Onye Ọ Bụla Ga-enwe Ezigbo Ụlọ n’Ikpeazụ!
Onye Ọ Bụla Ga-enwe Ezigbo Ụlọ n’Ikpeazụ!
KPỌMKWEM ná mpụga obodo Nairobi, nke dị na Kenya, ka e nwere otu ọmarịcha ogige dị hekta 56, bụ́ ogige Gigiri nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu rụrụ, bụ́ nke isi ụlọ ọrụ òtù UN-HABITAT dị na ya. Ọ na-abụ a hụ ogige a, e cheta nkwekọrịta mba ụwa mere idozi nsogbu ụkọ ụlọ e nwere n’ụwa nile. Ọ bụrụ na i jiri ụkwụ gagharịa n’ebe a na-akpọ Gigiri Nature Trail, nke dị n’ime ogige ahụ, ị ga-ahụ ihe àmà katara ahụ́ nke na-egosi ihe a pụrụ ịrụzu ma a rụkọọ ọrụ ọnụ ma wepụta ego ga-ezunụ. N’ebe a, a gbanwere ebe bụ́bu mkpọmkpọ ebe
ka ọ ghọzie ọmarịcha ogige nke ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ nakwa ndị na-abịa eleta ebe ahụ na-anọ atụrụ ndụ.Otú ọ dị, nanị kilomita ole na ole site n’ebe ahụ ka e nwere ógbè na-etebeghị anya ọ malitere, nke ụlọ ndị dị na ya nakwa ndị a ka nọgidere na-arụ na ya bụ mkpakara ụlọ mkpakara ụlọ. Ọ bụ ọnọdụ dị mwute nke na-echetara anyị otú nsogbu ụkọ ụlọ e nwere ugbu a taruru n’akpụ. Mkpakara ụlọ ndị ahụ e ji ájá, osisi, na ígwè tachara nchara rụọ nọkọrọ ọnụ n’ebe ala ya dị mita 16 n’ogologo nakwa n’obosara. Mmiri apịtị dọkọchara n’ebe ndị mmadụ si agafe n’akụkụ ụlọ ndị ahụ. Ego ndị bi n’ógbè a na-emefu n’ịzụ mmiri fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu ise karịa nke nwa afọ United States ọ bụla na-emefu ná mmiri. Ihe ka ọtụtụ n’ime ihe dị ka iri puku mmadụ anọ bi ebe ahụ nọ n’agbata afọ iri abụọ na ụma na afọ iri atọ na ụma. Ha abụghị ndị umengwụ ma ọ bụ ndị na-achọghị ịrụ ọrụ. Ihe kpọtara ha ebe ahụ bụ na ha bịara ịchọ ọrụ n’obodo Nairobi nke dịdewere ebe ahụ.
N’ụzọ dịwaga nnọọ iche, ndị ọchịchị ụwa na-ezukọ ebe a n’ọmarịcha ogige dị ọcha ma dị ntụsara ahụ́ iji tinye ọnụ n’okwu metụtara ọdịnihu nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka ndị bi kpọmkwem n’ụlọ ndị ha na ogige ahụ gbara. Dị ka odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Kofi Annan, si kwuo, ihe mere ọnọdụ a ji dị nnọọ mwute bụ na “ụwa nwere akụ̀, amamihe, na ike” a chọrọ iji meziwanye nnọọ ọnọdụ obibi ndụ nke ndị bi ná mkpakara ụlọ. Gịnịzi ka ọ dị mkpa ka e mee? Maazị Annan na-ekwu, sị: “Olileanya m bụ ka . . . ndị nile nke a dị n’aka [nwee ike] ịkwụsị mmụọ achọghị m ịma na enweghị ọchịchọ ime ihe bụ́ nke meworo ka ihe ghara ịga aga.”
Ma, olee otú a ga-esi emezu olileanya a? Gịnị ka ọ ga-ewe iji mee ka ndị ọchịchị mba ụwa hapụgodị ọchịchọ nke ha ma rụkọọ ọrụ ọnụ iji mezuo ihe ga-abara onye ọ bụla uru? E nwere Onye nwere akụ̀, amamihe, na ike a chọrọ iji kwụsị nsogbu ụkọ ụlọ a a na-enwe ugbu a. Nke kadị mkpa bụ na o nwekwara ọmịiko na mmụọ ime ihe banyere ya n’isi nso. N’eziokwu, o kwuwo otú ọchịchị ya ga-esi kwụsị nsogbu ụkọ ụlọ e nwere n’ụwa nile kpamkpam.
Atụmatụ Ọhụrụ nke Ịhụ na Onye Ọ Bụla Nwere Ụlọ
Na Bible, Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-ekwu ihe ndị o zubere ime. Ọ na-ekwe nkwa, sị: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Aịsaịa 65:17) Nke ahụ ga-eme ka e nwee mgbanwe dị ịrịba ama. Ọchịchị “eluigwe” ọhụrụ ahụ ga-emezu ihe ọchịchị ụmụ mmadụ e nwere ugbu a na-apụghị imezu. Alaeze Chineke, ma ọ bụ ọchịchị ya, ga-ahụrịrị na ahụ́ ga-esi ndị ga-emejupụta ụwa ọhụrụ ahụ ike, ha ga-anọ ná nchebe, onwe ha ga-ejukwa ha afọ. Tupu a gwa Aịzaịa banyere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ, e buwo ụzọ gwa ya na a ga-achịkọta ndị ga-emejupụta ụwa ọhụrụ a “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” (Aịsaịa 2:1-4) Nke a pụtara na oge mgbanwe ndị a ga-ewere ọnọdụ eruwela.—Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5.
Ọ dị mma ịrịba ama na n’okwu ndị e dekọrọ n’amaokwu ndị ọzọ nke Aịsaịa isi 65, Chineke kwuru hoo haa na ya ga-eme ka onye ọ bụla ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ nwee ezigbo ụlọ nke ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-ekwu, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha . . . Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie.” (Aịsaịa 65:21, 22) Chegodị echiche inwe ezigbo ụlọ nke gị n’ikpeazụ nakwa ibi n’ebe dị ọcha na n’ọnọdụ na-adịghị ize ndụ n’ime paradaịs ahụ dị ebube! Ònyekwanụ ka ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-adịghị agụ agụụ? Ma, olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-emezu ihe o kwere ná nkwa?
Nkwa Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
Mgbe Chineke kere Adam na Iv, ọ hapụghị ha ka ha biri ná mkpọmkpọ ebe. Kama, o tinyere ha n’ogige Iden, bụ́ ọmarịcha ogige nwere ezigbo ikuku, nweekwa mmiri na ihe Jenesis 2:8-15) A gwara Adam ka o “jupụta ụwa,” ọ bụghị ka o jubiga ya ókè. (Jenesis 1:28) Site ná mmalite, Chineke zubere na onye ọ bụla nke ga-anọ n’ụwa ga-ebi n’ebe dị n’usoro, nke a na-emekọ ihe ọnụ, nke e nwekwara ezi ihe n’ụba.
oriri n’ụba. (Mgbe e mesịrị, n’ụbọchị Noa, ụwa bịara jupụta n’ihe ike na omume rụrụ arụ, n’ihi ya, “e bibiri ụwa n’ihu Chineke.” (Jenesis 6:11, 12) Chineke ò leghaara ọnọdụ ahụ anya? Mbanụ. O mere ihe ozugbo. O ji Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ mee ka ụwa dị ọcha n’ihi aha ya nakwa n’ihi onye ezi omume bụ́ Noa na ụmụ ya. Ya mere, mgbe Noa si n’ụgbọ ahụ pụta, a gwakwara ya ka ọ mụọ ọmụmụ, ‘baa ụba, jupụta ụwa.’—Jenesis 9:1.
Ka e mesịkwara, Chineke nyere ụmụ Izrel ala ahụ o kwere nna nna ha bụ́ Ebreham ná nkwa. A kọwara Ala Nkwa ahụ dị ka “ala dị mma nke sakwara mbara, . . . nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:8) N’ihi nnupụisi ha, ụmụ Izrel wagharịrị n’ọzara n’enweghị ezigbo ụlọ nke ha ruo iri afọ anọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke mesịrị nye ha ala ha ga-ebi na ya dị ka o kwere ná nkwa. Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Jehova wee mee ka ha zuru ike gburugburu . . . Ọ dịghị ihe ọ bụla dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ụlọ Izrel; ha nile mere.”—Joshua 21:43-45.
Onye Ọ Bụla Ga-enwe Ụlọ n’Ikpeazụ!
Ya mere, o doro anya na okwu ndị ahụ Jehova kwuru n’Aịsaịa isi 65 abụghị nkwa elu ọnụ. Dị ka Onye kere ihe nile, n’ezie o nwere ike nke ime ihe ọ bụla a chọrọ iji mee ka ụwa dị ọcha na iji mezuo nzube mbụ ya maka ụwa. (Aịsaịa 40:26, 28; 55:10, 11) Ọzọkwa, Bible na-emesị anyị obi ike na ọ chọrọ ime ya. (Abụ Ọma 72:12, 13) N’oge ochie, o mere ka ndị ezi omume nwee ezigbo ụlọ nke ha, ọ ga-emekwa ya ọzọ n’isi nso.
N’eziokwu, mgbe Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bịara n’ụwa, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere kpọmkwem ka ‘uche Chineke mee n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’ (Matiu 6:10) O kwuru na ụwa ga-abụ paradaịs. (Luk 23:43) Chee echiche ihe nke ahụ ga-abụ. A gaghị enwekwa mkpakara obodo, ndị na-arahụ n’okporo ámá, ma ọ bụ ndị a chụpụrụ n’ụlọ. Lee nnọọ oge obi ụtọ nke ahụ ga-abụ! N’Alaeze Chineke, onye ọ bụla ga-enwe ụlọ nke ya n’ikpeazụ!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
ỤLỌ N’IZREL OGE OCHIE
Dị ka ihe àmà na-egosi, ndị Izrel, dịkwa ka ndị Kenan bu ha ụzọ biri n’Ala Nkwa ahụ, na-ahọrọ ịrụ ụlọ nkume, ebe ọ bụ na ụlọ ndị a na-esi ike karịa ndị ọzọ, ha na-akakwa abụ ihe nchebe pụọ n’aka ndị ọjọọ. (Aịsaịa 9:10; Emọs 5:11) Otú ọ dị, n’ebe ndị na-abụghị ugwu, a na-eji blọk e ji ájá kpụọ arụ ahụ́ ụlọ. Ihe ka ọtụtụ n’elu ụlọ ndị a na-adị larịị, mgbe ụfọdụ, a na-arụnye ọnụ ụlọ n’elu ha. Ọtụtụ n’ime ha na-enwe ekwu ọkụ n’ogige ya, ụfọdụ n’ime ha na-enwekwa olulu mmiri.—2 Samuel 17:18.
N’Iwu ahụ e nyere ndị Izrel, e nwere ọtụtụ ihe e kwuru banyere ụlọ. N’ezie, e jighị ihe gbasara ndụ gwuo egwuregwu. A ga-arụ ihe mgbochi gburugburu elu ụlọ iji gbochie ihe ọghọm. Nke iri n’ime Iwu Iri ahụ dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị megide inwe anyaukwu n’ebe ụlọ mmadụ ibe ha dị. Onye ọ bụla rere ụlọ ya nwere ike ịgbara ya, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’ime oge ụfọdụ.—Ọpụpụ 20:17; Levitikọs 25:29-33; Deuterọnọmi 22:8.
Ụlọ ndị a na-arụ n’Izrel bụkwa ebe a na-anọ akụzi ihe ime mmụọ. A gwara ndị bụ́ nna kpọmkwem ka ha na-akụziri ụmụ ha iwu Chineke mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha, a gaghịkwa ewebata ihe arụsị ọ bụla na ya.—Deuterọnọmi 6:6, 7; 7:26.
[Foto]
N’Izrel oge ochie, a na-anọ n’ebe obibi eme ihe ime mmụọ, dị ka Ememe Ụlọ Ntu
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
ỤLỌ NDỊ MBỤ
Ọ dịghị ihe ọ bụla Bible kwuru banyere nwoke mbụ, bụ́ Adam, ibi n’ụlọ. Ma, Jenesis 4:17 na-ekwu na Ken “nọ na-ewu obodo, o wee kpọọ aha obodo ahụ, dị ka aha nwa ya nwoke si dị, Inọk.” O yiri ka obodo a ọ̀ bụ a kwaa akwụrụ ma e jiri ya tụnyere ụdị ndị a na-arụ n’oge a. Ihe ndekọ ahụ ekwughị ụdị ụlọ a rụrụ n’obodo ahụ. Ikekwe, ọ bụ Ken na ezinụlọ ya nanị bi n’obodo ahụ.
Ụlọikwuu bụ ụlọ a na-arụkarị n’oge ochie. A kpọrọ nwa Ken bụ́ Jebel “nna ndị bi n’ụlọikwuu, ndị nwekwara anụ ụlọ.” (Jenesis 4:20) O doro anya na ụlọikwuu ga-akawo adị mfe ọrụrụ nakwa n’ibugharị ya ebugharị.
Ka oge na-aga, ọtụtụ mba bịara rụwa obodo ndị ụlọ ndị dị na ha bụ́ ịgba. Dị ka ihe atụ, n’obodo Ua, bụ́ ebe nna ochie bụ́ Ebram (Ebreham) biiri, ọkpọ ụlọ ndị dị n’obodo ahụ na-egosi na ụfọdụ ndị biiri ya bi n’ezigbo ụlọ nwere ọnụ ụlọ 13 ma ọ bụ 14 e tere ahụ́ ha ete ma tee ágbá. Ụlọ ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụworị anya lewe n’oge ahụ.
[Foto dị na peeji nke 18, 19]
Chineke kwere nkwa inye ndị ezi omume ezigbo ụlọ