Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?

À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?

À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?

▪ Ọ ga-amasị ọtụtụ mmadụ inweta azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha nye ajụjụ ndị dị ka: À na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị? Mkpụrụ obi ọ̀ bụ ihe na-adịghị anwụ anwụ? Gịnị n’ezie ka Bible na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ n’ụwa?

Na nso nso a, otu nwanyị nọ na France detaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ akwụkwọ banyere ajụjụ ndị dị otú ahụ. O kwuru, sị: “Ana m enwekarị obi ụtọ ịgụ broshuọ unu, bụ́ ndị na-akọwa isiokwu dị iche iche nke ọma. Enyemaka na nkasi obi Bible na-enye na-eme ka ndụ na-adịkwu mfe obibi.”

Ọ kọwara, sị: “Ana m edetara unu akwụkwọ banyere broshuọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? bụ́ nke nyere m nkasi obi dị ukwuu. O mere ka ihe nile doo anya ma dị mfe nghọta.” Ọ gakwara n’ihu kwuo, sị: “Ọ ga-amasị m ka e zitere m broshuọ a 10 ma ọ bụ 15 nke m ga-enye ndị m maara ka ha wee nwee ike iritekwa uru n’ihe unu dere.”

Anyị nwere olileanya na gị onwe gị ga-eritekwa uru na broshuọ a bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? bụ́ nke dị ụtọ ọgụgụ ma dịrị peeji 32. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.