Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Nwetara Enyemaka Chineke

Anyị Nwetara Enyemaka Chineke

Anyị Nwetara Enyemaka Chineke

DỊ KA ESTHER GAITÁN SI KỌỌ

“Anyị atọrọwo mama gị. Anwakwala anwa ịkpọ ndị uwe ojii. Nanị ihe ị ga-eme bụ ichere ruo mgbe anyị ga-akpọ gị na fon n’isi ụtụtụ echi.”

NWANNE m nwanyị nke m tọrọ ka a gwara ihe a na fon banyere mama anyị, bụ́ Esther, n’otu ụbọchị Tuesday n’afọ gara aga. Mụ na di m, bụ́ Alfredo, ka si nnọọ nzukọ anyị gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova lọta mgbe anyị nụrụ banyere ozi a e ji fon zie. Mgbe anyị rutere n’ebe papa m na mama m bi na Mexico City, ndị ikwu anyị anọrọlarị anọ ebe ahụ. Nwanne m nwanyị na nwanne m nwoke ndị m tọrọ nọ na-ebegbu onwe ha n’ákwá, ụmụnne mama m ndị nke nwanyị nọkwa na-ebe ákwá.

Papa m na nwanne m nwoke nke tọrọ m anọghị ya, ha mere njem maka achụmnta ego. Mgbe anyị na ha kwurịtasịrị okwu na fon, anyị nile kwekọrịtara na ọ ga-akasị mma ime ka ndị uwe ojii mara. N’abalị ọjọọ ahụ dum, anyị kpekuru Chineke ekpere maka enyemaka. Anyị nwere nnọọ mmetụta na Chineke na-enye anyị “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Ndị Kọrint 4:7.

N’ụtụtụ echi ya, ọ bụ m zara fon mgbe ndị ahụ tọọrọ mama m kpọrọ. Ọ bụ ezie na ụjọ ji m, ị gaghị achọpụta ya site n’olu okwu m. Ha chọrọ ka ha na papa m kwuo, ma agwara m ha na o mere njem. Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọrọnụ kwuru na ha ga-echere ruo mgbe papa m lọtara tupu ha ekwuwe ihe a ga-emere ha ka ha wee hapụ mama m. Ọ gwara m na ọ bụrụ na anyị akwụghị ha nnukwu ego, na ha ga-egbu mama m.

N’echi ya, ọ bụkwa m zara fon mgbe otu n’ime ha kpọrọ. Ebe ọ bụ na olu okwu m egosighị na ụjọ ji m n’agbanyeghị egwu nile ọ na-eyi, ọ jụrụ m, sị: “Ì chere na anyị na-egwu egwuregwu?”

Azara m ya, sị: “Ama m na unu anaghị egwu egwuregwu. Unu tọọrọ mama m. Ma anyị bụ Ndịàmà Jehova, obi sikwara anyị nnọọ ike na Chineke anyị ga-enyere anyị aka. Bible na-emekwa ka anyị dị njikere ịtachi obi n’ụbọchị ọjọọ ndị a anyị na-ebi na ha.”

Ọ zara, sị: “Ọ bụ eziokwu, ihe a nile i kwuru doro m anya. Mama gị na-ekwukwa otu ihe ahụ. Ọ tụkwasịrị unu na Chineke ya obi nke ukwuu.” N’ihi ya, anyị matara na okwukwe mama anyị ka siri nnọọ ike, nke a mekwara ka obi sikwuo anyị ike.

Enyemaka Iji Tachie Obi

Ka ụbọchị nọ na-aga, Ndị Kraịst ibe anyị kpọrọ anyị na fon ma zitere anyị kaadị ozi ekele, zitekwara anyị ozi na kọmputa. Anyị nọgidere na-aga nzukọ ọgbakọ ma na-arụ ọrụ nkwusa. Anyị nwetakwara nkasi obi site n’ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible kwa ụbọchị. Nke kachasịnụ bụ na ekpere mere ka anyị nweta “udo nke Chineke.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Otu n’ime ndị uwe ojii ahụ anyị kọọrọ kwuru, sị: “N’ime afọ itoolu m nọworo n’ọrụ a, ahụla m ụdị obi mgbawa ọtụtụ ezinụlọ na-enwe, ma unu dị iche. Ahụ́ ruru unu nnọọ ala. Eji m n’aka na ọ bụ n’ihi Chineke unu na-efe.”

Anyị gosiri ya Teta! (Bekee) nke December 8, 1999, nke isiokwu ya bụ “Ịtọrọ Mmadụ—Ihe Mere O Ji Bụrụ Ihe Iyi Egwu Zuru Ụwa Ọnụ,” bụ́ nke anyị tụleghachirila. (Nke Igbo ya dị na Teta! nke January 8, 2000, peeji nke 13-22) Ọ gụrụ ya ma gwa anyị ka anyị wetakwuoro ya ya, ma kwuo na ọ ga-amasị ya ịmatakwu Ndịàmà Jehova nke ọma.

N’ikpeazụ, mgbe anyị na ndị ahụ tọọrọ mama m kparịtasịrị ruo ụbọchị 15, ha hapụrụ ya. Ọ dịghị ihe ha mere ya, ọ bụ ezie na ha tụrụ ya ị́gà n’ụkwụ ma kpọchigide ya n’otu obere ọnụ ụlọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ji nkwanye ùgwù mesoo ya ihe, ha nyekwara ya ọgwụ ọ na-aṅụ maka ọrịa shuga na ọbara mgbali elu.

Mama m kọwara otú o si nagide nnọọ ọnọdụ ahụ nke ọma. O kwetara, sị: Ná mmalite, oké ụjọ tụrụ m; ma amalitere m ikpeku Jehova ekpere, o mekwara ka m ghara inwe nkụda mmụọ. Ọ dịghị mgbe ọ dị m ka m nọ nanị m n’ọnụ ụlọ ahụ ha kpọchigidere m. Achọpụtara m otú Jehova si bụrụ nnọọ onye dị adị nye m; ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ m. Arịọrọ m ya ka o nyere m aka igosipụta mkpụrụ nke mmụọ ya—nke ka nke, ndidi.

“N’ihi enyemaka Chineke, ọ dịghị mgbe m bere ákwá ma ọ bụ mgbe ahụ́ mara m jijiji. Ihe m na-eme n’ụbọchị bụ icheta amaokwu Bible ndị m maara, nakwa ịbụ abụ Alaeze n’olu dara ụda. Mgbe ụfọdụ, ana m eji anya nke uche m ahụ ebe m nọ ná nzukọ ọgbakọ ma na-ekere òkè na ya. Ana m ejikwa anya nke uche m ahụ ebe m na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ma na-eduziri ha ọmụmụ Bible. Ihe ndị a dị m nnọọ n’obi nke na ọ bịara dị m ka oge ọ̀ gbara ọsọ.

“Enwedịịrị m ohere ịgbara ndị ahụ tọọrọ m àmà banyere ihe ndị m kweere. Mgbe ọ bụla otu n’ime ha buteere m nri, ana m ekwusara ya ozi ọma, n’agbanyeghị na ha kechiri m anya. Dị ka ihe atụ, n’otu mgbe, agwara m onye ahụ na Bible buru amụma banyere oge a siri ike anyị bi n’ime ya nakwa na m ma na ọ ghaghị ịbụ na ego dị ha mkpa nke ukwuu. Agwara m ya na Jehova Chineke kachasị ike ma ọ dịghị mgbe ọ na-eji ike ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Arịọziri m ya biko ka ha ghara iji ike ha meso m ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, kama ka ha meso m ihe n’ụzọ dị mma.

“O gere m ntị nke ọma ma gwa m na ụjọ atụla m, na ọ dịghị ihe ha ga-eme m. Ana m ekele Jehova maka ichebe m n’oge a ihe siiri m ike, ekpebisikwara m ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịnọgide na-ejere ya ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile [onye na-ekwusa ozi ọma oge nile] ruo ókè ike kwere m.”

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọnwụnwa a mere ka mama anyị bịarukwuo Jehova nso, dịkwa ka o mere anyị nile. Anyị apụghị ịkọwa ụdị ekele anyị nwere na mama anyị lọtara. Ọ bụụrụ anyị ihe nkasi obi ịmara na n’Alaeze Chineke, ihe ike dị otú a agaghị adịkwa ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, mụ na ezinụlọ anyị pụrụ ịgba akaebe banyere eziokwu nke okwu ọbụ abụ nke Bible, bụ́ onye bụrụ, sị: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.”—Abụ Ọma 34:19.