Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe A Na-anọ Akparịta Ụka n’Intanet—Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Nsogbu Ndị Na-esi na Ya Apụta?

Ebe A Na-anọ Akparịta Ụka n’Intanet—Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Nsogbu Ndị Na-esi na Ya Apụta?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ebe A Na-anọ Akparịta Ụka n’Intanet—Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Nsogbu Ndị Na-esi na Ya Apụta?

“Ana m akparịtabu ụka n’Intanet ruo awa atọ ma ọ bụ anọ n’ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, ana m akparịta ya ruo awa isii ma ọ bụ asaa n’akwụsịghị akwụsị.”—José. *

EBE A NA-ANỌ AKPARỊTA ỤKA N’INTANET—dịkwa ka ebe ọ bụla ọzọ ndị ị na-amaghị na-anọkọ—na-ebute nsogbu ndị i kwesịrị ịma banyere ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị gaa n’obodo ukwu, o doro anya na ị ga-agba mbọ ịhụ na ị baghị n’ihe ize ndụ site n’ịchọpụta ebe ndị dị ize ndụ ma zere ha.

I kwesịrị ime otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na ị na-aga n’ebe a na-anọ akparịta ụka n’Intanet. Na Teta! nke October 8, e kwuru banyere nsogbu abụọ a na-adabakarị na ha n’ọtụtụ ebe a na-anọ akparịta ụka n’Intanet. Nke

mbụ bụ na i nwere ike ịdaba n’aka ndị na-achọ ndị ha ga-eso enwe mmekọahụ, nke abụọ bụ na ị pụrụ ịghọ onye aghụghọ. E nwere nsogbu ndị ọzọ ọ dị mkpa ka a tụlee. Ma, ka anyị burugodị ụzọ chọpụta otú e si hazie ebe ndị a a na-anọ akparịta ụka n’Intanet.

E Nwere Nzube E Ji Hazie Ha

A na-ahazikarị ebe a na-anọ akparịta ụka n’Intanet gaa n’isiokwu ndị na-amasị mmadụ ụfọdụ. A pụrụ ịhazi ụfọdụ maka ndị na-enwe mmasị n’otu egwuregwu ma ọ bụ ntụrụndụ. Ndị ọzọ pụrụ ịbụ ebe a na-anọ akparịta banyere otu ihe ngosi a na-eme na telivishọn. Ndị ọzọkwa pụrụ ịbụ maka ndị na-ekwu na ha nọ n’otu okpukpe.

Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ pụrụ ịgụ gị agụụ ịga n’ebe nke a sị na e mere dị ka ebe ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà si ebe nile n’ụwa pụrụ ịnọ mete ndị enyi ọhụrụ. Imete enyi n’etiti ndị ntorobịa gị na ha nọ n’otu okpukpe bụ ihe mgbaru ọsọ dị mma. Otú ọ dị, ebe ndị a a na-anọ akparịta ụka n’Intanet na-etinye Ndị Kraịst ná nsogbu. Olee ụdị nsogbu ọ bụ?

Imebi Omume Ọma

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Tyler kwuru, sị: “Mụ na otu ndị m nchere na ha nile bụ Ndịàmà Jehova nọ nnọọ na-akparịta ụka n’Intanet. Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ha malitere ịkatọ ozizi anyị. Obere oge, ọ bịara doo m anya na ha bụ n’ezie ndị si n’ezi ofufe dapụ.” Ha bụ ndị kpachapụrụ nnọọ anya nwaa imebi omume nke ndị ha sị na ha bụ ndị kwere ekwe ibe ha.

Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, dọrọ aka ná ntị na ụfọdụ n’ime ndị sooro ya ga-akpagbu ibe ha. (Matiu 24:48-51; Ọrụ 20:29, 30) N’oge Pọl onyeozi, Pọl kpọrọ ndị dị otú a ụmụnna ụgha ma kwuo na ha ‘gbebatara’ iji merụọ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ́. (Ndị Galeshia 2:4) Jud, bụ́ onye so dee Bible, kwuru na ha ‘gbebatara’ iji “na-atụgharị obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke anyị ịbụ ihe ngọpụ maka omume rụrụ arụ.” (Jud 4) Ọ kọwakwara ha dị ka “nkume ndị zoro n’ala ala mmiri.”—Jud 12.

Rịba ama na ma Pọl ma Jud mere ka a mara ụzọ aghụghọ ndị si n’ezi ofufe dapụ na-esikarị eme ihe. Ndị a so dee Bible kwuru na ndị si n’ezi ofufe dapụ ‘gbebatara’ iji mebie omume ọma nke ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Taa, ebe ndị a na-anọ akparịta ụka n’Intanet na-eme ka ndị ọjọọ dị otú ahụ nwee ebe dị mma ha ga-ezo wee na-akpa nkata aghụghọ ha. Dị ka nkume ndị zoro n’ala ala mmiri, Ndị Kraịst ụgha a na-ezo ihe ha bu n’obi site n’ime ka à ga-asị na ha nwere mmasị n’ebe Ndịàmà na-eto eto nọ. Ma nzube ha bụ imebi okwukwe nke ndị na-amaghị nke a na-akọ.—1 Timoti 1:19, 20.

Magazin a, nakwa akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta, adọọla aka ná ntị ugboro ugboro banyere ihe ize ndụ a kpọmkwem. * Ya mere, onye ọ bụla gị na ya na-akparịta ụka n’ebe a sị na ọ bụ Ndịàmà Jehova mepere ha n’Intanet, bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, onye na-eleghara ndụmọdụ ndị dị otú ahụ anya. Ị̀ ga-achọ n’ezie ka ndị họọrọ ileghara ntụziaka ndị dabeere na Bible anya bụrụ ndị enyi gị?—Ilu 3:5, 6; 15:5.

Ọnyà nke Mmadụ Ịdị Na-anọ Nanị Ya

Ihe ọzọ i kwesịrị ịtụle banyere ebe ndị a bụ oge ha na-eri. José, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite isiokwu a, na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ, ịkparịta ụka n’Intanet na-eri m isi nke na adịghị m eri nri.”

Ọ pụrụ ịbụ na ị naghị emefu oge dị ukwuu na ya otú José si emefu. Ma, ka i wee na-enwe oge ịkparịta ụka n’Intanet, ị ghaghị ịzụpụta oge site n’ihe ndị ọzọ. Ebe mbụ ị ga-esi enweta oge nwere ike ọ gaghị abụ n’oge i ji eme ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị mee n’ụlọ ma ọ bụ n’oge i ji arụ ọrụ dịịrị gị n’ụlọ. Ebe mbụ ị ga-esi enweta oge pụrụ ịbụ n’oge ị na-eji eso ezinụlọ gị ekwurịta okwu. Adrian, bụ́ onye bi na Spen, kwuru, sị: “Ana m apụ ozugbo m risịrị nri ma gaa na kọmputa anyị iji soro ndị mmadụ kparịta ụka n’Intanet. Ịkparịta ụka n’Intanet bịara rie m isi nke na ọ fọrọ obere ka m kwụsị iso ndị ezinụlọ anyị akparịta ụka.”

Ọ bụrụ na ị na-eji oge dị ukwuu akparịta ụka n’Intanet, ị pụrụ n’otu aka ahụ ịdị na-anọpụ iche n’ebe ndị kasị dị gị mkpa nọ. Bible na-enye ịdọ aka ná ntị a dị mkpa, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) Ndị ahụ ị na-amaghị bụ́ ndị gị na ha na-akparịta ụka n’Intanet eyighị ka hà ga-agba gị ume ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ezi amamihe ndị a na-ahụ na Bible. O yikarịrị ka hà ga-agba gị ume ịchọwa ọdịmma onwe gị nanị ma nwaa gị ọnwụnwa ịkwụsị ịgbaso ụkpụrụ omume Ndị Kraịst.

N’ezie, otu n’ime ihe ndị na-eme ka i nwee mmasị ịdị na-akparịta ụka n’Intanet pụrụ ịbụ na ọ na-adịrị gị mfe ịnọ na ya akparịta ụka karịa otú o si adịrị gị mfe iso ndị ezinụlọ unu akparịta ụka. Ndị gị na ha na-akparịta n’Intanet pụrụ ịdị na-enwe mmasị ịmata ihe i chere banyere ihe ụfọdụ, ha pụkwara ịgwa gị obi ha n’ezoghị ọnụ. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ ịdị gị ka ndị ezinụlọ gị adịghị enwe ohere ige gị ntị mgbe ị na-akọrọ ha ihe, ọ pụkwara ịdị na-esiri ha ike ịgwa gị obi ha n’ezoghị ọnụ.

Ma, jụọ onwe gị, sị: ‘Ndị a mụ na ha na-akparịta ụka n’Intanet hà ma onye m bụ n’ezie? Hà nwere mmasị n’ezie n’ọdịmma m?’ O yiri nnọọ ka ndị òtù ezinụlọ gị hà ga-aka ha enwe mmasị ilekọta gị n’ụzọ ime mmụọ nakwa mgbe i nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, mara na ha nwere nnọọ mmasị iso gị na-ekwurịta okwu. (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụ na i jiri nkwanye ùgwù na-agwa ha echiche na mmetụta gị, ọ pụrụ ịtụ gị n’anya na ha ga-egosi gị obiọma karịa otú ị tụrụ anya ya.—Luk 11:11-13.

Izere Nsogbu Ndị Ahụ

Ị pụrụ inwe ezigbo ihe mere ị ga-eji akparịta ụka n’Intanet—dị ka ihe atụ, ọ pụrụ iso n’ihe a gwara unu mee n’ụlọ akwụkwọ. * Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịhụ na ọ gaghị abụrụ gị ọnyá site n’ịgbaso ịdọ aka ná ntị ndị a dị mfe, bụ́ ndị na-esonụ.

Nke mbụ, adọbala kọmputa e ji abanye n’Intanet n’ọnụ ụlọ nanị gị na-anọ. Ime otú ahụ ga-adị ka nanị gị ịnọ na-agagharị n’okporo ámá gbara ọchịchịrị n’obodo ị na-amaghị—nsogbu ka ị na-achọ. Kama, dọba kọmputa ahụ n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị n’ime ụlọ unu bụ́ ebe ọ pụrụ ịdịrị ndị ọzọ mfe ịhụ ihe ị na-eme.

Nke abụọ, mee ka gị na ndị mụrụ gị na-ekwurịtakwu okwu site n’ịdị na-egosi ha ebe ndị ị na-akparịta ụka n’Intanet, nakwa site n’ịdị na-akọwara ha ihe mere i ji achọ ịkparịta ụka n’ebe ụfọdụ n’Intanet. Ọzọkwa, kpebie oge ị ga-anọ na kọmputa ma hụkwa na ị nọfeghị oge ahụ.

Nke atọ, tinye n’ime kọmputa gị, ihe ndị ga-enye aka chebe gị pụọ n’aka ndị na-ezitere mmadụ ihe ndị metụtara mmekọahụ, nke bụ́ ihe ndị ga na-enyocha ozi ndị a na-ezitere gị ma na-ewepụ ndị na-adịghị mma. Ọ bụrụ na mmadụ ezitere gị ozi metụtara mmekọahụ mgbe gị na ya na-akparịta ụka n’Intanet, mee ka ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye nkụzi gị mara ozugbo. Ná mba ụfọdụ, ndị merela okenye bụ́ ndị maara na ị ka bụ obere nwa ma na-arata gị site n’izitere gị ozi ma ọ bụ foto ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ iwu mpụ ka ha na-ada. E kwesịrị ịgwa ndị uwe ojii banyere ha.

Tụkwasị na nke a, anwakwala anwa enye onye gị na ya na-akparịta ụka n’Intanet aha gị, adres gị, aha ụlọ akwụkwọ gị, ma ọ bụ nọmba fon gị. Ọ bụrụkwa na ọ gwa gị ka ị bịa otu ebe ka unu hụ ihu na ihu, anwakwala anwa aga!

Ọ bụ ezie na ọtụtụ puku afọ agafewo kemgbe e dekọrọ otu ihe onye amamihe bụ́ Eze Solomọn kwuru, ihe ahụ o kwuru bara nnọọ uru ma a bịa n’izere nsogbu ebe a na-anọ akparịta ụka n’Intanet na-ebute. O kwuru, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”—Ilu 22:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị dị n’isiokwu a.

^ par. 14 Lee Teta! nke December 8, 2004, peeji nke 16-19.

^ par. 22 Lee Teta! April 8, 2000, peeji nke 24.

[Foto dị na peeji nke 26]

Jiri amamihe gosi ndị mụrụ gị ebe ndị ị na-akparịta ụka n’Intanet