Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Na-akpata Ya?

Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Na-akpata Ya?

Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Na-akpata Ya?

“N’ỤWA nile, ihe karịrị otu narị nde mmadụ enweghị ebe obibi,” ka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu. Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ eziokwu, ihe ọ pụtara bụ na otu onye n’ime mmadụ iri isii ọ bụla ma ọ bụ karịa enweghị ezigbo ụlọ o bi na ya! N’agbanyeghị nke ahụ, o siri nnọọ ike ikwu kpọmkwem otú nsogbu a dịruru ná njọ. N’ihi gịnị?

Otú e si akọwa enweghị ebe obibi n’otu ebe n’ụwa na-adị nnọọ iche n’otú e si akọwa ya n’ebe ọzọ. Ụzọ ndị na-enyocha nsogbu a si enyocha ya na ihe ha na-ebu n’obi enyocha ya na-emetụta otú ha si akọwa ya. Otú ha si akọwa ya na-abịazi metụta ọnụ ọgụgụ ha na-enye. N’ihi ya, o siri ike, ma ọ bụrụkwarị na ọ ga-ekwe omume, ịghọta otú nsogbu a dịruru ná njọ.

Akwụkwọ bụ́ Strategies to Combat Homelessness, nke Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Ndị Mmadụ Inwe Ebe Obibi bipụtara, na-akọwa enweghị ebe obibi dị ka mmadụ “ebighị n’ụlọ nwere ihe ndị a tụrụ anya ka ha dịrị n’ụlọ. Ọ na-agụnye ọnọdụ nile a pụrụ iwere dị ka nke na-adịghị mma” n’obodo onye ahụ na-enweghị ebe obibi bi. Ụfọdụ pụrụ ibi n’okporo ámá ma ọ bụ biri n’ụlọ ndị a hapụrụla ahapụ, ebe ndị ọzọ pụrụ ibi n’ụlọ ndị ọrụ ebere rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi. Ndị ọzọkwa na-aga n’ụlọ ndị enyi ha gaa biri. Ụdị ụlọ ọ sọrọ ha biri, otu akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e were mmadụ dị ka onye na-enweghị ebe obibi, ọ pụtara na onye ahụ nọ n’ọnọdụ ‘a na-aghaghị ime ihe banyere ya’ iji nyere ya aka.”

E kwuru na ndị na-enweghị ebe obibi na Poland, bụ́ mba ndị bi na ya ruru ihe dị ka nde 40, ruru ihe dị ka mmadụ 300,000. Ọ dịghị onye ma ole ha dị kpọmkwem, n’ihi na ha nile ebighị otu ebe, ha na-akwagharịkarịkwa akwagharị. Ụfọdụ kweere na ọnụ ọgụgụ ha ga-afọ nnọọ nke nta ka o ruo ọkara otu nde!

Ebe ọ bụ na enweghị ebe obibi bụ nsogbu zuru ebe nile, ọ pụrụ imetụta onye ị maara. Ọnọdụ ọjọọ ndị na-enweghị ebe obibi nọ na ya na-eme ka a jụwa ọtụtụ ajụjụ. Olee otú ndị a si ghọọ ndị na-enweghị ezigbo ụlọ ha bi na ya? Olee otú ha si enweta ihe na-akpa ha ná ndụ? Ònye na-enyere ha aka? Gịnịkwa ka ọdịnihu ga-abụrụ ndị na-enweghị ebe obibi?

Ọtụtụ Mmadụ Na-aghọ Ndị Na-enweghị Ebe Obibi

Sabrina * bụ nne nanị ya na-azụ ụmụ, onye si n’otu ógbè na-emepeghị emepe na Harlem, nke dị na New York City. Ọ kwụsịrị ịga akwụkwọ mgbe ọ gụsịrị klas nke anọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Sabrina na ụmụ ya nwoke atọ bi n’otu ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi. Ya na ụmụ ya ahụ—bụ́ ndị dị ọnwa iri, afọ atọ, na afọ iri—bi n’otu ọnụ ụlọ. Gọọmenti rụrụ ụlọ ndị ahụ maka ndị na-enweghị ezigbo ụlọ ha bi na ya.

Sabrina si n’ụlọ nne ya pụọ n’afọ iri gara aga. Kemgbe ahụ, ya na enyi ya nwoke, ndị enyi, na ndị ikwu ya ebiela. Mgbe ihe bịaziri siere ya ike, ọ gara biri n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi. Ọ na-ekwu, sị: “Anọwo m na-eme m rụtụ ọrụ mụ akwụsị. Ọrụ m na-arụkarị iji na-akpata ego bụ ịkpa ndị mmadụ isi. Ma, ihe ka ukwuu n’oge ndị a, ana m adabere n’ego enyemaka gọọmenti na-enye m.”

N’ụzọ na-eju anya, magazin bụ́ Parents na-akọ na nsogbu Sabrina malitere mgbe ọ chọtara ezigbo ọrụ dị ka onye na-ehicha ụlọ n’otu họtel. Mgbe ọ na-arụ ọrụ na họtel a, a na-akwụ ya ezigbo ego nke ga-eme ka ọ ghara inweta ego enyemaka gọọmenti na-enye. Ma ego ahụ a na-akwụ ya anaghị ezuru ya igbo mkpa ya, dị ka ịkwụ ụgwọ ụlọ, ịzụ nri, uwe, ịkwụ ụgwọ ụgbọ njem, na ịzụ ụmụ ya. N’ihi ya, o siiri ya ike ịkwụ ụgwọ ụlọ, onye o bi n’ụlọ ya bịakwara chọọ ịchụpụ ya. N’ikpeazụ, Sabrina kwụsịrị ọrụ ya ma gaa biri n’otu ebe gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi ruo mgbe o nwetara ọnụ ụlọ o bi na ya ugbu a.

Sabrina na-ekwu, sị: “Ụmụ m atagbuola onwe ha n’ahụhụ. Nwa m nke mbụ agụọlarị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ atọ. O kwesịrị ịnọ na klas nke ise n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ma ihe dọlara ya azụ bụ na ọ gụgharịrị otu klas . . . Ụkwụ anaghị anọ anyị otu ebe. Anyị si ebe a kwara laa ebe a, anyị esikwa ebe ahụ kwara laa ebe ọzọ.” Aha Sabrina abanyela n’aha ndị e depụtara ka gọọmenti nyere aka inweta ụlọ nke ha.

Onye na-enweghị nnọọ ebe ọ ga-akwaga pụrụ iwere ya na Sabrina enweghị nsogbu. Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile na-enweghị ebe obibi na-enwe mmasị ibi n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi. Dị ka Kọmitii Na-ahụ Maka Inyere Ndị Obodo Aka na Poland si kwuo, ụfọdụ “na-atụ ụjọ ntaramahụhụ na iwu ndị a na-enye ndị bi n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi.” N’ihi ya kwa, ha adịghị ekwe ebi n’ụlọ ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, a tụrụ anya ka ndị bi n’ụlọ ndị ahụ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi na-arụ ọrụ ma zere ịṅụ mmanya na ọgwụ ike. Ọ bụghị mmadụ nile dị njikere irube isi n’iwu ndị ahụ. N’ihi ya, dabere n’oge ọ bụ n’afọ, a pụrụ ịhụ ndị na-enweghị ebe obibi ka ha na-ehi n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’okpuru steepụ, n’ọnụ ụlọ dị n’okpuru ala nke a na-akwanye ngwongwo, na bench ndị dị n’ogige ntụrụndụ, n’okpuru àkwà mmiri na flaịova, tinyere n’ebe ndị e nwere ụlọ ọrụ mmepụta ihe. A na-ahụ ọnọdụ yiri nke ahụ n’ebe nile n’ụwa.

N’otu akwụkwọ nke kwuru banyere enweghị ebe obibi, e depụtara ọtụtụ ihe na-eme ka ndị mmadụ ghara inwe ebe obibi na Poland. Ha na-agụnye enwekwaghị ọrụ, iji ụgwọ, na nsogbu ezinụlọ. Ụlọ na-akọ ndị agadi, ndị nwere nkwarụ, na ndị na-arịa ọrịa AIDS. Ọtụtụ ndị na-enweghị ebe obibi nwere nsogbu uche na nke anụ ahụ́ ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị ihe riri ahụ́, karịsịa mmanya. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ nwanyị ndị na-enweghị ebe obibi bụ ndị hapụrụ—ma ọ bụ gbapụrụ—di ha, ndị a chụpụrụ n’ụlọ, ma ọ bụ ndị gbatụrụla akwụna. O yiri ka onye ọ bụla na-enweghị ezigbo ụlọ o bi na ya ò nwere ihe dị mwute kpatara ya.

Ndị Ọnọdụ Ọjọọ Kpataara Ya

Stanisława Golinowska, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ọhaneze na akụ̀ na ụba, kwuru, sị: “[Na Poland] ebe a, ọ dịghị onye ji aka ya họrọ ịbụ onye na-enweghị ebe obibi. . . . Kama, ihe na-akpata ya bụ enweghị ihe e tinyere aka na ya na-aga aga, bụ́ nke meworo ka ike ụwa gwụ ha.” O yiri ka ọ̀ bụ ndị chere na ha agaghị enweli ike idozi nsogbu ha n’ihi ihe ndị dịgasị iche iche, ka nsogbu enweghị ebe obibi na-emetụta. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ bụ ndị a tọhapụrụ n’ụlọ mkpọrọ, ma ha alọta hụ na ndị ohi ezukpọwo ihe ndị dị n’ụlọ ha. Ndị ọzọ bụ ndị a chụpụrụ n’ụlọ. Ọtụtụ aghọwo ndị na-enweghịzi ebe obibi n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha. *

N’otu nnyocha e mere, a chọpụtara na ihe fọrọ nke nta ka o ruo ọkara nke ndị na-enweghị ebe obibi bụ́ ndị e ji mee nnyocha ahụ na Poland, dị mgbe ha na ndị ezinụlọ ha biiri, nweekwa mgbe ha na di ma ọ bụ nwunye ha biiri, ọ bụ ezie na ezinụlọ ha na-enwekarị nsogbu. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha ma ọ bụ bụrụ ndị gbapụrụ n’ihi oké ihe isi ike. Ọ bụ nanị pasent 14 ji aka ha kpebie ịhapụ ụlọ ha.

Mgbe ụfọdụ bisịrị n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi ruo ogologo oge, ha na-enweghachi ike igboro onwe ha mkpa ha ma chọta ụlọ nke ha. N’ebe ndị ọzọ nọ, ọnọdụ a na-esikwu ike. Ha na-anọgide bụrụ ndị na-enweghị ebe obibi n’ihi ọrịa uche ma ọ bụ nke anụ ahụ́, ịṅụ ọgwụ ike, adịghị ike ọrụ, amaghị ọrụ, agụghị akwụkwọ nke ọma, ma ọ bụ ọtụtụ n’ime ihe ndị a a kpọtụrụla aha. Na United States, ihe dị ka pasent 30 nke ndị na-enweghị ebe obibi nọ n’ihe otu òtù ọrụ ebere kpọrọ “ọnọdụ enweghị ebe obibi”—nke na-agụnye ha bie n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi, ha ebie n’ụlọ ọgwụ, e mesịakwa, ha ebie n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ nke dị mwute. A na-ekwu na ọ bụ n’isi ndị a nọgideworo na-enweghị ebe obibi ka a na-emefu ihe ruru pasent 90 nke ego gọọmenti na-ewepụta iji nyere ndị na-enweghị ebe obibi aka.

È Nwere Enyemaka Maka Ndị Na-enweghị Ebe Obibi?

Ụfọdụ ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi na-enyere ndị mmadụ aka isi n’ọnọdụ ahụ pụta. A pụrụ inyere ndị a na-enweghị ebe obibi aka inweta enyemaka ego site n’aka gọọmenti nakwa n’aka ndị ọzọ na inweta enyemaka nke ndị ọkàiwu. A pụkwara inyere ha aka ịhụ na ha laghachikwuuru ndị ezinụlọ ha, ma ọ bụkwanụ ha pụrụ inwe ohere nke ịmụta ọrụ ụfọdụ. Ogige ndị a rụrụ maka ndị na-eto eto na London na-enye ndị mmadụ ọzụzụ n’ihe banyere ihe oriri, isi nri, ibi ezigbo ndụ, na otú a pụrụ isi chọta ọrụ. Nzube e ji enye ọzụzụ ahụ bụ iji mee ka ndị mmadụ lewekwuo onwe ha anya dị ka ndị nwere ùgwù ma kpalie ha ime ihe nakwa inyere ha aka ịmụta ịdị na-emere onwe ha ihe ka ha wee nwee ike inweta ebe obibi nke ha ma nọgide na ya. N’eziokwu, ndokwa ndị dị otú ahụ bụ n’ezie ihe kwesịrị ịja mma.

Otú ọ dị, ọ bụghị mgbe nile ka ndị na-elekọta ụlọ ndị a gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi na-enyere ndị na-enweghị ebe obibi ụdị aka ha chere kasị dị ha mkpa. Jacek, bụ́ onye na-enweghị ebe obibi, nke nọ n’obodo Warsaw, na-akọwa na ụdị ndụ a na-ebi n’ụlọ gọọmenti rụrụ maka ndị na-enweghị ebe obibi adịghị ekwe ka ndị bi na ha nwee ike iso mmadụ ndị ọzọ na-emekọ ihe. Ọ na-eche na ebe ọ bụ na ndị bi ebe ahụ adịchaghị eso ndị bi n’ebe ndị ọzọ akpakọrịta ma na-enwe mkparịta ụka, o yiri ka “hà na-eche echiche n’ụzọ gbagọrọ agbagọ.” Ọ na-ekwu, sị, “Ụlọ ndị a gọọmenti rụụrụ anyị na-eme ka anyị ghara iso ndị bi n’ebe ndị ọzọ na-emekọ ihe, si otú a na-eme ka anyị, bụ́ ndị okenye, na-emezi ihe ka ụmụaka.” N’echiche ya, ọtụtụ ndị bi ebe ahụ “adịghị eche echiche nke ọma.”

Dị ka otu nnyocha e mere na Poland gosiri, owu ọmụma bụ ihe kasị enye ndị na-enweghị ebe obibi nsogbu n’obi. N’ihi ịbụ ndị na-enweghị ego na ndị nọ n’ọkwá dị ala, ndị na-enweghị ebe obibi yiri ka hà na-ewere onwe ha dị ka ndị na-abaghị uru. Ụfọdụ na-amalite ịṅụ mmanya. Jacek na-ekwu, sị, “Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime anyị enweghị olileanya na ihe ga-agbanwe, ha na-eji nwayọọ nwayọọ kwere na ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime iji mee ka ọnọdụ anyị dị mma.” Ihere na-eme ha n’ihi otú ha dị, n’ihi ogbenye ha dara, n’ihi enyemaka ha na-enweghị, nakwa n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ha enweghị ebe obibi.

Francis Jegede, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo, kwuru, sị: “Ma ànyị na-ekwu banyere ndị bi ná mkpakara ụlọ ndị dị n’obodo Bombay [Mumbai] na Calcutta ma ọ bụ ndị na-ehi n’ala nkịtị n’okporo ámá ndị dị na London, ma ọ bụ ụmụaka ndị bi n’okporo ámá ndị dị na Brazil, ọnọdụ ndị na-enweghị ebe obibi nọ na ya jọgburu nnọọ onwe ya ma dị mwute nke na ọ dịghị mma ichetụ ya n’echiche, ma ya fọdụzie ịnọ n’ọnọdụ ahụ anọ.” Mgbe ahụ, o kwukwara, sị: “Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya tinyere ndị a n’ọnọdụ a, ajụjụ a na-ajụkarị bụ, gịnị mere o ji yie ka nsogbu nke enweghị ebe obibi ọ̀ karịrị ụwa ike n’agbanyeghị akụ̀ na ụba na amamihe nakwa nkà na ụzụ nile ụwa nwere?”

O doro anya na enyemaka dị ndị nile na-enweghị ebe obibi mkpa—ọ bụghị nanị enyemaka ego kamakwa ụdị enyemaka nke ga-eme ka obi jụrụ ha ma gbaa ha ume. Enyemaka dị otú ahụ pụrụ ime ka ndị mmadụ nwee ike iche ọtụtụ nsogbu ndị na-akpata enweghị ebe obibi ihu na idozi ha. Ma, ebee ka ndị na-enweghị ebe obibi pụrụ isi nweta ụdị enyemaka ahụ? Oleekwa olileanya e nwere na nsogbu nke enweghị ebe obibi ga-emesị kwụsị kpamkpam?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị dị n’isiokwu ndị a.

^ par. 15 Ọgba aghara ma ọ bụ agha emewokwa ka ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile ghọọ ndị na-enwekwaghị ebe obibi. Ị chọọ ịmata banyere ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya, biko lee usoro isiokwu kwuru banyere ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ nke e bipụtara na Teta! nke February 8, 2002, peeji nke 15-25.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ihe Ogbenye Ọnụ Ntụ Na-akpata

Ọtụtụ narị puku mmadụ bi n’okporo ámá obodo ukwu ndị dị n’India. E kwuru n’oge gara aga na e nwere ihe dị ka mmadụ 250,000 bi ná mkpakara ụlọ n’obodo Mumbai nanị. Ihe ha ji mere ebe obibi pụrụ ịbụ tapolin e kegidere n’osisi nakwa n’ahụ́ ụlọ dịdewere ebe ahụ. N’ihi gịnị ka ha ji biri ebe a kama ịga biri n’ụlọ ndị ahụ dịtụ ọnụ ala bụ́ ndị dị ná mpụga obodo ahụ? Ọ bụ n’ihi na ha na-arụ ọrụ—dị ka ndị na-agba mgbere ahịa, ndị na-ere ihe n’okporo ụzọ, ndị na-akwa trọk, ma ọ bụ ndị akpakara—n’ebe dịdewere ebe na-ekwo ekwo n’obodo ahụ. Akwụkwọ bụ́ Strategies to Combat Homelessness na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime. Ha dara nnọọ ogbenye nke na ha agaghị eji ego nri ha gaa kwụwa ụgwọ ụlọ.”

Ihe dị ka mmadụ 2,300, ndị ihe mejupụtara ha bụ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka bi n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Johannesburg, South Africa. Ha na-arahụ n’elu ebe a na-anọ abanye ụgbọ okporo ígwè, na-eji blanket ndị dọkachara adọka ma ọ bụ katọn emere ihe ndina. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha enweghị ọrụ, ha enweghịkwa olileanya ịchọta ọrụ. Ọtụtụ puku mmadụ gburugburu ụwa nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Ha enweghị mmiri, ụlọ mposi, na ọkụ eletrik. Ọrịa na-agbasa ngwa ngwa n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ.

Ihe kpatara òtù abụọ ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ yiri ha ji nọrọ n’ọnọdụ ahụ doro anya—ọ bụ ogbenye ọnụ ntụ.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe Mba Ụwa Kụrụla Afọ n’Ala Ime

Akwụkwọ bụ́ Strategies to Combat Homelessness, nke Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Ndị Mmadụ Inwe Ebe Obibi bipụtara, kwuru ụfọdụ ihe ọhaneze, ọchịchị, na ndị oji ego achụ nta ego kụworo afọ n’ala ime ma a bịa n’ime ka mmadụ nile nwee ebe obibi. Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ha:

● “Isi sekpụ ntị mere e ji nwee ndị na-enweghị ebe obibi ka bụ na gọọmenti enwebeghị ike iwepụta ọkpụrụkpụ ego a ga-eji mee ka mmadụ nile nwee ezigbo ụlọ, nke bụ́kwanụ ihe ruuru mmadụ nile.”

● “Enweghị iwu kwesịrị ekwesị na emeghị ezigbo nhazi pụrụ . . . imebi ihe ma a bịa n’ime ka imirikiti mmadụ dara ogbenye nwee ụlọ nke ha.”

● “Enweghị ebe obibi bụ otu ihe na-egosi na a dịghị eke ego ụlọ nke gọọmenti na-enye maka iji nyere obodo aka, n’ụzọ ha nhata.”

● “Nsogbu nke enweghị ebe obibi bụ ihe si n’iwu ndị na-elebaghị anya ná mmetụta ọjọọ mgbanwe a na-enwe n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na-enwe, nakwa nke enweghị ụlọ ndị aka ụmụ mmadụ pụrụ iru, ọṅụṅụ ọtụtụ mmadụ na-aṅụ ọgwụ ike, na ọrịa uche na nke anụ ahụ́ ndị ọnọdụ a kasị emetụta . . . n’obodo na-enwe, ma ọ bụkwanụ n’iwu ndị nke weere ọnọdụ a dị ka ihe na-adịghị ihe ha bụ.”

● “Ọ dị nnọọ mkpa ka e nyegharịa ndị ọkachamara na-ahụ maka ndị na-enweghị ebe obibi ọzụzụ. E kwesịrị ịdị na-ele ndị na-enweghị ebe obibi, karịsịa, ụmụaka ndị bi n’okporo ámá anya dị ka ndị ka ga-abara obodo uru, ọ bụghị dị ka ndị bụụrụ obodo ibu arọ.”

[Foto]

Ebe otu nne na ụmụ ya nwanyị abụọ na-arịọ arịrịọ, Mexico

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Mark Henley/ Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 6]

Ọdụ ụgbọ okporo ígwè gọọmenti jizi mere ụlọ maka ndị na-enweghị ebe obibi na Pretoria, South Africa

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Dieter Telemans/Panos Pictures

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 4]

Foto nke dị n’aka ekpe: © Gerd Ludwig/Visum/Panos Pictures; foto nke nwanyị ku nwa: © Mikkel Ostergaard/Panos Pictures; foto nke dị n’aka nri: © Mark Henley/Panos Pictures