Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe A Na-anọ Akparịta Ụka n’Intanet—Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ya?

Ebe A Na-anọ Akparịta Ụka n’Intanet—Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ebe A Na-anọ Akparịta Ụka n’Intanet—Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ya?

“N’agbanyeghị na m bụ onye ihere, apụrụ m ịga n’Intanet ma soro ndị m na-agaraghị enwe ike ịkpanyere ụka ma mụ na ha nọrọ, na-akparịta ụka. Ha anatụghịdị ama onye m bụ.”— Peter. *

“Mgbe ị nọ n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, ọ na-adị gị ka ì nweere onwe gị ikwu ihe ọ bụla ị chọrọ ikwu.”— Abigail.

EBE A NA-ANỌ AKPARỊTA ỤKA N’INTANET bụ “ebe ndị” e mere n’Intanet maka ịnọ kparịta ụka site n’iderịta ozi. Ndị na-enwe ụdị mkparịta ụka a na-ederịta ma na-anatarịta ozi dị ka à ga-asị na ha na-ahụ onwe ha ihu na ihu. Ọtụtụ mmadụ, bụ́ ndị pụrụ ịgụ ozi ma saa ya site n’ide ya ede, pụrụ isonye ná mkparịta ụka a n’otu mgbe.

Ụfọdụ ebe ndị a na-anọ akparịta ụka n’Intanet na-aka amasị ndị na-eto eto. Ọtụtụ nde ndị ntorobịa si n’obodo dịgasị iche iche na-akparịta banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu ọ bụla kwa ụbọchị. Ugbu a, ụfọdụ ụlọ akwụkwọ na-eji ihe a na-abara ndị nọ n’ebe nile n’ụwa uru, eme ihe. Dị ka ihe atụ, ka onye nkụzi nọ na-ele ihe ha na-eme, ụmụ akwụkwọ nọ na United States pụrụ iso ụmụ akwụkwọ ibe ha nọ na Spen, England, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ kparịta banyere ihe ndị metụtara ọhaneze. Ụmụ akwụkwọ nwedịrị ike iso injinia maara ọrụ, ọkà n’ihe banyere ọgwụ, ma ọ bụ ọkachamara ọ bụla ọzọ kparịta banyere ihe e nyere ha ime n’ụlọ akwụkwọ.

Otú ọ dị, ọtụtụ abụghị ihe metụtara ụlọ akwụkwọ ka ha na-akparịta. Ọ bụrụ na ị na-eji Intanet eme ihe, olee nsogbu ndị ọ na-akpata bụ́ ndị i kwesịrị ịma banyere ha?

Ebe Ndị Na-arata Mmadụ Iso Ha Nwee Mmekọahụ Na-anọ Achọta Ndị Ha Ga-eji Mere Anụ Oriri

Abigail kwuru, sị: “Mụ na ụfọdụ ndị nọ na-akparịta ụka n’Intanet mgbe otu nwoke jụrụ m ma ọ̀ dị ndị dị afọ 14 m maara. Ọ chọrọ iso ha nwee mmekọahụ. O kwuru na ya dị njikere inye ha ego iji soro ha nwee mmekọahụ.”

Ahụmahụ a Abigail nwere abụghị ihe ọhụrụ. Isi n’Intanet arata ndị a ga-eso enwe mmekọahụ bụzi nsogbu zuru ebe nile, nke na ụfọdụ ndị ọchịchị ewepụtala ntụziaka banyere ụzọ a pụrụ isi chebe ndị ntorobịa. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta Maka Mpụ na United States bipụtara na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ndị ọ na-abụ, gị na ha malitehaala mkparịta ụka, ha ekwuwe banyere mmekọahụ. Ọ na-adọkwa aka ná ntị banyere ndị “na-eji nwayọọ nwayọọ arata ndị ha chọrọ irigbu site n’igosi ha mmasị, ịhụnanya, obiọma, na ọbụna inye ha onyinye.”

Ka akwụkwọ ahụ ụlọ ọrụ a bipụtara na-akọwa ụzọ ụfọdụ ndị nrigbu a si eme ihe kpọmkwem, o kwuru, sị: “Ha na-ege ụmụaka ntị ma na-emetere ha ebere ná nsogbu ha. Ha na-ama egwú ọhụrụ, ihe ntụrụndụ, na ihe ndị ọzọ ụmụaka nwere mmasị na ha. Ndị a na-agbalị iji nwayọọ nwayọọ eme ka ahụ́ ruwe ụmụaka ala iso ha na-akparịta site n’iji nke nta nke nta na-ewebata ihe ndị metụtara mmekọahụ ná mkparịta ụka ha.”

Ọ bụghị nanị ndị okenye na-eme omume rụrụ arụ ka e kwesịrị izere. Ọ dịkwa mkpa ka ị kpachara anya maka ndị ntorobịa na-amaghị ụkpụrụ omume ọma nke Bible ma ọ bụ ndị nke na-ejighị ya akpọrọ ihe. Tụlee ihe mere otu nwa okorobịa aha ya bụ Cody. Ya na ndị ntorobịa ndị ọzọ nọ na-akparịta ụka n’Intanet mgbe otu nwa agbọghọ gwara ya ka ya na ya kpaa nke ha iche n’otu ebe nanị ha abụọ pụrụ ịnọ kparịta. Mgbe ọ gara ebe ahụ, nwa agbọghọ ahụ jụrụ ya otu ajụjụ gosiri na ọ chọrọ mmekọahụ. Cody jidere nnọọ onwe ya ma kwụsị mkparịta ụka ahụ ozugbo.

Ebe ọ bụ na inwe mmasị ná mmekọahụ bụ ihe dị mmadụ n’ọbara, ọ pụrụ isiri gị nnọọ ike ime ihe a Cody mere. Peter, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekweta, sị: “Echere m na m pụrụ ijide onwe m ma sere aka ná mkparịta ụka ma a malitehaala ikwu banyere mmekọahụ na ya. Ma ugboro ugboro, ana m anọgide na ya ma na-eso ha akparịta banyere mmekọahụ. E mesịakwa, ya ewutewe m.” Ma, ị pụrụ ichewe, sị, ‘Ọ bụrụ na m ezochie onye m bụ mgbe m na-akparịta ụka n’Intanet, ọ̀ dị ihe ọjọọ dị n’ịkparịta banyere mmekọahụ?’

Ọ̀ Dị Ihe Ọjọọ Dị n’Ịnọ n’Intanet Akparịta Banyere Mmekọahụ́?

Bible ezoghị ọnụ n’okwu banyere mmekọahụ. (Ilu 5:18, 19) N’eziokwu, n’oge ntorobịa ka mmasị mmadụ na-enwe n’ihe banyere mmekọahụ na-aka njọ. N’ihi ya, i kwesịrị ikwu banyere mmekọahụ. Ọ dị gị mkpa inweta azịza nke ajụjụ ndị i nwere n’isiokwu a dị mkpa. * Ma, ụzọ i si emejụ agụụ ị na-enwe banyere ihe ndị metụtara mmekọahụ ga-eso ekpebi ma ị̀ ga-enwe obi ụtọ ugbu a nakwa n’ọdịnihu ma ọ bụ na ị gaghị enwe.

Ọ bụrụ na i kpebie ịkparịta banyere mmekọahụ n’Intanet, ọ bụrụgodị na ọ bụ gị na ndị sị na ha bụ ndị enyi gị na-akparịta ya, ihe ga-eme gị pụrụ iyi ihe mere otu nwa okorobịa a kọrọ banyere ya na Bible. N’ihi ịchọ ịmatacha ihe, ọ gawara n’akụkụ ụlọ onye akwụna. Na mbụ, ihe akwụna ahụ mere bụ nanị ịkpanyere ya ụka. Ma, ozugbo a kpaliri mmasị nwa okorobịa ahụ, mkparịta ụka ahụ ezughịziri ya. “Nwa okorobịa ahụ na-ejeso ya na mberede. Dị ka ehi si abịa n’ogbugbu ya, . . . dị ka nnụnụ si eme ngwa ịba n’igbudu.”—Ilu 7:22, 23.

N’otu aka ahụ, ịnọ n’Intanet akparịta banyere mmekọahụ pụrụ n’ụzọ dị mfe ime ka ị chọwakwuo ụzọ ị ga-esi emejụ agụụ ị na-enwe maka ya. Otu onye na-eto eto aha ya bụ Philip na-echeta, sị: “Mụ na otu onye nọ na-akparịta ụka n’Intanet mgbe otu foto onye gba ọtọ pụtara n’ihu kọmputa m. Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-akparịta ziteere m ya.” Ozugbo a kpaliri mmasị gị ikiri na iche banyere ihe ndị metụtara mmekọahụ, a pụrụ ịnwa gị ịchọ ịmatakwu banyere ya site n’ịga, dị ka ihe atụ, n’ebe e meere ndị okenye n’Intanet. * Ọtụtụ ndị dabara n’ọnyà nke ikiri foto ndị gba ọtọ na-esi ná nkiri gaa n’ime omume rụrụ arụ ma taa ahụhụ ndị na-aghaghị isi na ya pụta.—Ndị Galeshia 6:7, 8.

Ndị na-achọ ka gị na ha kparịta banyere mmekọahụ n’Intanet ebughị ọdịmma gị n’obi. Ha na-achọ ịrata gị iso ha kwurịtawa banyere mmekọahụ—nakwa o kwe ha mee, iso gị nwee mmekọahụ—iji mejụọ agụụ ha na-enwe. * Ka Eze Solomọn nọ na-agbalị ichebe nwa ya nwoke pụọ n’aka onye na-arata mmadụ iso ya nwee mmekọahụ, o dere, sị: “Mee ka ụzọ gị dị anya n’ebe ọ nọ, abịarukwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso: ka i wee ghara inye ndị ọzọ ebube gị, . . . ka afọ wee ghara iju ndị na-abụghị ndị nke gị n’ume gị.” (Ilu 5:8-10) A pụrụ ịkọwa ndụmọdụ a e nyere ebe a otú a: Abịarula nso ebe a na-akparịta banyere mmekọahụ n’Intanet, ka i wee ghara iwere ebube gị nye ndị na-abụghị nke gị, bụ́ ndị nanị ihe ha chọrọ bụ iji ike gị mee ka afọ ju ha.

“Ndị Ihu Abụọ”

Otú ọ dị, ị pụrụ ikwu na ị chọghị ịkparịta banyere mmekọahụ n’Intanet. Dị ka Peter na Abigail, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, ị pụrụ iwere Intanet dị ka ebe ị pụrụ ịnọ kwuo uche gị n’akọwaghị onye ị bụ, n’atụghịkwanụ ụjọ na a ga-emenye gị ihere. * N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere nsogbu ọzọ i kwesịrị ịmara banyere ya.

Ebe ọ bụ na mmadụ anaghị akọwa onye ọ bụ n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, nke a pụrụ ime ka ị ghọwa aghụghọ. Abigail na-ekwu, sị: “Ana m eso ndị mmadụ malite mkparịta ụka ma mewezie ka m̀ bụ onye ọzọ iji kwekọọ n’ihe anyị na-akparịta.” Dị ka Abigail mere, ị pụrụ ịbụ onye a nwara imewe ka ị̀ bụ onye ọzọ ka i wee kwesị ndị gị na ha na-akparịta ụka. Ka ị na-achọ imete ndị enyi ọhụrụ, ị pụrụ ikwuwe okwu ka ha ma ọ bụ bụrụzie onye ihe ndị na-amasị ha na-amasị. N’aka nke ọzọ, ị pụrụ iwere Intanet dị ka ebe ị pụrụ ịnọ kwuo echiche gị banyere ihe ndị i chere na ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị enyi gị agaghị anabata. Nke ọ bụla ọ bụ, a ga-enwerịrị ndị ị ga-aghọgbu. Site n’ime ka ị̀ bụ onye ị na-abụghị mgbe ị na-akparịta ụka n’Intanet, ị na-aghọgbu ndị ahụ gị na ha na-akparịta ụka. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị dịghị agwa ndị mụrụ gị na ndị enyi gị ihe bụ́ obi gị n’ezie, ị na-aghọgbu ha.

Ọ bụ ezie na ebe a na-akparịta ụka n’Intanet ka pụtara ọhụrụ, ọchịchọ ụmụ mmadụ na-enwe ịgha ụgha adịwalarị kemgbe ụwa. Bible na-egosi na onye malitere ụgha, bụ́ Setan Ekwensu, bụ onye malitere ụdị aghụghọ ndị na-aga n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet na-aghọ. O zochiri onye ọ bụ tupu ya aghaa ụgha mbụ ya. (Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9, 10) Ị pụrụ izere ịbụ onye ndị ụgha ghọgburu site n’ịgbaso ihe nlereanya Eze Devid. O dere, sị: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ adịghị abakọkwa.”—Abụ Ọma 26:4.

Dị ka anyị kwuru na mbụ, ụfọdụ ebe a na-anọ akparịta ụka n’Intanet pụrụ ịba nnọọ uru. Ka o sina dị, ndị ntorobịa, bụ́ ndị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, aghaghị ịkpachara anya n’otú ha si eji ụzọ ọgbara ọhụrụ a e si ezirịta ozi eme ihe. Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ịga n’Intanet, dị ka iji kparịta maka ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ, gwa ndị mụrụ gị ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto ka ha nọnyere gị mgbe ị na-eme ya. Isiokwu a ga-ebipụta n’ọdịnihu ga-akọwa ụzọ ihe abụọ ọzọ mere ị ga-eji kpachara anya banyere ịga n’ebe a na-anọ akparịta ụka n’Intanet. Ọ ga-akọwakwa otú ị pụrụ isi zere kpọmkwem nsogbu ndị pụrụ ịdapụta ọbụna ma ọ bụrụ na ị na-akpachapụ anya n’ụzọ i si eji ya eme ihe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 15 Akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nwere ndụmọdụ ndị bụ́ ịgba dabeere na Bible banyere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, imetọ onwe onye, na isiokwu ndị ọzọ yiri ha.

^ par. 17 N’ebe ụfọdụ a na-anọ akparịta ụka n’Intanet, bụ́ ndị e kwuru na ọ bụ maka ndị okenye, a dịghị ekwe ka ndị na-erubeghị afọ ndụ ụfọdụ gaa na ya. Nke a na-abụkarị n’ihi na ihe ndị a na-akparịta na ha nakwa foto ndị a na-egosi na ha na-abụ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Otú ọ dị, nnyocha ndị e mere na-egosi na ụmụaka ndị dị ọbụna afọ itoolu na-agha ụgha banyere afọ ndụ ha iji nwee ike ịbanye n’ebe ndị a e mere maka ndị okenye.

^ par. 18 Ebe ọ bụ na ị pụghị ịhụ onye gị na ya na-akparịta ụka n’Intanet, ọ pụrụ ime ka à ga-asị na ọ bụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị, n’agbanyeghị na ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị.

^ par. 20 Akwụkwọ bụ́ A Parent’s Guide to Internet Safety na-atụ aro ka ndị na-eji Intanet eme ihe ghara ịdị na-agwa onye ha na-amaghị nke ha zutere n’Intanet aha ha, adres ha, ma ọ bụ nọmba fon ha!

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Ịkparịta ụka n’Intanet pụrụ itinye mmadụ ná nsogbu