Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Nza Merụrụ Ahụ́ Enweta Ebe Obibi Ọhụrụ

Otu Nza Merụrụ Ahụ́ Enweta Ebe Obibi Ọhụrụ

Otu Nza Merụrụ Ahụ́ Enweta Ebe Obibi Ọhụrụ

“ÀNYỊ na-achọ ọrụ anyị ga-arụ?” Ihe a ka m kwuru mgbe nwunye m ji otu obere nza si n’akwụ́ ya dapụ, lọta n’ụlọ anyị. Mgbe m lerukwuru nnụnụ ahụ ahụ́ na-ama jijiji anya, abịara m metere ya ebere. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bịara dị m ka nnụnụ a ahụ́ na-esighị ike agaghị anya. *

Na mbụ, anyị na-adị adụtụ nnụnụ a osisi n’ahụ́ iji mee ka o rie nri a kwọriri akwọri. Ma, ka ọ na-erule echi ya, obere nza ahụ maliteziri ibe ákwá mgbe nile ka e nye ya nri. A pụdịrị ịnọ na steepụ dị ná mpụta ụlọ anyị anụ olu ákwá ya, n’agbanyeghị na ọnụ ụzọ ụlọ anyị nwere ibo ụzọ abụọ ibo ụzọ abụọ!

Ábụ́bà ya mere ka o doo anyị anya na nza a bụ nne. Ka oge na-aga, o nwetara ike ma malite ife efe. Ma, mgbalị nile anyị mere ka ọ laghachi ebe o si enweghị isi! ‘Ikekwe ọ ga-abụ na obi akabeghị ya isi n’ụlọ anyị pụọ,’ ka anyị chere. N’ihi ya, anyị zụtara keeji nnụnụ ma malite ịzụ ya. Anyị gụrụ ya “Spatzi,” bụ́ ụzọ dị ụtọ e si akpọpụta okwu German nke pụtara “nza.”

Otu ụbọchị, anyị siri osikapa, bụ́ nke yiri ka ọ̀ bụ otu n’ime nri ndị kasị atọ Spatzi ụtọ. Ebe ọ bụ na ọ ka dị ọkụ, nwunye m dọbara ya otu ebe ma wụsara Spatzi mkpụrụ akụ́kụ́ ụfọdụ kama ịwụsara ya osikapa ahụ. Gịnị ka obere nnụnụ anyị a mere? O hulatara isi ya ma jiri ọnụ ya kpapụsịa mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ahụ n’elu tebụl! Nke a tụrụ mụ na nwunye m n’anya, anyị eleritakwa ibe anyị anya ma dapụ n’ọchị. Ozugbo ahụ, anyị wụsaara Spatzi obere osikapa jụrụla oyi, o yikwara ka obi ọ dị ya mma mgbe ọ hụrụ ya!

Ilekọta obere nnụnụ a mara mma na-echetara anyị ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma.” Mgbe ahụ Jizọs gwara ha, sị: “Unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29-31.

Lee nnọọ ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova na-ahụ ahụhụ nile anyị na-ata ma na-echeta ntachi obi anyị na-enwe. (Aịsaịa 63:9; Ndị Hibru 6:10) Ee, ọmịiko anyị nwere n’ebe obere nnụnụ nọ adịtụghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ịhụnanya Jehova Chineke nwere n’ebe ndị na-ejere ya ozi nọ!—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Mgbe ụfọdụ, mmadụ pụrụ ibute ọrịa ma ọ bụ daa iwu obodo ma ọ bụrụ na ọ na-azụ nnụnụ na-arịa ọrịa ma ọ bụkwanụ nke merụrụ ahụ́.