Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Ọ̀ Na-akpa Ókè Megide Ụmụ Nwanyị?

Bible Ọ̀ Na-akpa Ókè Megide Ụmụ Nwanyị?

Echiche nke Bible

Bible Ọ̀ Na-akpa Ókè Megide Ụmụ Nwanyị?

TERTULLIAN, bụ́ ọkà mmụta okpukpe nke narị afọ mbụ, kọwara ụmụ nwanyị dị ka “ọnụ ụzọ Ekwensu.” Ndị ọzọ ejirila Bible gosi na ụmụ nwanyị adịrughị mkpa ka ụmụ nwoke. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ na-ewere ya na Bible na-akpa ókè megide ụmụ nwanyị.

Elizabeth Cady Stanton, bụ́ ọnụ na-ekwuchitere ụmụ nwanyị n’ihe ndị ruuru ha na narị afọ nke 19 na United States, kwuru na “Bible na Chọọchị abụrụwo ihe kasị egbochi ụmụ nwanyị inwere onwe ha.” N’otu oge, Stanton kwuru banyere akwụkwọ ise mbụ nke Bible, sị: “Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ m maara nke na-akụzi nnọọ ka ụmụ nwanyị na-anọ n’okpuru nakwa ka a na-eweda ha ala karịa akwụkwọ ise ndị a.”

Ọ bụ ezie na ụfọdụ mmadụ taa pụrụ inwe echiche gabigara ókè otú ahụ, ọtụtụ mmadụ ka kweere na akụkụ ụfọdụ nke Bible na-akwado ịkpa ókè megide ụmụ nwanyị. Echiche dị otú ahụ ò ziri ezi?

Otú E Si Ele Ụmụ Nwanyị Anya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru

“N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Ndị nkatọ na-arụtụ amaokwu Bible a aka dị ka ikpe Chineke mara Iv nakwa nkwado Chineke kwadoro ka ụmụ nwoke na-eweda ụmụ nwanyị ala. Otú ọ dị, n’ebe a, Chineke adịghị ekwu ihe bụ́ nzube ya, kama ihe ọ na-ekwu bụ kpọmkwem ihe ọjọọ si ná mmehie nakwa n’ọjụjụ a jụrụ ịchịisi Ya pụta. Mmegbu a na-emegbu ụmụ nwanyị bụ n’ihi ezughị okè mmadụ, Chineke ezubeghị ka ọ dị otú ahụ. N’ọtụtụ mba, ndị di na-achịkwa nwunye ha, ọtụtụ mgbe ha na-eji nnọọ aka ike achị ha. Ma nke a abụghị nzube Chineke.

E kere ma Adam ma Iv n’oyiyi Chineke. Ọzọkwa, e nyere ha abụọ otu iwu nke bụ́ ịmụ ọmụmụ, baa ụba, jupụta ụwa, ma buda ya n’okpuru onwe ha. A chọrọ ka ha abụọ rụkọọ ọrụ ọnụ. (Jenesis 1:27, 28) O doro anya na n’oge ahụ, ọ dịghị onye n’ime ha mekpọrọ ibe ya ọnụ. Jenesis 1:31 na-ekwu, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”

Mgbe ụfọdụ, ihe ndekọ ndị dị na Bible adịghị ekwu ihe bụ́ echiche Chineke banyere ihe a kọrọ. Ha pụrụ ịbụ nnọọ akụkọ na-ekwu ihe ndị merenụ. A kọrọ banyere ebe Lọt nyere ndị Sọdọm ụmụ ya nwanyị abụọ, ma e kwughị ma ihe ahụ o mere ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ ma ọ bụkwanụ ma Chineke ọ̀ kwadoro ya ka ọ̀ kwadoghị ya. *Jenesis 19:6-8.

Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke kpọrọ ụdị nrigbu na mmegbu ọ bụla asị. (Ọpụpụ 22:22; Deuterọnọmi 27:19; Aisaia 10:1, 2) N’Iwu ahụ Chineke nyere ndị Izrel, ọ katọrọ idina nwanyị n’ike na ịgba akwụna. (Levitikọs 19:29; Deuterọnọmi 22:23-29) A machibidoro ịkwa iko nke onye nwere nwunye ma ọ bụ di iwu, a na-egbukwa di ma ọ bụ nwunye dara iwu a. (Levitikọs 20:10) Kama ịkpa ókè megide ụmụ nwanyị, Iwu ahụ mere ka ha nwekwuo ùgwù ma chebe ha pụọ n’ụdị mmegbu a na-emegbukarị ụmụ nwanyị ná mba ndị nọ ha gburugburu. Onye Juu, bụ́ nwunye nke na-ejide onwe ya nke ọma, bụ onye a na-akwanyere ùgwù dị ukwuu nakwa onye e ji kpọrọ ihe. (Ilu 31:10, 28-30) Ọdịda ndị Izrel dara idebe iwu Chineke banyere ịkwanyere ụmụ nwanyị ùgwù bụ ha ka o si n’aka, ọ bụghị ihe Chineke zubere. (Deuterọnọmi 32:5) N’ikpeazụ, Chineke kpere mba ahụ n’ozuzu ikpe maka ịsa anya mmiri nupụrụ ya isi, ọ takwara ha ahụhụ maka ya.

Ime Ka Ha Nọrọ n’Okpuru Ọ̀ Pụtara na A Na-akpa Ókè Megide Ha?

Òtù ọ bụla na-eme nke ọma nanị mgbe ha na-eme ihe n’usoro. Ka ihe wee na-aga n’usoro, ọ dị mkpa ka e nwee ndị ga na-ahazi ihe. Ma é meghị ya otú ahụ, ọgba aghara ga-adị. “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.”—1 Ndị Kọrint 14:33.

Pọl onyeozi kọwara ndokwa e mere maka ịbụisi n’ezinụlọ, sị: “Isi nke nwoke ọ bụla bụ Kraịst ahụ; n’aka nke ọzọ isi nke nwanyị bụ nwoke; n’aka nke ọzọ isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Onye ọ bụla, ma a gụpụ Chineke, nwere onye ọ nọ n’okpuru ya. Na Jizọs nwere onye ọ nọ n’okpuru ya ọ̀ pụtara na a na-akpa ókè megide ya? Mbanụ! Na Akwụkwọ Nsọ kwuru ka ụmụ nwoke na-edu ndú n’ọgbakọ nakwa n’ezinụlọ apụtaghị na a na-akpa ókè megide ụmụ nwanyị. Ka e wee nwee ihe ịga nke ọma ma n’ezinụlọ ma n’ọgbakọ, ọ dị mkpa ka ma ụmụ nwanyị ma ụmụ nwoke jiri ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-arụ ọrụ dịịrị ha.—Ndị Efesọs 5:21-25, 28, 29, 33.

Jizọs kwanyeere ụmụ nwanyị ùgwù mgbe nile. Ọ jụrụ ịgbaso omenala na iwu ndị Farisii na-akụzi bụ́ nke na-akpa ókè megide ụmụ nwanyị. Ya na ụmụ nwanyị na-abụghị ndị Juu kwurịtara okwu. (Matiu 15:22-28; Jọn 4:7-9) Ọ kụziiri ụmụ nwanyị ihe. (Luk 10:38-42) O kwuru okwu megide nwoke ịhapụ nwunye ya. (Mak 10:11, 12) Ikekwe, otu ihe a na-adịghị emekebe n’oge ahụ nke Jizọs mere bụ ime ka ụmụ nwanyị soro n’ezigbo ndị enyi ya. (Luk 8:1-3) Jizọs, dị ka onye na-egosipụta àgwà nile nke Chineke n’ụzọ zuru okè, gosiri na ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị hà nhata n’anya Chineke. N’ezie, n’etiti Ndị Kraịst oge mbụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị natara onyinye nke mmụọ nsọ. (Ọrụ 2:1-4, 17, 18) A bịa ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya nke iso Kraịst jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà, a gatụghị enwe ọdịiche n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ozugbo a kpọlitere ha n’ọnwụ ibi ndụ n’eluigwe. (Ndị Galeshịa 3:28) Onye chepụtara ihe e dere na Bible, bụ́ Jehova, adịghị akpa ókè megide ụmụ nwanyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Lee Ụlọ Nche, February 1, 2005, peeji nke 25-26.

[Foto dị na peeji nke 22]

Jizọs emeghị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ha na ya dịkọrọ ndụ, ọ kwanyeere ụmụ nwanyị ùgwù