Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inye Nkasi Obi Mgbe E Nwere Ọdachi

Inye Nkasi Obi Mgbe E Nwere Ọdachi

Inye Nkasi Obi Mgbe E Nwere Ọdachi

Dolores Gómez, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova bi n’otu obodo nta dị nso na Barcelona, Spen, dị afọ 44 mgbe dọkịta ya gwara ya na akpụ̀ toro ya n’ụbụrụ. Ọ gwara ya na ọ gaghị anọfe ọnwa asatọ tupu ya anwụọ. Ndị Kraịst ibe ya gosiri ya nnọọ ịhụnanya nke ukwuu. N’ụbọchị ndị ikpeazụ ọ nọrọ ndụ tupu ya anwụọ, ndị ikwu ya na-abụghị Ndịàmà si ebe dị iche iche na Spen bịa ileta ya.

Ndịàmà bi ebe ahụ lekọtara ha nke ọma site n’inye ha ebe ha ga-anọ, ihe oriri, ụgbọ njem, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Okwukwe siri ike Dolores gosiri ruo ọnwụ ya nakwa ùgwù o nwere, tinyere nlekọta Ndịàmà bi n’ógbè ahụ lekọtara ndị ezinụlọ ya, metụrụ ndị ezinụlọ ya n’obi. Akwụkwọ ozi na-esonụ ha dere gosiri otú obi dị ha.

“Ndị anyị na-edegara akwụkwọ ozi a bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị na-abụghị nanị okwu ọnụ ka ha ji egosi na ha hụrụ mmadụ ibe ha n’anya kamakwa, ndị na-egosi ya site n’ọmịiko sitere n’ala ala obi ha. E gosiri anyị ịhụnanya a n’oge dị ịrịba ama ná ndụ anyị. Nke a bụ oge nwanne anyị nwanyị, bụ́ Loli [Dolores], na-arịa ọrịa mesịrị gbuo ya.

“Ya mere, anyị nile (ụmụnne ya bi n’ebe ndị dị anya na Spen) bụ́ ndị na-edi ọnwụ ya, chọrọ iji ohere a kelee unu nile ekele sitere n’ala ala obi anyị ma meekwa ka unu ghọta ịhụnanya dị ukwuu anyị nwere n’ebe unu nọ. Anyị na-ekele unu nile ndị so ya mgbe ọ na-aṅụrị ọṅụ na mgbe ọ nọ ná mwute, mgbe ihe dịịrị ya mma na mgbe ihe siiri ya ike, ma sogidekwa ya ruo mgbe ọ nwụrụ.

“Anyị chọkwara ime ka unu mara na anyị ahụwo otu n’ime ụzọ ndị kasịnụ e siworo gosipụta ịhụnanya na ịdị n’otu. Anyị alaghachikwurula ndị ezinụlọ anyị n’ebe obibi anyị ma malitekwa ọrụ ndị dịịrị anyị, ma e nwewo ihe dị iche ná ndụ anyị, n’ihi na ụdị ịhụnanya nke dịịrị n’etiti unu na nwanne anyị nwanyị bụ́ Loli emetụwo anyị n’ahụ́, nke a na-emekwa ka obi sikwuo anyị ike ịnọgide na-adị ndụ kwa ụbọchị.

“Anyị ji nnọọ obi ekele na ịhụnanya na-asị unu nọrọnụ nke ọma. Ruo mgbe anyị ga-ahụ ọzọ, ka Jehova jiri obi ụtọ gọzie unu.”

Ndị bịanyere aka n’akwụkwọ ozi a bụ ndị ezinụlọ Dolores Gómez na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị bi n’ógbè ahụ