Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Kwesịrị Ka Ụmụ Nwanyị Na-ezo Mma ha?

Ò Kwesịrị Ka Ụmụ Nwanyị Na-ezo Mma ha?

Echiche nke Bible

Ò Kwesịrị Ka Ụmụ Nwanyị Na-ezo Mma ha?

“ỤMỤ nwanyị ejighị ịchọ mma egwuri egwu,” ka George Simonton, onye bụ́ aka ochie n’ịkwa ákwà, bụrụkwa prọfesọ n’ụlọ akwụkwọ Fashion Institute of Technology nke New York, kwuru. Ọ na-akọwa, sị: “Ụmụ nwanyị na-enwe mmasị ime ka ha pụọ iche, ka ha dị ọgọ n’anya, ka mma ha pụtakwuo . . . Ana m eche na ime nke a na-egosi na ha na-akwanyere onwe ha na ndị ha na ha nọ ùgwù.” Ee, ọ dịla anya a chọpụtara na ịchọ mma bụ ụzọ ụmụ nwanyị si egosipụta na ha bụ nwanyị, ụzọ ha si eme ka ha dịkwuo mma n’anya, nakwa ụzọ ha si eme ka onwe ha ju ha afọ.

Otú ọ dị, n’ihi nkwenkwe okpukpe, ụfọdụ na-ele mma ụmụ nwanyị na-achọ anya ọjọọ. “Ụmụ nwanyị dị nsọ, . . . ọ bụrụ. . . na ha mara mma site n’afọ nne ha, . . . ekwesịtụghị ime ka mma ha pụtakwuo, kama ha kwesịrị ịgbalị izochi ya,” ka Tertullian dere na narị afọ nke atọ O.A. O kwukwara banyere ihe ntecha, sị: “Ụmụ nwanyị ndị na-ete ude n’ihu ha, na-ete ihe na ntì ha, ma ọ bụ n’iku anya ha iji mee ka o tokwuo ogo, na-emehie megide Chineke.” Ọ kọwakwara ọlaedo na ọlaọcha “ndị e ji achọ mma” dị ka “ihe ndị e ji arata mmadụ.”

Taa, ọtụtụ ka na-elekwa mma ụmụ nwanyị na-achọ anya ọjọọ. Ọbụna ụfọdụ okpukpe machibidoro ndị òtù ha iyi ọla ndị e ji achọ mma, ite ihe ntecha, ma ọ bụ iyi uwe mara mma. Ò kwesịrị ka nwanyị bụ́ Onye Kraịst zochie mma ya, ka ò kwesịrị ime ka mma ya pụtakwuo?

Echiche Chineke

Bible ekwughị ọtụtụ ihe banyere iyi ọla ịchọ mma ma ọ bụ ite ihe ntecha. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi na Chineke adịghị akatọ ụdị ịchọ mma a ma ọ bụ ụdị ndị ọzọ.

Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke na-akọwa otú o si gọzie Jeruselem, o kwuru banyere obodo ahụ ka à gasị na ọ bụ nwanyị. O kwuru, sị: “M wee kee gị ihe ịchọ mma, . . . i wee magbuo onwe gị ná mma.” (Ezikiel 16:11-13) Ihe ịchọ mma ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha bụ nke ihe atụ, gụnyere ọla aka, ihe olu, na ọla ntị. N’ụzọ dị mma, Akwụkwọ Nsọ jikwa ihe ịchọ mma ọlaedo tụnyere “onye na-aba mba nke maara ihe” nke onye na-aṅa ntị na-anabata okwu ya. (Ilu 25:1, 12) Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ ji ihe ịchọ mma tụnyere onye maara ihe otú a, ọ ghaghị ịbụ na Chineke adịghị emegide ụmụ nwanyị iji ihe ndị mara mma eme ka mma ha pụtakwuo.

Ụmụ Nwanyị Bụ́ Ndị Kraịst Na-achọ Onwe Ha Mma

Akụkụ ụfọdụ na Bible kwuru okwu kpọmkwem banyere ụmụ nwanyị ịchọ mma. Pọl onyeozi dere, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma.” Mgbe nwanyị ji ‘imeru ihe n’ókè na uche zuru okè’ mee nke a, ọ pụrụ igosi na ọ bụ nwanyị na-asọpụrụ Chineke. (1 Timoti 2:9, 10) Mgbe ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-achọru mma n’ókè, ọ pụrụ iwetara ozizi Chineke na ọgbakọ ya aha ọma.

Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na amaokwu ahụ kwuru na ịchọ mma ekwesịghị ịbụ “n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” Nke a ọ̀ pụtara na ụmụ nwanyị ekwesịtụghị ịkpa isi ha ma ọ bụ yiri ọla?

Ee e, ọ bụghị ihe ọ pụtara; Bible kwuru okwu dị mma banyere ịchọ mma. N’ihi ya, Pọl adịghị enye iwu ka a ghara ịchọ ụdị mma ụfọdụ, kama ọ nọ na-agba ụmụ nwanyị ume ka ha na-elekwasị anya karịsịa n’iji àgwà kwesịrị Ndị Kraịst na ezi ọrụ achọ onwe ha mma.

Ihe Dị Mkpa Bụ Ihe E Bu n’Obi Achọ Mma

Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị kwụsị ịdị na-ekpe ibe anyị ikpe, ma kama nke ahụ, meenụ ka nke a bụrụ mkpebi unu, na unu agaghị edebe ihe ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ihe na-akpata mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna.” (Ndị Rom 14:13) Olee otú nke a si gbasa ihe ndị anyị na-ahọrọ iji achọ mma?

Nke mbụ, Pọl gwara anyị ka anyị kwụsị “ịdị na-ekpe ibe anyị ikpe.” Anyị aghaghị ịkpachara anya ka anyị ghara ‘idebe ihe ịsụ ngọngọ n’ihu nwanna.’ Ihe e weere dị ka ịchọ mma kwesịrị ekwesị pụrụ ịdịgasị iche dabere n’obodo nakwa n’omenala obodo. Nke e weere dị ka nke kwesịrị ekwesị n’otu oge nakwa n’otu ebe pụrụ ịbụ nke na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nakwa n’oge ọzọ. Anyị ekwesịghị ịkpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụ mee ka ha sụọ ngọngọ site n’ịchọ ụdị mma ndị obodo anyị na-ewere dị ka nke ndị na-ebi ndụ ọjọọ. Ụmụ nwanyị ndị na-asọpụrụ Chineke kwesịrị ịjụ onwe ha, sị: ‘Olee otú ndị obodo si ele ejiji m anya? Ejiji m ọ̀ na-emenye ndị mụ na ha nọ n’ọgbakọ ihere ma ọ bụ na-eme ka ha ghara inwe ọnụ okwu?’ Ọ bụrụgodị na nwanyị bụ́ Onye Kraịst nweere onwe ya iyi uwe ma ọ bụ idozi onwe ya n’ụzọ ụfọdụ, o kwesịrị ịhapụ ya ma ọ bụrụ na nke ahụ ga-eme ka ndị ọzọ lewe ya anya ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 10:23, 24.

Ọzọkwa, mmadụ itinyekarị uche n’ọdịdị ahụ́ ya pụrụ iduba ya n’àgwà ọjọọ. N’ọtụtụ mba taa, ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị na-achụ nwoke na-eji ihe ịchọ mma arata ụmụ nwoke. Otú ọ dị, ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-ezere nnọọ iji ịchọ mma na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi otú ahụ. Ha na-agbalịsi ike inwe uche zuru okè na igosipụta omume dị ọcha n’ihe ndị ha na-eme, “ka e wee ghara ikwujọ okwu Chineke.”—Taịtọs 2:4, 5.

Ụmụ nwanyị na-asọpụrụ Chineke na-aghọta na n’agbanyeghị otú ha si chọọ onwe ha mma, na mma nke bụ́ mma n’ezie bụ “mmadụ zoro ezo nke obi,” nakwa na ọ bụ àgwà ka e ji egosipụta ya. (1 Pita 3:3, 4) Nwanyị nke na-eme nhọrọ dị mma n’ihe banyere ụdị uwe ọ na-eyi, otú o si etecha ntecha, na otú o si eyi ọla na-abụ onye ndị ọzọ na-akwanyere ùgwù, ọ na-ewetakwara Onye Okike ya nsọpụrụ.