Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ụlọ Ji Dị Ụkọ?

Gịnị Mere Ụlọ Ji Dị Ụkọ?

Gịnị Mere Ụlọ Ji Dị Ụkọ?

OTU nwanyị aha ya bụ Josephine, bụ́ onye dị afọ 36, na ụmụ ya nwoke atọ, bi ná mpụga otu obodo ukwu dị n’Africa. Nke tọcharanụ n’ime ụmụ ya ahụ dị afọ iri na otu, nke a tọchara adịrị afọ isii. Iji nweta ego, Josephine na-aga atụtụkọta ihe ndị dị ka rọba mmiri, bụ́ ndị ọ na-eresị otu ụlọ ọrụ dị nso n’ebe ha bi, bụ́ ndị na-eji ha emepụtaghachi rọba ndị ọhụrụ. Ihe ọ na-akpata n’ụbọchị n’ọrụ ike a anaghị eru dollar abụọ. N’obodo ukwu ahụ, ego a agaghị ezuru ya iji nye ụmụ ya nri ma ọ bụ iji kwụọrọ ha ụgwọ akwụkwọ.

Mgbe ọ rụsịrị ọrụ n’ụbọchị, ọ na-alaghachi ná mkpakara ụlọ o ji mere ebe obibi. E ji osisi a kpara akpa na ájá ọcha rụọ ahụ́ ụlọ a. Ihe e ji kpuchie elu ya bụ ígwè dị mbadamba tachara nchara na wọtapruf. A tụkwasịrị nkume, osisi, na ígwè ndị merela ochie n’elu ụlọ ahụ ka oké ifufe wee ghara iburu ihe ndị ahụ e ji kpuchie ya. Ihe o ji mere “ibo ụzọ” na “ibo windo” bụ akpa dọkara adọka, bụ́ nke na-enweghị ike icheta oyi n’oge ihu igwe jọrọ njọ—nke o jikwanụ egbochi ndị ọjọọ ịbata.

N’ezie, mkpakara ụlọ a abụghịdị nke ya. Josephine na ụmụ ya nọ n’ụjọ mgbe nile na a ga-achụpụ ha n’ụlọ a. E bidohaala atụmatụ e mere ime ka otu okporo ụzọ dịdewere ya sakwuo mbara, ọ pụtara na mkpakara ụlọ a ga-apụ. Ọ dị mwute ikwu na e nwere ọnọdụ yiri nke ahụ n’ọtụtụ mba n’ụwa nile.

Ụlọ Ndị Dị Ize Ndụ

Robin Shell, bụ́ onye ọnụ na-eru n’okwu n’otu òtù mba ụwa nke na-enyere ndị mmadụ aka inwe ụlọ na-ekwu, sị: “Mkpakara ụlọ na-eme ụmụaka bi na ha ihere, . . . ezinụlọ bi na ha na-arịakarị ọrịa, . . . ha adịghịkwa ama mgbe onye ọchịchị ma ọ bụ onye nwe ụlọ ga-abịa ịkụtu [ebe ha bi].”

Ibi n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-eme ka ndị nne na nna na-echegbu onwe ha mgbe nile banyere ahụ́ ike nke ụmụ ha na ihe ize ndụ ha nọ na ha. Kama ịgbali mbọ meziwanye ọnọdụ obibi ndụ ha, ha na-ejikarị ihe ka ukwuu n’oge na ike ha adọga igboro ụmụ ha mkpa ha ndị bụ́ isi, dị ka ihe oriri, izu ike, na ebe obibi.

Ọ bụrụ na i jighị anya gị hụ ihe a a na-akọ, ọ pụrụ ịdịrị gị mfe ikwu na ndị ogbenye pụrụ ime ka ọnọdụ ha dị mma ma ọ bụrụ na ha agbasikwuo mbọ ike. Ma nanị ịgwa ndị mmadụ ka ha kee ájị̀ n’ume abụghị ebe o biri. E nwere nnukwu ihe mere ụlọ ji dị ụkọ, bụ́ ndị karịrị mmadụ ọ bụla ike. Ndị nchọpụta na-ekwu na isi ihe ndị na-akpata ya bụ ụba mmadụ, mmepe obodo na-emepe n’ike n’ike, ọdachi ndị na-emere onwe ha, nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ogbenye ndị mmadụ nọgidere na-ada. Dị ka mkpịsị aka ise nke aka a kwụkwụchisiri ike, ihe ndị a anaghị ekwe ọtụtụ ndị ogbenye nọ n’ụwa ṅụọ mmiri tọgbọ iko.

Ụba Mmadụ

N’ozuzu, a na-ekwu na kwa afọ, ọ na-adị mkpa ịrụ ụlọ ọhụrụ nde mmadụ 68 ruo 80 a na-amụ n’ụwa kwa afọ ga na-ebi. Dị ka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ si kwuo, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa gafere ijeri mmadụ 6.1 n’afọ 2001. A na-atụkwa anya na ọ ga-eru ihe dị n’agbata ijeri mmadụ 7.9 na 10.9 ka ọ na-erule afọ 2050. Nke kadị awa ndị mmadụ isi bụ na e kwuru na, n’ime iri afọ abụọ na-abịanụ, ọ bụ ná mba ndị ka na-emepe emepe ka a ga-enwe pasent 98 nke mmụba ahụ. Mgbakọ na mwepụ ndị a e mere na-egosi na agwọ nọ n’akịrịka n’ihe banyere igbo mkpa ebe obibi. Ma, eziokwu ahụ bụ́ na ebe ndị mmadụ kasị akwaga na ha n’ọtụtụ mba bụ obodo ukwu ndị ahụ mmadụ bijurula ebiju na ha, na-eme ka nsogbu a na-aka njọ.

Mmepe Obodo Na-emepe n’Ike n’Ike

A na-elekarị obodo ndị a ma ama—dị ka New York, London, na Tokyo—anya n’ozuzu dị ka mba osisi na-amị ego na ha. N’ihi ya, ọtụtụ puku mmadụ na-esi n’ime obodo akwaga n’obodo ndị ahụ ha weere dị ka ‘ebe osisi na-amị ego’ kwa afọ, karịsịa iji gụọ akwụkwọ ma ọ bụ iji chọọ ọrụ.

Dị ka ihe atụ, akụ̀ n’ụba mba China na-eto n’ike n’ike. N’ihi ya, otu akụkọ na-ekwu na n’ime iri afọ ole na ole na-abịanụ, a ga-achọ ụlọ ọhụrụ dị ihe karịrị narị nde abụọ nanị n’obodo ukwu ndị a ma ama ná mba ahụ. Nke ahụ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ụlọ nile e nwere ugbu a na United States. Olee ndị ọrụ ihe owuwu ga-arụpụtali ụlọ ọnụ ọgụgụ ha haruru otú ahụ?

Dị ka Ụlọ Akụ̀ Ụwa si kwuo, “kwa afọ, ihe ruru nde ezinụlọ 12 ruo 15, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ụlọ ha ga-ebi ga-erukwa otú ahụ, na-akwaga n’obodo ukwu ndị e nwere ná mba ndị na-emepe emepe.” Ebe ọ bụ na ụlọ aka ndị ogbenye bi n’obodo ukwu ga-eru dị ole na ole, ihe ha na-eme bụ ịga ebe aka ha pụrụ iru, nke na-abụkarịkwa ebe ndị ọzọ na-adịghị ekwe ibi.

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha na Nsogbu Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị

Ịda ogbenye emeela ka ọtụtụ ndị gaa biri n’ebe idei mmiri, apịtị na-asọ asọ, na ala ọma jijiji na-emekarị. Dị ka ihe atụ, a na-ekwu na n’obodo Caracas, nke dị na Venezuela, ihe karịrị ọkara nde mmadụ bi “ná mkpakara ụlọ ndị a rụrụ ná mkpọda ugwu, bụ́ ndị a na-enwekarị mbuze na ha.” Ị pụkwara icheta ihe ọghọm ahụ mere n’afọ 1984, n’otu ụlọ ọrụ dị na Bhopal, India, bụ́ nke tara isi ọtụtụ puku mmadụ ma merụọ ọtụtụ puku ndị ọzọ ahụ́. N’ihi gịnị ka ọtụtụ mmadụ ji nwụọ ma ọ bụ merụọ ahụ́ n’ihe ọghọm ahụ? Isi ihe kpatara ya bụ na a rụgidewo mkpakara ụlọ gburugburu ya rụrute ya n’ebe dị nanị mita ise site n’ebe ụlọ ọrụ ahụ dị.

Nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, dị ka agha obodo, anọgidewokwa na-eme ka ụlọ na-akọ. Otu akwụkwọ otu òtù na-ahụ maka ihe ruuru mmadụ bipụtara n’afọ 2002, kwuru na n’agbata afọ 1984 na 1999, ọ pụrụ ịbụ na ihe ruru nde mmadụ 1.5, karịsịa ndị bi n’ime obodo n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Turkey, gbara ọsọ ndụ n’oge ahụ a lụrụ agha obodo. Ọtụtụ n’ime ha adịghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị ịga chọwa ụlọ n’ebe ọ bụla ha nwere ike. Ọtụtụ mgbe, ha na-aga soro ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị agbata obi ha biri ná mkpakara ụlọ, n’ụlọ a na-akwụ ụgwọ na ya, n’ụlọ a rụrụ n’ugbo, ma ọ bụ n’ebe a na-ewu ihe owuwu. A kọrọ na otu ìgwè nke ọtụtụ ezinụlọ mejupụtara gara biri n’ụlọ anụ. Ha bi mmadụ 13 ma ọ bụ karịa n’otu ọnụ ụlọ. Ha nile na-aga mposi n’otu ebe, ọ bụkwa nanị otu pọmpụ ka e nwere n’ụlọ ahụ ha bi. Otu n’ime ndị ahụ gbara ọsọ ndụ kwuru, sị: “Ike ibi ụdị ndụ a agwụla anyị. Anyị bi n’ụlọ a rụụrụ ụmụ anụmanụ.”

Agaghị Ihu Agaghị Azụ A Na-enwe n’Ọnọdụ Akụ̀ na Ụba

N’ikpeazụ, ụlọ na ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ndị ogbenye nwere nnọọ njikọ. Dị ka akwụkwọ ahụ si n’aka Ụlọ Akụ̀ Ụwa bụ́ nke e kwuburu banyere ya na mbụ si kwuo, n’afọ 1988 nanị, nde mmadụ 330, bụ́ ndị bi n’obodo ukwu ndị dị ná mba ndị na-emepe emepe, bụ ogbenye, a dịghịkwa atụ anya na a ga-enwe mgbanwe buru ibu n’afọ ndị na-abịanụ. Mgbe ndị mmadụ dagidere ogbenye ruo n’ókè nke enweghị ike inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ, dị ka ihe oriri na uwe, olee otú ha ga-esi rụtalie ma ọ bụ kwụlie ụgwọ ezigbo ụlọ?

Oké ọmụrụ nwa na ihe ịda oké ọnụ na-eme ka ọtụtụ ezinụlọ ghara inwe ike ibite ego n’ụlọ akụ̀, oké ego a na-akwụ n’ihe ndị dị ka ọkụ eletrik na-emekwa ka o siere ndị mmadụ ike imeziwanye ọnọdụ ha. Ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ọrụ, bụ́ nke mụbaworo ruo pasent 20 ná mba ụfọdụ, na-eme ka ọ ghara ikwecha omume inweta ihe ndị bụ́ isi ná ndụ.

Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ emeela ka ọtụtụ narị nde mmadụ n’akụkụ nile nke ụwa gaa biri ná mkpakara ụlọ. Ndị mmadụ na-ebi na bọs mebiri emebi, ná nnukwu igbe e ji atụbata ngwá ahịa, nakwa n’ụlọ ndị e ji katọn rụọ. Ha na-ebi n’okpuru steepụ, n’ụlọ e ji wọtapruf rụọ, nakwa n’ụlọ e ji osisi e jibu rụọ ihe, rụọ. Ụfọdụ agawo biri ọbụna n’ebe ụlọ ọrụ ụfọdụ nọbu emepụta ihe.

Gịnị Ka A Na-eme Banyere Ya?

Ọtụtụ ndị ọnọdụ a na-emetụ n’obi, òtù dị iche iche, na gọọmenti dị iche iche, anọworị na-agbasi mbọ ike iji kwụsị nsogbu a. Na Japan, e guzobewo ọtụtụ ụlọ ọrụ iji nye aka rụọ ụlọ aka ndị mmadụ ga-eru. N’atụmatụ owuwu ụlọ a malitere na South Africa n’afọ 1994, a rụọla ihe karịrị otu nde ụlọ ndị nwere ọnụ ụlọ anọ ọnụ ụlọ anọ. Na Kenya, ihe mgbaru ọsọ e setịpụrụ n’otu nnukwu atụmatụ owuwu ụlọ bụ ịhụ na a na-arụ ụlọ obibi ruru 150,000 n’obodo ukwu, na ihe ji okpukpu abụọ karịa nke ahụ n’ime obodo, kwa afọ. Mba ndị ọzọ, dị ka Madagascar, agbawala mbọ dị ukwuu iji chọpụta usoro ha ga-eji na-ewu ụlọ ka o wee ghara ifu ha oké ego.

E guzobewo òtù mba ụwa ndị dị ka òtù UN-HABITAT iji gosi njikere ụwa dị “igbochi na ibelata nsogbu ndị na-esi ná nkwaga ọtụtụ mmadụ na-akwaga n’obodo ukwu apụta.” Òtù ọrụ ebere na ụlọ ọrụ dị iche iche nke ndị nkịtị na-agbalịkwa inye aka. Otu òtù ọrụ ebere enyeworo ezinụlọ karịrị 150,000 nọ ná mba dị iche iche aka inweta ezigbo ụlọ. Òtù a na-ekwu na ya ga-enyere otu nde mmadụ aka inweta ezigbo ụlọ a rụrụ n’ụzọ dị mfe, bụ́ ndị aka ha ga-eru, tupu afọ 2005 eruo.

Ọtụtụ n’ime òtù ndị a emewo ka ndị bi ná mkpakara ụlọ mara ihe ndị dabara adaba ha ga-eme iji mee ka ọnọdụ ha dị mma ma ọ bụ ọbụna ka ọ ka mma. N’ezie, ọ bụrụ na ị chọrọ enyemaka, ị pụrụ irite uru ná ndokwa ndị a. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị bụ́ isi ị pụrụ ime iji nyere onwe gị aka.—Lee igbe bụ́ “Ụlọ Gị na Ahụ́ Ike Gị,” bụ́ nke dị na peeji nke 17.

N’agbanyeghị ma ì nwere ike ime ka ọnọdụ gị ka mma ma ọ bụ na i nweghị, e nwechaghị olileanya na mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọ bụla pụrụ ịkwụsị ihe ndị ahụ bụ́ isi na-akpata nsogbu ụkọ ụlọ a e nwere n’ụwa nile. Mba ụwa anọgidewo na-akụ afọ n’ala n’igbo mkpa dị ngwa e nwere maka ịkwalite ọnọdụ akụ̀ na ụba na ịgbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. Kwa afọ, a na-amụ ọtụtụ nde ụmụaka n’ezinụlọ ndị a nọgideworo na-ada ogbenye. È nwere ezi olileanya dịnụ na nsogbu a ga-akwụsị kpamkpam?

[Igbe dị na peeji nke 17]

ỤLỌ GỊ NA AHỤ́ IKE GỊ

Dị ka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa si kwuo, n’ozuzu, iji na-enwe ezi ahụ́ ike, ụlọ ọ bụla kwesịrị inwe ọ dịkarịa ala ihe ndị na-esonụ:

▪ Ezigbo elu ụlọ iji na-egbochi mmiri ịbata

▪ Ezigbo mgbidi na ibo iji gbochie oyi mgbe ihu ígwè na-adịghị mma nakwa iji gbochie anụmanụ ịdị na-abata

▪ Ụgbụ anwụnta a kụrụ n’ibo nakwa na windo iji gbochie ụmụ ahụhụ ịdị na-abata, karịsịa anwụnta

▪ Ihe na-eche ndo gburugburu ụlọ iji gbochie anwụ ịdị na-achakwasị n’ahụ́ ụlọ n’oge anwụ na-achasi ike

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ụdị Ụlọ E Ji Mara Ime Obodo Africa

Kemgbe ọtụtụ afọ, ụlọ ata jupụtara n’Africa. A na-arụ ha n’ụzọ dịgasị iche iche, ha nile anaghịkwa aha nhata. Ndị bi n’ụfọdụ obodo nta, dị ka Kikuyu na Luo, bụ́ ndị dị na Kenya, na-enwe mmasị ịrụ ụlọ ata dị okirikiri. Ndị ọzọ, dị ka ndị Masai nke Kenya na Tanzania, na-arụ nke nwere akụkụ anọ. N’ógbè ndị dị n’ụsọ oké osimiri nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, ụfọdụ ụlọ ndị a na-arụ na ha na-abụ ụlọ ata ndị ata ha na-eru n’ala ma na-eyi ụlọ aṅụ.

Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ihe ndị e ji arụ ụlọ ndị ahụ dị adị, e nwechaghị nsogbu ụkọ ụlọ. A pụrụ inweta ájá e ji arụ ha nanị site n’ịgwakọta ájá na mmiri. Ọtụtụ oké ọhịa ndị e nwere gburugburu ebe ndị ahụ na-eme ka ọ dị mfe inweta osisi, ahịhịa, na akwụkwọ achara ndị e ji arụ ha. N’ihi ya, n’agbanyeghị otú ezinụlọ baruru n’ọgaranya ma ọ bụ daruo n’ogbenye, ha ga-arụtali ụlọ nke ha.

Otú ọ dị, ụdị ụlọ ndị ahụ nwekwara ọghọm nke ha. Ebe ọ bụ na e ji ihe ndị nwere ike ịghọrọ ọkụ arụ ihe ka ọtụtụ n’elu ụlọ ndị a, ha pụrụ ịgba ọkụ ngwa ngwa. Ọzọkwa, onye ọjọọ pụrụ ịbanye na ha ngwa ngwa site n’ibepụ otu ebe n’ahụ́ ájá. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na n’ọtụtụ ebe taa n’Africa, e jirila nwayọọ nwayọọ na-eji ụlọ ndị ka anọte aka edochi ụlọ ata ndị a.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ African Traditional Architecture

Ụlọ ata: Site n’ikike ụlọ ọrụ Bomas of Kenya Ltd - A Cultural, Conference, and Entertainment Center

[Foto dị na peeji nke 15]

EUROPE

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Tim Dirven/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 16]

AFRICA

[Foto dị na peeji nke 16]

EBE NDỊDA AMERICA

[Foto dị na peeji nke 17]

EBE NDỊDA AMERICA

[Foto dị na peeji nke 17]

ESHIA

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]

© Teun Voeten/Panos Pictures; J.R. Ripper/BrazilPhotos

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 17]

JORGE UZON/AFP/Getty Images; © Frits Meyst/Panos Pictures