Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdịiche E Nwere n’Etiti Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye

Ọdịiche E Nwere n’Etiti Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye

Ọdịiche E Nwere n’Etiti Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye

N’AGBANYEGHỊ okwu e ji kọwaa mba ndị a, ọnọdụ obibi ndụ nke mba ndị mepere nnọọ emepe magburu onwe ya, ebe ọnọdụ obibi ndụ nke mba ndị na-enwechaghị ụlọ ọrụ mmepụta ihe, bụ́ nke mere ha na-ejighị mepee emepe, na-adịchaghị mma. Ọ fọrọ obere ka ọ dị ka à ga-asị na ụdị mba abụọ ndị a anọghị n’otu ụwa.

N’ezie, ọbụna n’ime otu mba, a pụrụ inwe ndị ọgaranya na ndị ogbenye. Chegodị banyere mba ndị ahụ bara ọgaranya a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ. Ha nwere ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye. Dị ka ihe atụ, na United States, ihe dị ka pasent 30 nke ego nile mba a na-akpata na-aba n’akpa pasent 10 nke ezinụlọ ndị oké ozu. N’otu mgbe ahụ, ọ bụ nanị pasent 5 nke ego nile mba a na-akpata na-aba n’akpa pasent 20 nke ezinụlọ ndị na-abaghị ọgaranya. Ọnọdụ a ma ọ bụ nke yiri ya pụrụ ịdị ná mba i bi, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị na-eriju afọ n’ebe ahụ ebughị ibu. Ma, ọbụna gọọmenti nke mba ndị nwere ọtụtụ ndị na-eriju afọ enwebeghị ike ka ọ dị ugbu a ime ka a gharazie inwe ọdịiche n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye ma a bịa n’ihe banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba.

Ọ Dịghị nke Ọ Bụla Ihe Zuuru n’Ime Òtù Abụọ Ahụ

Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime òtù abụọ ahụ ga-asị na ihe nile zuuru ya. Chegodị banyere ahụhụ doro anya ndị bi ná mba ndị dara ogbenye na-ata. Ụlọ ọgwụ ha nwere adịtụghị ezuru ha. A bịa n’ihe banyere nlekọta ahụ́ ike, e jiri mba 9 ahụ kasị baa ọgaranya e depụtara n’igbe dị na peeji a tụnyere mba 18 ahụ kasị daa ogbenye, ọdịiche e nwere abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ná mba 9 ahụ, e kenyewe ndị dọkịta nọ na ha ụmụ amaala ha ga na-agwọ, otu dọkịta ga-eketa mmadụ 242 ruo 539, ebe ihe otu dọkịta ga-eketa ná mba 18 ndị ahụ kasị daa ogbenye ga-abụ mmadụ 3,707 ruo 49,118. Ya mere, n’ụzọ kwere nghọta, e kewe afọ ndụ nke ndị bi ná mba ndị ahụ kasị baa ọgaranya eke, ihe otu onye na-adịru bụ afọ 73 ma ọ bụ karịa, ebe otu onye na-anatụghị adịru afọ 50 n’ihe karịrị ọkara nke mba ndị ahụ kasị daa ogbenye.

Ná mba ndị dara ogbenye, ụmụaka adịchaghịkwa enwe ike ịgụ akwụkwọ, bụ́ nke na-emekarị ka ha bụrụ ndị ga-adarịrị ogbenye ma ha too. A na-achọpụta nke a site n’ọnụ ọgụgụ ndị maara ka e si agụ na ka e si ede. Ọ bụ ezie na onye ọ bụla nọ ná mba 7 n’ime mba 9 ahụ kasị baa ọgaranya gụrụ akwụkwọ (ndị gụrụ akwụkwọ n’abụọ ndị nke ọzọ dị pasent 96 na pasent 97), ọnụ ọgụgụ ndị gụrụ akwụkwọ ná mba 18 ahụ kasị daa ogbenye nọ n’agbata pasent 81 ruo pasent 16. Ná mba 10 n’ime ha, ụmụ amaala gụrụ akwụkwọ erughị ọkara.

Ma, ndị bi ná mba ndị bara ọgaranya nwekwara nsogbu ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ndị bi ná mba ndị dara ogbenye adịghị ahụ ihe ha riri, ọtụtụ ndị ọgaranya na-erigide ihe rigbuo onwe ha. Akwụkwọ bụ́ Food Fight na-ekwu, sị: “Iribiga nri na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ ókè anọchiela erighị nri ndị na-edozi ahụ́ dị ka nsogbu kasịnụ a na-enwe ná nri n’ụwa.” Magazin bụ́ The Atlantic Monthly kwukwara, sị: “Ihe dị ka nde itoolu nke ndị America ‘buru ajọ ibu’ ugbu a, nke pụtara na ha ji ihe dị ka kilogram 45 ma ọ bụ karịa, bufee ibu ókè, ọrịa ndị ibu ibu na-akpata na-emekwa ka ihe dị ka mmadụ 300,000 na-anwụchu ọnwụ kwa afọ ná mba a.” Otu akwụkwọ ahụ na-atụ aro na “n’oge na-adịghị anya, oké ibu pụrụ ịka ma agụụ ma ọrịa na-efe efe bụrụ nsogbu ahụ́ ike kasị akpa ọhaneze aka ọjọọ.” *

N’eziokwu, ọnọdụ obibi ndụ nke ụmụ amaala nke mba ndị bara ọgaranya dị nnọọ mma. Ma, n’otu mgbe ahụ, ha pụrụ iwere ihe onwunwe dị ka ihe dị mkpa karịa mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Nke a na-eme ka ha na-etinye uche nke ukwuu n’inwe ihe ma hapụ ịdị na-etinyecha uche n’ịnụ ụtọ ndụ. Ha na-abịazi adabere n’ọrụ mmadụ na-arụ, n’ego ole ọ na-akpata, ma ọ bụ n’ihe ndị o nwere ele ya anya kama ịdabere n’ihe ọmụma, n’amamihe, n’ihe ndị ọ ga-emeli, ma ọ bụ n’àgwà ọma ya.

Iji gosi nnọọ na ibi ndụ dị mfe bụ ihe na-eweta obi ụtọ, otu isiokwu gbara na magazin bụ́ Focus, bụ́ nke a na-ebipụta kwa izu na Germany, jụrụ, sị: “Gịnịkwanụ Banyere Inwe Ihe Dịtụ Obere?” Isiokwu ahụ kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ amaala nke mba ndị mepere emepe adịghịzi enweru obi ụtọ otú ha nweruru ya ọtụtụ iri afọ gara aga, n’agbanyeghị oké akụ̀ na ụba ha nwere ugbu a. . . . Onye ọ bụla nke tinyere obi ya n’ihe onwunwe yiri ka ọ̀ ga-emesị bụrụ onye obi na-adịghị ụtọ.”

Ime Ka Ihe Hara Nnọọ Nhata

Ee, ihe ndị mere eme na-agba akaebe na ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ọ bụ ezie na e nwere akụkụ ha ndị dị mma, nwekwara akụkụ ha ndị dị njọ. Ọ bụ ezie na ndụ ndị ogbenye na-ebi pụrụ ịbụ nke dị nnọọ mfe, nke ndị ọgaranya na-ebi pụrụ ịbụ nnọọ ndụ gbalụ gbalụ. Lee nnọọ uru ọ gaara aba ma a sị na òtù abụọ a amụta ihe n’aka ibe ha. Ma, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na a ga-enwe oge ndị ọgaranya na ndị ogbenye ga-aha nhata?

E lewe ya otú mmadụ si ele ihe anya, ị pụrụ iche na ụmụ mmadụ agaghị enwe ike iru ihe mgbaru ọsọ a, n’agbanyeghị na ọ bụ ihe mgbaru ọsọ dị mma. E lewekwa ihe ndị merela eme, echiche gị adịghị njọ. Ma, olileanya dị. Ọ pụrụ ịbụ na i legharawo ụzọ ezi uche kasị dịrị na ya isi dozie nsogbu a, anya. Olee ụzọ ọ bụ?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee Teta! nke November 8, 2004, peeji nke 3-12.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“N’oge na-adịghị anya, oké ibu pụrụ ịka ma agụụ ma ọrịa na-efe efe bụrụ nsogbu ahụ́ ike kasị akpa ọhaneze aka ọjọọ”—Magazin bụ́ The Atlantic Monthly

[Ihe e sere na peeji nke 5]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E dere aha mba ndị a Nkezi Afọ Ndụ Pasent Ndị Ma

n’usoro A B CH, dabere ná Ndị Nwoke (afọ) Ka E Si Agụ na

mkpụrụ okwu malitere aha ha Ka E Si Ede

Mba Itoolu Belgium 75.1 100

Ndị Kasị Canada 76.4 96.6

Baa Denmark 74.9 100

Ọgaranya Iceland 78.4 100

Japan 78.4 100

Luxembourg 74.9 100

Norway 76.5 100

Switzerland 77.7 100

United States 74.4 95.5

Mba Iri na Benin 50.4 37.5

Asatọ Ndị Burkina Faso 43 23

Kasị Daa Burundi 42.5 48.1

Ogbenye Chad 47 53.6

Congo, Rep. Of 49 80.7

Etiopia 47.3 38.7

Guinea-bissau 45.1 36.8

Madagascar 53.8 80.2

Malawi 37.6 60.3

Mali 44.7 40.3

Mozambique 38.9 43.8

Niger 42.3 15.7

Nigeria 50.9 64.1

Rwanda 45.3 67

Sierra Leone 40.3 36.3

Tanzania 43.3 75.2

Yemen 59.2 46.4

Zambia 35.3 78

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ 2005 Britannica Book of the Year.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

© Mark Henley/Panos Pictures