Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmetụta Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Na-enwe n’Ahụ́

Mmetụta Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Na-enwe n’Ahụ́

Mmetụta Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Na-enwe n’Ahụ́

“Santé!” “Salute!” “Za vashe zdorovye!” “Chuc suc khoe!” Ma na France, Ịtali, Russia, ma na Vietnam, ndị enyi na-agọrọ ibe ha ọfọ ndụ tupu ha amalite ịṅụkọ mmanya ọnụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile na-aṅụgide mmanya ṅụta ọnwụ ha.

ỊṄỤ mmanya na-aba n’anya n’ụzọ na-adịghị mma bụ nsogbu dị n’ụdị n’ụdị. Otu bụ ịṅụ ya otú ọ pụrụ imebi ihe n’ahụ́. Nke ọzọ bụ ịṅụ ya otú ọ ga-egbu egbu. Nke ikpeazụ bụ aṅụrụma. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa kọwara mmadụ ịṅụ mmanya otú ọ pụrụ imebi ya ihe n’ahụ́ dị ka ya “ịṅụ mmanya otú o nwere ike ịkpatara ya nsogbu” n’anụ ahụ́ nakwa n’ụbụrụ, ma ọ bụ mebie mmekọrịta ya na mmadụ ibe ya. Ọ na-agụnye ịṅụfe ókè ndị ọrụ ahụ́ ike kwuru ka a ghara ịṅụfe ma ọ bụ ókè iwu kwadoro. Onye na-aṅụ mmanya otú ọ ga-egbu ya egbu, bụ́kwa onye na-aṅụbiga mmanya ókè, bụ onye mmanya maliterela imebi ihe n’ahụ́ ma ọ bụ n’ụbụrụ, ma ọ ghọbeghị onye aṅụrụma. A kọwawo onye aṅụrụma dị ka onye “na-anaghị anọli n’aṅụghị mmanya.” Onye aṅụrụma na-achọsi mmanya ike, nọgide na-aṅụ ya n’agbanyeghị nsogbu dịgasị iche iche ọ na-akpatara ya. Ọ kwụsị ịṅụ ya, ya enyewe ya nsogbu n’ahụ́.

Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwanyị, afọ ole ọ sọrọ gị dịrị, ma ọ bụ obodo ọ sọkwara gị siri, ị pụrụ ịṅụ mmanya otú ọ pụrụ imebi gị ihe n’ahụ́. Gịnị kpọmkwem ka mmanya na-eme n’ahụ́ mmadụ? Olee ọrịa ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata? Oleekwa ókè e weere dị ka ókè dị mma ịṅụru ya?

Ọ Dị Ize Ndụ Nye Ụbụrụ

Ethanol, bụ́ otu ihe na-adị n’ọtụtụ mmanya na-aba n’anya, pụrụ imebi ụbụrụ. N’ezie, onye mmanya na-egbu yiri onye nsí dị n’ahụ́. Ọ bụrụ na ethanol buru ibu abaa mmadụ n’ahụ́, onye ahụ ga-atụbọ ma nwụọ. Dị ka ihe atụ, na Japan, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-anwụ kwa afọ n’ihi ịzọ̀ nzọ̀ mmanya, bụ́ nke ha na-akpọ ikkinomi. Ahụ́ mmadụ nwere ikike nke ime ka ethanol ghara inye nsogbu n’ahụ́, ma ọ dịghị eme ya n’otu ntabi anya. Ọ bụrụ na mmadụ aṅụọ mmanya ngwa ngwa otú ahụ́ ya na-agaghị ebuli, ethanol ga-ehi nne n’ahụ́ ya ma malite imetụta ụbụrụ ya n’ụzọ pụtara ìhè. Olee otú o si eme ya?

Ụzọ dị nnọọ mgbagwoju anya nke ozi si aga n’ụbụrụ na-emetụta okwu, ịhụ ụzọ, ịdị gara gara, echiche, na akparamàgwà. Ọ bụrụ na ethanol abata mmadụ n’ahụ́, ọ na-emeghasị ụzọ a ozi si aga, na-eme ka akụkụ ụfọdụ nke ụbụrụ ghara ịnatacha ozi ma ọ bụkwanụ ka ha natawakwuo ozi. N’ụzọ dị otú a, ọ na-agbanwe ozi ụbụrụ na-anata, na-egbochi ụbụrụ ịrụ ọrụ nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji abụ mmadụ ṅụbiga mmanya ókè, ya ana-adọ okwu adọ, na-ahụ ihe inyoghị inyoghị, na-adagharị adagharị, ọ gaghị na-ejiteli onwe ya, ya ana-emekwa ihe otú o si masị ya—bụ́cha ihe ndị e ji ama onye mmanya na-egbu.

Ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ruo ogologo oge, ụzọ ozi si aga n’ụbụrụ ya na-agbanwe iji nwee ike iguzogide mmetụta ọjọọ ethanol na-enwe n’ahụ́ ya na iji hụ na akwara ozi ndị dị n’ụbụrụ ya nọgidere na-arụ ọrụ otú kwesịrịnụ. Nke a na-eme ka mmanya ole na-adị egbubu ya egbu gharazie ịdị ya ka ọ dị ihe ọ ṅụrụ. Mmadụ na-aghọ onye aṅụrụma mgbe ụbụrụ ya nabatarala mmanya ruo n’ókè nke na ụbụrụ ahụ apụghịzi ịrụ ọrụ ma ọ hụghị mmanya. Ahụ́ onye ahụ ga na-achọ mmanya iji na-arụ ọrụ otú kwesịrịnụ. Mgbe a napụrụ ya mmanya, ụbụrụ ya na-agbaghasị, ọ na-amalitekwa inwe nsogbu ndị dị ka nchekasị, ahụ́ ịma jijiji, ma ọ bụ ọbụna ihe ọdịdọ.

E wezụga ime ka otú ụbụrụ si arụ ọrụ gbanwee, ịṅụbiga mmanya ókè pụrụ imebi na igbu mkpụrụ ndụ, na-egbu kpọmkwem ihe ndị mejupụtara ụbụrụ. Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ịgbaketụ ma ọ kwụsị ịṅụ mmanya, ụfọdụ n’ime ihe ndị a mebirinụ n’ahụ́ ya yiri ka ha agaghị ekwe ngwọta. Nke a na-emekwa ka nsogbu a metụta ikike icheta ihe na ihe ndị ọzọ e ji ụbụrụ eme. Ọ bụghị nanị mgbe a ṅụgidere mmanya ruo ogologo oge ka ọ na-emebi ihe n’ụbụrụ. Nnyocha ndị e mere yiri ka hà na-egosi na ọbụna ịṅụbiga mmanya ókè ruo obere oge pụrụ ịdị ize ndụ.

Ọrịa Imeju na Ọrịa Cancer

Imeju na-arụ ọrụ dị mkpa n’ịgbari nri, n’ịlụso ọrịa ọgụ, n’ịchịkwa otú ọbara si erugharị n’ahụ́, nakwa n’iwepụ ihe ndị na-egbu egbu, tinyere mmanya na-aba n’anya, n’ahụ́ mmadụ. Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ruo ogologo oge na-egbu imeju n’àgbà n’àgbà. N’àgbà nke mbụ, imeju gbariwe ethanol dị ná mmanya, ọ na-eme ka imeju ghara ịgbari abụba ngwa ngwa. Nke a na-abịa mee ka abụba hie nne n’imeju. Ọ bụ ya ka ndị Bekee na-akpọ steatohepatitis, ma ọ bụ imeju abụba juru na ya. Ka oge na-aga, imeju onye ahụ na-abịa zaa azaa, nke pụtara na onye ahụ arịawala ịba ọcha n’anya. Ọ bụ ezie na mmanya n’onwe ya pụrụ ịkpata ịba ọcha n’anya, o yikwara ka ọ̀ na-ebelata ike ahụ́ ji alụso nje ndị na-akpata ịba ọcha n’anya ụdị nke B na nke C, ọgụ. * Ọ bụrụ na e meghị ihe banyere ya, ọzịza ahụ imeju zara ga-eme ka mkpụrụ ndụ ndị dị na ya gbawaa ma nwụọ. Nke ka njọ bụ na o yiri ka mmanya ọ̀ na-akpali mkpụrụ ndụ dị n’ahụ́ ịnwụ mgbe oge ha na-erubeghị.

Àgbà nke ikpeazụ ya bụ ọrịa imeju ndị Bekee na-akpọ cirrhosis. Ka imeju onye ahụ nọgidere nnọọ na-aza, mkpụrụ ndụ imeju ya anọgidekwa na-anwụ, imeju ahụ na-emebi n’ụzọ na-agaghị ekwe mmekwata. E mesịa, ọ na-abịa kpọchie kama ịnọgide na-adị ka nzà. N’ikpeazụ, àpà ndị dị na ya egbochiwe ọbara irugharị nke ọma, na-eme ka imeju ahụ kwụsị ịrụ ọrụ nakwa ka onye ahụ nwụọ.

Mmanya na-akpatakwara imeju nsogbu ọzọ—ọ na-eme ka imeju ghara inwecha ike igbochi ihe ndị na-akpata ọrịa cancer ịkpa ike n’ahụ́. Tụkwasị n’ime ka mmadụ nwee ike ịrịa ọrịa cancer nke imeju, mmanya na-eme nnọọ ka mmadụ nwee ike ịrịa ọrịa cancer nke ọnụ na nke akpịrị. Ọzọkwa, mmanya na-eme ka ọ dịrị ihe ndị pụrụ ịkpata ọrịa cancer, bụ́ ndị na-adị na siga, mfe ịbanye n’akụkụ ọnụ nke na-emepụta ihe a na-akwapụta n’ụkwara, na-eme ka ndị na-ese siga kara nọrọ n’ihe ize ndụ. Ụmụ nwanyị ndị na-aṅụ mmanya kwa ụbọchị ka nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa cancer ara. Dị ka otu nnyocha e mere gosiri, ndị na-aṅụ ihe dị ka otu karama biya ma ọ bụ karịa kwa ụbọchị ji pasent 69 nọrọ n’ihe ize ndụ karịa ndị na-adịghị aṅụ mmanya.

Ụmụ Ọhụrụ Ndị O Mebiri Ihe n’Ahụ́

Ihe kasị dị mwute ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata bụ mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ ụmụ e bu n’afọ. “Mmanya na-aba n’anya na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ́ nwa e bu n’afọ karịa ihe ọ bụla ọzọ na-egbu egbu nke e ji eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune, na-ekwu. Nwanyị dị ime ṅụọ mmanya, nwa o bu n’afọ na-aṅụkwa ya. Mmanya na-enwekwa nnọọ mmetụta ọjọọ n’ahụ́ mmadụ n’oge a ọ ka nọ n’afọ. Mmanya na-emebi ụbụrụ na akwara ozi ya n’ụzọ na-agaghị ekwe mmekwata. Ọ na-eme ka akwara ozi ghara ịnọzi anọzi. Ọ na-egbu mkpụrụ ndụ. Ọ na-emekwa ka mkpụrụ ndụ ụfọdụ gaa nọrọ n’ebe ha na-ekwesịghị ịnọ.

Ihe nke a na-akpata, bụ́ mmanya ịba nwa e bu n’afọ n’ọbara, bụ ihe kasị eme ka ụmụaka na-eme iberibe ma a mụọ ha. Nsogbu ụmụaka mmanya bara n’ọbara n’oge e bu ha n’afọ na-enwe bụ na ụbụrụ ha adịghị aghọ nkọ, ha adịghị ama okwu ekwu, ha adịghị enwe ike ịmụta ihe, ha na-eme iberibe, ha adịghị eto ngwa ngwa, ha na-emekarị aghara, ọ na-esikwara ha ike ịnụ ihe na ịhụ ụzọ. Ihu ọtụtụ ụmụaka mmanya bara n’ọbara na-agba ọrụ.

Tụkwasị na nke ahụ, ụmụaka ndị nne ha ṅụrudịrị mmanya n’ókè n’oge a dị ime ha pụrụ inwe nkwarụ ụfọdụ, nke gụnyere ime iberibe na enweghị ike ịmụta ihe. Prọfesọ Ann Streissguth, nke òtù na-ahụ maka ụmụaka mmanya na ọgwụ ike bara n’ọbara n’oge e bu ha n’afọ na Mahadum nke Washington, na-ekwu, sị: “Ọ bụghị iwu na ị ga-abụ onye aṅụrụma tupu mmanya ị na-aṅụ emetụta nwa gị. Ị pụrụ itinye nwa i bu n’afọ ná nsogbu nanị site n’ịṅụ mmanya mgbe ị dị ime.” Akwụkwọ si n’aka ụlọ ọrụ French National Institute of Health and Medical Research, nke aha ya bụ Alcool—Effets sur la santé, kwuru, sị: “Nwanyị ịṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe ọ dị ime na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ́ nwa o bu n’afọ. Ọ dịbeghịkwa ókè e kwuru na ọ ga-abụ ọ ṅụruo ya, ya adị mma.” N’ihi ya, ọ kasị mma ka ụmụ nwanyị dị ime ma ọ bụ ndị nke na-achọ afọ ime ghara ịṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya. *

Ókè Dị Mma Ịṅụru Ya

Nsogbu ahụ́ ike ndị e depụtara n’elu abụtụghị nanị nsogbu mmanya na-akpata. N’afọ 2004, otu isiokwu e bipụtara na magazin bụ́ Nature kwuru na “ọbụna obere mmanya pụrụ nnọọ ime ka mmadụ nwee nsogbu, meekwa ka o nwee ike ịrịa ihe dị ka ọrịa iri isii.” N’ihi nke a, olee ókè ọ ga-abụ a ṅụruo ya, ya adị mma? Taa, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile na-aṅụ mmanya mgbe ụfọdụ. Ihe ahụ́ mmadụ chọrọ bụ ịṅụru ya n’ókè. Ma, oleekwanụ ókè ọ ga-abụ a ṅụọ, ya abụrụ na a ṅụruru ya n’ókè? Ihe ka ọtụtụ na-ewere onwe ha dị ka ndị na-aṅụru mmanya n’ókè, ikekwe na-ekwu na ebe ọ bụ na mmanya adịghị egbu ha egbu ma ọ bụ na ha abụghị ndị aṅụrụma, na ha enweghị nsogbu. Otú ọ dị, otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla nọ na Europe na-aṅụ ya ruo n’ókè a na-ewere na ọ pụrụ imebi ha ihe n’ahụ́.

Ọtụtụ akwụkwọ kọwara ókè ọ ga-abụ a ṅụruo mmanya, ya abụrụ na a ṅụruru ya n’ókè. Ha kwuru na nwoke ekwesịghị ịṅụfe ihe dị ka otu karama biya, ma ọ bụ mmanya ihe na-eme ka ọ na-aba n’anya dị gram 20 kwa ụbọchị, ebe ụmụ nwanyị na-ekwesịghị ịṅụfe ọkara karama biya, ma ọ bụ mmanya ihe na-eme ka ọ na-aba n’anya dị gram 10. Ndị ọrụ ahụ́ ike nọ na France nakwa na Britain na-atụ aro na “ókè ezi uche dị na ya” ịṅụru ya bụ ihe dị ka otu karama biya na ọkara maka ụmụ nwoke na otu karama biya maka ụmụ nwanyị. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịṅụbiga Mmanya Ókè na Aṅụrụma na United States tụkwara aro ka “ndị dị site afọ 65 gbagowe ghara ịṅụfe ihe dị ka ọkara karama biya kwa ụbọchị.” * Otú ọ dị, otú ahụ́ anyị si anabata mmanya abụghị otu. Ọbụna ókè ndị a a sị na ha dị mma pụrụ ịkpa ike n’ahụ́ ụfọdụ ndị. Dị ka ihe atụ, “mmanya pụrụ ịkpa ike n’ahụ́ ndị nwere nsogbu ụbụrụ na ndị na-enwe nchekasị, ọbụna ma ha ṅụruo ya n’ókè,” ka akwụkwọ bụ́ 10th Special Report to the U.S. Congress on Alcohol and Health, na-ekwu. Afọ ndụ, ọrịa mmadụ na-arịakarị, na otú mmadụ há, bụcha ihe ndị e kwesịrị iburu n’uche.—Lee igbe bụ́ “Ibelata Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya.”

Olee ihe enyemaka ndị na-aṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma nwere? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Dị ka otu nnyocha e mere na France gosiri, ohere ndị na-arịa ịba ọcha n’anya, ụdị nke C, bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya nwere ibute ọrịa imeju bụ́ cirrhosis ji okpukpu abụọ karịa nke ndị nke na-adịghị aṅụ oké mmanya nwere ibute ọrịa imeju a. A na-atụ aro ka ndị na-arịa ụdị ịba ọcha n’anya a na-aṅụ mmanya nwa ntịị ma ọ bụ ghara ịṅụ ya chaa chaa.

^ par. 17 Ụmụ nwanyị ndị na-enye nwa ara kwesịrị ịmara na mgbe ha ṅụsịrị mmanya, na mmanya ahụ na-abanye ná mmiri ara ha. N’ezie, mmanya na-abanye ná mmiri ara na-akakarị nke na-abanye n’ọbara, ebe ọ bụ na mmiri na-adị ná mmiri ara, bụ́ nke mmanya na-agwakọta n’ime ya, na-aka ehi nne karịa nke na-adị n’ọbara.

^ par. 20 Ebe ọ bụ na ihe e weere dị ka otu “karama mmanya” dịgasị iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ, ókè ihe na-aba n’anya ná mmanya a gbanyere na karama haruru ga-adabere n’ụdị karama e ji agba mmanya n’obodo nke ọ bụla. E kwesịkwara iburu nke a n’uche tupu a ṅụwa mmanya.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 5]

È KWESỊRỊ ỊṄỤ YA TUPU A KWỌWA ỤGBỌALA?

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ bụ kemgbe e mepụtara ụgbọala ka a malitere nyewe iwu ka a ghara ịkwọ ụgbọala ma a ṅụọ mmanya. Mba mbụ nyere iwu dị otú a bụ Denmark, n’afọ 1903.

Ị ṅụọ mmanya na-aba n’anya mgbe ị na-eribeghị nri, ọ na-akasị akpa ike n’ahụ́ gị n’ime ihe dị ka ọkara otu awa ị ṅụsịrị ya. N’ụzọ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere, ịṅụ kọfị, ịnara ịkụkụ ndụ, na imega ahụ́ agaghị eme ka anya doo gị. Ọ dịghị ihe ị pụrụ ime iji mee ka ọ kwụsị igbu gị ma ọ́ bụghị ịhapụ ya ruo mgbe ọ kpasịrị ike ya. Echefukwala na “mmanya bụ mmanya.” Nke bụ́ na ọ bụrụ na ị chọrọ ịṅụ ihe dị ka ọkara karama biya ma ọ bụ otu shọọtụ mmanya ọkụ, marakwa na ihe na-eme ka ha na-aba n’anya (akọhọl), bụ otu. *

Ọbụna ntakịrị mmanya na-aba n’anya pụrụ imetụta ụzọ i si akwọ ụgbọala. Mmanya na-emetụta anya gị. Ihe mgbaàmà okporo ụzọ pụrụ ipekwu gị mpe n’anya. Ị gaghịzi na-ahụ ihe ndị nọ n’akụkụ ụzọ otú ị gaara esi ahụ ha ma anya doo gị. Ọ ga na-esiziri gị ike ịhụ ihe ndị nọ ebe dị anya na ịmata ma ihe ọ̀ nọ gị nso ka ọ̀ nọ gị n’ebe dị anya. Ị gaghị na-aghọtacha ihe, ị gaghịzi adị gara gara otú ị na-adịbu, ị gaghịkwa enwecha ike ịkpakọ echiche gị ọnụ.

Ọ bụrụ na i nwee ihe ọghọm mgbe mmanya na-egbu gị, ahụ́ ị ga-emerụ nwere ike ịkarị nke ị gaara emerụ ma a sị na anya doro gị. Ọzọkwa, n’ihi mmetụta mmanya na-enwe n’obi nakwa n’ọbara, ndụ gị ga-aka anọ n’ihe ize ndụ ma a waa gị ahụ́ n’ọnọdụ mberede. “N’ihi ya, n’ụzọ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere, ndị kasị anwụ n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè bụ kpọmkwem ndị ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu,” ka otu akwụkwọ Ụlọ Ọrụ France nke Na-eme Nnyocha Banyere Ahụ́ Ike na Ọgwụ dere, na-ekwu. N’ihi ihe ize ndụ ndị a, akwụkwọ ahụ na-atụ aro ndị na-esonụ:

▪ Akwọla ụgbọala ma ị ṅụọ mmanya.

▪ Abanyela n’ụgbọala onye ṅụrụ mmanya na-akwọ.

▪ Ekwela ka ndị enyi gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị kwọọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 N’ikwu ya n’ozuzu, akọhọl na-apụ mmadụ n’ahụ́ n’ime otu awa bụ ihe dị ka gram asaa. Ihe e weere dị ka karama mmanya dịgasị iche site ná mba ruo ná mba. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-akọwa karama mmanya há otú kwesịrị dị ka nke akọhọl ya dị gram 10. Nke a bụ ihe na-eruchaghị ọkara karama biya, ihe dị ka karama wine ndị obere, ma ọ bụ otu shọọtụ mmanya ọkụ.

[Foto]

Ihe na-aba n’anya (akọhọl) nke dị ná mmanya nile e depụtara ebe a, fọrọ obere ka ha hara nhata

Ihe dị ka ọkara otu karama biya (33 cl nke akọhọl ya dị pasent 5)

Otu shọọtụ mmanya ọkụ (wiski, kaị kaị, vodka) (4 cl nke akọhọl ya dị pasent 40)

Iko mmanya wine (14 cl nke akọhọl ya dị pasent 12)

Obere iko mmanya brandy (7 cl nke akọhọl ya dị pasent 25)

[Igbe dị na peeji nke 6]

MMADỤ ỊBỤ ONYE AṄỤRỤMA—Ọ̀ NA-ESI N’ỌBARA?

Ka ndị ọkà mmụta sayensị na-achọ ụzọ ha ga-esi na-agwọ ndị aṅụrụma, ha agbasiwo mbọ ike ịchọpụta òkè mkpụrụ ndụ na-ekere n’ime ka mmadụ malite ma ghọọ onye aṅụrụma. Ọ dịla anya ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara ọtụtụ mkpụrụ ndụ ndị yiri ka hà na-emetụta otú ahụ́ mmadụ si anabata mmanya. Ma, aṅụrụma anaghị esi nanị n’ọbara. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ mmadụ nwere mkpụrụ ndụ ndị pụrụ ime ka ha bụrụ ndị aṅụrụma, ọ pụtaghị na ha apụghị izere ịbụ ndị aṅụrụma. Ọnọdụ ndị gbara mmadụ gburugburu na-eso eme ka ọ ghọọ onye aṅụrụma. Ihe ndị e kwuru na ha socha akpata ya bụ mmadụ enwetaghị ezigbo ọzụzụ n’aka ndị mụrụ ya, ya ịbụ onye ndị òtù ezinụlọ ma ọ bụ ndị ọgbọ ya na-aṅụbiga mmanya ókè, esemokwu, mmadụ ịbụ onye na-anaghị edinwu ihe, mmadụ ịda mbà n’obi, ya ịbụ onye na-eme ihe ike ike, ya ịbụ onye na-emekarị ihe ndị dị ize ndụ, mmadụ ịbụ onye isi ya na-ebuli mmanya, ma ọ bụ ya ịbụ onye ọgwụ ike ririla ahụ́. Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ pụrụ ime ka mmadụ bụrụ onye aṅụrụma.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

FRANCE:

Nnyocha e mere gosiri na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè ná mba a dị ihe dị ka nde mmadụ ise. Ihe nọ n’agbata nde abụọ na nde atọ n’ime ha bụ ndị aṅụrụma

NIGERIA:

Dị ka akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Lagos bụ́ Daily Champion si kwuo, “ihe karịrị nde mmadụ iri na ise na Nigeria bụ ndị aṅụrụma”—nke ahụ bụ ihe fọrọ obere ka o ruo pasent 12 nke ndị bi ná mba a

PORTUGAL:

E kewe ndị na-aṅụ mmanya na-aba n’anya n’ụwa nile eke, mba a kasị nwee ọnụ ọgụgụ ndị na-aṅụ ya. Akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Lisbon, bụ́ Público, na-akọ na pasent 10 nke ndị bi ná mba ahụ nwere “ajọ nkwarụ ndị mmanya kpatara”

UNITED STATES:

Dị ka akwụkwọ bụ́ 10th Special Report to the U.S. Congress on Alcohol and Health si kwuo, “ihe dị ka nde mmadụ iri na anọ n’America—pasent 7.4 nke ndị bi ná mba ahụ—ka ndị dọkịta kwuru na ha na-aṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ bụrụ ndị aṅụrụma”

[Igbe dị na peeji nke 8]

IBELATA IHE IZE NDỤ NDỊ DỊ NA YA

Ihe ndị na-esonụ bụ ókè e dere n’akwụkwọ na ọ ga-abụ a ṅụruo mmanya, ya adịtụ mma. Ndị dere ya bụ Ngalaba Na-ahụ Maka Ụbụrụ na Ihe Iri Mmadụ Ahụ́ nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa. Na ọ dịtụ mma apụtaghị na ọ dịcha mma. Otú ahụ́ mmadụ si anabata mmanya abụghị otu.

▪ Aṅụfela ihe e weere dị ka otu karama mmanya n’ụbọchị  *

▪ Ka e nwee, ọ dịkarịa ala, ụbọchị abụọ ị na-aṅụghị mmanya n’izu

N’ọnọdụ ndị na-esonụ, a pụrụ iwere mmadụ dị ka onye ṅụfere mmanya ókè ma ọ ṅụọ ọbụna otu karama mmanya ma ọ bụ abụọ:

▪ Mgbe ọ na-akwọ ụgbọala ma ọ bụ jiri ígwè ọrụ na-arụ ọrụ

▪ Mgbe ọ dị ime ma ọ bụ na-enye nwa ara

▪ Mgbe ọ na-anara ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ

▪ Ma ọ bụrụ na ọ na-arịa ụdị ọrịa ụfọdụ

▪ Ma ọ bụrụ na ọ pụghị ịchịkwa ókè ọ na-aṅụru mmanya

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 58 Ihe e weere dị ka otu karama mmanya bụ mmanya ihe na-eme ka ọ na-aba n’anya dị gram 10.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ Brief Intervention for Hazardous and Harmful Drinking

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

MMANYA NA-ABA N’ANYA—Ọ̀ NA-ADỊ MMA N’OBI?

Ndị ọkà mmụta sayensị kweere na otu ihe na-adị ná mmanya ndị na-acha ọbara ọbara (polyphenol) na-eme ka otu ihe na-akpọchi akwara ndị na-ebu ọbara ghara inwecha ike.

Ọzọkwa, e kwuwo na mmanya na-aba n’anya n’ozuzu ha so eme ka ihe a sị na ọ bụ ezigbo cholesterol na-amụba. Ọ na-ebelatakwa ihe ndị pụrụ ime ka ọbara na-akpụkọta.

Mgbe mmanya na-aba uru ọ bụla n’ahụ́ bụ mgbe a ṅụrụ ya obere obere ugboro ole na ole n’ime izu, ọ bụghị mgbe a ṅụrụ ihe nile e kwesịrị ịṅụ n’izu nanị n’otu mgbe. A na-ekwu na ịṅụfe ihe e weere dị ka karama mmanya abụọ n’ụbọchị so akpata ọbara mgbali elu. Ịṅụ oké mmanya na-emekwa ka mmadụ nwee ike ịrịa ọrịa strok, ọ pụkwara ime ka obi zaa, meekwa ka obi ghara ịdị na-akụ nke ọma. Ịṅụfe mmanya ókè na-akpata ọrịa ndị a na ndị ọzọ, na-eme ka ọghọm ya karịa uru ọ bụla ọ pụrụ ịbara obi. Imefe ihe dị mma ókè adịghị ihe ọzọ ọ bụ karịa imebiga ihe ókè.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 7]

OTÚ MMANYA NA-ABA N’ANYA PỤRỤ ISI MEBIE IHE N’AHỤ́ GỊ

Ụbụrụ

Ọ na-egbu mkpụrụ ndụ na ikike icheta ihe, na-akpata ịda mbà n’obi na ime ihe ike ike

Ọ na-akpata nsogbu ịhụ ụzọ, ikwu okwu, na ịkpakọ ihe ọnụ

Ọ na-akpata ọrịa cancer nke akpịrị, nke ọnụ, nke ara, nke imeju

Obi

Ọ na-eme ka uru ahụ́ ghara isi ike, ọ pụrụ ịkpata ọrịa obi

Imeju

Ọ na-eme ka abụba ju na ya, e mesịa ya azaa, n’ikpeazụ ya akpọọ nkụ (ọrịa cirrhosis)

Ihe ize ndụ ndị ọzọ

Ọ na-eme ka ahụ́ ghara inwecha ike ịlụso ọrịa ọgụ, na-eme ka anyịnya zaa azaa, na-akpata ọnyá afọ

Ụmụ nwanyị dị ime

Ọ pụrụ ime ka ha mụọ ụmụ nwere nkwarụ ma ọ bụ ụmụaka na-adịghị amụta ihe

[Foto dị na peeji nke 8]

“Mmanya na-aba n’anya na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ́ nwa e bu n’afọ karịa ihe ọ bụla ọzọ na-egbu egbu nke e ji eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma”