Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Iwu na Anyị Ga-emerịrị Ememe Agbamakwụkwọ?

Ọ̀ Bụ Iwu na Anyị Ga-emerịrị Ememe Agbamakwụkwọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ọ̀ Bụ Iwu na Anyị Ga-emerịrị Ememe Agbamakwụkwọ?

“Ọ bụ Cindy, bụ́ nwa agbọghọ m na-achọ ịlụ, bu ụzọ kwute okwu izopụ gaa gbaa akwụkwọ n’agwaghị ndị enyi na ndị ikwu anyị nile. Mgbe anyị kparịtasịrị ya, anyị abụọ kpebiri na ime otú ahụ agaghị eri oge dị ukwuu, ọ gachaghịkwa agwụ anyị ike ma butere anyị ahụ́ mgbakasị.”— Allen. *

ỌBỤRỤ na i toruwo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ya abụrụkwa na e nwere onye gị na ya na-ekwu okwu ọlụlụ, echiche nke izopụ ezopụ gaa gbaa akwụkwọ yiri ka ọ̀ pụrụ ịmasị gị. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mmadụ abụọ chọrọ ịlụ onwe ha ka ha gbapụ gaa gbaa akwụkwọ n’agwaghịdị ndị mụrụ ha. Olee ụkpụrụ ndị pụrụ inyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme?

Ịgbaso Omenala Ọ̀ Bụ Ihe Ka Mkpa?

Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye bụ ihe a na-eme n’ọtụtụ obodo, otú e si eme ya dịgasị nnọọ iche. Ihe kasị dị Ndị Kraịst mkpa n’agbamakwụkwọ ha abụghị ma è mere ihe nile omenala chọrọ. (Ndị Rom 12:2) Kama nke ahụ, ihe bụ́ mkpa ha karịsịa bụ ịhụ na omume ha mgbe ha ka na-ekwu okwu ọlụlụ na mgbe ha lụsịrị wetaara Jehova Chineke otuto.—1 Ndị Kọrint 10:31.

Ebe ọ bụ na alụmdi na nwunye bụ ihe e kwesịrị ịkwanyere ùgwù, ọ bụghị ihe ọtụtụ ná ndị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-achọ izowe ezo. N’ọtụtụ mba, Ndịàmà Jehova chọrọ ịlụ di na nwunye na-emekarị ndokwa ịgba akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ha. * E mesịa, ha pụrụ ime oriri agbamakwụkwọ, bụ́ nke ha na-anọ na ya nye ndị enyi na ndị ezinụlọ ha ihe oriri ma meekwa ihe ụfọdụ na-akpa ọchị ma eleghị anya. Ọ dịghị mkpa na a ga-eme ya otú ọ ga-akpọtụ akpọtụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe doro anya na ịhazi agbamakwụkwọ na oriri agbamakwụkwọ na-etinye mmadụ n’oké ndọlị, nakwa na ọ pụrụ ifu nnukwu ego. Dị ka ihe atụ, ịhazi oriri agbamakwụkwọ na United States na-efu ọtụtụ puku dollar.

Iji hụ na ha belatara ihe mgbakasị ahụ́ na ego a na-emefu, ụfọdụ ndị na-achọ ịlụ di na nwunye ekpebiwo ime ya n’ụzọ dịkwu mfe. Cindy na-ekwu, sị: “Anyị gwara ndị mụrụ anyị na anyị agaghị agba akwụkwọ dị ka omenala si dị, n’ihi na anyị chọrọ ka ememe ahụ dịrị mfe ma ghara ifu nnukwu ego. Ndị mụrụ m mesiri anyị obi ike na ha ghọtara ọnọdụ anyị. Ha kwadoro anyị nke ukwuu.” N’aka nke ọzọ, mgbe Allen nke a kpọtụrụ aha na mbụ, bụ́ onye chọrọ ịlụ Cindy, gwara ndị mụrụ ya otú ha chọrọ isi agba akwụkwọ, o siiri ha ike ịghọta ihe mere ha ji mee mkpebi dị otú ahụ. Allen na-ekwu, sị: “Ha chere na ọ bụ ha ka o si n’aka, na ihe mere anyị ji mee mkpebi ahụ bụ n’ihi ihe ha mere. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na o sighị ha n’aka.”

Ndị mụrụ unu pụkwara iwere ya na unu mechuru ha ihu ma ọ bụrụ na unu ekpebie ime ka agbamakwụkwọ unu dịrị nnọọ mfe, n’ihi na ha pụrụ ịchọ ka ọtụtụ ndị bịa soro ha ṅụrịa n’ụbọchị ahụ pụrụ iche. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ị chọghị ịgwa ndị mụrụ gị n’ihi na ị maara na ha agaghị ekwe?

Chebara Mmetụta Ndị Ezinụlọ Gị Echiche

Ọ pụrụ ịbụ na ihe mere ndị mụrụ gị ga-eji jụ bụ n’ihi na ha weere na i torubeghị ime ụdị mkpebi dị mkpa otú ahụ. Ụjọ ha nwere ike ịbụ na ka ị na-etolitekwu, ihe ndị na-amasị gị ugbu a agaghịzịkwa na-amasị gị nakwa na, n’oge na-adịghị anya, ị ga-amalite ịkwa ụta banyere onye ị lụrụ. Ma ọ bụkwanụ, ha pụrụ iwere na i toruwo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma ya abụrụ na ọ dị àgwà ọjọọ ha chọpụtara na onye ị chọrọ ịlụ nwere. Ma ọ bụ, ihe mere ha ga-eji jụ pụdịrị ịbụ n’ihi na gị na onye ahụ ị chọrọ ịlụ adịghị ekpe otu okpukpe.

Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ ezi Ndị Kraịst, ụjọ ahụ ha na-atụ pụrụ ịbụ n’ihi ihe ụfọdụ Bible kwuru. O kwesịrị nnọọ ekwesị na ha ga-ekwupụta nchegbu ọ bụla ha pụrụ inwe. N’ezie, Jehova ga-ele ha anya dị ka ndị leghaara ọrụ ha anya nakwa dị ka ndị na-adịghị ahụ n’anya ma ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ. Gị ige ha ntị n’olu bụkwa maka ọdịmma gị.—Ilu 13:1, 24.

Iji maa atụ: Mgbe ị chọrọ ịzụ uwe, ikekwe ị na-ajụ ndị ọzọ ma uwe ahụ ọ̀ ga-adị gị mma n’ahụ́. O nwere ike ọ bụghị mgbe nile ka ị na-ekwere ihe ha kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ị ka ga-achọkwa ka ezigbo ndị enyi gị gwa gị ma uwe ahụ ma ọ bụkwanụ otú e si kwaa ya ọ̀ ga-adị gị mma n’ahụ́ ka ọ̀ gaghị adị gị mma. Ị na-enwe ekele maka ihe ha gwara gị, ebe ọ bụ na ọ pụrụ inye aka mee ka ị ghara imebi ego. Lee ka o si dị mkpa ọbụna karị na i kwesịrị inwe mmasị ịnụ ihe bụ́ echiche ndị ezinụlọ gị banyere onye ị na-achọ ịlụ. Ọ bụ ezie na ị pụrụ iweghachi uwe mgbe ị zụsịrị ya ma ọ bụkwanụ hapụ iyi ya, ọ dịghị otú ahụ n’ebe alụmdi na nwunye dị. Jehova na-atụ anya ka gị na onye ị lụrụ bigide ruo afọ ndụ gị nile. (Matiu 19:5, 6) Ọ bụrụ na ị lụọ onye ihe na-adịghị adabara gị na ya ma a bịa n’omume nakwa n’ihe ime mmụọ, ọ ga-eme ka ahụ́ ghara iru gị ala ná ndụ gị nile karịa ka iyi uwe na-adịghị gị mma n’ahụ́ ga-eme. (Jenesis 2:18; Ilu 21:9) Ya dị otú a, ohere nke inwe ezi obi ụtọ pụkwara ifunahụ gị.—Ilu 5:18; 18:22.

N’eziokwu, ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ igbochi nwa ha ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’ihi ọdịmma nke onwe ha—dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ha achọghị ka nwa ha si ha n’aka pụọ. Otú ọ dị, tupu i were na ihe mere ndị mụrụ gị ji enwe nchegbu ahụ bụ n’ihi ọdịmma nke onwe ha ma jiri maka ya zopụ gaa gbaa akwụkwọ, ọ́ gaghị aka mma ibu ụzọ chọpụta ihe mere ha ji jụ?

Ihe Ndị Mere Ị Ga-eji Kpachara Anya

Ọ bụ nnọọ eziokwu na ihe ndị na-amasị gị ga na-agbanwe ka ị na-etolitekwu. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-adị ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọworo dimkpa, ewepụwo m omume nwa ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrint 13:11) N’otu aka ahụ, o yiri ka àgwà onye ọzọ na-akpa nke masịrị gị mgbe ị dị afọ iri na ụma ọ̀ ga-adị nnọọ iche na nke ga-amasị gị mgbe i tolitetụkwuru. N’ihi ya, Bible na-atụ aro ka i chere ruo mgbe ị ‘gafere ntoju ntorobịa,’—afọ ndị ị kasị enwe agụụ mmekọahụ—tupu gị ekwuwe okwu ilu di ma ọ bụ nwunye.—1 Ndị Kọrint 7:36.

Gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị ihe na-amasịghị ndị mụrụ gị banyere onye ahụ ị chọrọ ịlụ? N’ihi ahụmahụ ndị mụrụ gị nwere ná ndụ, ikike nghọta ha pụrụ ịbụ nke a zụrụ nke ọma karịa nke gị ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, ha pụrụ ịhụ ọrụ onye ahụ ị chọrọ ịlụ gbara, ebe gị onwe gị na-adịghị ahụ ya. Tụlee ihe a nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn dere: “Onye ezi omume n’anya ndị ikpe ka onye ahụ bụ nke buru ụzọ kpee ọnụ ya; ma mmadụ ibe ya abịa gwupụta ala okwu ya.” (Ilu 18:17) N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ ị chọrọ ịlụ emeela ka i kweta na ya bụ onye kwesịrị gị. Otú ọ dị, mgbe ndị mụrụ gị ‘gwupụtara ala okwu ya,’ ha pụrụ ime ka ị hụ ihe ụfọdụ ndị dị mkpa ka i lebara anya.

Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ichetasiri gị ike na Bible nyere ezi Ndị Kraịst ntụziaka ka ha lụọ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Ị pụrụ ịgbagha okwu ha site n’ikwu na ị maara onye lụrụ onye ya na ya na-anọghị n’otu okpukpe Ndị Kraịst, ma ugbu a, ha abụọ ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. N’eziokwu, nke ahụ na-eme. Ma, ọ dịghị emekebe. Ọ bụrụ na ị lụọ onye gị na ya na-anaghị ekpe otu okpukpe, ọ bụghị nanị na i leghaara ụkpụrụ Jehova anya, kamakwa, ị na-etinye onwe gị n’ihe ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ.—2 Ndị Kọrint 6:14. *

Ihe Amamihe Na-adịghị na Ya nke Ị Na-ekwesịghị Iji Maka Ya Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwunye

Ụfọdụ ndị ntorobịa agbapụla gaa lụọ di ma ọ bụ nwunye n’ihi na ha tinyere aka n’omume rụrụ arụ ma chee na ịlụ onye ahụ ga-eme ka akọ na uche ha ghara ịma ha ikpe. Ma ọ bụkwanụ, ọ pụrụ ịbụ na ha bu n’obi ikpuchi ihe si ná mmehie ha pụta, dị ka afọ ime a na-atụghị anya ya.

Ọ bụrụ na ihe mere i ji alụ di ma ọ bụ nwunye bụ iji kpuchie mmehie i mere, ọ pụrụ ịbụ na ị na-eme ka ihe ka njọ. Solomọn dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ́ ya.” (Ilu 28:13) Nna na nne Solomọn, bụ́ Devid na Bat-sheba, chọpụtara nzuzu dị n’ịnwa izochi omume rụrụ arụ ha mere. (2 Samuel 11:2-12:25) Kama izochi mmehie gị, gwa ndị mụrụ gị na ndị okenye ọgbakọ banyere ya. Nke a ga-achọ obi ike n’aka gị, ma mara na Jehova ga-agbaghara gị ma ọ bụrụ na i chegharịa. (Aịsaịa 1:18) Ozugbo i nwetaghachiri akọ na uche dị ọcha, ị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ime mkpebi dị mma banyere alụmdi na nwunye.

Izere Ịkwa Ụta

Ka Allen na-echeta oge ọ gbara akwụkwọ, o kwuru, sị: “Mkpebi anyị mere inwe agbamakwụkwọ dị mfe mere ka anyị ghara inwe oké mgbakasị ahụ́. Nanị ihe m na-akwara ụta bụ na emeghị m ka ndị ezinụlọ m ghọta nke ọma ihe ndị mere anyị ji mee mkpebi ahụ.”

N’ezie, ma nwoke na nwanyị toruru ịlụ onwe ha hà ga-agba agbamakwụkwọ dị ka omenala si dị ma ọ bụ na ha agaghị agba ya otú ahụ, bụ mkpebi dịịrị ha abụọ. Otú ọ dị, mgbe ị na-eme mkpebi ọ bụla banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye, achụla ya n’ike, soro ezinụlọ gị kwurịta ya, ma ‘na-aghọta ije ụkwụ gị.’ Nke a ga-eme ka ihe ndị ga-eme ka ị kwaa ụta belata.—Ilu 14:15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.

^ par. 7 Ebe ndị a a na-anọ efe ofufe na-abụ ebe magburu onwe ya maka agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova. Agbamakwụkwọ ahụ na-adị mfe, ihe a na-eme na ya na-abụ ịkọwa n’ụzọ dị nkenke, ụkpụrụ Bible ndị ga-atọ ntọala maka ezi alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, a dịghị akwụ ụgwọ maka ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ya.

^ par. 18 Ọ bụrụ na ị chọrọ ebe a kọwakwuru isiokwu a nke ọma, lee Ụlọ Nche nke July 1, 2004, peeji nke 30-31, na nke November 1, 1989, peeji nke 18-22.

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe ị na-eme mkpebi ọ bụla banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gị na ndị ezinụlọ gị kparịta ya