ana m enwe nchegbu banyere ụmụ klas m. Olee otú ha ga-esi mara banyere Jehova?” Sydnee chepụtara ihe ọ ga-eme. N’ụbọchị ha mechiri akwụkwọ, o nyere nwa akwụkwọ ọ bụla onyinye o kechiri ekechi. Onyinye ahụ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Akwụkwọ Sydnee nyere ụmụ akwụkwọ ahụ dị 26, ọ gwakwara ha nile ka ha tọpee ya n’ụlọ n’ihu ndị mụrụ ha. Sydnee weere ụmụ klas ya dị ka ókèala e kenyere ya onwe ya ịgba àmà. Ọ na-akpọdị ha na fon ịjụ ha otú ha si nwee mmasị n’akwụkwọ ahụ. Otu nwatakịrị nwanyị kwuru na ya na nne ya na-agụ Akwukwọm nke Akukọ Bible ahụ n’abalị ọ bụla.

Mgbe Ellen dị afọ 15, o nyere onye nkụzi na-akụziri ha akụkọ ihe mere eme mbipụta Teta! dị iche iche. Ellen na-ekwu, sị, “Ọ na-atọ ya ụtọ, o ruokwala afọ abụọ o bidoro gụwa Teta!” Ellen gakwara n’ihu, sị: “Na nso nso a, enyere m ya Akwukwọm nke Akukọ Bible, ọ gwakwara m na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ na-enwe nnọọ mmasị ịgụ ya. N’ihi ya, enyere m ya akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ka e mesịrị, o nyere m kaadị ozi ekele. Ihe e dere na kaadị ahụ bụ: ‘Ana m ekele gị nke ukwuu maka akwụkwọ ndị ahụ. Mụ na ụmụ m nwanyị na-agụ ha. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ onye na-eto eto maara ihe ma jiri ihe akpọrọ ihe dị ka gị. Ọ dịghị onyinye a pụrụ iji tụnyere okwukwe siri ike i nwere. Ị kụziworo m ihe karịrị ihe m pụrụ ịkụziri gị!’ Ahụmahụ a mere ka m mara ụdị ekele ndị mmadụ na-enwe maka eziokwu Bible mgbe anyị mere mgbalị iji wetara ha ya.”

Daniel dị afọ isii mgbe ọ malitere iduzi ọmụmụ Bible mbụ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ana m eso mama m mgbe ọ na-eduziri ndị ọzọ ọmụmụ ihe, ma achọrọ m iduziri mmadụ ọmụmụ ihe n’onwe m.” Daniel họọrọ otu agadi nwanyị aha ya bụ́ Oriakụ Ratcliff, bụ́ onye o nyere akwụkwọ e ji amụ Bible na mbụ. Ọ gwara nwanyị ahụ, sị: “Achọrọ m igosi gị akwụkwọ kasị amasị m, ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible.” Ya ekwuokwa, sị: “M ga-achọ ịma ma ị̀ ga-enwe mmasị ka m na-abịa n’izu ọ bụla na-agụrụ gị ya.” Oriakụ Ratcliff kwetara ozugbo ahụ. “Ka e mesịrị n’otu ụbọchị ahụ, anyị na Oriakụ Ratcliff malitere ịmụ ihe,” ka Laura, bụ́ mama Daniel, na-ekwu. “Daniel na Oriakụ Ratcliff na-eme onye gụọ otu paragraf onye ọzọ agụọ nke na-eso, ha gụsịa, Daniel agwa ya ka ọ gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara ná ngwụsị nke akụkọ ahụ. Mụ na Daniel na-eso aga, ma o yiri ka Oriakụ Ratcliff ọ̀ na-achọ nnọọ ka ọ bụrụ nanị ya na Daniel ga na-amụ ihe ahụ!” Ka oge na-aga, Daniel na Oriakụ Ratcliff malitere ịmụ akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ka ọ na-erule oge a, nwanne nwanyị Daniel nke nta bụ́ Natalie eruola ogo ịgụ ihe, n’ihi ya, ọ malitere isonyere ha n’ọmụmụ ihe ahụ. Oriakụ Ratcliff na-ajụ ọtụtụ ajụjụ—ụfọdụ n’ime ha na-atakwa nnọọ akpụ. Ma Daniel na Natalie na-eji akwụkwọ nta bụ́ Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu nakwa ndepụta nke okwu ndị dị na Bible, bụ́ nke dị n’azụ Bible, enweta ihe ndị na-enyere ha aka inye ya azịza ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Oriakụ Ratcliff, bụ́ onye Katọlik ná ndụ ya nile, bịara nwee obi ụtọ n’ihi ihe ọ na-amụta. Otu ụbọchị ha mụsịrị ihe, o kwuru, sị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na amalitere m ịmụ Bible ọtụtụ afọ gara aga!” Ọ bụ ihe dị mwute na Oriakụ Ratcliff nwụrụ na nso nso a mgbe ọ dị afọ 91. Ma ịmụ Bible nyeere ya aka ịmata eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa, tinyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ na paradaịs elu ala bụ́ nke e kwuru banyere ya n’ime Bible. Daniel dị afọ iri ugbu a, ọ na-eduzikwa ọmụmụ Bible abụọ. Natalie, bụ́ onye dị afọ asatọ ugbu a, na-amụkwara otu nwatakịrị ya na ya bụ ọgbọ, Bible.

Ndị na-eto eto ndị dị ka Kristina, Sydnee, Ellen, Daniel na Natalie na-eme ka nne na nna ha bụ́ Ndị Kraịst na-enwe ọṅụ. Nke ka mkpa, ha na-eme ka obi Jehova ṅụrịa, ọ gaghịkwa echefu ịhụnanya ndị na-eto eto dị otú ahụ na-egosi maka aha ya.—Ilu 27:11; Ndị Hibru 6:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ nile e zoro aka na ha n’isiokwu a.

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Kristina (n’ebe elu) na Sydnee

[Foto dị na peeji nke 19]

Daniel na Natalie

[Foto dị na peeji nke 19]

Ellen