Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ị Hụzielanụ Ihe Nzukọ Jehova Dị Ka Ya”

“Ị Hụzielanụ Ihe Nzukọ Jehova Dị Ka Ya”

“Ị Hụzielanụ Ihe Nzukọ Jehova Dị Ka Ya”

Otu ezinụlọ nke ha na Ndịàmà Jehova kpakọrịtaworo ruo oge ụfọdụ na Finland enwetawo mkpagbu site n’aka ọtụtụ ndị. “Ha ga-erikwa ego unu,” ka ndị mmadụ nọ na-adọ ha aka ná ntị. Ndị ọzọ kwuru, sị, “Ụlọ unu ga-efunahụ unu.” Ka ihe si eme nnọọ, n’otu abalị, ọkụ gbapịara otu akụkụ ụlọ ezinụlọ ahụ, bụ́ ebe ihe na-eme ka ụlọ ahụ kporo ọkụ dị. Nke a bụ nnọọ nnukwu ọdachi n’ebe ugwu ụwa nke e ji oké oyi mara.

Ego ịnshọransị ha ezughịdị ịzụta ngwá ọrụ a ga-eji rụghachi ụlọ ahụ. Ọkụ ahụ gbaranụ mere ka o yie ka ihe ahụ ndị mmadụ kwuru ọ̀ bụ eziokwu. Nna nwe ụlọ ahụ ji mwute na-echeta, sị: “Anyị bịara daa nnọọ mbà n’obi.” N’agbanyeghị nke ahụ, di na nwunye ahụ gara n’ihu ná mkpebi ha mere ịbụ ndị a ga-eme baptizim nanị n’izu atọ na-abịanụ.

Ndị ọgbakọ ha hụrụ nke a dị ka ohere ha nwere itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, nke bụ́: “Ụmụntakịrị, ka anyị na-ahụ n’anya, ọ bụghị n’okwu ma ọ bụ site n’ire, kama n’omume na n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Ndị kwere ekwe ibe ha malitere ime atụmatụ ịrụghachi ụlọ ahụ. Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Finland nyere ntụziaka otú a ga-esi malite ya. E sere ụkpụrụ a ga-eji rụghachi ụlọ ahụ, nweta akwụkwọ ikike n’aka gọọmenti, depụta ihe ndị a ga-eji rụọ ya, ma kpọọ òkù ka ndị ọrụ afọ ofufo bịa nye aka.

Ka ọ na-erule ihe dị ka otu ọnwa ọkụ ahụ gbasịrị, ọrụ biiri ọkụ n’ụlọ ahụ. N’otu ụbọchị Wednesday, Ndịàmà bi n’ógbè ahụ kwatuchaziri ụlọ ahụ. Na Friday ya, site n’enyemaka nke Ndịàmà si n’ọgbakọ ndị ọzọ, a malitere ntọala nke ụlọ ọhụrụ ahụ. N’otu oge mgbe nna nwe ụlọ ahụ gara n’obodo ukwu, ọ hụrụ otu onye ọrụ obodo, bụ́ onye jụrụ ya ma o jirila tapolin kpuchie elu ụlọ ahụ ọkụ gbara ka mmiri ozuzo ghara ịbanye na ya. Nna nwe ụlọ ahụ ji nganga zaghachi ya, sị, “Mba, ọ dịghị tapolin nọ n’elu ya, kama ihe nọ n’elu ya bụ ndị ikom iri atọ!”

N’ụbọchị Saturday, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 50 n’ime ụmụnna ime mmụọ anyị, bụ́ ndị dị nnọọ ike ọrụ, bịara rụọ ọrụ na ya, na-enwe obi ụtọ na ha so nweta ihe ùgwù nke iso nye aka n’ọrụ ahụ. Otu onye agbata obi ha, bụ́kwa onye nyere aka n’ọrụ ahụ kwuru, sị: “N’abalị gara aga, abịara m chewe echiche banyere otú unu si pụọ iche! Unu na-elekọta ma na-enyere ibe unu aka n’ezie.”

Ná mgbede ahụ ka ọrụ ahụ gwụrụ. Ụlọ ọhụrụ ahụ gosiri nnọọ na ịdọ aka ná ntị ahụ e ji ịkpọasị dọọ ndị ezinụlọ ahụ enweghị isi. Otu okenye ọgbakọ na-echeta mgbe ya na nna nwe ụlọ ahụ kwụ otu ebe na-ekiri ụlọ ahụ a rụcharala, wee kwuo, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ ikonye nwanna anyị nwoke a a ka mere baptizim ọhụrụ aka n’olu ma gwa ya, sị, ‘Ị hụzielanụ ihe nzukọ Jehova dị ka ya.’”

[Foto dị na peeji nke 30]

Ihe ọkụ ahụ mebiri

[Foto dị na peeji nke 30]

Mgbe a na-arụgharị ya