Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Iso Ndị Ọjọọ Na-akpakọrịta?

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Iso Ndị Ọjọọ Na-akpakọrịta?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Iso Ndị Ọjọọ Na-akpakọrịta?

“Amalitere m iso otu nwa agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na-akpa. . . . Ọ naghị aṅụ ọgwụ ike, ọ naghị aga oriri oké mkpọtụ, ma ọ bụ na-akwa iko. Ọ naghịdị akpọ mmadụ iyi, ọ na-agbakwa onye mbụ n’ụlọ akwụkwọ. Ma, o doro anya na ọ bụghị onye kwesịrị ka mụ na ya na-akpa.”—Beverly. *

N’IHI gịnị ka Beverly ji kwuo ihe ahụ o kwuru n’elu? Ọ chọpụtara ugbu a na nwa agbọghọ a na-eme ka ọ na-etinye aka n’omume ọjọọ. Beverly na-akọwa, sị, “Ka mụ na ya nọgidere na-akpa, amalitere m ịgụ akwụkwọ ndị mgbaasị, ọbụna na-ede akụkọ metụtara mgbaasị.”

E dubakwara otu nwa agbọghọ aha ya bụ Melanie n’omume ọjọọ—onye dubara ya bụ otu onye nke sị na ya bụ Onye Kraịst ibe ya! Olee otú ị pụrụ isi mara ma mmadụ ò nwere ike ịbụ ezigbo enyi? Ọ̀ bụ mgbe nile ka iso onye na-ekweghị ekwe akpachi anya na-adị ize ndụ? Ndị enyi Onye Kraịst na-emete n’etiti Ndị Kraịst ibe ya hà na-abụcha ezi ndị enyi?

Nke kasịnụ, gịnịkwanụ banyere iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eme enyi? Ọ bụrụ na ị na-ele mmadụ anya dị ka onye ị ga-alụ, olee otú ị pụrụ isi mara ma adịm ná mma unu ọ̀ ga-abụ nke ọma ya? Ka anyị lee otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nye aka zaa ajụjụ ndị dị otú ahụ.

Olee Ụdị Ndị Enyi Dị Mma?

Na nwa akwụkwọ ibe ya ahụ adịghị efe ezi Chineke ò kwesịrị imewo ka Beverly zere iso ya bụrụ enyi? N’eziokwu, ezi Ndị Kraịst anaghị ewere mmadụ dị ka onye ọjọọ ma ọ bụ onye na-eme omume rụrụ arụ nanị n’ihi na ọ bụghị onye kwere ekwe ibe ha. Ma mgbe o ruru na nke iso ya na-akpachi anya, ọ dị ihe mere a ga-eji kpachara anya. Pọl onyeozi dọrọ ndị nọ n’ọgbakọ Kọrint nke narị afọ mbụ aka ná ntị, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Gịnị ka okwu ya pụtara?

O kwere nnọọ omume na ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ahụ nọ na Kọrint so ndị òtù Epikurọs, bụ́ ụmụazụ nke onye Gris ahụ bụ́ ọkà ihe ọmụma nke aha ya bụ Epikurọs, na-akpakọrịta. Epikurọs kụziiri ụmụazụ ya ka ha na-ebi ndụ n’ụzọ ezi uche dị na ya, ka ha na-enwe obi ike na njide onwe onye, ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọbụna ọ gwakwara ha ka ha ghara ịdị na-eme mmehie nzuzo. Ọ̀ bụzi n’ihi gịnị ka Pọl ga-eji were iso ndị òtù Epikurọs, na ọbụna ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị nwere echiche yiri nke ha, na-akpakọrịta dị ka “mkpakọrịta ọjọọ”?

Ndị òtù Epikurọs anaghị efe ezi Chineke ahụ. Ebe ọ bụ na ha ekweghị ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, mkpa ha bụ ibi ndụ nanị maka taa. (Ọrụ 17:18, 19, 32) Ka a sịkwa ihe mere na, n’ihi iso ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Kọrint bịara kwụsịwa inwe okwukwe ná mbilite n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere 1 Ndị Kọrint isi 15—nke Pọl nọ na ya dọọ aka ná ntị banyere mkpakọrịta ọjọọ—ji nwee ọtụtụ okwu ndị e ji mee ka obi sighachi Ndị Kraịst oge gboo ike na olileanya mbilite n’ọnwụ ga-emezurịrị.

Gịnị ka nke a na-eme ka a ghọta? Ọ bụ na ọbụnadị ndị na-ekweghị na Chineke pụrụ ịkpa àgwà ọma. Ma, ọ bụrụ na ị họrọ ha dị ka ezi ndị enyi gị, ọ ga-emetụta echiche gị, okwukwe gị, na àgwà gị. N’ihi ya, n’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrint, o kwuru, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ”—2 Ndị Kọrint 6:14-18.

Fred, bụ́ onye dị afọ 16, chọpụtara amamihe dị n’okwu ahụ Pọl kwuru. Na mbụ, o kwenyere isonyere ụmụ akwụkwọ ibe ya na njem ụlọ akwụkwọ ha dokwara ime, bụ́ nke ha ga-aga n’otu mba ka na-emepe emepe, iji nye aka kụziere ụmụaka ndị nọ n’ebe ahụ ihe. Ma, ka ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya nọ na-ejikere ịga, Fred gbanwere obi ya. O kwuru, sị: “Achọpụtara m na oge dị ukwuu mụ na ha ga-anọ ebe ahụ agaghị abara m uru ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ.” N’ihi ya, Fred kpebiri isere aka ya na njem ahụ ma họrọ isi n’ụzọ ọzọ nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.

Mgbe Ị Chọrọ Imete Ndị Kraịst Ibe Gị Enyi

Gịnịkwanụ banyere imete ndị nọ n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst enyi? Mgbe Pọl na-edegara nwa okorobịa bụ́ Timoti akwụkwọ, ọ dọrọ ya aka ná ntị, sị: “N’ime ụlọ buru ibu, e nwere arịa dị iche iche, ọ bụghị nanị nke ọlaedo na ọlaọcha kamakwa nke osisi na nke ụrọ, ụfọdụ bụkwa maka nzube kwesịrị nsọpụrụ ma ndị ọzọ bụ maka nzube nsọpụrụ na-adịghị na ya. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ezere ndị nke ikpeazụ ahụ, ọ ga-abụ arịa bụ maka nzube kwesịrị nsọpụrụ, nke e doro nsọ, nke baara onye nwe ya uru, nke a kwadebere maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 2:20, 21) Ya mere, Pọl ezoghị ọnụ ime ka a mara eziokwu ahụ bụ́ na ọbụna n’etiti Ndị Kraịst, a pụrụ inwe ndị na-adịghị akpa ezi àgwà. O zoghịkwa ọnụ ịgba Timoti ume ka o zere ndị dị otú ahụ.

Nke a ọ̀ na-apụta na i kwesịrị ịdị na-enyo Ndị Kraịst ibe gị enyo? Mbanụ. Ọ dịghịkwa apụta na i kwesịrị ịdị na-atụ ndị enyi gị anya n’aka ka ha ghara imehie ihe. (Eklisiastis 7:16-18) Ma, nanị na onye na-eto eto na-abịa nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ nwee nne na nna na-anụ ọkụ n’obi n’ọgbakọ adịghị apụta na ọ dị mma ịhọrọ onye a dị ka ezigbo enyi.

“Ọbụna nwata na-eme ka a mata ya site n’omume ya nile, ma ọrụ ya [ọ̀] dị ọcha, ma [ò] zikwara ezi,” ka Ilu 20:11, na-ekwu. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ka ị tụlee, sị: Mmekọrịta ya na Jehova ọ̀ bụ ihe kasị mkpa ná ndụ ya? Ka ò nwere ihe ndị na-egosipụta “mmụọ nke ụwa” n’echiche na n’omume ya? (1 Ndị Kọrint 2:12; Ndị Efesọs 2:2) Ọnụnọ gị na ya ọ̀ na-eme ka ị na-enwekwu ọchịchọ ife Jehova?

Ọ bụrụ na ị họrọ enyi ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe ma nwee ịhụnanya dị ukwuu n’ebe Jehova nọ, ọ bụghị nanị na ị ga-ezere nsogbu, kamakwa ị ga-enwetakwu ike ijere Chineke ozi. Pọl gwara Timoti, sị: “Chụsoo ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.”2 Timoti 2:22.

Mgbe Ị Chọrọ Imete Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe Gị Enyi

Ọ bụrụ na i toruwo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gị achọọkwa ịlụ, ì chetụla echiche banyere otú ihe ndị a e kwuru kwesịrị isi metụta ụdị onye ị ga-ahọrọ ịlụ? E nwere ọtụtụ ihe ndị pụrụ ime ka i nwee mmasị n’ebe onye ị chọrọ ịlụ nọ, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha dị mkpa ka ọnọdụ ime mmụọ ya.

N’ihi ya, Bible na-adọ aka ná ntị ugboro ugboro megide ịlụ onye na-anọghị “n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39; Deuterọnọmi 7:3, 4; Nehemaịa 13:25) N’ezie, ndị na-abụghị ndị kwere ekwe ibe gị pụrụ ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị na-akpa ezi àgwà, na ndị na-echebara ndị ọzọ echiche. Ma, ha adịghị enwe ihe ndị na-akpali ha otú o si akpali gị ịnọgide n’àgwà ọma ndị ahụ na ịnọgidesi ike n’alụmdi na nwunye ha ka oge na-aga.

N’aka nke ọzọ, ihe ọ sọkwara ya mee, onye raara onwe ya nye Jehova ma na-eguzosi ike n’ihe nye ya, na-azụlite nnọọ àgwà Ndị Kraịst ma na-echekwa ha. Ọ na-aghọta na Bible na-ekwu na ka mmadụ wee soro Jehova na-enwe ezi mmekọrịta, ọ ghaghị ịhụ di ma ọ bụ nwunye ya n’anya. (Ndị Efesọs 5:28, 33; 1 Pita 3:7) N’ihi ya, mgbe di na nwunye hụrụ Jehova n’anya, ọ ga-eme ka ha guzosie ike n’ihe nye ibe ha.

Nke a ọ̀ pụtara na alụmdi na nwunye Ndị Kraịst ga-agarịrị nke ọma? Ee e. Dị ka ihe atụ, olee ihe pụrụ ime ma ị lụọ onye na-enwechaghị mmasị n’ihe ime mmụọ? Ebe ọ bụ na onye na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ adịghị njikere ịnagide nsogbu nke usoro ihe a, o yiri ka ọ̀ ga-esi n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụọ. (Ndị Filipaị 3:18; 1 Jọn 2:19) Cheedị echiche banyere obi mgbawa na nsogbu ị ga-enwe n’alụmdi na nwunye gị ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye gị emikpuo onwe ya “ná mmerụ nke ụwa.”—2 Pita 2:20.

Tupu gị na mmadụ adịgide ná mma ruo n’ókè nke ikwuwe okwu ọlụlụ, chee echiche, sị: Onye a ọ̀ na-akpa àgwà ka onye ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe? Ọ̀ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya dị ka Onye Kraịst? Onye a ọ̀ maara eziokwu Bible nke ọma, ka ọ̀ ka chọkwuru oge iji gbasikwuo ike n’ụzọ ime mmụọ? Ì kwenyesiri ike na ihe kasị mkpa ná ndụ ya bụ ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ? Ịmara na onye ahụ nwere aha ọma ga-enyere gị aka. Ma n’ikpeazụ, ị ghaghị ikwenyesi ike na onye ahụ i nwere mmasị ịlụ raara onwe ya nye Jehova ma bụrụ onye o yiri ka ọ̀ ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye.

Chetakwa na ọ bụ ihe ọjọọ—dị ka ụdị ntụrụndụ ma ọ bụ ihe omume ụfọdụ na-adịghị mma—na-ebu ụzọ adọrọ mmasị nke ụfọdụ ndị na-enwe mmasị iso “ndị ọjọọ” na-akpakọrịta. Ndị ntorobịa na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ Ndị Kraịst agaghị eso gị eme ihe ndị dị otú ahụ. N’ihi ya, nyochaa obi gị nke ọma.

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka e kwesịrị ịdọ obi gị aka ná ntị, obi ekoropụla gị. A pụrụ ịdọ obi aka ná ntị. (Ilu 23:12) E kwuo elu kwuo ala, ihe kasị mkpa bụ: Gịnị kpọmkwem ka ị chọrọ? Ị̀ chọrọ ịbụ onye ezi ihe na ndị na-eme ya na-adọrọ mmasị ya? Site n’enyemaka Jehova, ị pụrụ ịzụlite ụdị obi ahụ. (Abụ Ọma 97:10) Sitekwa n’ịzụ ikike nghọta gị iji na-amata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ, ọ ga-adịrị gị mfe ịchọpụta ndị ga-abụ ezigbo ndị enyi ga na-ewuli gị elu.—Ndị Hibru 5:14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ndị ahụ.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ezigbo ndị enyi ga-eme ka i jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe