Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Ga-enwe Ụwa Nke Agụụ Na-agaghị Adị Na Ya?

À Ga-enwe Ụwa Nke Agụụ Na-agaghị Adị Na Ya?

À Ga-enwe Ụwa Nke Agụụ Na-agaghị Adị Na Ya?

CHEGODỊ echiche otú obi ga-adị nna hụrụ ụmụ ya n’anya mgbe ọ hụrụ ka ụmụ ya na-arịa ọrịa n’ihi erighị nri ndị na-edozi ahụ́. Ọ ga-ewuteru ya n’ụmị. Ọ bụrụ na ọ ga-adị nna bụ́ mmadụ otú ahụ, chegodị echiche otú ọ na-aghaghị ịdị Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya. Ọ maara banyere ahụhụ ọtụtụ narị nde mmadụ bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ a na-ata.

N’agbanyeghị ezigbo ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ nwere inye ndị agụụ na-agụ n’ụwa a nri, ọnụ ọgụgụ ndị agụụ na-agụgbu mụbara ná mmalite narị afọ nke 21 a. Otú ọ dị, Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, pụrụ ime ka agụụ kwụsị ruo mgbe ebighị ebi, ọ ga-emekwa ya. Olee otú anyị si mara?

Bible na-akọwa na mgbe Chineke tinyere Adam na Iv n’ogige Iden, o nyere ha ihe nile dị ha mkpa iji nọrọ ná nchebe, nwee afọ ojuju, ma rijuo afọ. Chineke gwara ha, sị: “Enyewo m unu ihe ọkụkụ nile ọ bụla na-amịpụta mkpụrụ ọghịgha, nke dị n’elu ụwa nile.” Nzube Jehova bụ ka ụmụ Adam na Iv “jupụta ụwa” nakwa ka ihe nile a kpọrọ mmadụ nwee ezi ihe ha ga na-eri n’ụba.—Jenesis 1:28, 29.

Ọ bụ ezie na mmadụ abụọ mbụ nupụụrụ Onye Okike ha isi ma ghara inweta ngọzi ya, nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ agbanwebeghị. Bible kpọrọ Jehova “Onye na-enye ndị agụụ na-agụ nri.” N’ime Bible, e nwekwara ọtụtụ amụma ndị na-egosi na ọ ga-eme ka nsogbu nile a na-enwe n’inweta nri kwụsị kpamkpam.—Abụ Ọma 146:7.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya banyere ihe ịrịba ama, ma ọ bụ ihe àmà, a ga-eji ama oge ọ gaje iguzobe Alaeze ya ma tinye aka iji dozie nsogbu ndị a na-enwe n’ụwa, Jizọs gwara ha ihe ndị ga-eme tupu ya etinye aka. Otu n’ime ha bụ “ụnwụ nri.” Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya tụlee okwu ahụ Jizọs kwuru, ọ ga-edo anyị anya na ahụhụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ata ga-akwụsị n’isi nso. *Matiu, isi 24.

Banyere Paradaịs ahụ Chineke ga-eweta, e buru amụma n’Abụ Ọma 72:16, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” N’Izrel oge ochie, ebe a na-akọkarị ọka bụ na ndagwurugwu. Ma, n’ọnọdụ a dị ngọzi a kọwara n’amụma a, ọka ndị a kọrọ n’ala na-adịtụghị eme nri—bụ́ ndị na-agaraghị amị mkpụrụ ma ihe dị otú ọ na-adịbu—ga-amị mkpụrụ nke ọma. Otu onye ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “N’oge ọchịchị Mezaịa, ọ ga-adị ka à ga-asị na ubi ọka dị ebe nile, ọbụna n’ọnụ ọnụ ugwu, ma ọ bụ dị ka à ga-asị na e si na ndagwurugwu kọrọ ihe ruo n’ọnụ ọnụ ugwu, nke mere ka ala ahụ nile bụrụ sọ ubi ọka.”

Lee nnọọ ọdịiche e nwere n’etiti ọnọdụ e buru amụma ya na Bible na a ga-enwe n’ọdịnihu na ọnọdụ ọtụtụ nde mmadụ nọ na ya taa! N’ezie, n’ọdịnihu ahụ Chineke kwere ná nkwa, ‘ala ga-eme ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.’—Abụ Ọma 67:6.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ka gị na ndị ị hụrụ n’anya nweta ngọzi ndị a na ọtụtụ ngọzi ndị ọzọ a kọwara banyere ha n’amụma Bible ndị a na-emesi obi ike, alala azụ ịjụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị banyere ya ma ọ bụkwanụ gị ejiri adres ọ bụla dabara adaba e depụtara na peeji nke 5 detara anyị akwụkwọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ị chọọ ịtụlekwu otú amụma Jizọs ahụ siworo na-emezu, lee isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 18]