Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Anyị Na-echeta . . . Galik”

“Anyị Na-echeta . . . Galik”

“Anyị Na-echeta . . . Galik”

Site n’aka onye edemede Teta! na Dominican Republic

Ọ BỤRỤ na ị nọ n’ebe dị anya n’obodo gị ma agụụ a na-agụ gị, olee nri ị ga-achọ iri? Ihe pụrụ ịgbata gị n’obi pụrụ ịbụ mkpụrụ osisi a ka ghọtara ọhụrụ na akwụkwọ nri ndị e nwere n’obodo unu, ma ọ bụkwanụ gị echeta ọmarịcha stuu mama gị na-adị eji anụ na azụ esi. Galik ọ̀ ga-agụwa gị?

Ihe dị ka afọ 3,500 gara aga, ka ụmụ Izrel ji ụkwụ na-agafe ọzara Saịnaị, ha kwuru, sị: “Anyị na-echeta azụ nke anyị na-eri n’Ijipt na-azụghị azụ; ya na cucumbers, na melons, na leeks, na [yabasị, na galik].” (Ọnụ Ọgụgụ 11:4, 5) Ee, galik gụrụ ha. Galik na-amasị ndị Juu nke ukwuu nke na dị ka omenala ha si dị, ha bịara kpọwa onwe ha ndị orii galik.

Olee otú ndị Izrel si ghọọ ndị na-eri galik? N’ime narị afọ abụọ na iri na ise ha nọrọ n’Ijipt, galik so n’ihe ndị ha riri. Ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-egosi na ọtụtụ afọ tupu Jekọb na ezinụlọ ya agaa Ijipt, ndị Ijipt na-akọ galik. Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus na-akọ na ndị ọchịchị Ijipt na-azụ yabasị, radish, na galik n’ụba iji na-azụ ndị ohu na-arụrụ ha pyramid. Ihe ndị a ha na-eri nke galik na-ehikarị nne na ya, yiri ka ọ̀ na-enye ndị ọrụ ahụ ume na ike. Mgbe ndị Ijipt liri Fero Tutankhamen, ha debere ọtụtụ ihe ndị bara uru n’ili ya, tinyere galik. N’ezie, ọ dịghị uru galik baara onye nwụrụ anwụ, ma ọ nọgidewo nnọọ na-abara ndị dị ndụ uru.

Ezigbo Ọgwụ

Ọ dịla anya ndị dọkịta malitere iji galik agwọ ndị ọrịa. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị dọkịta bụ́ Hippocrates na Dioscorides, bụ́ ndị Gris, na-agwa ndị mmadụ ka ha taa ya maka nsogbu nke nri agbarighị n’afọ, ọrịa ekpenta, ọrịa cancer, ọnyá, na ọrịa obi. Na narị afọ nke 19, Louis Pasteur, bụ́ onye France bụ́ ọkà n’ihe banyere ọgwụ, nyochara galik ma kọwaa na o nwere ihe ndị na-egbu nje. N’Africa, n’ime narị afọ nke 20, Albert Schweitzer bụ́ onye ozi ala ọzọ a ma ama, bụrụkwa dọkịta, ji galik gwọọ ọnyụnyụ ọbara nke nje a na-akpọ amoeba kpatara nakwa ọrịa ndị ọzọ. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe ọgwụ ọgbara ọhụrụ ndị dọkịta na-agwọ ndị agha Russia ji na-agwọ ọrịa gwụrụ, ha ji galik gwọọ ndị agha merụrụ ahụ́. N’ihi ya, a bịara mara galik dị ka ọgwụ ndị Russia ji agwọ ọnyá. Na nso nso a, ndị ọkà mmụta sayensị mere nnyocha iji chọpụta otú galik si abara akụkụ ahụ́ ndị na-ebusa ọbara uru.

N’ihi ya, a ma galik ama dị ka ihe na-enye ezigbo ihe n’ahụ́ ma na-agwọ ọrịa, ísì ya na ụtọ ya gbapụkwara nnọọ iche. Ebee ka a nọ malite ịkọ galik? Ụfọdụ ndị ọkà n’ihe banyere ihe ọkụkụ na-ekwu na ọ malitere n’ebe etiti Eshia, ya esizie ebe ahụ gbasaa ruo ebe nile n’ụwa. Ka anyị tụlee otu ebe mara mma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa bụ́ ebe a ma galik ama.

Ịkọ Galik na Constanza

Ndagwurugwu Constanza, bụ́ nke dị na Dominican Republic, nwere ihu igwe dị mma. N’ihi ugwu ndị gbara ya gburugburu, ndagwurugwu ahụ nwere ala na-eme nri nke mmiri na-ezo na ya nke ọma. Constanza bụ ebe dị nnọọ mma maka ịkọ galik.

Na September ma ọ bụ n’October, ndị ọrụ ugbo nọ na Constanza na-asụchasị ma na-akọ ala ha. Ha na-akọ ya nnukwu riiji nnukwu riiji. Oghere na-adị n’agbata otu riiji na ibe ya na-abụ ihe dị ka otu mita. Ha na-abịazi kọọ riiji atọ ma ọ bụ anọ ndị dịtụ obere n’elu nnukwu riiji nke ọ bụla. Ọ bụ na riiji ndị nke ahụ dịtụ obere ka ha na-akụ galik. Tupu a kụwa ya, a na-agbakapụtasị galik ndị ahụ agbakapụtasị ka ha nọrọ otu otu. Mgbe ha banyesịrị ha na mmiri ruo minit 30, ha akụnyezie ha na riiji ndị ahụ. N’oge oyi a na-enwe na Dominican Republic bụ́ nke na-adị mma n’ahụ́, galik ndị ahụ na-epulite ma too.

Na March ma ọ bụ n’April, a na-amalite iwe ha. Ndị ọrụ na-abụpụta galik ndị kara aka n’ala ma hapụ ha n’ubi ebe ahụ ruo ụbọchị ise ma ọ bụ isii. Mgbe ahụ, ha na-atụtụkọta ha, bepụ mkpọrọgwụ na akwụkwọ ha, ma tinye ndị nke bụ́ galik n’ihe dị ka nnukwu efere a na-akpọ cribas. Ha na-ahapụ cribas ndị ahụ galik juru na ha n’anwụ ruo otu ụbọchị ka galik ahụ a ka bụpụtara abụpụta kpọọ. E mesịa nke ahụ, ị mara na o ruola ka ọ pụọ ahịa.

Obere Galik, Oké Ísì

Mgbe ọ bụla ị bịara iri nri ma ọ bụ salad dị ụtọ, imi gị na-agwa gị ozugbo ma galik ọ̀ dị na ya. Ma, gịnị mere galik anaghị esi ísì mgbe a na-egwepịabeghị ya egwepịa? Galik nwere mmiri ọgwụ ndị dị ike bụ́ ndị na-agwakọtaghị ọnụ. Ọ bụ nanị mgbe e mepuru ya, berie, ma ọ bụ gwepịa ya ka mmiri ọgwụ ndị a na-agwakọta ọnụ. I berie galik eberi, mmiri ọgwụ a na-akpọ alliinase na nke a na-akpọ alliin na-agwakọta ọnụ. Ozugbo ha gwakọtara, ha na-aghọ mmiri ọgwụ a na-akpọ allicin, bụ́ ihe na-enye galik ísì na ụtọ ya.

Ị tabiri galik na-akpọbeghị akpọ, ọ na-adị ka à ga-asị na mmiri ọgwụ ahụ a na-akpọ allicin gbawara gị n’ọnụ. Ma nke a ọ̀ na-amasị gị ma ọ bụ na ọ dịghị amasị gị, ísì galik ga-ezu gị ahụ́. È nwere ihe ị pụrụ ime iji belata ísì galik n’ọnụ gị? Ị pụrụ ịta akwụkwọ parsley ka na-epupụta ọhụrụ ma ọ bụ akụ́kụ́ a na-akpọ clove, bụ́ nke a na-etinye ná nri iji mee ka o nwee ísì ụtọ, ka ísì galik dị gị n’ọnụ belata.

Ma buru n’obi na ísì galik dị gị n’ọnụ bụ n’akpa ume gị ka o si apụta. Ị taa galik, akụkụ ahụ́ ndị na-agbari nri n’ahụ́ gị na-ebuga ya n’ọbara gị. Ọbara gị na-ebufezi ya n’akpa ume gị. Mgbe i kupụrụ ume, ísì ọjọọ ya ahụ na-esi n’ọnụ gị apụta. N’ihi ya, ma ihe e ji asacha ọnụ ma parsley adịghị nke ga-eme ka ísì galik pụchaa gị n’ọnụ. Ò nwere ihe ị pụrụ ime iji mee ka ísì a pụchaa gị n’ọnụ? O nweghị. Ma, ọ bụrụ na ndị nile nọ gị gburugburu tara galik, ikekwe ọ dịghị onye ga-achọpụta na ị na-esi galik galik!

N’ọtụtụ mba, ọ rara ahụ́ ịhụ nri a na-etinyeghị galik na ya. Ọbụnadị n’ebe ndị a na-adịghị erikarị galik, ọtụtụ ndị na-eri galik na-ekwu na uru ya karịrị nnọọ ọghọm ya.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe a gbara galik a ka bụpụtara abụpụta n’anwụ

[Foto dị na peeji nke 29]

Ndagwurugwu Constanza

[Foto dị na peeji nke 29]

Gịnị mere o ji bụrụ nanị mgbe e gwepịara galik ka ọ na-esi ísì?