Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Chebe Ezé Gị

Otú Ị Pụrụ Isi Chebe Ezé Gị

Otú Ị Pụrụ Isi Chebe Ezé Gị

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CANADA

MGBE i lere anya n’enyo, gịnị ka ị na-ele? Ikekwe ọ bụ ntutu isi gị ma ọ bụ ihe ụfọdụ ndị ọzọ dị gị n’ahụ́. Ma, gịnị banyere ezé gị? Ị̀ chọpụtawo otú ezé gị si emetụta ọnụ ọchị gị? Ee, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọnụ ọchị gị na-adị mma, ị ga-elebara ezé gị anya. E mere ezé ị na-epute mgbe ezé mbụ gị dapụrụ otú ọ ga-enwe ike ịdịgide ruo ogologo ndụ gị nile. Ọ dị mkpa ka i lebara ha anya n’ụzọ pụrụ iche. Ezé na-arụ ọrụ ọzọ na-abụghị nanị ịta nri na ime ka i nwee ike ikwu okwu nke ọma. Ọ na-eme ka egbugbere ọnụ gị na ntì gị kwụrụ kwem—na-eme ka ọnụ ọchị gị dị mma. N’ezie, ezé gị bara uru nke ukwuu!

Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime Iji Chebe Ezé Gị?

Na mmadụ nwere ezé dị mma na-amalite ná nri ọ na-eri. Ezigbo nri ndị na-enye calcium na vitamin ụdị nke A, C, na D ga-enye aka mee ka ezé gị malite ịdị, site n’oge a ka bu gị n’afọ ruo mgbe ezé gị putechara. * Ọ bụrụ na ị na-eri nri nke ọma mgbe nile, ọ ga-enye aka mee ka ezé gị gbasie ike. Ma, kpachakwara anya banyere nri ndị shuga hiri nne na ha! Ọ pụrụ ime nnọọ ka ezé gị mebie. N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị a nọgidere na-enye banyere otú iri shuga si emebi ezé, a na-ekwu na n’Ebe Ugwu America, otu onye na-eri shuga dị kilogram 50 ruo 60 kwa afọ! Olee ihe mere shuga ji emebi ezé?

E nwere ụdị nje bacteria abụọ na-emebi ezé. Aha ha bụ “mutans streptococci na lactobacilli.” Ha na-eso eme ka ezé ree. Ihe ndị e riri eri kpafanyere n’ezé sokwa eme ya. Nje ndị a na-eri shuga ma na-eme ka ha ghọọ acid ndị na-amalite imebi ezé. Shuga ụfọdụ pụrụ ịghọ acid ngwa ngwa karịa ibe ha ma ọ bụ nyapagide n’ezé, na-enyekwu nje ndị ahụ oge ịmalite imebi ezé. * Nje ndị a na-asapụghị mgbe a na-asa ezé pụrụ ịkpọ nkụ ma ghọọ ure ezé gburugburu agbụ̀.

Ịhụ na ị na-asapụ nje bacteria ndị a, karịsịa nke ahụ a na-akpọ mutans streptococci, dị oké mkpa iji gbochie ezé gị imebi. Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọnụ ọchị gị na-adị mma, ị ghaghị ịdị na-asa ezé gị kwa ụbọchị. Ụlọ akwụkwọ bụ́ Columbia University School of Dental and Oral Surgery, na-ekwu, sị: “E wezụga iji eriri ewepụsị ihe ndị kpafanyere n’ezé, [iji brọsh asa ezé] bụ otu ihe kasị mkpa ị pụrụ ime iji hụ na ezé gị na agbụ̀ gị dị mma ma gbasie ike.” Na peeji nke 20 na 21, e gosiri ihe osise nke ụzọ ndị dị mma e si eji brọsh asa ezé nakwa ụzọ ndị e si ewepụ ihe ndị kpafanyere n’ezé. Dọkịta gị nwere ike ịgwa gị ihe ndị ọzọ na ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi na-edebe ezé gị ọcha nke ọma ka ọnụ ọchị gị wee na-adị mma.

Ọ bụrụ na acid anọgide na-egbu ezé, ọ na-eme ka ezé ghara isi ike. Otú ọ dị, ezé dị otú ahụ na-esighachi ike kwa ụbọchị. N’ụzọ dị aṅaa? E gosiwo na ọgwụ a na-akpọ fluoride na-anọgide enye aka eme ka ezé ghara imebi site n’inyere ihe ahụ na-eme ka ezé na-esighachi ike aka. N’ihi ya, ọ bụ ezie na otu ezé mebirinụ pụrụ imetụta ezé ndị nke ọzọ, a pụkwara ime ka ọ dịghachi mma ma ọ bụrụ na e jiri ihe ụfọdụ, dị ka fluoride, mee ihe. Ee, ezé na-esighị ike pụrụ iji aka ya sighachi ike!

Ihe E Kwesịrị Ịtụ Anya Ya Mgbe A Na-aga Ịhụ Dọkịta Ezé

N’otu nnyocha bụ́ nke a gwara ndị mmadụ ka ha depụta ihe ndị kasị atụ ha ụjọ, ihe ha dere dị ka ihe kasị atụ ha ụjọ bụ ikwu okwu n’ihu ọha, nke na-esote ya bụ ịga hụ dọkịta ezé. Hà kwesịrị ịtụ ụjọ ịga hụ dọkịta ezé? Ná mba ndị mepere emepe, ígwè ndị bụ́ ọkpọka e ji akpọpu ezé na ọgwụ ndị e ji agbasi ahụ́ na-eme ka ndị dọkịta na-agwọ ọtụtụ ọrịa ezé otú ọ na-agaghị afụcha onye ọrịa ahụ ụfụ. Ịma usoro ndị a ga-eji gwọọ gị na ihe ndị a ga-eme n’usoro nke ọ bụla nwere ike ime ka ụjọ na-atụ gị kwụsịlata.

Ị gaa na nke ndị na-ahụ maka ezé, ndị bụ́ aka ochie n’ịsa ezé pụrụ ịsa gị ezé. Mgbe a na-asa gị ezé, a na-ewepụsị ure ezé ndị kpafanyere n’ebe brọsh e ji asa ezé na eriri e ji ewepụ ihe ndị kpafanyere n’ezé, na-adịghị eru. E wepụsịa ha, a na-abịa tee ihe n’ezé ahụ iji gbochie ure ezé iju na ya na iji wepụ ihe ndị gburu ezé gị bụ́ ndị na-eme ka ihere na-eme gị ịmụmụ ọnụ ọchị.

E gosiwo na ọgwụ a na-akpọ fluoride na-eme ka ezé ghara ire ngwa ngwa. N’ọtụtụ mba kwa, a na-etekarị ya ụmụaka n’ezé ma ha gaa na nke dọkịta ezé. A na-etinyekwa fluoride ná mmiri ọhaneze ji eme ihe n’ọtụtụ mba, na-etinyekarịkwa ya n’ọtụtụ ihe ndị e ji asa ezé iji chebekwuo ezé ka ọ ghara imebi.

Gịnị Ka Dọkịta Ezé Pụrụ Ime?

A na-enyekwu ndị dọkịta ezé ọzụzụ banyere ụzọ ndị ha ga-esi na-ebelata nsogbu ezé a na-enwe n’ihi ezé esighị ike. Ọ bụrụ na a gwọwa nsogbu a mgbe ọ ka dị obere, ọtụtụ mgbe, a pụrụ ime ka ezé ahụ na-achọ imebi dịghachi mma. N’ihi ya, site n’ịchọpụta ma gwọwa nsogbu ezé mgbe ọ ka na-amalite amalite, ọgịga ị gara na nke dọkịta ezé ga-abụrụ gị ihe obi ụtọ.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na acid nje ndị dị n’ezé mepụtara anọgide n’ezé, ezé ahụ ga-emebi. Ọ bụrụ na e meghị ihe ọ bụla banyere ya, ezé ahụ pụrụ inwe oghere. Ọ́ dị otú ahụ, mara na ọ dị mkpa ka e lebara ezé ahụ anya. Mgbe ezé ahụ na-emebibeghị banye n’ime ime ebe dị nro n’ezé, a pụrụ ime ka ọ dịghachi mma site n’ịfachi ebe ahụ ghe oghe.

Dọkịta ezé na-eji ígwè e ji akpọpu ezé akpụchasị ebe ahụ ghere oghe n’ezé ma mee ya ka ọ dị mma tupu a fachiwe ya. Ọ kpụchasịchaa ya, ya afachie oghere ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe dị ka mercury a gwakọtara ya na ihe ọzọ ka e ji fachie oghere ahụ, ọ ga-akpọ ngwa ngwa. A na-ebekwa ya otú ọ ga-afachi oghere ahụ nke ọma. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ mgbá Bekee ka e ji fachie ya, a ga-eji otu ụdị ọkụ pụrụ iche ṅakpọọ ya. Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e mere banyere oghere ahụ dị n’ezé, ezé ahụ emebigidekwa ruo n’akwara dị n’ukwu ezé, ọ pụrụ ịdị mkpa ka a waa ezé ahụ awaa iji kpụchapụ ebe ahụ mebiri emebi ma fachie ya, ma ọ bụkwanụ e fopụ ezé ahụ efopụ. Ọ bụrụ na a waa ezé awaa otú a, o nwere ike ọ gaghịzi adị mkpa ifopụ ya efopụ, ebe ọ bụ na a ga-akpụchapụ ebe ahụ mebiri emebi ma fachie ya. A na-eji ihe ekpuchi ezé mebiri nke ukwuu, na-ejikwa ezé adịgboroja edochi ezé e fopụrụ efopụ. *

Ihe Mere O Ji Ruo Mgbalị E Meere Ya

Ikekwe, ị ka na-atụ ụjọ ịhụ dọkịta ezé. Ọ bụrụ otú ahụ, gị na dọkịta ezé gị kparịta ihe mere i ji atụ ụjọ. Tupu a malite ịgwọ gị, kpebie otú ị ga-esi agwa dọkịta gị mgbe ahụ́ fụwara gị ụfụ (dị ka site n’iweli aka elu). Gwa ya ka ọ kọwaara gị usoro ndị ọ ga-eji agwọ gị na ihe ndị ọ ga-eme n’usoro nke ọ bụla. Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, ị pụrụ inye aka mee ka ezé ha na-adị ọcha site n’ịdị na-ekwu okwu ọma banyere ịsa ezé ma ghara ịdị na-eji ịga na nke dọkịta ezé eyi ha egwu ma ha mee ihe na-adịghị mma.

Dr. Daniel Kandelman, bụ́ prọfesọ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ezé na Mahadum Montreal, kwuru, sị: “Taa, o kwere omume iru ihe mgbaru ọsọ a dị mma n’ihe banyere ezé: chebe ezé gị ka ọ gbasie ike ma maa mma, ka ọnụ ọchị gị wee na-adị mma ruo ogologo ndụ gị nile.” O ruru mgbalị i meere ya!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Nwata ipu ezé nke ọma bụ nnọọ ihe na-egosi na nne ya riri ezigbo nri mgbe ọ dị ime ya nakwa n’oge ọ ka ku ya n’aka, bụ́ oge ezé nwa ahụ na-apụtabeghị apụta. Nwata na-akwụsị ipu eze mgbe o ruru ihe dị ka afọ 19 ma ọ bụ afọ 23.

^ par. 6 Ndị dọkịta ezé achọpụtawo na xylitol, bụ́ shuga nke na-apụtara onwe ya, na-enye aka egbochilata nje bacteria ọjọọ ndị a na-emebi ezé. A na-eji xylitol eme chịngọm ụfọdụ.

^ par. 16 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ezé adịgboroja, lee isiokwu bụ́ “Ọ̀ Dị Gị Mkpa Inwe Ezé Adịgboroja?” na Teta! (Bekee) nke February 22, 1993, peeji nke 18-20.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

Iji Brọsh Asa Ezé Gị

E nwere ọtụtụ ụzọ e si eji brọsh asa ezé. E nwekwara otu okwu ịdọ aka ná ntị. Ihe a na-etinye na brọsh wee na-asa ezé pụrụ iri ezé, ọ pụkwara “iji ọtụtụ narị okpukpu sie ike karịa ezé n’onwe ya.”

1 Mee ka ọnụ brọsh gị hulatatụ ehulata mgbe i ji ya asa ezé. Jiri nwayọọ nwayọọ si n’ebe agbụ̀ na-echi ya aga n’ebe i ji ata nri. Hụ na ị sara ma ebe ihu ya ma ebe azụ ya.

2 Jiri nwayọọ nwayọọ chie brọsh kpọmkwem n’ebe ndị i ji ata nri.

3 Ị sawa ebe azụ nke ezé ihu gị, kwụwa brọsh gị ọtọ. Si n’ebe agbụ̀ gị na-echi ya aga n’ebe i ji ata nri.

4 Jiri brọsh saa ire gị na okpo ọnụ gị, na-asa ya apụta n’ihu ọnụ gị.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nke 1 ruo 4: Site n’aka www.OralB.com

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

Iji Eriri Ewepụ Ihe Ndị Kpafanyere Gị n’Ezé

Ndị dọkịta ezé na-atụ aro iji ụdị eriri e mere maka iji na-ewepụ ihe ndị kpafanyere n’ezé ewepụ ihe ndị ahụ kwa ụbọchị na iji brọsh asa ezé mgbe ọ bụla i risịrị nri.

1 Kee otu isi nke eriri ahụ na mkpịsị aka ogologo nke aka nri gị, kee isi ya nke ọzọ na mkpịsị aka ogologo nke aka ekpe gị.

2 Jiri mkpịsị aka ukwu nke otu aka gị na mkpịsị aka na-esote mkpịsị aka ukwu n’aka nke ọzọ dọtịa eriri ahụ ma jidesie ya ike. Na-adọ eriri ahụ aga ihu na azụ iji mee ka ọ banye n’etiti ezé gị.

3 Adọtịla eriri ahụ ogologo kama dọtịa ya ka ọ rọjie arọji ma yie mkpụrụ akwụkwọ bụ́ C. Na-adọ eriri ahụ aga elu na ala n’akụkụ ezé nke ọ bụla. Jiri nwayọọ ma eriri ahụ rutewe n’agbụ̀ gị, ekwela ka o chie n’agbụ̀ gị mgbe ị na-adọ ya aga ihu na azụ.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ The Columbia University School of Dental and Oral Surgery’s Guide to Family Dental Care

Nke 1 ruo 3: Site n’aka www.OralB.com