Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịṅụ mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Nsogbu Na-emetụta Ọhaneze

Ịṅụ mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Nsogbu Na-emetụta Ọhaneze

Ịṅụ mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Nsogbu Na-emetụta Ọhaneze

MMANYA na-aba n’anya nwere uru na ọghọm. Bible na-ekwu na obi mmadụ pụrụ ịṅụrị ma ọ ṅụruo mmanya n’ókè. (Abụ Ọma 104:15) N’otu mgbe ahụ, Bible na-adọkwa aka ná ntị na ịṅụbiga ya ókè pụrụ imebi ihe n’ahụ́ mmadụ ma ọ bụ ọbụna kpatara ya ọnwụ, dị ka arụ agwọ ọjọọ tara mmadụ. (Ilu 23:31, 32) Ka anyị lebatụkwuo anya n’ọtụtụ ihe ịṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma na-efu.

“Otu ọkwọ ụgbọala nke ṅụrọrọ anya kụturu otu nne dị afọ 25 na nwa ya nwoke dị afọ abụọ na Saturday. . . . Nwanyị ahụ, bụ́ onye dị ime ọnwa isii, nwụrụ na Sunday. Nwa ya nwoke, bụ́ onye merụrụ ahụ́ n’isi, nọ n’ọnọdụ ọjọọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Monde kọrọ. N’ụzọ dị mwute, akụkọ ndị dị otú ahụ abụtụghị ihe ọhụrụ. Ikekwe, ọ dị onye ị ma nwere ihe ọghọm n’ihi ịṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma. Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ na-anwụ ma ọ bụ na-emerụ ahụ́ n’ihe ọghọm okporo ụzọ nke mmanya kpatara.

Ndị Na-anwụ na Ya

N’ụwa nile, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ịṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Na France, a gụpụ ọrịa cancer na ọrịa obi, ịṅụbiga mmanya ókè bụ ihe kasị egbu ndị mmadụ. Ọ na-egbu ihe dị ka iri puku mmadụ ise kwa afọ n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị ìhè. Dị ka akwụkwọ Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na France dere si kwuo ya, nke a bụ “ihe há ka mmadụ ole ga na-anwụ ma nnukwu ụgbọelu jet bujuru mmadụ ebuju na-akpọka atọ atọ kwa izu.”

Ndị na-eto eto kasị anwụ n’ihi mmanya na-aba n’anya. Dị ka otu akwụkwọ Òtù Ahụ́ Ike Ụwa dere, bụ́ nke e bipụtara n’afọ 2001 si kwuo, mmanya bụ ihe kasị egbu ụmụ nwoke ndị dị site n’afọ 15 ruo afọ 29 na Europe. A na-atụ anya na, ná mba ụfọdụ ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, n’oge na-adịghị anya, otu onye n’ime ụmụ okorobịa atọ ọ bụla ga-anwụ n’ihi ịṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma.

Ime Ihe Ike na Ndina n’Ike

Mmanya so eme ka a na-eme ihe ike. Mmanya pụrụ ịkpali mmadụ ime otú masịrị ya na ime ihe ọhaneze na-adịghị anabata. Ọ pụkwara imetụta otú mmadụ si ele omume mmadụ ibe ya anya, na-eme ka ọ dịrị ya mfe iji ike meghachi omume.

Mmanya sokarị akpata ihe ike a na-eme n’ebe obibi nakwa ndina a na-edina ndị mmadụ n’ike. N’otu nnyocha ndị France ji ndị mkpọrọ mee, a chọpụtara na ikekwe, mmanya so mee ka mmadụ abụọ n’ime mmadụ atọ ọ bụla dinara mmadụ n’ike nakwa ndị nke ji ike mesoo mmadụ omume rụrụ arụ, tinye aka n’àgwà ọjọọ ndị ahụ. Magazin bụ́ Polityka na-ekwu na nnyocha ndị e mere na-egosi na, na Poland, pasent 75 nke ụmụ nwanyị di ha bụ ndị aṅụrụma bụ ndị di ha na-eti ihe. Ndị mere otu nnyocha na-ekwu na “ịṅụ mmanya so mee ka ọchụ ndị nọ n’afọ ndụ nile na-egbu jiri ihe dị ka okpukpu abụọ mụbaa, nakwa na [ọbụna] ndị na-adịghị aṅụ mmanya, bụ́ ndị ha na ndị na-aṅụ mmanya bi n’otu ụlọ, nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a ga-egbu.”—Òtù Na-ahụ Maka Ọgwụ na Ahụ́ Ike n’America, Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Nkà Mmụta Sayensị.

Ihe Ọ Na-efu Ọhaneze

Mgbe a gbakọrọ ego a na-emefu n’ịgwọ ọrịa nakwa n’ịkwụ ụgwọ inshọransị, gbakọọkwa otú ihe ụlọ ọrụ na-arụpụta si na-ebelata n’ihi ihe ọghọm, ọrịa, ma ọ bụ nnwụchu ọnwụ, a na-ahụ na ego ọ na-efu ọhaneze karịrị akarị. A na-ekwu na ịṅụbiga mmanya ókè na-efu nde mmadụ anọ bi na Ireland, ọ dịkarịa ala, otu ijeri dollar kwa afọ. Otu akwụkwọ e hotara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Irish Times kwuru na ego a haruru ka “ego a ga-eji na-arụ otu ụlọ ọgwụ ọhụrụ, otu ámá egwuregwu, na ego a ga-eji na-azụrụ Minista ọ bụla otu ụgbọelu jet, kwa afọ.” N’afọ 1998, akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Daily News kọrọ na ịṅụ oké mmanya na-efu Japan “ihe karịrị puku ijeri yen isii [ijeri dollar 55] n’afọ.” Otu akụkọ e ziteere Ndị Omeiwu nke United States kwuru, sị: “Ego ịṅụbiga mmanya ókè furu United State n’afọ 1998 nanị bụ ihe dị ka ijeri dollar 184.6, ma ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ dollar 638 n’isi nwoke, nwanyị, na nwatakịrị ọ bụla nọ ná mba a n’afọ ahụ.” Gịnịkwanụ banyere obi mgbawa ezinụlọ mmanya tisara ma ọ bụ ndị nke o mere ka mmadụ nwụọ na ya na-enwe, tinyere ndị o mere ka ha ghara ịgụcha akwụkwọ ma ọ bụ ịmụcha ọrụ?

O sighị ike ịchọpụta ihe ịṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma na-efu ọhaneze. Ụzọ i si aṅụ mmanya ọ̀ na-etinye gị na ndị ọzọ n’ihe ize ndụ? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.