Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụrụ Na Nri Adịghịzi

Ọ Bụrụ Na Nri Adịghịzi

Ọ Bụrụ Na Nri Adịghịzi

N’EBE ụfọdụ n’ụwa, ndị bi n’obodo ukwu na-ewere ya na ọ dịghị mgbe ha na-agaghị enweta nri ga-ezuru ha n’ọnụ ego dị mma ma ha gaa n’ụlọ ahịa ma ọ bụ n’ọma ahịa. Mgbe nri dị, echiche ndị na-azụ ya nwere ike ọ gachaghị agawa n’otú e si akọpụta ma na-ekesa ya. Otú ọ dị, n’oge e nwere nsogbu, ndị mmadụ na-amalite iche ihe ọ na-ewe iji kpọsa nri n’ụlọ ahịa. O nwehaala ihe mere ka nri kọọ, ihe pụrụ imebi.

Tụlee ihe mere n’otu mba dara ogbenye nke dị n’Ebe Ugwu Africa. N’ihi nkwụsị gọọmenti kwụsịrị inye ndị ọrụ ugbo ego enyemaka iji na-akọpụtakwu nri, ego e ji azụta otu isi bred bịara mụbaa okpukpu abụọ n’otu ntabi anya. N’ihi ya, ndị mmadụ mere ngagharị iwe n’okporo ámá ndị dị n’obodo ahụ, kụwasịa windo ụlọ ahịa dị iche iche, mebisịakwa ụlọ akụ̀ na post ọfịs dị iche iche. Ọgba aghara bịara daa ebe nile ná mba ahụ, n’ihi ya kwa, gọọmenti mere ihe ozugbo iji kwụsị ọgba aghara ahụ. Mgbe ndị uwe ojii malitere ịgba ìgwè mmadụ egbe iji kwụsị ngagharị iwe ahụ, e kwuru na ha gbagburu mmadụ 120 ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ́.

Otu ihe mere na Britain na September 2000 na-egosi na nri pụrụ ịkọ ọbụna ná mba ndị bara ọgaranya. Ndị na-eme ngagharị iwe n’ihi ego e tinyere n’ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala bịara kpọchie ụzọ ndị e si aba n’ebe ndị a na-esi mmanụ ala, na-eme ka tanka ghara iburu mmanụ ụgbọala pụta. N’ime ụbọchị ole na ole, ọ dịghịzi mmanụ dị n’ebe ndị a na-ere mmanụ ụgbọala, a hụghịzi mmanụ e ji akwọ ụgbọala, ọ dịghịkwa ụgbọala e ji ebuga nri n’ebe ndị a na-anọ ere ha. Ná mba ahụ dum, ụlọ ahịa ukwu na ndị nta, bụ́ ndị na-adabere ná nri ndị a na-ebutere ha “kpọmkwem n’oge a chọrọ ha,” enweghịzi nri ha na-ere.

A na-enwe ọtụtụ nsogbu ma a bịa n’ikesa nri ná mba ndị na-emepe emepe. N’ihi ọtụtụ ihe—ihe ndị dị ka oké ọkọchị, nsogbu akụ̀ na ụba, ọgba aghara obodo, na agha—“a dịkebeghị ahazi ihe nke ọma [n’ihe metụtara nri], a dịkebeghịkwa ekesa ya otú ọ ga-eru onye ọ bụla aka,” ka akwụkwọ bụ́ Feeding the Cities, nke Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo (FAO) bipụtara, na-ekwu. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla e nwere ọnọdụ dị otú a, ọ sọ ya ya bụrụ n’otu ógbè ma ọ bụkwanụ na ọ nọteghị aka, ọ bụ ndị ogbenye na-ata ahụhụ ya.”

Ndị na-eme nnyocha kweere na nkwaga a na-akwaga n’obodo ukwu n’ike n’ike ga-ebutere ndị na-akọpụta nri na ndị na-ekesa ya “oké ihe ịma aka.” A na-ekwu na ka ọ na-erule afọ 2007, ihe karịrị ọkara nke ndị bi n’ụwa ga-akwaga obodo ukwu. Dị ka òtù FAO si kwuo, “ibutere [ndị bi n’obodo ukwu] nri dị mma na nke aka ha pụrụ iru, ga-esiri ndị na-akọpụta nri na ndị na-ekesa ya ike ruo n’ókè nke ime ka ha wụsa ọwa.”

Ịhụ nri ị ga-azụta na nke ị ga-eri bụ ihe ruru ka e chebara ya echiche. N’ihi ya, ruo ókè ha aṅaa ka a pụrụ ịtụkwasị obi n’ụzọ e si akọpụta ma na-ekesa nri? N’ihi gịnị ka ndị ọkachamara ji enwe nchegbu na ọ dịghị ka ọ̀ dị ihe a na-eme n’agbanyeghị mbọ nile a na-agba n’akụkụ a? Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe oge ọ na-adịghị onye ga na-echegbu onwe ya banyere otú ọ ga-esi enweta nri ọ ga-eri?

[Foto dị na peeji nke 11]

Ka ndị mmadụ na-akwakọrọ ihe ndị dị n’ụlọ ahịa n’oge e nwere ụkọ nri

[Ebe E Si Nweta Foto]

BETAH/SIPA