Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara azịza ha nile na peeji nke 13. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Ònye zụrụ ọgba Makpila n’aka Efron onye Het maka iji ya na-eli ozu, mmadụ ole ka e kwuru na e liri na ya? (Jenesis 49:30-33; 50:13)

2. Mgbe Devid na ndị agha ya na-alụso ndị Filistịa agha, n’ihi gịnị ka ndị agha Devid ji jụ na ọ gakwaghị eso ha na-alụ agha? (2 Samuel 21:15-17)

3. Olee osisi na-esi ísì ụtọ a kpọtụrụ aha nanị n’Abụ nke Abụ? (Abụ nke Abụ 1:14; 4:13; 7:11)

4. Olee ihe Gidiọn mere iji mee ka o jide n’aka na Jehova ga-emezu nkwa o kwere isi n’aka ya zọpụta Izrel? (Ndị Ikpe 6:36-40)

5. Gịnị ka a na-akpọ nnukwu ite ọla ahụ ndị nchụàjà ji asa ahụ́ bụ́ nke dị n’ogige ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru? (2 Ihe E Mere 4:6)

6. Olee nke kasịnụ n’ihe ndị Hibru ji atụ ego na ihe ndị ọzọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? (Ezra 8:26)

7. Gịnị dara n’eluigwe mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ? (Mkpughe 12:7)

8. Olee ihe Jizọs kwuru na ọ dịịrị kamel mfe isi na ya gafere “karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke”? (Matiu 19:24)

9. Ole ihe Jizọs kpọrọ ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ n’ihi ozizi ụgha ha ji na-eduhie ndị mmadụ? (Matiu 15:14)

10. Olee eze Siria nke chụpụrụ ndị Juu n’obodo Elat nke Juda, si otú ahụ mee ka Eze Ehaz jiri ụjọ gakwuru Asiria maka enyemaka? (2 Ndị Eze 16:6, 7)

11. Olee nwunye Eze Devid nke mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Itream? (2 Samuel 3:5)

12. Mgbe Josef zipụrụ otu ohu ya ka ọ chụwa ụmụnne ya ma napụta ha iko ya furu efu, ebee ka a chọtara ya? (Jenesis 44:12)

13. Olee onye Keleb nke Jehova tigburu, onye e ji nlelị kọwaa dị ka onye siri ike n’obi, onye jọrọ njọ n’omume, onye ọjọọ, na onye nzuzu? (1 Samuel 25:3, 17, 25, 36-38)

14. Olee ihe ndị Hibru jikarị alụ agha nke Finihas ji magbuo ma Zimri ma Cozbi, si otú ahụ kwụsị ihe otiti ahụ gburu ndị Izrel 24,000 n’Ọzara Moab? (Ọnụ Ọgụgụ 25:6-15)

15. Olee ihe anọ ndị karịrị Agua ịghọta? (Ilu 30:18, 19)

16. Gịnị ka Bible ji mee ihe atụ nke ikike ndị nne na nna nwere n’ebe ụmụ ha nọ? (Ilu 29:15)

17. Olee ngwá ọrụ e ji arụ ọrụ ugbo nke ndị Izrel ji abọ ahịhịa? (Aịsaịa 7:25)

Ajụjụ Nye Azịza

1. Ebreham. Mmadụ isii: Sera, Ebreham, Aịzik, Ribeka, Jekọb, na Lia

2. N’ihi na ike agwụwo ya, ọ fọkwara obere ka Ishbaị-binọb, bụ́ dike onye Filistịa, gbuo ya

3. Henna

4. Ajị anụ

5. “Oké osimiri”

6. Talent

7. Agha

8. “Anya agịga”

9. “Ndị nduzi kpuru ìsì”

10. Rezin

11. Egla

12. “N’akpa Benjamin”

13. Nebal

14. Ube

15. “Ụzọ ugo n’eluigwe; ụzọ agwọ n’elu oké nkume; ụzọ ụgbọ n’etiti oké osimiri; na ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ”

16. Mkpanaka

17. Ọgụ