Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịma Aka A Na-enwe n’Inyeju Ndị Bi n’Obodo Ukwu Afọ

Ihe Ịma Aka A Na-enwe n’Inyeju Ndị Bi n’Obodo Ukwu Afọ

Ihe Ịma Aka A Na-enwe n’Inyeju Ndị Bi n’Obodo Ukwu Afọ

“Ọrụ inyeju ndị bi n’obodo ukwu ndị dị n’ụwa afọ bụ ọrụ na-esiwanye nnọọ ike, nke ndị na-akọpụta nri, ndị na-eji ụgbọala ebute ya, ndị o ji ego achụ nta ego, na imirikiti ndị na-agba mgbere ahịa kwesịrị ịgbakọ aka rụọ.”—JACQUES DIOUF, BỤ́ ỌGA KPATA KPATA NKE NGALABA ÒTÙ MBA NDỊ DỊ N’OTU NKE NA-AHỤ MAKA NRI NA ỌRỤ UGBO (FAO).

NDỊ ọkachamara n’ikesa nri ekwuwo ọbụna na nri iru onye ọ bụla bi n’obodo ukwu aka pụrụ ịghọ “nsogbu ga-akasị achọ enyemaka nke ndị ọrụ ebere” n’ime narị afọ nke 21.

Mgbe a na-ekwu banyere nri iru onye ọ bụla aka, ihe a na-ekwu bụ “onye ọ bụla inweta nri ga na-ezuru ya mgbe ọ bụla iji na-enwe ezi ahụ́ ike.” Ka ọ dị ugbu a, nri e nwere n’ụwa ga-ezuru ndị nile bi n’ụwa—ma a sị na a na-ekesa ya dị ka mkpa si dị. Ma, ihe a na-ahụ bụ na ihe dị ka nde mmadụ 840 adịghị eriju afọ alakpu ụra kwa abalị. Ọtụtụ n’ime ha bi n’obodo ukwu. Tụlee ihe ole na ole na-akpata nsogbu a.

Obodo Ukwu Ndị Nwere Afọ Nri

Ka ndị mmadụ na-akwagaju n’obodo ukwu, a na-eji nke nta nke nta arụ ụlọ obibi, ụlọ ọrụ, na okporo ụzọ n’ala ndị a na-akọbu ugbo na ha, bụ́ ndị dịdewere obodo ukwu ndị ahụ. N’ihi ya, ebe ndị a na-akọ ugbo na-abịazi dị anya site n’obodo ndị na-eri ihe ndị ahụ a na-akọ. Ọtụtụ mgbe, a dịghị akọ nri ọ bụla n’obodo ukwu ma ọ bụkwanụ nke a na-akọ akọ epee mpe. A na-esikwa n’obodo nta ndị dị anya ebute anụ. N’ọtụtụ mba ndị ka na-emepe emepe, okporo ụzọ ndị a na-esi esi n’ugbo ebubata nri n’obodo ukwu adịghị mma. Nke a na-apụta na ọ ga na-ewekwu oge iji na-ebute nri ndị a, nri ndị ga na-emebi n’ụzọ ga na-ehikwu nne, n’ikpeazụ kwa, ndị na-azụ ha, ndị ọtụtụ n’ime ha dara nnọọ ogbenye, azụwa ha oké ọnụ.

Ndị mmadụ ebijuolarị n’obodo ukwu ụfọdụ ndị dị ná mba ndị na-emepe emepe, o dokwara anya na ndị mmadụ ga-anọgide na-akwaga na ha. Tupu afọ 2015, a na-atụ anya na ndị ga-ebi na Mumbai (bụ́ nke a na-akpọbu Bombay) ga-eru nde mmadụ 22.6, ndị ga-ebi na Delhi eruo nde mmadụ 20.9, ndị ga-ebi na Mexico City eruo nde mmadụ 20.6, ndị ga-ebi na São Paulo eruokwa nde mmadụ 20. A na-ekwu na obodo ukwu ndị nde mmadụ iri bi na ha—dị ka Manila ma ọ bụ Rio de Janeiro—aghaghị ịdị na-atụbata nri ịdị arọ ya ruru puku tọn isii kwa ụbọchị.

Nke a abụghị obere ọrụ. Ọnọdụ a adịwabeghịkwa mma, karịsịa n’obodo ndị mmadụ na-akwata n’ike n’ike na ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụghị nanị na ọnụ ọgụgụ ndị a na-amụ n’obodo Lahore, nke dị na Pakistan, na-ehi nnọọ nne (pasent 2.8), kamakwa ndị mmadụ na-esi n’ime obodo akwaga na ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kọwarala dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ “dị egwu.” N’ọtụtụ mba ndị na-emepe emepe, a na-ahụ ka ọtụtụ nde mmadụ na-akwaga n’obodo ukwu ndị mmadụ jurula nnọọ eju na ha iji nweta ọnọdụ obibi ndụ ka mma, ọrụ, ihe onwunwe, na ihe ndị e ji enyere ndụ aka. N’ihi otú a ndị mmadụ si akwagaju n’obodo ukwu, a na-atụ anya na obodo Dhaka, nke dị na Bangladesh, ga na-eji otu nde mmadụ ma ọ bụ karịa amụba kwa afọ n’ime afọ ole na ole na-abịanụ. A na-atụ anya na ka ọ na-erule afọ 2025, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na China, ndị ụzọ abụọ n’ụzọ atọ n’ime ha bi n’ime obodo, ga-akwagazi n’obodo ukwu. Ka ọ na-erule n’otu oge ahụ, a na-atụ anya na narị nde mmadụ isii ga-ebi n’obodo ukwu ndị dị n’India.

Nkwaga ndị mmadụ na-akwaga n’obodo ukwu na-eme ka ọnọdụ e nwere n’ọtụtụ ebe n’ụwa na-agbanwe. Dị ka ihe atụ, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ bụ nanị pasent 14 nke ndị bi na ya bi n’obodo ukwu n’afọ 1960. Ka ọ na-erule afọ 1997, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo ukwu bịara dịrị pasent 40. A na-atụkwa anya na tupu afọ 2020, ọnụ ọgụgụ ha ga-eru pasent 63. N’ebe ọwụwa anyanwụ Africa, a na-atụ anya na n’ime afọ iri na-abịanụ, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo ukwu ga-eji okpukpu abụọ mụbaa. A na-ekwukwa na pasent 90 nke ndị a ga-amụ ná mba ndị na-emepe emepe n’ọdịnihu ga-abụ n’obodo ndị mepetụrụ emepe nakwa n’obodo ukwu ka a ga-amụ ha.

Iwelitekwu aka ná nri a na-ebute n’obodo ukwu iji na-enyeju ndị a na-akwaga na ha afọ abụghị obere ọrụ. Ọ bụ ọrụ chọrọ na ọtụtụ puku ndị ọrụ ugbo, ndị na-akwanye ngwongwo n’ụgbọala, ndị ọkwọ ụgbọala, ndị na-azụ ahịa, na ndị na-ahụ maka nri, tinyere ọtụtụ puku ụgbọala, ga-agbakọ aka rụọ ya. Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ, obodo ndị dịdewere obodo ukwu adịghị enwe ike ịkọpụta nri na-ezuru ndị bi n’obodo ukwu. Ọzọkwa, n’ihe ka ọtụtụ n’obodo ukwu ndị dị ná mba ndị na-emepe emepe, ihe ndị dị ka ụgbọ njem anaghị ezu, ụlọ ndị a na-akwasa ngwongwo, ụlọ ahịa, na ụlọ ndị a na-egbu anụ anaghịzikwa aba aba.

Ogbenye Ọtụtụ Mmadụ Dara

Ihe ịma aka a na-enwe n’inyeju ọtụtụ mmadụ afọ na-akakwu njọ n’obodo ọtụtụ mmadụ bụ ndị ogbenye. N’ọtụtụ obodo ukwu ndị dị ná mba ndị na-emepe emepe, dị ka Dhaka, Freetown, Guatemala City, Lagos, na La Paz, ọkara ma ọ bụ ihe karịrị ọkara nke ndị bi na ha adịlarị mbụ daa ogbenye.

Mgbe ndị na-eme nnyocha na-ekwu okwu banyere nri a na-ebutere ndị bi n’obodo ndị dị otú a, ha na-eme ka a hụ ọdịiche dị n’inwe nri na ịhụ na o ruru ndị mmadụ aka. Nri pụrụ ịdị n’ahịa ndị dị n’obodo ukwu—nke pụtara na e nwere nri—ma ọ dịghị uru ọ baara ndị ogbenye bi n’obodo ukwu ma ọ bụrụ na aka ha apụghị iru ya. A chọpụtawo na ka ụfọdụ ndị bi n’obodo ukwu na-akpatakwu ego, nri ha na-eri na-ebukwu ibu, ha na-agbanwekwa nri karịa otú ha sibu agbanwe. N’aka nke ọzọ, ọ na-esiri ndị ogbenye bi n’obodo ukwu ike ịzụta nri na-ezuru ha na iri ụdị nri na-agụ ha. Ezinụlọ dị otú ahụ dara ogbenye pụrụ imefu ihe dị n’agbata pasent 60 na 80 nke ego nile ha na-akpata, nanị ná nri.

Ọ bụrụ na a zụọ nri n’akpa, ọ pụrụ ime ka ọnụ ego ya belata; ma, nke ahụ agaghịnụ ekwe omume ma ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị ego ga-ezuru ha ịzụ ya otú ahụ. Ọtụtụ ezinụlọ enweghịdị ego ịzụta nri ga na-edozitụ ha ahụ́, nke ahụ na-emekarịkwa ka ha dị njọ n’anya. Otu ihe atụ bụ obodo ukwu ndị dị n’ebe ndịda Ọzara Sahara nke dị n’Africa, bụ́ ebe a na-ekwu na erighị nri na-edozi ahụ́ bụ “ajọ nsogbu zuru ebe ahụ ọnụ.”

Ndị inweta nri na-akasị esiri ike bụ ndị si n’ime obodo kwata ọhụrụ n’obodo ukwu, bụ́ ndị ọ na-esiri ike ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’obodo ukwu—ha bụ, ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ, ndị ọrụ Bekee nọ n’ọkwá dị ala bụ́ ndị a na-adịghị akwụ ụgwọ ọnwa n’oge n’ihi nsogbu ego gọọmenti na-enwe, ndị nwere nkwarụ, ndị agadi, na ndị ọrịa. Ndị dị otú a na-ebikarị n’ebe a na-enweghị ihe ndị e ji enyere ndụ aka—ọkụ eletrik, mmiri pọmpụ, ụlọ mposi, ezigbo ụzọ, na ebe a na-ekpofu ahịhịa. Ha na-adịkwa ọtụtụ ebi ná mkpakara ụlọ. Ọtụtụ nde ndị na-adọga igbo mkpa ha ndị bụ́ isi n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú a bụ ha kasị ata ahụhụ mgbe ọ bụla e nwere nsogbu n’ihe banyere ikesa nri. Ndị dị otú a na-ebikarị n’ebe dị anya site n’ahịa ndị dị nso, ọ dịghịkwa ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ́ bụghị ịkwụ nnukwu ego maka nri ndị na-abụghị ezigbo ya. N’ezie, ha nọ n’ọnọdụ dị mwute.

Ọnọdụ Ndị A Na-ejighị n’Aka na Ndị Na-akpata Ọrịa

N’ọtụtụ ebe n’obodo ukwu, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ka ọtụtụ mmadụ na-arụ ụlọ gháá ghàà gháá nakwa n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Nke a na-eme ka e nwee ọnọdụ ndị na-akpata ọrịa, meekwa ka obodo bụrụ nke obi na-ekoro mmadụ n’elu na ya nakwa nke ndị omekome juru na ya. Akwụkwọ bụ́ Feeding the Cities, nke òtù FAO bipụtara kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, ndị na-elekọta obodo ukwu ndị dị ná mba ndị na-emepe emepe na-adọga ịhụ otú ha ga-esi anagide imerime ndị na-akwata n’ebe doro anya na ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị bi na ya ka ebe ahụ ga-aba.”

N’ọtụtụ ebe n’Africa, a dịkebeghị eme nhazi tupu e guzobe ahịa. Ndị mmadụ na-amalite ire ahịa ha n’ebe ọ bụla ha hụrụ ndị ga-azụ ya. N’ihi ya, ahịa e ji otú a malite adịghị enwe ọbụna ihe ndị kasị mkpa ahịa kwesịrị inwe.

N’obodo Colombo, nke dị na Sri Lanka, ahịa ukwu na ndị nta e nwere ebe ahụ dị n’ebe ha na-ekwesịghị ịdị, ahịa ndị ahụ adịtụghịkwa aba aba. Ndị na-anya gwongworo ji mwute na-ekwu na ọ na-ewe ha ọtụtụ awa iji rute ma pụta n’ọma ahịa ukwu nke obodo ahụ. Ebe ndị a na-adọba ụgbọala na ebe a na-anọ akwanye ma na-ebutu ihe n’ụgbọala adịghị aba aba.

N’ebe ndị ọzọ, a dịghị elekọta ahịa nke ọma. Ọnọdụ na-adịghị ọcha a na-enwe n’ihi unyí ndị si n’ihe ndị a na-ere n’ahịa, na-akpatara ndị mmadụ ọrịa. Onyeisi nke otu obodo ukwu dị n’Ebe Ndịda Eshia kwuru, sị: “Nsogbu ndị a so eme ka ndị mmadụ nọgide na-arịa ọrịa.”

Ihe a chọpụtara n’otu nnyocha e mere banyere anụ ndị a na-ere n’ahịa n’otu obodo ukwu dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Eshia mere ka a ghọta otú nsogbu nke edebeghị ihe ọcha na nke enweghị ebe dị mma a na-anọ ere ahịa dịruru ná njọ. N’ebe ahụ, ọ bụghị ihe ọhụrụ “ịkpọsa anụ n’ala nkịtị n’ebe ájá na mmiri ruru unyí ga na-emesa ya.” A hụrụ nje a na-akpọ salmonella na pasent 40 nke anụ ezì e ji mee nnyocha ahụ, hụkwa ya na pasent 60 nke anụ nama e ji mee nnyocha ahụ, ebe nje a na-akpọ E. coli dị n’anụ nama nile e ji mee nnyocha ahụ. A hụkwara anụ ndị ihe ndị dị ka òzé na mercury banyere na ha, na-eme ka ha ghara ịdị mma oriri.

N’ihi ịbụ ndị na-adịghị enweta nri mgbe ọ bụla ha chọrọ ya, ndị bi n’obodo ukwu, dị ka ọtụtụ ndị bi na Kano, Nigeria, na-anwa ịkọ ihe n’ebe ọ bụla ha hụrụ ala. Ma, ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị ha nwe ala ndị ahụ. N’ihi ya, a pụrụ ịchụpụ ha ebe ahụ, ihe nile ha tara ahụhụ kọọ n’ugbo ahụ efunahụkwa ha.

Olivio Argenti, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ikesa nri n’obodo ukwu, nke na-arụ n’òtù FAO, kọwara ihe ọ hụrụ mgbe ọ gara n’otu ebe ndị bi n’obodo ukwu na-akọ ugbo na Mexico. Ebe a ha na-akọ ugbo dịdewere otu osimiri nke ndị bi n’obodo nta dị nso na-awụnye mmiri nsị́ ha. Ndị ọrụ ugbo bi n’ógbè ahụ na-esi ná mmiri ahụ ekute mmiri ha na-agba n’ubi akwụkwọ nri ha, ha na-ejikwa ájá mmiri ahụ akọ ubi mkpụrụ ọghịgha. Argenti na-ede, sị: “Ajụrụ m ndị ọchịchị obodo ahụ ma hà ma ihe ize ndụ ọnọdụ a pụrụ itinye mmadụ na ya, ha asị na ọ dịghị ihe ọ bụla ha pụrụ ime n’ihi na ha enweghị ego ma ọ bụ ngwá ọrụ ha ga-eji eme ihe banyere ya.” A na-ahụ nsogbu yiri nke ahụ n’ọtụtụ ebe ná mba ndị na-emepe emepe.

Obodo Ukwu Ndị Na-adọga Ịkpa Afọ Ha

O yiri ka chi ọ̀ ga-eji, bọọkwa ma a gụwa nsogbu obodo ukwu ndị a na-akwataju na ha n’ike n’ike na-enwe. Òtù mba ụwa dị iche iche, ndị na-eme nhazi, na ndị ọchịchị na-eme ihe ha pụrụ ime iji dozie nsogbu ndị a. Ụzọ ndị ha si eme ya na-agụnye ịgba ndị bi n’ime obodo ume ịdị na-akọpụtakwu nri na inyere ha aka ime ya, tinyere ịrụkwu ụzọ, ahịa, na ebe ndị a na-anọ egbu anụ. Ha na-ahụ mkpa ọ dị ịgba ndị mmadụ ume iwepụta ego ha iji rụọ ụlọ nkwakọba ihe, ime ka ọ dịkwuoro ndị ọrụ ugbo, ndị na-ere ahịa, na ndị na-akwọ ụgbọala mfe ibite ego, na ịhụ na onye ọ bụla na-agbaso iwu ndị kwesịrị ekwesị banyere azụmahịa na idebe ihe ọcha. Ma, ndị na-eme nnyocha na-ekwu na n’agbanyeghị mgbalị nile e merela, ọtụtụ ndị ọchịchị obodo ekwebeghị aghọta nsogbu a e nwere ma mee ihe ha kwesịrị ime banyere ya. Ọbụna mgbe ha mere ihe banyere ya, ego ha nwere adịghị ezu igbo mkpa ahụ.

Oké ihe ịma aka obodo ukwu na-enwe, karịsịa ná mba ndị na-emepe emepe, emewo ka e nye ịdọ aka ná ntị ndị chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ha. Dị ka Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Inyocha Nri, bụ́ nke dị na Washington, D.C., si kwuo, “ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo ukwu ga-anọgide na-amụba, nsogbu ndị a [agụụ, erighị nri na-edozi ahụ́, na ịda ogbenye] ga-esokwa ha na-amụba—ọ gwụla ma ànyị mere ihe banyere ha ugbu a.” Banyere ihe obodo ukwu ndị dị ná mba ndị dara ogbenye ga-adị ka ya n’ọdịnihu, Janice Perlman, bụ́ onyeisi oche nke Mega-Cities Project, bụ́ òtù mba ụwa nke ọrụ ya bụ ịchọta ihe ngwọta maka nsogbu ndị a na-enwe n’obodo ukwu, kwuru, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe e nyere ọtụtụ mmadụ buru ibu nri, ebe obibi, ọrụ, ma ọ bụ ụgbọ njem n’okpuru ọnọdụ tara akpụ otú a nke ego na-adịghị ezu, nke ala na-adịghịkwa aba ndị mmadụ. Obodo ukwu dị iche iche ejuwela n’ọnụ. Oge ga-erukwa mgbe ha na-agaghịzi enwe ike igbo mkpa nke ndị bi na ha.”

Otú ọ dị, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na n’isi nso, a ga-edozi nsogbu nke ịkọpụta na ikesa nri.

[Igbe dị na peeji nke 13]

OBODO UKWU NDỊ MMADỤ NA-AKWAGAJU NA HA

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile a na-atụ anya ịmụ n’ụwa nile n’ime afọ 30 na-abịanụ ga-abụ n’obodo ukwu ka a ga-amụ ha.

A na-atụ anya na ka ọ na-erule afọ 2007, ihe karịrị ọkara nke ndị nọ n’ụwa ga-ebi n’obodo ukwu.

A na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo ukwu n’ụwa nile ga-eji pasent 1.8 na-amụba kwa afọ; o jiri otú a na-amụba, ọ pụtara na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo ukwu ga-amụba okpukpu abụọ n’ime afọ 38.

A na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ obodo ukwu ndị nde mmadụ ise ma ọ bụ karịa bi na ha ga-esi n’obodo 46 n’afọ 2003 mụbaa ruo obodo 61 n’afọ 2015.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ World Urbanization Prospects—The 2003 Revision, Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Akụ̀ na Ụba na Ihe Ndị Metụtara Ọhaneze, Ngalaba nke Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Mmadụ

[Igbe dị na peeji nke 14]

ỤFỌDỤ IHE NDỊ NA-EME KA NRI DỊ ỤKỌ NA MMETỤTA HA NA-ENWE

“N’ụwa nile, ọ bụ ihe a ma nke ọma na mgbe ọ bụla ọnụ ahịa nri rịrị nnọọ elu, a na-enwe nsogbu n’ọchịchị obodo ukwu, na-enwekwa ọgba aghara n’etiti ọhaneze.”—Jacques Diouf, bụ́ ọga kpata kpata nke Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo.

N’afọ 1999, ụdị oké ifufe abụọ kpara ógbè Caribbean na Ebe Etiti America aka ọjọọ, mebie ọtụtụ ihe, mee ka ndị mmadụ kwụsị ọrụ ndị ha na-arụ kwa ụbọchị, meekwa ka nri kọọ.

Ngagharị iwe e mere n’ihi mbuli e buliri ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala n’Ecuador n’afọ 1999 nakwa na Britain n’afọ 2000 mere ka inweta nri sie ike.

Ụkọ nri so ná nsogbu agha na-akpata.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

IHE ATỤ NKE OTU ONYE N’IME ỌTỤTỤ NDE NDỊ ỌZỌ

CONSUELO na ụmụ 13 ya bi n’otu obodo nta (nke e gosiri n’elu) bụ́ nke dị ná mpụga obodo Lima, Peru. Mmadụ atọ n’ime ụmụ ya na-arịa ụkwara nta. Consuelo na-ekwu, sị: “Anyị bibu n’ugwu, ma n’otu abalị, ọtụtụ narị ndị anyị na ha bi n’otu ebe akwaga obodo ukwu. Anyị chere na ọ bụrụ na anyị akwaga Lima, na ụmụ anyị ga-aga akwụkwọ ma yiwezie akpụkpọ ụkwụ. Ihe ga-akara ha mma ebe a.’” N’ihi ya, ndị obodo ahụ kpara ute, n’otu abalị kwa, ha nile kwagara obodo ukwu ma jiri ute ndị ahụ rụọ ụlọ ute. N’ụtụtụ ya, ụlọ mkpakara e nwere ebe ahụ bịara hie nne nke na ndị ọchịchị apụghị ịchụpụ mmadụ nile ahụ.

Elu ụlọ Consuelo nwere nnukwu oghere, e teghịkwa ala ụlọ ya ete. O kwuru, sị: “Ana m akpa ọkụkọ ndị a iji resị ha ndị ọgaranya.” Ọkụkọ ọ na-ekwu banyere ha bụ ọkụkọ ndị nọ na-akpagharị gburugburu ụlọ ya ahụ. “Achọrọ m inweta ego m ga-eji zụtara nwa m nwanyị akpụkpọ ụkwụ. Ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ m ga-eme ma ọ́ bụghị iji ya kwụọ ụgwọ ọgwụ na nke ndị ụlọ ọgwụ sị m kwụọ.”

Nri Consuelo nwere bụ nanị yabasị ole na ole. Ọrụ siri ike nchọta, o nweghịkwa ego na-ezuru ya ọbụna iji zụta mmiri mgbe nile. E nweghị mmiri pọmpụ n’ụlọ mkpakara ahụ o bi, ụlọ mposi adịghịkwa na ya. O kwuru, sị: “Anyị na-aga mposi n’ite a. N’abalị, ana m ezi ụmụ m ka ha gaa kwafuo ya. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị nwere ike ime.”

Di Consuelo adịghị enyere ya aka, Consuelo adịkebeghịkwa ahụ ya. Consuelo dị nanị afọ iri atọ na ụma, ma i lee ya anya, ị ga-eche na ọ karịala nnọọ otú ahụ. Otu onye edemede nke gbara ya ajụjụ ọnụ kwuru, sị: “I lee ya anya ná mkpụrụ anya ojii ya ahụ dị obere, ị ga-achọpụta na ike ụwa agwụla ya. Ha enweghịzi olileanya.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ In Context

AP Photo/Silvia Izquierdo

[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]

“ÈKWESỊRỊ M ỊKWAGA OBODO UKWU?”

ONYE ọ bụla nke na-achọ ịkwaga obodo ukwu kwesịrị ịtụle ihe ụfọdụ. Akwụkwọ bụ́ Feeding the Cities nke Ngalaba Òtù UN nke Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo bipụtara, na-ekwu, sị: “Otu n’ime ihe ndị kasị eme ka ndị mmadụ na-enwe mmasị ịkwaga obodo ukwu bụ na ha na-atụ anya na ihe ga-akara ha mma ebe ahụ karịa n’ime obodo.” Otú ọ dị, “ihe nwere ike ọ gaghị akara ha mma ozugbo, ikekwe, ọ gaghịdị aka mma n’oge ndụ ha.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị si n’ime obodo kwaga obodo ukwu na-abanye ná nsogbu nke enweghị ebe obibi, enweghị ọrụ, ma daa ogbenye karịa ka ha daburu, ihe a nile n’ebe ha na-amaghị ala. Ya mere, ọ bụrụ na ị na-achọ ịkwaga obodo ukwu, ì ji n’aka na ọ ga-eme ka i nwee ike igbo mkpa ezinụlọ gị? A nakebeghị akwụ ezigbo ego n’ọrụ ndị a na-ahụ n’obodo ukwu, ma ọ bụrụkwarị na ọ dị nke a hụrụ. Nrụgide nke ịrụ ọrụ ogologo oge iji hụ ihe gị na ezinụlọ gị riri ọ̀ pụrụ ime ka gị ma ọ bụ ezinụlọ gị leghara ihe ndị unu weere dị ka ihe ndị dị mkpa anya?—Matiu 28:19, 20; Ndị Hibru 10:24, 25.

Ụfọdụ ndị nne na nna ahọrọwo ịkwaga obodo ukwu ma hapụ ezinụlọ ha n’ụlọ. Nke a ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya? Iwu ji ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst igbo mkpa anụ ahụ́ nke ezinụlọ ha. Ma, ọ bụrụ na ha na ezinụlọ ha anọghị, olee otú ha ga-esi elekọta ha n’ụzọ ime mmụọ ma lebara ihe ndị na-enye ha nsogbu n’obi anya? (1 Timoti 5:8) Ndị bụ́ nna hà ga-enwe ike ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova?” (Ndị Efesọs 6:4) Di ịhapụ nwunye ọ́ pụghị itinye ha abụọ n’ọnwụnwa nke ime omume rụrụ arụ?—1 Ndị Kọrint 7:5.

N’ezie, ọ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu ka ọ dịịrị ikpebiri onwe ha ma hà ga-akwaga ebe ọzọ ma ọ bụ na ha agaghị akwaga. Tupu Ndị Kraịst emewe mkpebi dị otú ahụ, ha kwesịrị ịtụle ihe nile nke a metụtara ma jiri ekpere chọọ nduzi Jehova.—Luk 14:28.

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

N’obodo ukwu dị iche iche, e nwere ọtụtụ ebe ndị ruru unyí, okporo ụzọ anaghịkwa aba ụgbọala ndị na-agba na ha

India

Niger

Mexico

Bangladesh

[Foto dị na peeji nke 16]

N’ọtụtụ ezinụlọ ndị dara ogbenye bụ́ ndị bi n’obodo ukwu, ọbụnadị ụmụaka na-arụ ọrụ

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 16]

India: © Mark Henley/Panos Pictures; Niger: © Olivio Argenti; Mexico: © Aubrey Wade/Panos Pictures; Bangladesh: © Heldur Netocny/ Panos Pictures; foto nke dị n’ala ala: © Jean-Leo Dugast/Panos Pictures