Ịpụ n’Agbụ nke Ịṅụbiga Mmanya Ókè
Ịpụ n’Agbụ nke Ịṅụbiga Mmanya Ókè
“Nna m bụ onye aṅụrụma, agbasokwara m omume ya. Mgbe m dị afọ 12, amalitela m ịṅụ mmanya. N’oge m lụrụ nwanyị, ana m aṅụbiga mmanya ókè kwa ụbọchị. Abịara m mewe ihe ike; ọtụtụ mgbe, ndị uwe ojii na-abịa agbatara ezinụlọ m ọsọ enyemaka. Ahụ́ m abụghịzikwa ahụ́ m. Mmanya kpataara m ọrịa afọ, bụ́ nke fọrọ obere ka ọ taa isi m. E mesịa, amalitere m ịrịa ọrịa cirrhosis, ọbara akọọkwa m n’ahụ́. Esonyeere m ìgwè ndị ji aka ha enyere onwe ha aka iji kwụsị ịṅụ mmanya, ma ọ dịghị nke nwere isi. Ọ bịara dị m ka è kere m agbụ m na-apụghị ịpụta apụta na ya.”—VÍCTOR, * ARGENTINA.
A NA-ANỤ akụkọ yiri nke a ugboro ugboro n’ọnụ ndị nọ n’agbụ nke ịṅụ mmanya. Dị ka ọ dị Víctor, ọ na-adị ha ka hà dara ọnyà nke ha na-apụghị ịpụta apụta na ya. À pụrụ idozi nsogbu ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata ma ọ bụ zere ha? Ọ bụrụ na a pụrụ, olee otú ọ bụ?
Ịghọta na Ọ Bụ Nsogbu
Nke mbụ, ọ dị oké mkpa ka onye na-aṅụ mmanya na ndị ya na ha dị ná mma ghọta mgbe nsogbu dị. Aṅụrụma abụghị ebe nsogbu a na-ebido. Tupu mmadụ aghọọ onye aṅụrụma, ọ na-ewe oge. Ikekwe onye ahụ na-aṅụrubu mmanya n’ókè ma ya anọgide na-aṅụ ya ruo mgbe o riri ya ahụ́. N’ụzọ na-eju anya, ihe ka ọtụtụ n’ihe ọghọm, ihe ike, na esemokwu ndị mmanya na-akpata anaghị esi n’aka ndị aṅụrụma. Rịba ama ihe a Òtù Ahụ́ Ike Ụwa kwuru: ‘Ụzọ kasị mma isi belata nsogbu nile mmanya na-akpata n’obodo bụ ilekwasị anya n’ịhụ na ndị na-aṅụ mmanya otú kwesịrịnụ, ọ bụghị ndị aṅụrụma, wetulatara aka n’otú ha si aṅụ mmanya.’ Ị̀ na-aṅụfe ókè ndị ọrụ ahụ́ ike kwuru ka a ghara ịṅụfe? Ị̀ na-aṅụ mmanya n’ọnọdụ chọrọ ka isi kpakọọ gị ọnụ nakwa ka ị dị gara gara? Mmanya ị na-aṅụ ọ̀ na-akpata nsogbu n’ime ezinụlọ gị ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ? Mmadụ ikweta na ụzọ o si aṅụ mmanya adịghị mma na ịkwụsịlata ya dị ka o kwesịrị bụ n’ezie “ụzọ kasị mma” isi zere ezigbo nsogbu n’ikpeazụ. Ozugbo mmadụ ghọrọ onye aṅụrụma, ọ ga-esiri ya nnọọ ike ịgbanwe.
Otu ihe ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na-emekarị ma a gwa ha banyere ya bụ ịgọ agụgọ. “Ana m aṅụ mmanya otú ndị ọzọ si aṅụ” ma ọ bụ “apụrụ m ịkwụsị ya mgbe ọ bụla m chọrọ,” ka ha na-ekwu. Konstantin, bụ́ onye nọ na Russia, kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ọ fọrọ obere ka m nwụọ n’ihi mmanya, ọ dịghị mgbe m weere onwe m dị ka onye aṅụrụma. N’ihi ya, ọ dịghị mgbe m mere ihe iji kwụsị ịṅụ ya.” Marek, bụ́ onye nọ na Poland na-echeta, sị: “Agbalịrị m ọtụtụ ugbo ịkwụsị ya, ma ewereghị m onwe m dị ka onye aṅụrụma. Eweere
m nsogbu ndị mmanya na-akpatara m dị ka ihe na-adịghị ihe ha bụ.”Olee otú a pụrụ isi nyere mmadụ aka ịghọta na o nwere nsogbu ma a bịa n’ịṅụ mmanya, ma mezie ihe iji dozie nsogbu ahụ? Nke mbụ, ọ ghaghị ikweta na ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè na-eme ka ihe na-esiri ya ike nakwa na ndụ ya ga-aka mma ma ọ kwụsị ịṅụ mmanya. Dị ka e kwuru n’akwụkwọ bụ́ La Revue du Praticien—Médecine Générale, o kwesịrị ịkwụsị inwe echiche bụ́, “ihe mere m ji aṅụ mmanya bụ n’ihi na nwunye m hapụrụ m, a chụọkwa m n’ọrụ,” ma nwewa echiche bụ́, “ihe mere nwunye m ji hapụ m, a chụọkwa m n’ọrụ bụ n’ihi na m na-aṅụ mmanya.”
Ọ bụrụ na ị chọrọ inyere onye aṅụrụma aka ịgbanwe echiche ya otú ahụ, i kwesịrị ịgbaso aro ndị a: Na-ege ya ntị nke ọma, na-eji obi ọcha ajụ ya ajụjụ ndị ga-eme ka ọ gwa gị obi ya n’ezoghị ọnụ, gosi ya ụdị ọmịiko ga-eme ka o nwee ike iwere ya na ị ghọtara ọnọdụ ọ nọ na ya, gbaa ya ume ọbụna maka obere ọganihu o nwere, zere ịkatọ ya ma ọ bụ ịkpaso ya àgwà ndị pụrụ ime ka ọ ghara ịgwa gị obi ya nakwa ka ọ ghara ịchọ enyemaka. Ọ pụkwara ịba uru ịgwa ya ka o nwee ihe ndepụta abụọ ọ ga-eji na-aza ajụjụ ndị bụ́, Gịnị ga-eme ma m nọgide na-aṅụ mmanya? na Gịnị ga-eme ma m kwụsị?
Ịchọ Enyemaka
Mgbe mmadụ malitere ịṅụbiga mmanya ókè, ọ bụghị onye furu ọhịa ma ọ bụ onye na-agaghị ekwe mmekwata. Ọbụna ụfọdụ na-agba mbọ jiri aka ha kwụsị ya. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịdị mkpa na ndị aṅụrụma ga-aga nweta enyemaka n’aka ndị ọkachamara iji nwee ike ịkwụsị ịṅụ mmanya. * Ọ bụrụ na ahụ́ enyewe ndị aṅụrụma nsogbu n’ihi nkwụsị ha kwụsịrị ịṅụ mmanya, ụfọdụ n’ime ha na-enweta onwe ha nanị site n’isi n’ụlọ ha aga anata ọgwụ. Ma, mgbe ahụ́ ahụ nyesiwere ha nsogbu ike, ọ pụrụ ịdị mkpa ka e nye ha àkwà n’ụlọ ọgwụ. Ozugbo nsogbu mbụ ahụ nkwụsị ha kwụsịrị ịṅụ mmanya kpataara ha kwụsịrị—n’agbata ụbọchị abụọ na ụbọchị ise—a pụrụ inye ha ọgwụ iji mee ka agụụ mmanya ha na-enwe belata, nakwa ka ha nọgide na-asọ mmanya.
Otú ọ dị, usoro ọgwụgwọ a nile adịghị eme ka e jide n’aka na ị ga-akwụsị ịṅụ mmanya. Ọgwụ nile a na-enye bụ nanị iji nye aka, ọ bụghị iji gwọọ ya. Alain, bụ́ onye nọ na France, nwetara ụdị ọgwụgwọ dị iche iche iji kwụsị ịṅụ mmanya. Ọ na-ekwu, sị: “Ozugbo m si ụlọ ọgwụ lọta, ana m amalite ịṅụ mmanya ọzọ n’ihi na ndị mụ na ha na-akpakọrịta bụ otu ndị ahụ mụ na ha na-aṅụkọ mmanya. Ihe bụ́ isiokwu bụ na enweghị m ezigbo ihe na-akpali m ịkwụsị ya.”
Iji Ihe Ọzọ Na-emejụ Agụụ Mmanya
Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọtụtụ ndị anaghị akwụsịli ịṅụ mmanya n’ihi na ọ na-adị ha ka ọ̀ dị ihe pụrụ ha n’ahụ́ ma ha aṅụghị ya, dị nnọọ ka ọ na-adị mmadụ ma ọ bụrụ na ezigbo enyi ya anọghịzi. Vasiliy, bụ́ onye nọ na Russia, kwuru, sị: “Mmanya na-adị m n’obi mgbe nile. Ụbọchị ọ bụla m na-aṅụghị mmanya, ụbọchị ahụ furu ọhịa.” Ma onye aṅụrụma aṅụbeghị mmanya, ihe ọ bụla ọzọ a na-ekwu na-ada ya ájá ájá ná ntị. “Ihe bụ́bu mkpa m ná ndụ bụ ịṅụ mmanya na ịkpata ego m ga-eji na-aṅụ mmanya,” ka Jerzy, bụ́ onye nọ na Poland, na-echeta. N’ihi ya, ọ dị onye aṅụrụma nke na-achọ ịkwụsị mmanya mkpa ịchọta ihe ọzọ ọ ga-ewere dị ka ihe ka mkpa ná ndụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịnọgide n’aṅụghị mmanya.
Otu akwụkwọ Òtù Ahụ́ Ike Ụwa bipụtara, bụ́ nke ha nyere ndị na-achọ ịkwụsị mmanya ndụmọdụ na ya, mere ka ọ pụta ìhè na ọ dị ha mkpa inwe ezigbo ihe ha ga na-eme iji zere ịlaghachi ná mmanya. Otu ihe atụ ha nyere nke ihe ha ga na-eme bụ ikere òkè n’ihe ime mmụọ.
Ịnọ na-arụsi ọrụ ime mmụọ ike pụrụ inyere mmadụ aka ịpụ n’agbụ mmanya kere ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Alain nọsịrị mkpọrọ nke ugboro atọ ya n’ihi ihe mmanya kpaliri ya ime, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova mụwa Bible. O kwuru, sị: “Ịmụ Bible mere ka m nwee nzube ná ndụ ma
nyere m aka ịkwụsị mmanya. Ihe kpaliri m abụghị nanị ka ọ bụrụ na m kwụsịrị mmanya kama ọ bụ ime ka obi dị Jehova ụtọ.”Ihe Ndị Ị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ị Na-alaghachi ná Mmanya Mgbe Ụfọdụ
Ndị na-enye ndụmọdụ n’ihe banyere ịṅụbiga mmanya ókè na-ekwu na nkwado na agbamume dị onye aṅụrụma na-achọ ịkwụsị mmanya mkpa. Ọtụtụ ndị enweghịzi ezinụlọ na ndị enyi n’ihi ọnọdụ ọjọọ ahụ ha nọ na ya. Owu nke na-ama ha n’ihi ya pụrụ ime ka ha daa mbà n’obi na ọbụna gbuo onwe ha. Akwụkwọ ahụ e kwuru banyere ya na mbụ tụụrụ ndị na-enyere ndị nwere nsogbu mmanya aka aro ndị na-esonụ: “Gbalịa ka ị ghara ịkatọ onye ị na-enyere aka, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe na-ewe gị iwe. Cheta na ọ naghị adị mfe mmadụ ịgbanwe àgwà maarala ya ahụ́. A ga-enwerịrị izu ihe ga-adị mma na izu ọ ga-adị njọ. Ọ dị mkpa ka ị na-agba ya ume, na-akwado ya ka o wee na-aṅụ ya obere obere ma ọ bụ kwụsị ịṅụ ya, ma na-atụrụ ya aro ndị bara uru.”
Hilario, bụ́ onye aṅụrụma ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 na-akọ, sị: “Ihe nyeere m aka bụ ịhụnanya ndị enyi m nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova gosiri m na otú ha si lekọta m. Alaghachiri m ná mmanya ọtụtụ ugboro, ma ha kwụ m n’azụ mgbe nile ịgba m ume na inye m ndụmọdụ ndị bịara n’oge ya site na Bible.”
Ọ bụrụ na ị na-adọga ịkwụsị mmanya, cheta na ị pụrụ ịlaghachi na ya mgbe ụfọdụ. I kwesịkwara iwere ya dị ka otu n’ime ihe ndị ị na-aghaghị ịgabiga iji kwụsị ya kpamkpam. Adala mbà! Chọpụta ihe mere i ji laghachi na ya. Dabere n’ihe ị chọpụtara, mara ihe ị ga-eme ka ọ ghara ime ọzọ. Chọpụta kpọmkwem ọnọdụ ndị na-eme ka mmanya gụwa gị. Ọ̀ bụ ike ọgwụgwụ, ịda mbà n’obi, owu ọmụma, arụmụka, nchegbu, ka ọ̀ bụ ihe omume ma ọ bụkwanụ ebe ndị ọzọ nọ na-aṅụ mmanya? Ị chọpụta ha, zere ha! Jerzy, bụ́ onye o were afọ abụọ iji kwụsị ịṅụ mmanya kpamkpam, kwuru sị: “Amụtara m ịghọta na ịmata mmetụta ndị pụrụ ime ka mmanya gụwa m. Ugbu a, ana m ezere ọnọdụ ndị na-eme ka ọ gụwa m. Anaghị m aga ebe ndị mmadụ na-aṅụ mmanya. Anaghị m eri ihe ọ bụla mmanya na-aba n’anya dị na ya, anaghịkwa m ete ude ma ọ bụ na-aṅụ ọgwụ ndị e ji mmanya na-aba n’anya mee. Anaghịkwa m ekiri ebe ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-akpọsa ya.” Ọtụtụ ndị achọpụtawo na ikpeku Chineke ekpere maka “ike karịrị ike nkịtị” bụ isi ihe mere ka ha nwee ike ịchịkwa agụụ mmanya ha na-enwe.—2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ịpụta na Ya!
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka na-adịgide adịgide, o kwere omume ịpụta n’agbụ nke ịbụ onye aṅụrụma. Ndị nile a kpọtụrụ aha n’isiokwu a apụtala na ya. Ahụ́ dị ha mma ugbu a karị, ha na-erikwa uru ya n’ezinụlọ ha nakwa n’ebe ha na-arụ ọrụ. Alain kwuru, sị: “Apụtala m n’agbụ mmanya kere m.” Konstantin na-ekwu, sị: “Ịmara Jehova chebere ezinụlọ m. Enwere m nzube ná ndụ ugbu a. Obi ụtọ m adịghị adabere ná mmanya.” Víctor na-ekwu, sị: “Ọ dị m ka à tọhapụrụ m n’agbụ. Enweela m ùgwù ma bụrụkwa ụdị mmadụ m kwesịrị ịbụ.”
Mmadụ pụrụ ịgbanwe n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ onye na-aṅụ mmanya otú ọ pụrụ imebi ya ihe n’ahụ́, onye na-aṅụ ya otú ọ na-emebi ya ihe n’ahụ́, ma ọ bụkwanụ bụrụ onye aṅụrụma. Ọ bụrụ na ụzọ i si aṅụ mmanya na-etinye gị n’ihe ize ndụ, egbula oge ime mgbanwe ndị dị mkpa. Ọ pụrụ ịbara gị uru, baakwara ndị hụrụ gị n’anya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 A gbanwewo ụfọdụ aha ndị dị n’isiokwu a.
^ par. 10 E nwere ọtụtụ ụlọ ọgwụ na ụlọ ọrụ ndị pụrụ inye aka n’ụdị ọnọdụ a. Ndịàmà Jehova adịghị akwado ụdị ọgwụgwọ ọ bụla. Mmadụ aghaghị ịkpachara anya ka o wee ghara itinye aka n’ihe ndị ga-emebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. E meekwa elu mee ala, ọ bụ onye ọ bụla ka ọ dịịrị ikpebiri onwe ya ụdị ọgwụgwọ ọ ga-achọ ka e nye ya.
[Foto dị na peeji nke 10]
Ihe mbụ bụ ikweta na i nwere nsogbu
[Foto dị na peeji nke 11]
Ọ dị ọtụtụ ndị mkpa inweta enyemaka n’aka ndị ọkachamara iji kwụsị ya
[Foto dị na peeji nke 12]
Ekpere pụrụ inye aka
[Foto dị na peeji nke 12]
Ị pụrụ inweta ike iji kwụsị ya!