Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-emenyere Mba Ụfọdụ Karịa Ibe ha?

Chineke Ọ̀ Na-emenyere Mba Ụfọdụ Karịa Ibe ha?

Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Na-emenyere Mba Ụfọdụ Karịa Ibe ha?

ỌTỤTỤ mmadụ na-eche na Chineke na-emenyere mba nke ha karịa mba ndị ọzọ. Ma, a sị ha kwuo ihe mere ha ji kwuo otú ahụ, gịnị ka ha pụrụ ikwu? Ụfọdụ pụrụ ịrụtụ aka n’ihe mba ha mezuworo—dị ka mba ndị ha meriri n’agha ma ọ bụ nnukwu akụ̀ na ụba ha nwere. Ha pụdịrị ịkpọtụ uche n’atụmatụ ndị gara nke ọma mba ha meworo iji hụ na e nyejuru ndị agụụ na-agụ afọ, na e chebere ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha, ma ọ bụ n’ịhụ na e kpere ikpe ziri ezi. Ndị ọzọ na-ekwu na Chineke na-emenyere ala nna ha n’ihi ihe okike ndị chọrọ mba ha mma.

A pụrụ ịhụ ndị na-eji mba ha etu ọnụ otú a ná mba nile. Ma, Bible ọ̀ na-akwado echiche ahụ bụ́ na Chineke na-emenyere otu mba karịa ibe ya?

Otu Àgwà Dị Mkpa E Ji Mara Chineke

Azịza ya doro anya ma ọ bụrụ na anyị aghọta otu àgwà dị mkpa e ji mara Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ àgwà Bible kọwara nnọọ nke ọma. Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Dị ka ihe atụ, Ọrụ 10:34 kwuru hoo haa, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” Bible kwukwara na Jehova Chineke anaghị ‘ahụ mmadụ ihu ọma n’ikpe’ nakwa na “ọ dịghị ajọ omume, ma ọ bụ ịhụ mmadụ ihu ọma, . . dị n’ime Jehova, bụ́ Chineke anyị.” (Deuterọnọmi 10:17; 2 Ihe E Mere 19:7) Chineke kpọrọ ile mmadụ anya n’ihu asị; ọbụna ọ na-ewere ya dị ka mmebi iwu.

Otú ọ dị, ị pụrụ iche, sị: ‘Chineke ọ́ hụghị mba Izrel oge ochie n’anya karịa mba ndị ọzọ? Nke ahụ ọ́ dịghị egosi na ọ na-ele mmadụ anya n’ihu?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge Bible, Chineke họọrọ mba Izrel dị ka ndị nke ya, o chebekwara ha n’agha ụfọdụ ha na mba ndị ọzọ lụrụ. Tụkwasị na nke ahụ, Bible kwuru banyere Chineke, sị: “Ọ na-egosi Jekọb okwu Ya, na-egosikwa Izrel ụkpụrụ Ya nile na ikpe Ya nile. O mesoghị mba ọ bụla otú a.” (Abụ Ọma 147:19, 20) Ma, otú a Chineke si meso ndị Izrel ihe ọ̀ na-enye echiche na ọ na-ele mmadụ anya n’ihu? Mbanụ. Tụlee ihe atọ mere anyị ji kwuo otú ahụ.

Nke mbụ, ihe mere Chineke ji họrọ mba Izrel bụ iji mee ihe ga-abara mba nile uru. Chineke na nna ochie nke mba ahụ, bụ́ Ebreham, gbara ndụ, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:17, 18) Ee, nzube Chineke ji họrọ mba Izrel bụ ka o si na ya nweta “mkpụrụ” nke ga-ewetara, ọ bụghị nanị ndị nke otu mba ngọzi bara ụba kamakwa, ndị nke “mba nile nke ụwa.”

Nke abụọ, ọ bụghị nanị ndị Izrel ka Chineke na-agọzi. O nyere ndị si mba ndị ọzọ ohere iso ndị ya ọ họpụtara na-efe ya ofufe. O mere nke a n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (2 Ihe E Mere 6:32, 33) Ọtụtụ mmadụ nabatara ohere ahụ, a gọzikwara ha n’ihi ya. Otu onye a ma nnọọ ama a pụrụ iji maa atụ bụ nwanyị Moab ahụ bụ́ Rut.—Rut 1:3, 16.

Nke atọ, adịm ná mma ahụ pụrụ iche dị n’etiti Chineke na mba Izrel dịruru nanị nwa oge. N’afọ 29 O.A., mba Izrel wepụtara “mkpụrụ” ahụ e buru amụma ya, nke bụ́ Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst. (Ndị Galeshia 3:16) Ma, ndị obodo Jizọs ekwetaghị na Jizọs bụ Mezaịa ahụ, ha jụkwara ya. Ọ gwara ha, sị: “Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:38) Mgbe nke ahụ gasịrị, mmekọ Chineke na ihe a kpọrọ mmadụ na-emekọ ihe abụghịzi n’ụdị nke ịhọrọ otu mba dị ka ndị nke ya na ịkwado ha n’agha ndị ha na-alụ. Kama nke ahụ, o mewo ka ngọzi ya na-eru ihe a kpọrọ mmadụ aka n’eleghị mmadụ ọ bụla anya n’ihu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Onyinye Chineke Nyere Mmadụ Nile

Àjà mgbapụta Jizọs Kraịst bụ onyinye kasịnụ Chineke nyere mmadụ. (Ndị Rom 6:23) Àjà a emewo ka anyị nwee ike ịbụ ndị a gbapụtara pụọ ná mmehie na ọnwụ, na-enye onye ọ bụla n’ime anyị ohere nke inweta ndụ ebighị ebi. Onyinye a bụ maka mmadụ ndị si “n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla.” (Mkpughe 5:9) Ee, Chineke chọrọ ka “onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe” na Jizọs nweta “ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Ozi ọma banyere Alaeze Chineke na-ewetara ndị na-anụ ya ọtụtụ ngọzi. (Mkpughe 14:6, 7) Ọ na-eme ka e nwee olileanya maka ọdịnihu ma na-enye ndụmọdụ amamihe dị na ya nke pụrụ ime ka mmadụ na-ebikwu ndụ obi ụtọ ugbu a. Jehova emewo ndokwa, n’eleghị mmadụ anya n’ihu, na a “ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 16:10) Ozi ọma a dị na Bible, bụ́ akwụkwọ e bipụtarala—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, akụkụ ya ụfọdụ—n’ihe karịrị asụsụ 2,300. Dị ka nna na-ahụ n’anya, Jehova emewo ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile bi n’ụwa nweta “okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:68; Joshua 1:8.

Onyinye ndị a na ọtụtụ onyinye ndị ọzọ si n’aka Chineke dị n’ebe aka onye ọ bụla ga-eru—ee, n’ebe aka ndị si ná mba, agbụrụ, na asụsụ nile ga-eru. N’ihi ya, inweta ihu ọma na ngọzi Chineke adịghị adabere n’ebe a mụrụ anyị ma ọ bụ n’agbụrụ anyị si.

Olee Ndị Na-enweta Ihu Ọma Chineke?

Gịnịzi ka ọ dị mkpa ka anyị mee iji nweta ihu ọma Chineke? Pita onyeozi zara ya site n’ikwu, sị: “Ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) O doro anya na inwe mmasị nkịtị n’ebe Chineke nọ ezughị. Ọ dị mkpa ka anyị mụta iji obi anyị hụ Chineke n’anya, na-atụ egwu imejọ ya. Ọ dịkwa mkpa ka anyị “na-eme ezi omume,” ma ọ bụ na-agbalịsi ike ime ihe dị mma n’anya Chineke.

Iji maa atụ: N’ọtụtụ mba, e nwere ụlọ akwụkwọ ndị e mere maka ọhaneze, ma, ọ bụ nanị ndị a na-akụziri ihe na ya, ha ana-etinyekwa ihe ha na-amụta n’ọrụ ka ọ ga-abara uru. N’otu aka ahụ, Chineke na-enye onye ọ bụla ihu ọma ya, ma ọ dị anyị mkpa itinye mgbalị iji nweta ya. Mgbalị dị otú ahụ na-agụnye ịgụchi Bible anya, igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst, na ibi ndụ dabeere n’ụkpụrụ Bible. Ọ bụrụ na anyị ‘achọọ Jehova’ n’ezie, anyị ga-achọta onwe anyị n’ụzọ na-eduga n’inweta ihu ọma ya.—Abụ Ọma 105:3, 4; Ilu 2:2-9.

[Foto dị na peeji nke 25]

Chineke emewo ka “okwu nke ndụ ebighị ebi” ruo ndị nke mba nile aka