Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ike Ime Ọzọ?

Ò Nwere Ike Ime Ọzọ?

Ò Nwere Ike Ime Ọzọ?

Ọ BỤRỤ na anyị echee echiche laa azụ n’ihe ndụ dị ka ya ihe dị afọ 85 gara aga, oge ahụ pụrụ iyi anyị oge a na-eme ihe mgbe ochie, ọ pụkwara ọbụna ịdọrọ mmasị anyị. Dị ka ihe atụ, ná mba ụfọdụ ndị dị n’America nakwa na Europe, ọ bụ oge a ka nwere ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ, oge a ka na-ekpu okpu elu ya toro ogologo, na oge a ka na-eyi sket ogologo ndị na-ekusa ekusa ma na-akpụ n’ala. Ọ bụkwa oge na-eyi egwu, mgbe imirikiti mmadụ nọ na-anwụ n’ụwa nile. Gịnị gburu ha?

Ọ bụghị agha gburu ha, ọ bụ ezie na a na-alụ agha n’oge ahụ. Ihe gburu ha bụ ihe ọzọ dị iche, nke a sị na ọ bụ ihe kasị gbuo mmadụ kemgbe ụwa. Ọ bụ ahụ́ ọkụ si Spen, ma ọ bụ influenza ahụ mere n’afọ 1918 ruo 1919.

Ahụ́ ọkụ ahụ gburu ọtụtụ mmadụ n’ihi na e nweghị ezigbo ọgwụ e ji agwọ ya ma ọ bụ ụzọ e si agwọ ya. Ọtụtụ nde ndị ntorobịa ahụ́ dị nnọọ mma nwụrụ ọnwụ ike n’oge ha ka nọ n’uju ndụ ha. Ozu bịara jupụta ebe nile, na-echezi ka e lie ha. N’obodo ụfọdụ, ndị nile bi na ha nwụchapụrụ.

Ihe a nile mere n’ihe dị ka afọ 85 gara aga. Ànyị ma ihe kpatara ọrịa ahụ? Ọdachi dị otú ahụ ò nwere ike ime ọzọ? Ọ bụrụ na o mee, ànyị nwere ike ichebe onwe anyị?

O nwere ihe ọzọ na-adọrọ mmasị banyere ya. Ị̀ ma na o nweela ihe Bible kwuru eri ogologo oge gara aga banyere ọrịa na-efe efe anyị hụrụla n’oge anyị a? (Luk 21:11; Mkpughe 6:8) Ahụ́ ọkụ ahụ si Spen ò so ná mmezu amụma Bible? A ga-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu ndị na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ebe a na-akwadebe ili ndị ahụ́ ọkụ ahụ si Spen gburu na Philadelphia, U.S.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ́bá akwụkwọ nke College of Physicians of Philadelphia