Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezigbo Ụlọ Dị Onye Ọ Bụla Mkpa

Ezigbo Ụlọ Dị Onye Ọ Bụla Mkpa

Ezigbo Ụlọ Dị Onye Ọ Bụla Mkpa

“Onye ọ bụla nwere ikike ịnọ n’obibi ndụ tosiri etosi maka ahụ ike na ọdịmma nke ya na nke ezi na ụlọ ya tinyere . . . ebe obibi.” —Nkwuwapụta Ụwa Nile Banyere Ikikere Madu Nwegasiri, Nkeji edemede 25.

OTU ìgwè ndị ọrụ ugbo na-akwagharị akwagharị ejirila nke nta nke nta kwagajuo n’otu ebe ha wereziiri dị ka obodo ha. Ọtụtụ narị ezinụlọ gara biri n’ebe a dịdewere obodo mepetụrụ anya n’ụlọ ndị ụgbọala na-adọkpụ, bụ́ ndị a na-akwụ obere ego na ha. Ihe ha na-akpọ ebe a bụ parqueaderos. N’ebe a, e nweghị ihe ndị dị mkpa, dị ka ụlọ mposi, ebe a na-ekute ezigbo mmiri, na ihe ndị e ji ekpofu ahịhịa, ndị nke e nwekwaranụ enwe emeela ochie. Otu onye nta akụkọ kọwara ebe a dị ka “ebe na-adịtụghị mma [nke na ndị ọrụ ugbo] pụrụ ịkwụli ụgwọ ya.”

Afọ atọ gara aga, mgbe ndị ọchịchị malitere imechi ụfọdụ n’ime ebe ndị ahụ, ụfọdụ ezinụlọ rere ụlọ ha ahụ ụgbọala na-adọkpụ ma kwaga n’ebe ndị mmadụ bijurula ebiju n’obodo mepetụrụ anya. Ndị ọzọ kwaara ngwongwo ha pụọ, na-achọ ebe ha ga na-alọghachi oge ọ bụla ha wesịrị ihe ubi—ebe ha pụrụ iwere dị ka obodo ha.

Obi gị ọ̀ gbatawala n’ebe ụfọdụ dị n’Ebe Etiti ma ọ bụ n’Ebe Ndịda America? Chetụkwuo echiche. Ebe a na-ekwu banyere ya ihe a dị n’obodo Mecca, nke dị n’ebe ndịda California, U.S.A. I jiri ụgbọala si n’ebe ọwụwa anyanwụ nke obodo Palm Springs ahụ mepere nnọọ emepe gawa ya, ọ gaghị ewe gị otu awa iji ruo ya. E kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị nwere ụlọ na United States na-amụba ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ, a bịakwa kee ego ezinụlọ nọ ná mba ahụ kpatara

n’afọ 2002 eke, ezinụlọ ọ bụla ga-eketa ihe dị ka dollar 42,000. N’agbanyeghị nke ahụ, e kwuwo na ihe karịrị nde ezinụlọ ise nọ n’America ka bi ná mkpakara ụlọ.

Ọnọdụ ahụ ka nnọọ njọ ná mba ndị na-emepe emepe. N’agbanyeghị ọtụtụ atụmatụ ndị ọchịchị, ọhaneze, na òtù okpukpe dị iche iche merela, nsogbu ụkọ ụlọ a e nwere n’ụwa nọgidere na-akawanye njọ.

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

E kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị bi ná mkpakara ụlọ n’ụwa nile karịrị otu ijeri. Ndị ọkà n’ihe banyere obodo ukwu na Brazil na-atụ ụjọ na, n’oge na-adịghị anya, favelas ma ọ bụ mkpakara ụlọ ndị nọgideworo na-ejupụta ná mba ahụ nakwa “ndị bi na ha ga-adị ọtụtụ karịa ụlọ na mmadụ ole e nwere n’obodo ndị ahụ a na-arụ ha.” Na Nigeria, e nwere obodo ukwu ndị ihe karịrị pasent 80 nke ndị bi na ha bi ná mkpakara ụlọ. Odeakwụkwọ Ukwu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Kofi Annan, kwuru n’afọ 2003, sị: “Ọ bụrụ na ọ dịghị ezigbo ihe e mere banyere ya, a na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ ndị bi ná mkpakara ụlọ gburugburu ụwa ga-amụba ruo ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ n’ime afọ 30 na-abịanụ.”

Otú ọ dị, ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ dị otú ahụ adịghịdị eme ka a mara ụdị ahụhụ ndị ogbenye nọ n’ụwa na-ata n’ihi ajọ ọnọdụ obibi ndụ. Dị ka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ihe karịrị ọkara nke ndị bi ná mba ndị na-emepe emepe enweghị ụlọ mposi na ihe ndị e ji ekpofu ahịhịa, otu ụzọ n’ụzọ atọ enweghị ezigbo mmiri, otu ụzọ n’ụzọ anọ enweghị ezigbo ụlọ, otu ụzọ n’ụzọ ise enweghị ezigbo ebe ha na-aga anara ọgwụ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi ná mba ndị mepere emepe agaghịdị ekwe ka anụ ndị ha ji mere enyi biri n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ.

Ihe Ruuru Mmadụ Nile

N’ebe nile, a na-ewere ezigbo ụlọ dị ka ihe dị onye ọ bụla mkpa. Akwụkwọ bụ́ Nkwuwapụta Ụwa Nile Banyere Ikikere Madu Nwegasiri, bụ́ nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu dere n’afọ 1948, kwuru na onye ọ bụla nwere ikike ịnọ n’obibi ndụ tosiri etosi, gụnyere ebe obibi dị mma. N’ezie, ezigbo ụlọ dị onye ọ bụla mkpa.

N’afọ 1996 a ka gara aga, ọtụtụ mba bịanyere aka n’akwụkwọ e mesịrị kpọọ Habitat Agenda, bụ́ nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara. Akwụkwọ a kwuru kpọmkwem ihe ndị e kwekọrịtara ime iji hụ na mmadụ nile nwere ezigbo ụlọ. Mgbe e mesịrị, na January 1, 2002, Òtù Mba Ndị Dị n’Otu bịara mee ka nkwekọrịta a ha mere sikwuo ike site n’ime ka ọ ghọzie ihe òtù a nakweere n’ozuzu ya.

Ọ bụ ihe siri ike nkweta na ka ụfọdụ n’ime mba ndị kasị baa ọgaranya ka maliteghachiri gbawa ume ka mba dị iche iche gaa n’ọnwa rụọ obodo nke ha nakwa ka a gbaa mbọ chọpụta otú mbara ala bụ́ Mars dị, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụ amaala ha ndị kasị daa ogbenye enweghịdị ike inweta ezigbo ụlọ ha ga-ebi na ya n’ụwa ebe a. Olee otú nsogbu ụkọ ụlọ a si na-emetụta gị? Ọ̀ dị ezigbo ihe mere a ga-eji enwe olileanya na otu ụbọchị, mmadụ nile ga-enwe ezigbo ụlọ nke ha?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Ka ọtụtụ mba na-achọ ịma ma ọ ga-ekwe mee ịrụ obodo nke ha n’ọnwa, ọtụtụ ụmụ amaala ha enweghịdị ezigbo ụlọ ha bi na ya n’ụwa ebe a

[Foto dị na peeji nke 13]

N’otu obodo ukwu, ezinụlọ 3,500 bi n’ụlọ ntu. Mmiri na-akọsi ha ike, ha enweghịkwa ụlọ mposi na ihe ndị e ji ekpofu ahịhịa

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Tim Dirven/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 14]

EBE UGWU AMERICA