Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Dị Ndị Ntorobịa Mkpa ‘Iso Ndị Okenye Akpakọrịta’

Ọ Dị Ndị Ntorobịa Mkpa ‘Iso Ndị Okenye Akpakọrịta’

Ọ Dị Ndị Ntorobịa Mkpa ‘Iso Ndị Okenye Akpakọrịta’

NNE ma ọ bụ nna ọ bụla na-ahụ n’anya maara na ụmụaka ndị na-amụ ije na-eme nke ọma ma a na-egosi ha ịhụnanya. Ha makwaara na ha ga-eji nwayọọ nwayọọ gara bịa n’ahụ́ ndị mụrụ ha mgbe ha chọrọ ka e kuru ha. Otú ọ dị, mgbe ha ruru afọ iri na ụma, o yiri ka ha agaghịzi achọ ka ndị mụrụ ha na-elebara ha anya, ka Dr. Barbara Staggers, bụ́ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọrịa ụmụaka n’ụlọ ọgwụ Children’s Hospital and Research Center nke dị n’Oakland, California, U.S.A., kwuru. Ma oge a bụ oge ọ kasị dị mkpa ka ndị mụrụ ha lebara ha anya ná ndụ. Gịnị mere o ji dị otú a?

Dị ka Staggers si kwuo, mgbe ụmụaka dị afọ iri na ụma, ha na-amalite ime ihe n’enwechaghị onye na-elebara ha anya, nke a bụkwa otu n’ime ihe ize ndụ ndị kasịnụ ndị dị afọ iri na ụma na-eche ihu. N’akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star, o kwuru, sị: “Oge uto bụ oge mmadụ ji amata ụdị onye ọ bụ na otú ọ ga-esi na-eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị gbara ya gburugburu. Ị gụnyekwuo ọchịchọ ọ na-enwekarị ime ihe ndị dị ize ndụ na ikike ndị ọgbọ ya na-enwe n’ebe ọ nọ, ị hụ na ihe ize ndụ ọ na-eche ihu pụrụ ịkarị akarị.” Oge uto dị ná nkebi ná nkebi, ihe a na-ekwukwa okwu ya ebe a abụghị afọ ole nwata dị. Kama, dị ka Staggers si kwuo ya, “ihe a na-ekwu bụ otú [ndị dị afọ iri na ụma] si eme ihe, otú ha si aghọta ihe, na otú ha si anwale ihe.” Nkebi nke mbụ nke oge uto bụ oge nwata ji echekarị echiche banyere onwe ya, oge mgbanwe ndị ọ na-ahụ n’ahụ́ ya na-echu ya ụra, na oge ọ na-emekarị ihe n’echeghị echiche. Ihe e jikarị ama nkebi nke abụọ nke oge uto bụ na nwa ahụ ga na-anwalekarị ihe. Nkebi nke atọ bụ oge ọ ga na-achọkarị ikpebiri onwe ya ihe.

Ee, oge mmadụ dị afọ iri na ụma pụrụ ịbụrụ ma ya ma ndị mụrụ ya oge obi ụtọ, ọ pụkwara ịbụ oge ha na-adịghị aghọta ibe ha. Staggers, bụ́ onye lebawooro ndị nọ n’oge uto anya ruo ihe karịrị afọ 20, na-ekwu na ọ dị ihe ka ọtụtụ n’ime ha “mkpa iso ndị okenye hụrụ ha n’anya na-akpakọrịta.” Olee otú e si eme nke a?

Soronụ ụmụ unu na-enwe ezi nkwurịta okwu! Ndị nne na nna, na-emesighachinu ụmụ unu obi ike na unu hụrụ ha n’anya site n’ịdị na-ege ha ntị nke ọma. Gosinụ na unu na-eche banyere ụmụ unu ndị dị afọ iri na ụma site n’ịdị na-ajụ ha ajụjụ ndị ga na-eme ka ha na-atụle ihe nke ọma na ndị ga na-enyere ha aka ịma ihe pụrụ isi ná mkpebi ọ bụla na-adịghị mma ha pụrụ ime pụta. Na-ekwu okwu ọma banyere ezi ihe ndị na-esi ná mkpebi ndị dị mma apụta. Nyere ha aka ịma ihe bụ́ omume kwesịrị ekwesị.

Ọ bụrụ na ndị nne na nna agbasoo echiche ọtụtụ mmadụ nwere nke bụ́ na e kwesịrị ịhapụ ụmụaka ka ha jiri aka ha na-edozi nsogbu ha, ha na-eme ka ọ dịrị ụmụ ha mfe ịdaba n’aka ndị ọjọọ. (Ilu 13:20) N’aka nke ọzọ, nne na nna ndị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ga-eme ka ụmụ ha nọrọ n’ọnọdụ kasị mma ito nke ọma ma ghọọ ndị okenye maara ihe. N’ihi ya, ndị nne na nna aghaghị ịmụta ‘ịzụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị.’—Ilu 22:6.

E nyere ndụmọdụ bara uru banyere ụzọ dị mma e si azụlite ma na-eso ndị dị afọ iri na ụma enwe nkwurịta okwu n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. * O nwekwara ndụmọdụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.