Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?

Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?

Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?

“I NYE mmadụ azụ, i nyela ya nri maka otu ụbọchị. Ị kụziere mmadụ otú e si egbu azụ, i nyela ya nri ga-ezuru ya ná ndụ ya nile.” Okwu a na-egosi n’eziokwu na igboro mmadụ mkpa anụ ahụ́ ya maka nanị otu ụbọchị nwere ike ọ gaghị abachara onye ahụ uru. Ọ kadị mkpa inyere ndị mmadụ aka ịmụta otú ha ga-esi jiri aka ha na-edozi nsogbu ha na otú ha ga-esi na-egbo mkpa ha. Ọ dị mkpa ịkụziri ọtụtụ mmadụ aka ọrụ ndị ga-abara ha uru ná ndụ ma ọ bụ ọbụna ụzọ dị iche ha ga-esi na-ele ndụ anya ma na-ebi ndụ.

Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na ụzọ kasị mma isi nyere ndị na-enweghị ebe obibi aka bụ ịkụziri ha ụzọ kasị mma e si ebi ndụ. Nke a pụtara ịgbaso ndụmọdụ kasị mma e nwere—nke Onye kere mmadụ nyere. Ọ̀ dị onye ka ya ruo eru inye ndụmọdụ dị otú ahụ? Ndụmọdụ ya na-enyere ndị mmadụ aka izere ọtụtụ n’ime nsogbu ndị na-akpata enweghị ebe obibi. Ndụmọdụ ya na-enyekwara ndị nwere obi eziokwu nọ ná nsogbu a aka idozi ya. N’eziokwu, ịgụ Bible nanị agaghị eme ka nsogbu nile anyị na-enwe kwụsị. Otú ọ dị, Bible pụrụ inyere ndị mmadụ aka ịkwụsị omume ọjọọ ndị na-efu ha ihe, mee ka ha nwee ùgwù ma biwe ndụ dị mma.

Ọtụtụ mmadụ enweghịzi ebe obibi n’ihi ịbụ ndị ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mmanya riri ahụ́, ịbụ ndị na-eme mpụ, ndị nwere nsogbu ego, ma ọ bụ n’ihi na ezinụlọ ha tisasịrị. Bible na-enye ndụmọdụ dị mma banyere nsogbu a nile. Ịgbaso ya enyewororị ọtụtụ nde mmadụ aka ime ka ụzọ ha si ele ndụ anya—nakwa àgwà ha n’ezie—gbanwee ma karazie mma. N’eziokwu, nanị ịgbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nwere ike ọ gaghị akwụsị nsogbu nile enweghị ebe obibi na-akpata. Ka ọ dị ugbu a, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọrịa, ịda ogbenye, ihe iri mmadụ ahụ́, na ihe ndị yiri ha bụ nsogbu ndị na-achọkarị ụdị enyemaka ndị ọzọ. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova na-eme ihe nile ha pụrụ ime iji nyere ndị na-ahụju anya n’ihi nsogbu ndị ahụ aka, ha ghọtara na ọ bụ nanị Onye kere mmadụ pụrụ idozi nsogbu ndị ahụ kpamkpam. Ọ̀ ga-edozi ha?

Nzube Mbụ nke Chineke

E nwere ezi ihe mere a ga-eji na-atụ anya na onye ọ bụla ga-enwe ebe obibi n’isi nso. Olee ihe ọ bụ? Tụlegodị ihe a: Jehova Chineke nyere di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ ezigbo ebe obibi. Chineke tinyere ha na paradaịs, bụ́ ebe ha nwere ihe nile dị ha mkpa. A sị na ha gbasoro nduzi nke Onye kere ha, ha gaara emeworị ka ụwa nile bụrụ Paradaịs. Ụmụ ha gaara enwe ezigbo ebe obibi na ihe onwunwe n’ụba. Onye ọ bụla gaara na-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-eso ha emekọ ihe. Nke ahụ bụ otú Chineke zubere ya na mbụ. Ọ gbanwebeghị obi ya.—Abụ Ọma 37:9-11, 29.

Ọzọkwa, ihe ọ bụla Chineke zubere na ọ ga-eme ga-emerịrị. (Aịsaịa 55:10, 11) Bible na-ebu amụma na oge na-abịa mgbe onye ọ bụla ga-enwe ebe obibi nke ya nakwa ihe onwunwe n’ụba. N’eziokwu, tupu nke ahụ ekwe omume, ọnọdụ nile nke ụmụ mmadụ nọ na ya dị ka anyị si mara ha ugbu a ga-agbanwe. Ihe ga-eme ka e nwee mgbanwe dị otú ahụ bụ Chineke ịgbatara ụmụ mmadụ ọsọ enyemaka. Nke ahụ bụ ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:9, 10.

N’ọchịchị ezi omume nke Alaeze Chineke, ụmụ mmadụ na-erube isi ga-ahụ mmezu nke amụma a na-enye nnọọ obi ụtọ, nke sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha . . . Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: . . . ndị M họpụtaworo ga-enwe ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:21, 22) N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ dịghị onye na-agaghị enwe ebe obibi.

Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike inye ndị mmadụ enyemaka ime mmụọ dị ha mkpa ugbu a. Ha na-achọ iji ịhụnanya nyere ndị ọzọ aka dị ka Jizọs tụrụ aro ya. (Matiu 22:36-39) Otu ịhụnanya ahụ ha nwere n’ebe ndị ọzọ nọ na-akpali ha ịgbatara ndị ọdachi na-emere onwe ha mebiri ụlọ ha ọsọ enyemaka. *

N’eziokwu, Ndịàmà ghọtara na ọ gaghị ekwe omume inyere mmadụ nile aka. Jacek, nke si Poland, bụ́ onye bi n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi, na-ekwu banyere ndị na-enweghị ebe obibi, sị: “Ụfọdụ na-eme ihe ike ike ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị ọgwụ ike na-egbu. Ndị ọzọ adịghị enwe mmasị ikwurịta ihe metụtara okpukpe, na-eche na Chineke enweghị mmasị n’ebe ha nọ. Ma, e nwere ndị nke na-anabata Okwu Chineke.” Dị ka ihe atụ, Jacek n’onwe ya mere otú ahụ. Ọ malitewo ịmụtakwu ihe Bible na-akụzi n’ezie.

Onye ọzọ nabatara Okwu Chineke bụ Roman, bụ́ onye na-arịa ọrịa AIDS, nke na-adịbeghị anya ọ kwụsịrị ibi n’okporo ámá. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe m rutere n’ogige ebe gọọmenti na-elekọta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, amaghị m na Ndịàmà Jehova na-enwe nzukọ n’ebe dịdewere ogige ahụ. N’oge na-adịghị anya, mụ na ha malitere ịkparịta ụka n’okporo ámá. Ha kọwakwaara m na Chineke na-anụ ákwá enyemaka ndị na-enweghị ebe obibi na-ebe. Ha gwakwara m ka m bịa otu n’ime nzukọ ha.”—Abụ Ọma 72:12, 13.

Olee otú ihe ndị ọ nụrụ si metụta ya? O kwuru, sị: “Amụtara m na m pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala nakwa na adị m oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. N’ihi ịbụ onye ndị enyi ọhụrụ na-ahụ n’anya gbara gburugburu, akwụsịrị m imetere onwe m ebere ma malite ịgbanwe àgwà m. N’ihi ịhụnanya m nwere n’ebe Chineke nọ, akwụsịrị m ise siga, ma jiri ekpere kwe ya nkwa na m ga na-eje ije n’ụzọ ezi omume.”

Roman nwere ezigbo ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, n’oge na-adịghịkwa anya, e mere ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Site n’enyemaka nke ndị kwere ekwe ibe ya nakwa ndị ọchịchị, ọ kwabara n’ezigbo ụlọ. Roman ji ọṅụ kwuo, sị: “Ụdị obi ụtọ m nwere ugbu a abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Abịaruwo m Chineke nke na-ahụ n’anya nso, bụ́ onye mere ka ndụ m nweghachi nzube. O nyere m ezinụlọ magburu onwe ya nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị mejupụtara, nyekwa m ebe obibi!”

Ọdịnihu Dị Mma Maka Ndị Na-enweghị Ebe Obibi

Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike igosi ndị agbata obi ha ọmịiko, gụnyere ndị na-enweghị ebe obibi. Ọ na-adị ha ọkụ n’obi ịkọrọ ndị ọzọ eziokwu Bible banyere ọdịnihu ka mma—eziokwu nke pụrụ ịgbanwe ndụ ndị mmadụ ọbụna ugbu a.—Jọn 8:32.

Bible na-ekwu, sị: “Ihe nke gbagọrọ agbagọ, a pụghị ime ka ọ dịzie.” (Eklisiastis 1:15) Ee, n’agbanyeghị ezi ihe ndị ọrụ afọ ofufo na ndị ọchịchị bu n’obi ime, o siri ike ikpochapụ nsogbu ndị gbara mkpọrọgwụ ụmụ mmadụ na-enwe, dị ka enweghị ebe obibi na ịda ogbenye. Ma, Bible na-emesi anyị obi ike na n’isi nso, n’ọchịchị Alaeze Chineke, ndị nile na-erube isi ga-anụ ụtọ ọnọdụ obibi ndụ zuru okè.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Dị ka ihe atụ, biko lee Teta! (Bekee) nke January 8, 1993, peeji nke 14-21; Teta! (Bekee) nke October 22, 2001, peeji nke 23-27; nakwa Teta! August 8, 2003, peeji nke 22-27.

[Foto dị na peeji nke 8]

Otu nne si Somalia gbaa ọsọ ndụ nke ji kaadị e ji eketa nri

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Trygve Bolstad/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 9]

Ihe kasị dị ndị na-enweghị ebe obibi mkpa bụ inwe olileanya maka ọdịnihu

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

N’Alaeze Chineke, ọ dịghị onye na-agaghị enwe ebe obibi