Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Bụ́ Ịgba A Ga-esi Mee Ka Ọdịiche ahụ Gharazie Ịdị

Ụzọ Bụ́ Ịgba A Ga-esi Mee Ka Ọdịiche ahụ Gharazie Ịdị

Ụzọ Bụ́ Ịgba A Ga-esi Mee Ka Ọdịiche ahụ Gharazie Ịdị

ỌTỤTỤ narị nde mmadụ n’ụwa nile na-adọga ịdị ndụ kwa ụbọchị n’agbanyeghị na ha bụ ogbenye ọnụ ntụ. O doro anya na ihe dị ụmụ mmadụ mkpa bụ ọchịchị ezi omume, nke a na-agaghị eme nrụrụ aka na ya, bụ́ nke nwere nnọọ ọchịchọ ịgbanwe ọnọdụ ọjọọ a. Ọchịchị a aghaghịkwa ịdị nnọọ ike ruo n’ókè nke imezu ezi nzube ya. Ànyị pụrụ n’ezie ịtụ anya na ụmụ mmadụ pụrụ iweta ọchịchị dị otú ahụ?

Ihe ndị merela eme na-egosi na okwu ịdọ aka ná ntị a Bible kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) Ị̀ chọpụtawo na mmadụ na-abụkarị onye e mechuru ihu ma ọ tụkwasị ọchịchị ụmụ mmadụ ma ọ bụ ndị ọchịchị obi? Ma, oleezi onye ọzọ anyị pụrụ ịtụkwasị obi?

N’eziokwu, ọtụtụ nde mmadụ ekpewo ekpere ka ọchịchị ezi omume gbanwee ọnọdụ ọjọọ a. Ikekwe, gị onwe gị ekpewokwa ekpere nlereanya anya ahụ Jizọs kụziri, nke bụ́: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa; gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ. Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.”—Matiu 6:9-13.

Ọ̀ bụ Alaeze a ka anyị chọrọ? Ọ̀ bụ ọchịchị ezi omume na nke a na-agaghị eme nrụrụ aka na ya? Ọ̀ dị ike ruo n’ókè nke imezu ezi nzube ya? Eenụ! Chineke nke guzobere ọchịchị a, “Nna anyị nke nọ n’eluigwe,” bụ “Chineke Nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta,” onye bụ́ ‘Onye ezi omume banyere ọrụ Ya nile.’ (Aịsaịa 45:21; Daniel 9:14) E kwuru banyere ya, sị: “Anya Gị abụọ dị ọcha karị ịhụ ihe ọjọọ,” n’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ dịghị mgbe ọchịchị ya ga-arụrụ aka. (Habakuk 1:13) Ebe ọ bụkwa na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma,” anyị maara na o nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla nọ n’ụwa nọ, na-akpaghị ókè ọ bụla.—Ọrụ 10:34, 35; Ndị Rom 2:11.

E Guzobewo Ya, Ọ Malitewokwa Ọrụ!

Ọ bụ ezie na Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe, ọ ga-ahazi nnọọ ihe n’ụwa ebe a iji mezuo nzube Chineke. Nke a na-agụnye iji ọchịchị zuru okè nke Chineke dochie ọchịchị ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Na Daniel 2:44, e kwere nkwa, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze [ọchịchị] ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”

N’okpuru ọchịchị nke Alaeze a, a ga-emezu nzube Chineke ma n’eluigwe ma n’ụwa n’ikpeazụ. Lee nnọọ ihe na-agba ume ọ bụ ịmara na nke a ga-abụ ọchịchị nke ga-enwe ike ikpochapụ ihe nile metụtara ahaghị nhata bụ́ nke soworo kpata nnukwu ọdịiche e nwere n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye tupu mgbe ahụ! A gaghịkwa enwe mmadụ ole na ole bara ọgaranya nakwa ọtụtụ mmadụ dara ogbenye.

Lee nnọọ ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịmara na Chineke eguzobewo ọchịchị eluigwe ya iji kwụsị nsogbu ndị a ruo mgbe ebighị ebi! Usoro ngụkọ oge Bible na ihe ndị na-eme n’ụwa na-arụtụ nnọọ aka n’afọ 1914 dị ka oge e guzobere ọchịchị Chineke n’eluigwe. * N’ụzọ dị otú a, ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ, ọ nọgidewo na-atọsi ntọala ike maka ụwa ọhụrụ nke ezi omume.

Ndị mataworo na e guzobewo Alaeze ahụ ma na-erube isi ná ntụziaka ya ugbu a anaghị akpa ókè. Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nkwusa ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba nile. A na-enye ụmụ amaala nke mba ndị a ohere ịmụta otú ha ga-esi nweta ndụ ebighị ebi, n’agbanyeghị ma hà bara ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye. (Jọn 17:3) Ndịàmà adịghị ekwe ka ọdịiche e nwere n’ihe banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba kpebie ọnọdụ ma ọ bụ ọkwá mmadụ ga-anọ na ya n’ọgbakọ ha. A naghị adabere n’ihe mmadụ nwere wee na-ele ya anya. Kama, a na-akwanyere ha ùgwù n’ihi ihe ha bụ. Ha na-aka elekwasị anya n’ihe ime mmụọ karịa n’ihe onwunwe.

Ọ̀ ga-amasị gị ịmata otú ị pụrụ isi dị ndụ n’ọchịchị ezi omume a? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị, malite taa mewe nchọpụta banyere ya. Mụta otú ị pụrụ isi na-atụ anya inwe ọṅụ nke ịdị ndụ mgbe akụ̀ na ụba na-agaghịzi ekewasị ụwa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Lee peeji nke 95-107 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ha Nile Bụ Ụmụnna, Ma Hà Bara Ọgaranya Ma Ọ Bụ Daa Ogbenye

▪ Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ na Europe na Eshia bịara nọrọ nnọọ n’ụkọ nri, uwe, na ebe obibi. Ndịàmà nọ ná mba ndị ọzọ zigaara ụmụnna ime mmụọ ha bi na Europe, Philippines, na Japan, uwe na ihe oriri n’ụba. Ndịàmà nọ na United States na Canada tụkọtakwara ihe enyemaka ndị e zigara Austria, Belgium, Czechoslovakia (nke bụ́ Czech Republic na Slovakia ugbu a), England, Finland, France, Germany, Gris, Holland, Hungary, Ịtali, Poland, na Romania.

[Foto]

United States

Switzerland

Germany

▪ Na nso nso a, n’oge okpomọkụ nke afọ 1994, otu ìgwè Ndịàmà si Europe, bụ́ ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo, gbataara ụmụnna ha ndị nọ n’Africa ọsọ enyemaka. E guzobere ogige ndị a haziri nke ọma na ebe ndị a na-anara ọgwụ maka ndị Rwanda gbara ọsọ ndụ. E bugara imirikiti uwe, blanket, ihe oriri, na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible iji nyere ihe karịrị puku mmadụ asaa gbara ọsọ ndụ aka—ihe fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova e nwere na Rwanda n’oge ahụ.

▪ Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, bụ́ n’afọ 1996, agha dara n’ebe ọwụwa anyanwụ nke mba Democratic Republic of Congo. E mebiri ihe ndị a kọrọ n’ubi, kwakọrọ nri ndị e chekwara echekwa, mechie ụzọ ndị e si ebubata ihe. Ihe ka ọtụtụ nọ na-eri nanị otu ugboro nri n’ụbọchị, nke a mekwara ka ha dị njọ n’anya n’ihi erighị ihe ndị na-edozi ahụ́, meekwa ka ha daa ọrịa. Ndịàmà Jehova nọ na Europe gbataara ha ọsọ enyemaka ozugbo. Otu ìgwè Ndịàmà, gụnyere ndị dọkịta, ji ụgbọelu butere ha ọgwụ na ego. Ka ọ na-erule June 1997, Ndịàmà nọ na Belgium, France, na Switzerland atụkọtalarị ọgwụ ịdị arọ ya dị kilogram 500, biskiiti na-enye nnọọ protein n’ahụ́ nke ịdị arọ ya dị tọn 10, ihe oriri ndị ọzọ nke ịdị arọ ha dị tọn 20, uwe ịdị arọ ya dị tọn 90, akpụkpọ ụkwụ dị 18,500, na otu puku blanket—nke ọnụ ego ha fọrọ nke nta ka o ruo otu nde dollar.

▪ E wezụga inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ anụ ahụ́, Ndịàmà Jehova na-enwe mmasị ọbụna karị n’inyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Nke a na-eme ka a ghọta ihe mere ha ji enwe ọchịchọ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ịnọ na ya enye ọzụzụ ime mmụọ. N’afọ 1997, a kọrọ, sị: “Site n’enyemaka nke ụmụnna ndị nọ mba ọzọ, [Watch Tower] Society enyewo aka rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ dị 413 ma rụzigharịa ndị ochie dị 727, nanị n’ime ọnwa anọ ná mba 75.” Ka ọ na-erule afọ 2003, a kọrọ, sị: “Otu n’ime mba ndị dị na Europe, bụ́ ndị na-erite uru ná ndokwa ahụ e mere inye aka rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ndị na-enwechaghị ego, bụ Romania, bụ́ ebe a rụcharala Ụlọ Nzukọ Alaeze dị 124 kemgbe July 2000. Site n’iji ụkpụrụ dị mma na-arụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nile, Ukraine rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị 61 n’afọ 2001, rụkwasịkwa 76 n’afọ 2002. Site n’ego ndị e nyere n’onyinye n’Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, a rụwo ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze na Bulgaria, Croatia, Masedonia, Moldova, Russia, Serbia nakwa na Montenegro.”

[Foto]

Romania

Croatia

Bulgaria

[Foto dị na peeji nke 7]

Otu onye ọrụ afọ ofufo nke na-elekọta ụmụaka abụọ na-enweghị nne na nna

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Liba Taylor/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndịàmà Jehova na-ezisa ozi olileanya

[Foto dị na peeji nke 10]

Alaeze Chineke ga-eme ka ịda ogbenye kwụsị