Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara azịza ha nile na peeji nke 18. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee ógbè Ijipt nke Fero nyere ndị Izrel ka ha biri, n’ihi gịnịkwa ka ebe a ji kwesị nnọọ ekwesị? (Jenesis 47:3-6)

2. Olee ụdị omume na-akpata esemokwu? (Ilu 10:12)

3. Olee ihe Jehova kwuru na ya mere iji gosi na nkwa o kwere banyere mba Izrel abụghị nkwa elu ọnụ nakwa na ọ bụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi? (Ezikiel 36:7)

4. Olee ihe atụ Jizọs ji kọwaa ọchịchọ ya ịchịkọta ndị Jeruselem na-ekweghị ege ya ntị? (Matiu 23:37)

5. Olee nwa Adam na Iv nke Jizọs si n’agbụrụ ya pụta? (Luk 3:38)

6. Olee ndị nọ n’isi na nkata ahụ a kpara igbu Jizọs? (Matiu 26:3)

7. Dị ka Jọn onyeozi si kwuo, olee òkù a na-akpọ ndị nile “akpịrị na-akpọ nkụ” maka ezi omume? (Mkpughe 22:17)

8. Ọ bụrụ na ọ dị mmadụ ọ bụla ka amamihe ọ̀ kọrọ ya, gịnị ka o kwesịrị ime, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (Jems 1:5)

9. Gịnị ka Jehova mere iji nwetara Adam nwunye? (Jenesis 2:22)

10. Olee ebe ndị e si na ha nweta ndị eze na ndị nchụàjà ga-eso Jizọs chịa ụwa? (Mkpughe 5:9)

11. N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị kwe ka Mozis banye n’Ala Nkwa ahụ? (Ọnụ Ọgụgụ 20:10-12)

12. Gịnị ka Devid mere iji gbapụ n’aka ndị Filistịa nọ na Gat? (1 Samuel 21:12-14)

13. Olee ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị nwoke bụ́ Onye Kraịst na-aghaghị izere iji ruo eru ịbụ onye nlekọta? (Taịtọs 1:7)

14. Olee otú Darayọs onye Midia si tụnye ụtụ n’iwu ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem? (Ezra 6:5-8)

15. Olee otú ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke kwesịrị isi kụziere ụmụ ha iwu Jehova, oleekwa mgbe ha kwesịrị ime ya? (Deuterọnọmi 6:6, 7)

16. Olee ọrụ Saịmọn onye Saịrini rụrụ n’oge e gburu Jizọs? (Matiu 27:32)

17. Olee ụdị omume ihu abụọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii mere nke Jizọs hotara ihe Aịsaịa kwuru mgbe ọ na-akatọ ha? (Matiu 15:8)

18. Gịnị bụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ, oleekwa ebe ọ nọ rụọ ya? (Jọn 2:1-11)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Goshen, n’ihi na ebe ahụ bụ́ ala kachasị mma maka ịkpa anụ n’Ijipt. Ezinụlọ Jekọb bụ ndị na-akpa anụ

2. Ịkpọasị

3. O weliri aka ya elu [ṅụọ iyi]

4. Nnekwu ọkụkọ na-achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya

5. Set

6. Ndị isi nchụàjà na ndị okenye Izrel

7. Ị bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu”

8. Ya “nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha”

9. Ka O mesịrị ka oké ụra dakwasị Adam, O weere otu n’ime ọgịrịga ya ma jiri ya kepụta nwanyị

10. “Site n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla”

11. O doghị Jehova nsọ n’anya ụmụ Izrel n’ihe banyere ụzọ ọrụ ebube Jehova si nye ha mmiri n’ọzara

12. O mere ka onye ara, eze Gat wee hapụ ya ka ọ laa dị ka onye nzuzu na-adịghị ihe ọ bịara ime ha

13. Ọ ghaghị ịbụ onye a na-adịghị ebo ebubo, onye na-adịghị ekwesi olu ike, onye na-adịghị enwekarị ọnụma, ọ bụghị onye aṅụrụma na-ese okwu, ọ bụghị onye na-eti mmadụ ihe, ọ bụghị onye nwere anyaukwu maka uru aghụghọ

14. O nyere iwu ka e si n’ụlọ akụ̀ eze weta ihe ndị e ji wuo ya, nakwa ka e bughachi arịa ọlaedo na ọlaọcha Nebukadneza bugara Babịlọn

15. Ndị nne na nna kwesịrị iji ohere ọ bụla dapụtaranụ—ma ọ̀ bụ n’oge a na-amụ ihe ma ọ̀ bụ n’oge ọ bụla ọzọ—kụnye eziokwu nke dị n’Okwu Chineke n’ime obi ụmụ ha

16. A manyere ya ka o buru osisi ịta ahụhụ Jizọs

17. Ha ji “egbugbere ọnụ ha” na-asọpụrụ Chineke, ma obi ha “dị nnọọ anya” n’ebe ọ nọ

18. O mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya n’otu oriri agbamakwụkwọ na Kena