Ọrịa Zuru Ụwa Ọnụ Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịtụ Anya Ya n’Ọdịnihu?
Ọrịa Zuru Ụwa Ọnụ Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịtụ Anya Ya n’Ọdịnihu?
INFLUENZA ahụ mere n’afọ 1918 ruo 1919 echetarala nnọọ ụfọdụ ndị na-amụ banyere ya ihe ndị Bible buru n’amụma. Dị ka ihe atụ, Gina Kolata kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Flu—The Story of the Great Influenza Pandemic of 1918 and the Search for the Virus that Caused It, sị: “Ha kpọrọ ọrịa ọjọọ ahụ pụtara n’afọ 1918 influenza, ma ọ dịghị ka influenza ndị ọzọ e nwetụrụla. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ọ bụ amụma Bible mezuru.”
Ọ̀ dị ihe Bible kwuru n’ezie banyere ọdachi a kpara ụmụ mmadụ aka ọjọọ? N’ezie, ọ dị.
Amụma Bible na Ọrịa Na-efe Efe
Ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst jụrụ ya banyere ihe ịrịba ama nke “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3) Jizọs zara ha ajụjụ ahụ site n’ịsị: “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze; a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe . . . ga-adịkwa site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.” (Luk 21:7, 10, 11) Bible bukwara amụma na n’oge ọgwụgwụ, a ga-enwe “ihe otiti na-akpata ọnwụ.”—Mkpughe 6:8.
Ahụ́ ọkụ ahụ si Spen malitere mgbe Agha Ukwu ahụ (1914-1918), nke e mesịrị kpọwa Agha Ụwa nke Mbụ, na-achọ ibi. N’oge ahụ ka a malitere ịhụ mmezu amụma Bible banyere “ụbọchị ikpeazụ.” N’amụma ndị ahụ, e kwuru banyere ụkọ nri, oké ala ọma jijiji, ịba ụba nke mmebi iwu, na oké ndakpọ nke omume ọma. Ihe ịrụ ụka adịghị Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5.
ya na ị ma na ihe ndị ahụ na-eme n’ụwa taa.—Mmezu amụma ndị metụtara “ọrịa na-efe efe” na “ihe otiti na-akpata ọnwụ” emeela ka ndị mmadụ nọrọ n’oké ụjọ ma na-ahụsi anya, ọ tawokwa isi ndị mmadụ. Dịkwa ka akwụkwọ bụ́ Microbes and Infection si kwuo, “ọ dịghị ihe mere a ga-eji chewe na a gaghị enwe ọrịa ọzọ ga-ezu ụwa ọnụ n’ọdịnihu. O yiri ka nke ahụ ọ ga-emerịrị.”
Ihe ahụ Na-eyi Egwu Ka Dịkwa
Magazin bụ́ Emerging Infectious Diseases nke April 2005 na-ekwu, sị: “Ndị nwere olileanya na ihe ga-adị mma nwere mgbe ha chere na a gaghịzi na-atụ egwu ọrịa ọjọọ ndị na-efe efe.” Otú ọ dị, magazin ahụ kwukwara na “ọrịa na-efe efe anọgidewo na-apụta n’esepụghị aka.” Magazin bụ́ Nature nke July 8, 2004, kwuru ihe nke a kpatarala, sị: “E kwuru na ọrịa na-efe efe na-egbu ihe dị ka nde mmadụ 15 . . . kwa afọ n’ụwa nile.”
Magazin ahụ na-akọwakwa, sị: “Mpụta ọrịa AIDS pụtara mere ka ndị mmadụ mara na ọrịa na-efe efe abụghị ihe a na-agbata n’ọsọ, meekwa ka ha mara ihe ndị pụrụ ime ma ọ pụta.” Òtù UNAIDS, bụ́ nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu na òtù ndị ọzọ gbakọrọ aka guzobe iji na-ahụ maka ọrịa AIDS, na-akọ, sị: “A na-atụ anya na, n’agbata afọ 2000 na afọ 2020, nde mmadụ 68 ga-anwụchu ọnwụ n’ihi ọrịa AIDS ná mba 45 ọrịa a kasị akpa aka ọjọọ.”
N’ime afọ 25 gara aga, ọrịa AIDS akpaala ike dị egwu, o gbuola ihe karịrị nde mmadụ 20. Ma ahụ́ ọkụ ahụ si Spen kpara ike nke ya n’ime ihe ji nke nta karịa otu afọ. Ugbu a, dị ka ịdọ aka ná ntị ndị a nọgiderela na-enye na-egosi, o yiri ka oge e kwesịrị inwe influenza ọzọ nke ga-adị egwu, nke ụwa na-adịbeghịkwa njikere maka ya, ò ruola ma gafee.
Na May 19, 2005, ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ Reuters Alert Net dọrọ aka ná ntị banyere otú nje virus ndị ọhụrụ na-akpata oké ahụ́ ọkụ si nọgide na-apụta, ma kwuo na ha “na-eme ka a nọgide na-atụ egwu na ọrịa ọjọọ ga-ezu ụwa ọnụ nwere ike ịpụta ọzọ.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal nke May 18, 2005, kwuru, sị: “E nwere nje na-akpatara ọkụkọ ahụ́ ọkụ ugbu a n’Eshia. Ihe a na-akpọ ya bụ H5N1. Oge mbụ a hụrụ nje a bụ n’afọ 1997, n’ahịa ọkụkọ dị na Hong Kong. Ụzọ o si akpa ike dị egwu—ọ na-egbu ihe ruru pasent 80 nke ndị butere ya.” E kwuru na ndị metụrụ ọkụkọ bu nje a ahụ́ pụrụ ibute ya.
Ọdịnihu—Ọ̀ Ga-adị Mma Ka Ọ̀ Ga-adị Njọ?
Olileanya anyị na-enwe inwe ezi ahụ́ ike n’ọdịnihu nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume. Mgbe Jizọs Kraịst kwuru na a ga-enwe ọrịa na-efe efe n’ụbọchị ikpeazụ, o gosiri n’ezie na e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee nchegbu. Otú ọ dị, Bible kwukwara ihe ga-eme ka e nwee olileanya. Dị ka ihe atụ, Chineke kwere Noa na ezinụlọ ya nkwa tupu Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ ewere ọnọdụ. O bu ụzọ dọọ Noa aka ná ntị banyere mbibi ahụ na-abịanụ, ma mesịa nye Noa ntụziaka ka o wuo ụgbọ, nke ya na ndị ọzọ ga-aba n’ime ya ka e wee chebe ha. (Jenesis 6:13, 14; 7:1) Pita onyeozi kọwara na “ndidi Chineke nọ na-echere n’ụbọchị Noa, ka a nọ na-ewu ụgbọ ahụ,” nakwa na mgbe e wusịrị ụgbọ ahụ, e buuru ndị ahụ lanarịrịnụ “gabiga na mmiri ahụ n’enweghị mmerụ ahụ́.”—1 Pita 3:20.
Jizọs Kraịst, bụ́ onye buru ọtụtụ amụma banyere ihe ndị anyị na-ahụ n’ụwa taa, mere ka a mara na oge anyị a yiri oge Noa. Ndị tụkwasịrị Chineke obi dị ka Noa mere nwere olileanya ịlanahụ oké mbibi. (Luk 17:26, 27) Jọn, bụ́ onyeozi Jizọs, dere, sị: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
N’oge ahụ, ọnọdụ ndị anyị na-ahụ n’ụwa taa agaghịzi adị. Olee ụdị ndụ ndị lanarịrịnụ ga-ebi? E mere ka Jọn onyeozi hụ ọhụụ nke ọmarịcha ọnọdụ a ga-enwe n’ụwa n’oge Alaeze Chineke ga na-achị. O dere, sị: “[Ha na Chineke] ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ọdịnihu gị ekwesịghị iyi gị ka ọ̀ ga-adị njọ. Ọ bụrụ na ị mata Chineke ma tụkwasị ya obi nke ọma, ọdịnihu gị ga-adị nnọọ mma. Nkwa Chineke kwere nke e jikwa n’aka na ọ ga-emezurịrị bụ na, n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ọrịa na-efe efe ga-alakwa ruo mgbe ebighị ebi. N’otu amụma nke ga-emezu n’ụwa ọhụrụ ahụ, Bible kwere nkwa, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
[Foto dị na peeji nke 20]
Bible kwere nkwa maka ụwa ọhụrụ nke “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa”