Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ike Akwụkwọ Akụkọ Nwere

Ike Akwụkwọ Akụkọ Nwere

Ike Akwụkwọ Akụkọ Nwere

Mgbe Agha Ụwa Mbụ mere ka ọchịchị ndị eze kwụsị na Germany, a malitere ụdị ọchịchị onye kwuo uche ya nke ụlọ ọrụ nile bịaziri dịrị gọọmenti n’aka, na Berlin. Mgbe e mesịrị, ndị ọchịchị Kọmunist bịara chọọ ịkwatu ọchịchị ọhụrụ a. Ma, ndị Kọmunist ma gọọmenti bịara chee na ha ịchịkwa ụlọ ọrụ mgbasa ozi ga-apụta na ha ga na-achịkwa, ọ bụghị nanị echiche ndị mmadụ, kamakwa ndị mmadụ n’onwe ha. Otú a ka e si malite ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ a lụrụ banyere onye ọ bụ ya ga-achịkwa ụlọ ọrụ mgbasa ozi.

N’IME narị afọ ole na ole gara aga, akwụkwọ akụkọ emetụtawo omenala, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na achụmnta ego, metụtakwa ndụ ọtụtụ nde mmadụ na-adị kwa ụbọchị. Òkè dị aṅaa ka ha na-ekere ná ndụ gị?

Ihe àmà gosiri na ọ bụ na Germany, n’afọ 1605, ka e bipụtara akwụkwọ akụkọ mbụ na Europe. N’ebe ụfọdụ taa, ihe dị ka mmadụ atọ n’ime mmadụ anọ ọ bụla dị ihe karịrị afọ 14 na-agụ akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị. Ọ bụ ezie na ná mba ụfọdụ ka na-emepe emepe, akwụkwọ akụkọ e nwere maka otu puku mmadụ ọ bụla erughị 20, Norway nwere ihe karịrị 600 maka otu puku mmadụ ọ bụla bi na ya. A gụkọta aha akwụkwọ akụkọ nile a na-ebipụta n’ụwa nile, ha dị ihe dị ka 38,000.

N’ebe nile, akwụkwọ akụkọ na-eme ka ọhaneze mara banyere ihe ndị dị mkpa. Ma, ha na-arụ ihe karịrị nke ahụ. Ha na-enye ihe ọmụma nke ọtụtụ ndị na-adabere na ha wee na-ekwu echiche ha. Dieter Offenhäusser nke na-arụ n’òtù German Commission for UNESCO kwuru, sị: ‘Akwụkwọ akụkọ anyị na-agụ kwa ụbọchị na-emetụta àgwà anyị, omume anyị, na ọbụna ihe ndị anyị na-ewere dị ka omume ọma.’

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na akwụkwọ akụkọ akpaliwo ndị mmadụ ịga agha, ịkwado ya, na igosi na agha ahụ ha lụrụ kwesịrị ekwesị. Ihe atụ ha na-enye bụ agha France na Germany lụrụ n’afọ 1870 ruo 1871 n’oge Prussia na-achị Germany, agha Spen na America lụrụ n’afọ 1898, na Agha Vietnam, bụ́ nke a lụrụ n’afọ 1955 ruo 1975. Aha ọtụtụ ndị oji ego achụ nta ego, ndị ọkà mmụta sayensị, ndị na-eme egwuregwu, na ndị ọchịchị emebiwo n’ihi akụkọ ọjọọ a kọrọ banyere ha n’akwụkwọ akụkọ. N’akụkọ ọjọọ ahụ wuru ewu a kọrọ n’ihe dị ka afọ 1975, bụ́ nke ndị Bekee kpọrọ Watergate scandal, ndị nta akụkọ dere ọtụtụ ihe banyere ya nke mere ka President Richard M. Nixon nke United States jiri aka ya rịtuo n’ọchịchị. Ee, ma n’ụzọ ọma ma n’ụzọ ọjọọ, akwụkwọ akụkọ pụrụ ịkpa ike dị egwu.

Ma, olee otú o si malite ịkpa ike a? Ruo ókè ha aṅaa ka anyị pụrụ ịtụkwasị ihe anyị na-agụta n’akwụkwọ akụkọ obi? Olee okwu ịdọ aka ná ntị ndị pụrụ inyere anyị aka irite uru na ha?

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọgụ ahụ a lụrụ banyere onye ọ bụ ya ga-achịkwa akwụkwọ akụkọ na Berlin mgbe Agha Ụwa Mbụ biri